Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara uru

Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara uru

Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara uru

“Onye ọ bụla nke ga-emeli ya, ya mee ya.”—MAT. 19:12.

1, 2. (a) Olee otú Jizọs, Pọl, na ndị ọzọ si lee ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye anya? (b) Olee ihe mere na ụfọdụ agaghị na-ele ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye anya dị ka onyinye?

O DORO anya na alụmdi na nwunye bụ otu n’ime onyinye ndị kacha dịrị oké ọnụ ahịa Chineke nyere ụmụ mmadụ. (Ilu 19:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe obi ụtọ. Harold, bụ́ nwanna nwoke dị afọ iri itoolu na ise, onye na-alụghị nwaanyị, kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m na-enwe obi ụtọ ma mụ na ndị ọzọ nọrọ, owu anaghị ama m ma naanị m nọrọ. N’eziokwu, ekwere m na m nwere onyinye, ya bụ, ịnọ n’alụghị nwaanyị.”

2 N’eziokwu, ma Jizọs Kraịst ma Pọl onyeozi kwuru na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye bụ onyinye si n’aka Chineke, dị ka ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ. (Gụọ Matiu 19:11, 12; 1 Ndị Kọrịnt 7:7.) Ma, ọ bụghị ndị niile na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kpebiri na ha agaghị alụ. Mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị na-eme ka o siere ụfọdụ ike ịchọta onye obi ha chọrọ. E nwekwara ndị nọzi naanị ha n’ihi na ha gbara alụkwaghịm ma ọ bụkwanụ n’ihi na di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ anwụ. Oleezi otú mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye si bụrụ onyinye? Oleekwa otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-esi jiri oge a mee ihe bara uru?

Onyinye Pụrụ Iche

3. Olee uru Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-eritekarị?

3 Onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enwekarị ohere, o nwekwaara onwe ya karịa onye lụrụ alụ. (1 Kọr. 7:32-35) Ihe ndị a bụ uru pụrụ iche ọ ga-abara ya, bụ́ nke ga-eme ka o nwee ike imekwu ihe n’ozi Jehova, hụkwuo ndị ọzọ n’anya, bịarukwuokwa Jehova nso. N’ihi ya, ọtụtụ Ndị Kraịst achọpụtala uru dị n’ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ha ekpebiekwala ‘ime ya,’ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ. Ndị ọzọ nwere ike ha ekpebighị na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, ma mgbe ihe gbanwere, ha na-ekpeku Jehova ekpere banyere ọnọdụ ha ma chọpụta na ha nwere ike ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye site n’enyemaka Jehova. Ha na-anabata ihe bịaara ha ma ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye.—1 Kọr. 7:37, 38.

4. Olee ihe mere obi ga-eji sie Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ike na ha zuru ezu ijere Chineke ozi?

4 Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye maara na ọ dịghị mkpa na ha ga-alụ di ma ọ bụ nwunye tupu Jehova ma ọ bụ ọgbakọ ya ejiri ha kpọrọ ihe. Chineke hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. (Mat. 10:29-31) O nweghị onye ma ọ bụ ihe nwere ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke. (Rom 8:38, 39) Ma ànyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụghị, e nwere ọtụtụ ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na anyị zuru ezu ijere Chineke ozi.

5. Gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iji oge ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe ga-aba ezigbo uru?

5 Ma, dị ka ọ dị n’onyinye ndị dị ka ịgụ egwú ma ọ bụ ịgba ọsọ, onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka oge a baara ya uru. Ya mere, olee otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye taa, ma ndị na-akatachabeghị ahụ́ ma ndị nke katarala ahụ́, ma ndị kpebiri na ha agaghị alụ ma ndị otú ihe si dịrị ha mere ka ha ghara inwe di ma ọ bụ nwunye, nwere ike isi jiri oge a mee ihe bara uru? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ na-agba ume banyere Ndị Kraịst oge ochie ma hụ ihe anyị nwere ike ịmụta na ha.

Ụmụ Okorobịa na Ụmụ Agbọghọbịa Ndị Na-alụghị Nwunye ma Ọ Bụ Di

6, 7. (a) Olee ihe ùgwù ụmụ Filip, bụ́ ndị na-amaghị nwoke, nwere n’ọgbakọ Chineke? (b) Olee otú Timoti si jiri oge ọ na-alụghị nwaanyị mee ihe bara uru, oleekwa otú e si gọzie ya n’ihi na o ji obi ya jee ozi mgbe ọ bụ okorobịa?

6 Filip onye na-ezisa ozi ọma nwere ụmụ agbọghọ anọ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma ka nna ha. (Ọrụ 21:8, 9) Ibu amụma so n’onyinye ọrụ ebube mmụọ nsọ nyere ndị ohu Chineke n’oge ochie, ụmụ agbọghọ ndị a jikwa onyinye ahụ mezuo ihe e dere na Joel 2:28, 29.

7 Timoti bụ nwa okorobịa nke ji oge ọ nọ n’alụghị nwaanyị mee ihe bara uru. Nne ya bụ́ Yunis, na nne nne ya bụ́ Lọịs, malitere mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ kụziwere ya “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) Ma, o yiri ka ọ̀ bụ mgbe mbụ Pọl bịara n’obodo ha bụ́ Listra n’ihe dị ka n’afọ 47 O.A. ka ha ghọrọ Ndị Kraịst. Ikekwe, Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ mgbe Pọl gara ebe ahụ nke ugbo abụọ ya mgbe afọ abụọ gachara. N’agbanyeghị na Timoti ka bụ nwa okorobịa mgbe ahụ, ọ dịbeghịkwa anya ọ natara eziokwu, ndị okenye nọ na Listra nakwa n’Aịkoniọm dị ya nso ‘kọrọ akụkọ ọma banyere ya.’ (Ọrụ 16:1, 2) N’ihi ya, Pọl gwara Timoti ka o soro ya na-eje ozi ala ọzọ. (1 Tim. 1:18; 4:14) Anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem na Timoti emechaghị lụọ nwaanyị. Ma, anyị ma na mgbe ọ bụ okorobịa, o ji obi ụtọ kwere soro Pọl, o jikwa oge ahụ ọ na-alụghị nwaanyị jee ozi ala ọzọ, bụrụkwa okenye ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ.—Fil. 2:20-22.

8. Gịnị mere ka Jọn Mak nwee ihe mgbaru ọsọ dị iche iche n’ọgbakọ, oleekwa otú e si gọzie ya maka nke a?

8 Jọn Mak jikwa oge ọ na-alụghị nwaanyị mee ihe bara uru. Ya na nne ya, bụ́ Meri, na nwa nwanne nne ya bụ́ Banabas, socha ná ndị mbụ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere na Jeruselem na narị afọ mbụ. Ọ nwekwara ike ịbụ na ezinụlọ Mak bara ọgaranya, ebe ọ bụ na ha nwere ụlọ nke ha na Jeruselem, nweekwa odibo. (Ọrụ 12:12, 13) Ma, n’agbanyeghị na ezinụlọ Mak hà bara ọgaranya, nke a emeghị ka nwa okorobịa a kporiwe ndụ ma ghara ime ihe ga-enye ya mmekpa ahụ́; o kpebighịkwanụ ịga lụọ nwaanyị mụwa ụmụ. Eleghị anya, mmata ya na ndịozi matara mere ka ije ozi ala ọzọ gụwa ya agụụ. Nke a mere ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi soro Pọl na Banabas gawa ozi ala ọzọ nke mbụ ha gara, ka o wee nyere ha aka. (Ọrụ 13:5) O mechara soro Banabas gaa ozi ala ọzọ, mechaakwa soro Pita jee ozi na Babịlọn. (Ọrụ 15:39; 1 Pita 5:13) Anyị amaghị ma Mak ò mechara lụọ nwaanyị. Ma a ma na ọ bụ onye ji obi ya dum jeere ndị ọzọ ozi, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi jee ozi Chineke.

9, 10. Olee ohere Ndị Kraịst na-eto eto na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere imekwu ihe n’ozi Chineke? Nye ihe atụ.

9 Ọtụtụ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ taa na-eji obi ụtọ ejere Chineke ozi n’oge ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Dị ka Mak na Timoti mere, ha ghọtara na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka ha nwee ike “ijere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche.” (1 Kọr. 7:35) Nke a bụ ohere magburu onwe ya. E nwere ọtụtụ ihe ha nwere ike ime, dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ oge niile, ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ịmụ asụsụ mba ọzọ, iso na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ, ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, na ije ozi na Betel. Ọ bụrụ na ị ka bụ nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa na-alụbeghị nwunye ma ọ bụ di, ì ji oge a na-eme ihe bara uru?

10 Otu nwanna nwoke aha ya bụ Mak malitere ọrụ ịsụ ụzọ mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ, gaa Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, jeekwa ozi n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Mgbe o chetara afọ iri abụọ na ise o jerela ozi oge niile, ọ sịrị: “M na-agba ọtụtụ ndị ume n’ọgbakọ anyị, m na-eso ụfọdụ aga ozi ọma, m na-aga eleta ọtụtụ ndị ná nleta ọzụzụ atụrụ, m na-akpọ ọtụtụ ndị ka ha bịa n’ụlọ m, m na-akpọkwa ha ka ha bịa nnọkọ ntụrụndụ ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume. Ihe ndị a niile na-eme ka m nwee ọṅụ dị ukwuu.” Ihe a Mak kwuru gosiri na a na-enwe ọṅụ dị ukwuu n’inye ihe, nakwa na ije ozi oge niile na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ ohere inye ndị ọzọ ihe. (Ọrụ 20:35) N’agbanyeghị ihe ndị na-amasị gịnwa bụ́ onye na-eto eto taa, ihe ndị ị ga-emeli, ma ọ bụ ihe ndị ị hụrụla ná ndụ, i nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme n’ọrụ Onyenwe anyị.—1 Kọr. 15:58.

11. Olee ụfọdụ uru mmadụ na-erite ma ọ bụrụ na o jighị ọsọ lụọ di ma ọ bụ nwunye?

11 Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-eto eto ga-emecha chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, e nwere ezigbo ihe mere na ha ekwesịghị iji ọsọ gbaba na nke a. Pọl onyeozi gwara ndị na-eto eto ka ha chere ruo, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mgbe ha gafere “oge ntoju ntorobịa,” bụ́ mgbe agụụ inwe mmekọahụ na-agụsi ike. (1 Kọr. 7:36) I kwesịrị icheretụ iji ghọta onwe gị nke ọma ma mụta ihe ndị dị mkpa ná ndụ, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịchọta onye kwesịrị ekwesị ị ga-alụ. Ikwe nkwa ọlụlụ abụghị obere okwu, mmadụ kwesịkwara ịkwụrụ ná nkwa a ná ndụ ya niile.—Ekli. 5:2-5.

Mmadụ Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mgbe O Merela Agadi

12. (a) Olee ihe Ana di ya nwụrụ ji oge ahụ di ya na-anọghịzi mee? (b) Olee ihe ùgwù o nwetara?

12 Ọ ga-abụ na o wutere Ana, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’Oziọma Luk, nke ukwuu mgbe dị ya nwụrụ ná mberede mgbe ha lụrụla naanị afọ asaa. Anyị amaghị ma ha mụrụ ụmụ, ma ọ bụkwanụ ma ò nwere mgbe ọ batara ya n’uche ịlụ di ọzọ. Ma, Baịbụl kwuru na mgbe Ana dị afọ iri asatọ na anọ, ọ ka bụ nwaanyị di ya nwụrụ. N’ihi ihe Baịbụl kwuru, anyị nwere ike ikwu na Ana ji oge a bịarukwuo Jehova nso. Ọ ‘dịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ, ọ na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie, na-ebu ọnụ, na-arịọsikwa arịrịọ ike.’ (Luk 2:36, 37) Nke a gosiri na o butere ihe gbasara Chineke ụzọ ná ndụ ya. Ọ gbara mbọ dị ukwuu iji nwee ike ime nke a, Jehova gọzikwara ya nke ukwuu maka ya. O nwere ihe ùgwù ịhụ Jizọs mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ma gbaara ndị ọzọ àmà banyere ntọhapụ a ga-esi n’aka Mesaya a tọhapụ ha.—Luk 2:38.

13. (a) Olee ihe gosiri na Dọkas nyeere ndị nọ n’ọgbakọ aka? (b) Olee otú e si kwụọ Dọkas ụgwọ maka obiọma ya na ihe ọma ndị o meere ndị ọzọ?

13 Otu nwaanyị aha ya bụ Dọkas, ma ọ bụ Tabita, bi na Jọpa, bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri nke dị n’ebe ugwu ma e si Jeruselem oge ochie gawa ya. Ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị okwu banyere di ya, ọ ga-abụ na ọ lụbeghị di mgbe ahụ. Dọkas “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere.” Ọ ga-abụ na ọ kwaara ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa na ndị ọzọ ọtụtụ uwe, nke a mekwara ka ha hụ ya n’anya nke ukwuu. N’ihi ya, mgbe ọ dara ọrịa na mberede ma nwụọ, ọgbakọ dupụrụ ndị gara rịọ Pita ka ọ bịa kpọlite nwanna nwaanyị a ha hụrụ n’anya n’ọnwụ. Mgbe akụkọ banyere mkpọlite a kpọlitere ya n’ọnwụ gbasara ebe niile na Jọpa, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 9:36-42) O nwere ike ịbụ na Dọkas nyeere ụfọdụ n’ime ha aka n’onwe ya n’ihi obiọma ya na-enweghị atụ.

14. Gịnị na-eme ka Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye gakwuo Jehova nso?

14 Dị ka ọ dị Ana na Dọkas, e nwere ọtụtụ ụmụnna anyị katarala ahụ́ ma ha alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ enwetabeghị ndị obi ha chọrọ, ebe ndị ọzọ bụ ndị gbara alụkwaghịm ma ọ bụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ anwụ. Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye enweghị di ma ọ bụ nwunye ha na-akọsara mkpa ha, ha na-atụkwasị Jehova obi ha dum. (Ilu 16:3) Silvia, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nke jerela ozi ihe karịrị afọ iri atọ na asatọ na Betel, na-ele alụghị di anya dị ka ngọzi. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-agwụ m ike na ọ bụ mụnwa na-agba ndị ọzọ ume. M na-adị na-ajụ onwe m, sị, ‘Ònye ga-agba m ume?’” Ma, o kwukwara, sị: “Ịmara na Jehova ma ihe dị m mkpa karịa ka m ma na-enyere m aka ịbịarukwu ya nso. M na-enwetakarịkwa agbamume mgbe ụfọdụ site n’ebe m na-atụghị anya ya.” Mgbe ọ bụla anyị gara Jehova nso, ọ na-agba anyị ume, na-emesikwa anyị obi ike.

15. Olee otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi ‘meghee obi’ ha hụkwuo ndị ọzọ n’anya?

15 Ọ bụrụ na mmadụ alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-enwe ohere pụrụ iche ‘imeghe obi ya’ hụkwuo ndị ọzọ n’anya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:11-13.) Jolene, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nke jerela ozi oge niile afọ iri atọ na anọ, kwuru, sị: “M na-agba mbọ imete ndị enyi, ọ bụghị naanị ndị ọgbọ m, kama ndị niile. Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwe ike inye Jehova, ezinụlọ gị, ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị, na ndị agbata obi gị, ihe. Ka m na-akatakwu ahụ́ ka m na-enwekwu obi ụtọ n’agbanyeghị na alụbeghị m di.” Ndị agadi, ndị ahụ́ na-adịghị, ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ, ndị na-eto eto, na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, na-enwe obi ụtọ otú ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye si enyere ha aka. N’eziokwu, mgbe ọ bụla anyị meere ndị ọzọ ihe iji gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya, obi na-adịkwa anyịnwa ụtọ. Ì nwere ike ‘imeghe obi’ gị hụkwuo ndị ọzọ n’anya?

Ikpebi na Ị Gaghị Alụ Di ma Ọ Bụ Nwunye

16. (a) Olee ihe mere na Jizọs alụghị nwaanyị? (b) Olee otú Pọl si jiri oge ọ na-alụghị nwaanyị mee ihe bara uru?

16 Jizọs alụghị nwaanyị; ọ kwadebere maka ọrụ ya, rụọkwa ya nke ọma. Ọ gara ọtụtụ ebe, rụọ ọrụ site n’isi ụtụtụ ruo n’ime abalị, mechaa jiri ndụ ya chụọ àjà. Ihe mere ka o nwee ike ime ihe a niile bụ n’ihi na ọ lụghị nwaanyị. Pọl onyeozi mere njem ruru ọtụtụ puku kilomita mgbe ọ na-eje ozi, ọ takwara ahụhụ dị ukwuu. (2 Kọr. 11:23-27) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na ọ lụrụ nwaanyị ná mmalite, ọ họọrọ ịnọ n’alụghị nwaanyị mgbe a họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeozi. (1 Kọr. 7:7; 9:5) Ma Pọl ma Jizọs gbara ndị ọzọ ume ka ha mee ka ha n’ihi ikwusa ozi ọma, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha mee. Ma, o nweghị onye n’ime ha kwuru na ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-egbochi mmadụ ijere Chineke ozi.—1 Tim. 4:1-3.

17. Olee otú ụfọdụ ndị taa si na-eṅomi Jizọs na Pọl, oleekwa ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na mbọ ha na-agba dị Jehova mma?

17 Ụfọdụ ndị taa ekpebiekwala na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka ha wee nwee ike ịnọgide n’ozi oge niile. Harold, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, ejeela ozi afọ iri ise na isii na Betel. O kwuru, sị: “Mgbe m nọrọ afọ iri na Betel, ahụrụ m ka ọtụtụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-apụ na Betel n’ihi ọrịa ma ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ịga lekọta ndị nne ma ọ bụ nna ha merela agadi. Nne m na nna m anwụọla. Ma, enwere m mmasị dị ukwuu n’ozi Betel nke na achọghị m ịhapụ ya n’ihi na m lụrụ nwaanyị.” Otu ọsụ ụzọ jerela ozi ọtụtụ afọ, onye aha ya bụ́ Margaret, kwukwara, sị: “Ọtụtụ ndị abịarala m di, ma alụghị m ha. Kama nke ahụ, eji m ohere m nwere na otú m si nwee ike ịga ebe ọ bụla m chọrọ n’ihi na alụghị m di na-eje ozi ọma, nke a emekwaala ka m na-enwe obi ụtọ dị ukwuu.” N’eziokwu, Jehova agaghị echefu ndị niile ji obi ha dum hapụ ihe ụfọdụ ha gaara achọ ime ka ha wee nwee ike ife ya n’enweghị ihe ndọpụ uche.—Gụọ Aịzaya 56:4, 5.

Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara Uru

18. Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi gbaa Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ume ma nyere ha aka?

18 Ndị Kraịst niile na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ndị na-agbasi mbọ ike n’ozi ha na-ejere Jehova, kwesịrị ka a na-aja ha mma ma na-agba ha ume. Anyị hụrụ onye ọ bụla n’ime ha n’anya maka ọrụ bara uru ha na-arụrụ ọgbakọ. Owu enweghị ike ịma ha ma ọ bụrụ na anyị aghọọrọ ha “ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ.”—Gụọ Mak 10:28-30.

19. Olee otú ị ga-esi jiri oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe bara uru?

19 Ma ọ̀ bụ gị kpebiri na ị gaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ ọnọdụ mere ka ọ dịrị gị otú a, ka ihe atụ ndị a dị n’Akwụkwọ Nsọ na ụmụnna ndị a a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a mee ka obi sie gị ike na i nwere ike inwe obi ụtọ, rụpụtakwa ezigbo ihe. Onyinye ụfọdụ bụ ndị a na-atụ anya ha, ebe ndị ọzọ na-abịa na mberede. A na-eji ụfọdụ akpọrọ ihe ozugbo ebe a na-eji ndị ọzọ akpọrọ ihe ka oge na-aga. Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka. Olee ihe ndị ị ga-eme iji gosi na i ji oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-eme ihe bara uru? Bịarukwuo Jehova nso, nwee ọtụtụ ihe ị na-arụ n’ozi Chineke, ma hụkwuo ndị ọzọ n’anya. Dị ka ọ dị ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, mmadụ ịbụ onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye bụ onyinye ma ọ bụrụ na e lee ya anya otú Chineke si ele ya, ma jiri ya mee ihe bara uru.

Ì Chetara?

• Olee otú mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye si bụrụ onyinye?

• Olee otú o si bụrụ na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye mgbe ha na-eto eto bụ ndị a gọziri agọzi?

• Olee ohere Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ịbịarukwu Jehova nso na ịhụkwu ndị ọzọ n’anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị A Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ì ji ohere ndị i nwere ejere Chineke ozi otú i kwesịrị?