Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Lee Aha Ya na Ndagwurugwu

Lee Aha Ya na Ndagwurugwu

Lee Aha Ya na Ndagwurugwu

Ị̀ NỤTỤLA banyere Sen Mọriz? E nwere ike ị nụtụla banyere ya n’ihi na ọ bụ ebe a ma ama nke ndị si n’ebe dị iche iche na-agakarị ezumike. Ọ dị na Ndagwurugwu Engadin dị na Swizaland. Ma, Sen Mọriz bụ otu n’ime ebe ndị mara mma nke dị na ndagwurugwu nke otu ugwu snoo jupụtara nke dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Swizaland. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị mmadụ na-agakarị na ndagwurugwu a dị nso n’Ịtali. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Swiss National Park dị. Otú ebe ahụ si maa mma nakwa osisi na ụmụ anụmanụ ndị dị na ya na-ewetara Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova, otuto. (Ọma 148:7-10) Otú ahụkwa ka ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-eme n’ebe ahụ, bụ́ ndị dịwara kemgbe ihe dị ka narị afọ atọ, na-eme.

Ihe e dere n’ọtụtụ ụlọ ndị dị na ndagwurugwu a nwere ike ịmasị gị ma ị hụ ya. Ha na-edekarị aha Chineke n’ihu ụlọ ha, dị ka n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ ha. N’ọtụtụ narị afọ ndị gara aga, ihe e ji mara ndị ebe ahụ bụ ịchọ ụlọ ha mma site n’ide ya ihe. Ha na-eji ágbá ede ụfọdụ, ma ọ bụkwanụ ha ejiri ihe kanye ya n’ahụ́ ụlọ, ma ọ bụ kanye ya na nkume. Na peeji a, ị ga-ahụ otu ụlọ nke dị n’otu obodo aha ya bụ Beva. Mgbe a sụgharịrị ihe e dere na ya, ihe ọ pụtara bụ: “A rụrụ ụlọ a n’afọ 1715. Jehova bụ mmalite, Jehova bụ ọgwụgwụ. Anyị ga-eme ihe niile n’ike Chineke, ma, o nweghị ihe anyị ga-emeli ma ọ́ bụghị n’ike ya.” N’eziokwu, aha Chineke pụtara ugboro abụọ n’ihe ahụ e dere n’ihe karịrị narị afọ atọ gara aga.

Na Madulaịn, ị ga-ahụdị ihe ka nke a mee ochie nke e dere n’ahụ́ àjà. Ihe e dere na ya bụ: “Abụ Ọma 127. Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, ọ bụ n’efu ka ndị na-ewu ya na-arụsi ọrụ ike na ya. Lucius Rumedius. N’afọ 1654.”

Gịnị mere ndị bi na ndagwurugwu a ji ede aha Chineke ebe mmadụ niile ga-ahụ ya? N’oge ahụ e nwere Mgbanwe, e bipụtara Baịbụl n’asụsụ Romansh, bụ́ asụsụ Latịn nke a na-asụ n’Engadin. Ọ bụ ya bụ akwụkwọ mbụ a sụgharịrị n’asụsụ ahụ. Ihe ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ gụtara n’Okwu Chineke masịrị ha. Nke a mere ka ha dee ma aha ha ma amaokwu Baịbụl ndị aha Chineke pụtara n’ụlọ ha.

N’eziokwu, ihe ndị ahụ e dere n’ahụ́ ájá ka na-eme ka a mara aha Jehova ma na-ewetara ya otuto, n’agbanyeghị na ọtụtụ narị afọ agaala kemgbe e dere ha n’ahụ́ ụlọ ndị ahụ. A na-akpọ ma ndị bịara ikiri ebe ahụ ma ndị bi ebi, ka ha bịa mụkwuo banyere Chineke dị ebube bụ́ Jehova, site n’ịga leta ụlọ ọzọ e dere aha Chineke, ya bụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na Beva.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 7]

© Stähli Rolf A/age fotostock