Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Nsọ Na-enyere Anyị Aka Idi Ihe Isi Ike

Mmụọ Nsọ Na-enyere Anyị Aka Idi Ihe Isi Ike

Mmụọ Nsọ Na-enyere Anyị Aka Idi Ihe Isi Ike

“N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—FIL. 4:13.

1. Gịnị mere ọtụtụ nsogbu ji abịara ndị Jehova?

NSOGBU na-abịara ndị Jehova n’ụdị n’ụdị. Ihe na-akpata ihe isi ike ụfọdụ ndị na-abịara anyị bụ ezughị okè ma ọ bụ ụwa Setan anyị bi na ya. Ihe isi ike ndị ọzọ nwekwara ike ịbịara anyị n’ihi iro dị n’etiti ndị na-efe Chineke na ndị na-anaghị efe ya. (Jen. 3:15) Kemgbe ụwa, Chineke na-enyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka idi mkpagbu a na-akpagbu ha n’ihi okpukpe ha, ọ na-enyere ha aka imeri nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha ka ha mee ihe ọjọọ, na-enyekwara ha aka idi ụdị nsogbu ndị ọzọ niile. Mmụọ nsọ ya na-enyekwara anyị aka imeri ihe ndị a.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Idi Mkpagbu A Na-akpagbu Anyị n’Ihi Okpukpe Anyị

2. Olee ihe a na-ebu n’obi akpagbu ndị mmadụ n’ihi okpukpe ha, oleekwa ụdị mkpagbu nwere ike ịbịa?

2 Ihe e ji akpagbu ndị mmadụ n’ihi okpukpe ha bụ ka ha kwụsị ikwere ihe ndị kweere, ka ha kwụsị ịgwa ndị ọzọ ihe ndị ahụ ha kweere, nakwa ka ha kwụsị ife chi ha na-efe. Mkpagbu nwere ike ịbịara anyị n’ụdị dị iche iche. O nwere ike ịbịa n’ụdị anyị ga-amata na ọ bụ mkpagbu ma ọ bụkwanụ n’ụdị anyị na-agaghị amata. Baịbụl ji ọnwụnwa Setan na-anwa anyị tụnyere otú nwa ọdụm na agwọ ubí si akpa ike.—Gụọ Abụ Ọma 91:13.

3. Olee otú mkpagbu ga-adị ya eyie otú ọdụm si atagbu anụ eri ma ọ bụ ya eyie otú agwọ ubí si ata mmadụ?

3 Ọtụtụ mgbe, Setan emeela ka ọdụm nke na-adọgbu anụ eri. Otú o sirila mee nke a bụ ibuso anyị agha, ịtụ anyị mkpọrọ ma ọ bụkwanụ ịmachibido ọrụ anyị iwu. (Ọma 94:20) Ihe a na-ebipụta n’akwụkwọ Yearbook, bụ́ ihe na-ekwu otú ọrụ Ndịàmà Jehova si aga n’oge a, na-akọ mkpagbu dị iche iche a na-akpagbu ndị ohu Chineke. Ndị na-eme ihe ike, bụ́ ndị ndị ndú okpukpe ma ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-edu ụfọdụ n’ime ha, na-akpagbu ndị Chineke n’ọtụtụ ebe. Ụdị mkpagbu a nke yiri ebe ọdụm na-adọgbu anụ eri emeela ka mmadụ ole na ole n’ime ndị ohu Chineke kwụsị ife ya ofufe. Dị ka agwọ ubí na-eme, Ekwensu na-eji aghụghọ esi n’ebe zoro ezo awakpo ndị mmadụ iji kụnye ha ihe rụrụ arụ n’obi ka ha wee mee ihe ọ na-achọ. Ụdị ihe a nwere ike ime ka mmadụ daa mbà ma ọ bụkwanụ mee ka onye ahụ nupụrụ Chineke isi. Ma, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka imeri ụdị ọnwụnwa abụọ a.

4, 5. Olee otú kacha mma anyị kwesịrị isi kwadebe maka mkpagbu, ọ bụkwa n’ihi gịnị? Nye ihe atụ.

4 Ịnọ na-eche ụdị mkpagbu ndị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu abụghị otú dị mma anyị kwesịrị isi na-akwadebe otú anyị ga-esi merie mkpagbu. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị otú anyị ga-esi mata ụdị mkpagbu ga-abịara anyị n’ọdịnihu. Ya mere, o nweghị uru anyị ichegbu onwe anyị banyere ihe ndị nwere ike ha agaghị eme ga-abara anyị. Ma, o nwere ihe anyị nwere ike ime. Ọtụtụ n’ime ndị meriri mkpagbu mere otú a site n’ịtụgharị uche n’otú ndị kwesịrị ntụkwasị obi e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ si bie ndụ nakwa site n’ichebara ihe dị iche iche Jizọs kụziri nakwa otú o si bie ndụ echiche. Nke a emeela ka ha hụkwuo Jehova n’anya. Ịhụnanya a ha nwere n’ebe Chineke nọ mekwara ka ha die ọnwụnwa ọ bụla bịaara ha.

5 Tụlee banyere ụmụnna nwaanyị abụọ bi na Malawi. Ndị na-eme ihe ike, bụ́ ndị chọrọ ịmanye ha ka ha zụrụ kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tiri ha ihe, gbaa ha ọtọ ma kwuo na ha ga-edina ha. Ha ghaara ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ụgha na ndị Betel azụrụla kaadị ndị ahụ. Gịnị ka ụmụnna ndị ahụ gwara ha? Ha sịrị: “Ọ bụ naanị Jehova bụ́ Chineke ka anyị na-efe. Ya mere, ọ bụrụ na ụmụnna anyị ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị zụụrụ kaadị, nke ahụ agbasaghị anyị. O nweghị ihe ga-eme ka anyị gbanwee obi anyị, a sịgodị na unu chọrọ igbu anyị!” Ha hapụrụ ụmụnna ndị ahụ mgbe ha hụrụ na obi siri ha ike.

6, 7. Olee otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka idi mkpagbu?

6 Pọl onyeozi kwuru na Ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka nabatara eziokwu dị na Baịbụl mgbe ha “nọ ná mkpagbu dị ukwuu,” ma, ha “ji ọṅụ nke mmụọ nsọ” nabata ya. (1 Tesa. 1:6) Ọtụtụ Ndị Kraịst, ma ndị dịrị ndụ n’oge ochie ma ndị nọ ndụ taa, bụ́ ndị meriri mkpagbu a kpagburu ha, na-ekwu na ha na-enwe udo, bụ́ ihe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, mgbe mkpagbu karịrị akarị. (Gal. 5:22) Udo ahụ na-eche obi ha na ike iche echiche ha nche. N’eziokwu, Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka ndị ohu ya die nsogbu, nke a na-enyekwara ha aka ime ihe ziri ezi mgbe ọnwụnwa bịaara ha. *

7 Ọ na-atụ ndị ma banyere mkpagbu a na-akpagbu ndị Chineke n’anya ịhụ otú ha si akwụsi ike n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha. O yiri ka Ndịàmà Jehova hà nwere ike karịrị nke mmadụ. N’eziokwu, ha nwere. Pita onyeozi mesiri anyị obi ike, sị: “Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, unu nwere obi ụtọ, n’ihi na mmụọ nke ebube, ya bụ, mmụọ nke Chineke, dịkwasịrị unu.” (1 Pita 4:14) Mkpagbu a na-akpagbu anyị n’ihi na anyị na-eme ihe ziri ezi gosiri na anyị na-eme ihe dị Chineke mma. (Mat. 5:10-12; Jọn 15:20) Ọṅụ na-ejupụta anyị obi n’ihi na Jehova na-agọzi anyị.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Imeri Nsogbu Ndị Ọgbọ

8. (a) Olee ihe nyeere Jọshụa na Keleb aka ime ihe dị iche n’ihe ndị ọgbọ ha mere? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jọshụa na Keleb mere?

8 Mkpagbu nke ji aghụghọ abịara Ndị Kraịst, bụ́ nke anyị kwesịrị idi, bụ nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha ka ha mee ihe na-ezighị ezi. Ma, ebe ọ bụ na mmụọ Jehova ka mmụọ na-achị ụwa ike, anyị ga-enwe ike imeri ndị na-akwa anyị emo, ndị na-ebo anyị ebubo ụgha, ma ọ bụ ndị na-agba mbọ ịmanye anyị ka anyị mewe ihe ha chọrọ. Dị ka ihe atụ, gịnị nyeere Jọshụa na Keleb aka ikwu ihe dị iche n’ihe ndị nledo ndị ọzọ ha na ha so gaa ala Kenan kwuru? Mmụọ nsọ mere ka ha nwee “mmụọ,” ma ọ bụ echiche, dị iche.—Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 13:30; 14:6-10, 24.

9. Olee ihe Ndị Kraịst ji kwesị ịdị njikere ime ihe dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eme?

9 Mmụọ nsọ nyekwaara ndịozi Jizọs aka irubere Chineke isi kama irubere ndị ọtụtụ mmadụ weere na ha na-eme ka ndị mmadụ mara ezi okpukpe. (Ọrụ 4:21, 31; 5:29, 32) Ọtụtụ ndị na-ahọrọ ime ihe ndị ọzọ na-eme, ka ndị ahụ wee nabata ha. Ma, ezigbo Ndị Kraịst na-emekarị ihe ha ma na ọ dị mma. Ha na-eme nke a n’ihi na ike mmụọ nsọ na-enye ha na-eme ka ha ghara ịtụ ụjọ ịgbapụ iche. (2 Tim. 1:7) Ka anyị tụlee otu n’ime ebe anyị na-ekwesịghị ikwe ka ndị ọgbọ anyị merie anyị.

10. Olee ihe nwere ike isiri Ndị Kraịst ụfọdụ ike omume?

10 O nwere ike isiri ụfọdụ ndị na-eto eto ike ịma ihe ha ga-eme ma ha mara na enyi ha mere ihe ọjọọ. Ha nwere ike iche na ịgwa ndị okenye ka ha nyere enyi ha aka ga-eme ka enyi ha ghara ịtụkwasị ha obi; nke a na-eme ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe ahụ n’agbanyeghị na ime otú a agaghị enyere enyi ha ahụ aka. Onye mere ihe ọjọọ nwedịrị ike ịgwa enyi ya ka ọ ghara ime ka onye ọ bụla mara ihe o mere. Ọ bụghị naanị ndị na-eto eto na-eme ụdị ihe a. O nwere ike isiri ụfọdụ ndị torola eto ike ịgakwuru ndị okenye gwa ha ihe ọjọọ enyi ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha mere. Ma, olee ihe ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ime banyere ụdị ihe a?

11, 12. Gịnị ka i kwesịrị ime ma nwanna gwa gị ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla na ya mere ihe ọjọọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

11 Chee echiche banyere ihe atụ a. Ka e were ya na Chibụike, bụ́ nwanna nwoke na-eto eto, ma na Onyedịka, bụ́ enyi ya nwoke ya na ya nọ n’otu ọgbakọ, na-ekirikarị ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. Chibụike agwa Onyedịka na ihe a ọ na-eme na-enye ya nsogbu n’obi. Ma, ihe ọ na-ekwu adịghị Onyedịka ka ihe. Mgbe Chibụike gwara Onyedịka ka ọ gwa ndị okenye, ya asị ya na ọ bụrụ na ọ ma na ha abụọ bụ enyi, ya agwala ya onye ọ bụla. Ụjọ ò kwesịrị ịtụwa Chibụike na ha abụọ nwere ike kwụsị ịbụ enyi? O nwere ike ịnọ na-eche onye ndị okenye ga-ekwere ihe o kwuru ma ọ bụrụ na Onyedịka amalite ịgọ agọ. Ma, ihe agaghị aka mma ma Chibụike gba nkịtị. Nke bụ́ eziokwu bụ na nke a nwere ike ime ka Onyedịka na Jehova ghara ịdị ná mma. Chibụike kwesịrị icheta na “ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà, ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.” (Ilu 29:25) Gịnị ọzọ ka Chibụike nwere ike ime? O nwere ike iji ịhụnanya gakwuru Onyedịka ọzọ wee gwa ya okwu banyere ihe ahụ o mere. Tupu o mee nke a, ọ ga-enwe obi ike. O nwere ike ịbụ na Onyedịka ga-ege ntị ugbu a mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ahụ o mere. Chibụike kwesịrị ịgba Onyedịka ume ọzọ ka ọ gwa ndị okenye ihe ahụ o mere. Ọ ga-agwakwa ya na ọ bụrụ na o meghị otú ahụ ruo mgbe dị otú a dị otú a na ya ga-eji ọnụ ya gwa ha ya.—Lev. 5:1.

12 Ọ bụrụ na ihe dịrị otú a, ná mmalite, enyi gị nwere ike na-ewe iwe maka mbọ a ị na-agba inyere ya aka. Ma, e mechaa, ọ ga-amata na mbọ ahụ niile ị gbara bụ maka ọdịmma ya. Ọ bụrụ na i nyere onye ahụ mere mmehie aka, ya anabatakwa ya, otú i si nwee obi ike ma gosi na ị hụrụ ya n’anya agaghị apụ ya apụ n’obi. Ma, ọ bụrụ na ọ na-eweso gị iwe na ị gwara ndị okenye ihe o mere, ọ̀ bụ ụdị onye a ka ị chọrọ ka gị na ya bụrụ enyi? Ime ihe ga-adị Enyi kacha enyi niile anyị nwere, bụ́ Jehova, mma bụ ihe anyị kwesịrị ime mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị ebute Jehova ụzọ, ndị ọzọ hụrụ ya n’anya ga na-akwanyere anyị ùgwù n’ihi na anyị na-eguzosi ike n’ihe, ha ga-aghọkwa ezigbo ndị enyi anyị. Anyị ekwesịghị inye Ekwensu ohere ka ọ bata n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị enye ya ohere, anyị ga-eme ka mmụọ nsọ Jehova nwee mwute. Ma, ọ bụrụ na anyị na-enye aka eme ka ọgbakọ dị ọcha, anyị na-akwado ọrụ mmụọ nsọ na-arụ.—Efe. 4:27, 30.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Idi Ụdị Nsogbu Ọ Bụla

13. Olee ụdị nsogbu na-abịara ndị Jehova, oleekwa ihe mere ụdị ihe ndị a ji ju n’ụwa?

13 Nsogbu na-abịara anyị n’ụdị n’ụdị, ndị dị ka ụkọ ego, mgbe a chụrụ anyị n’ọrụ, ọdachi na-emere onwe ya, ọnwụ nke onye mmadụ hụrụ n’anya, ọrịa, na ihe ndị ọzọ. Ebe anyị bi ‘n’oge dị oké egwu,’ ụdị ihe isi ike dị iche iche nwere ike ịbịara anyị mgbe ọ bụla. (2 Tim. 3:1) Ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ma nke a mee. Mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka idi ụdị nsogbu ọ bụla.

14. Gịnị nyeere Job aka idi ihe ndị bịaara ya?

14 Ihe isi ike dị iche iche bịaara Job, otu bịapụ ọzọ abịachie. Ihe o ji akpata ihe oriri lara n’iyi, ụmụ ya anwụọ, ọrịa amalite ịrịa ya, nwunye ya akwụsịkwa ịtụkwasị Jehova obi. (Job 1:13-19; 2:7-9) Ma, Elaịhu kasiri nnọọ Job obi. Ihe ọ gwara Job, na ihe ihe Jehova gwara Job pụtara bụ: “Guzo ma chebara ọrụ dị ebube nke Chineke echiche.” (Job 37:14) Gịnị nyeere Job aka imeri ihe isi ike ndị bịaara ya? Gịnịkwa ga-enyere anyị aka idi ihe isi ike ndị nwere ike ịbịara anyị? Ọ bụ icheta ụzọ dị iche iche Jehova sirila jiri ike ya na mmụọ nsọ rụọ ọrụ, nakwa ichebara ụzọ ndị a echiche. (Job 38:1-41; 42:1, 2) Ikekwe, anyị na-echeta oge dị iche iche ihe ndị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya mere ná ndụ anyị. Ọ ka hụrụ anyị n’anya.

15. Gịnị nyeere Pọl onyeozi aka idi ihe isi ike ndị bịaara ya?

15 Pọl onyeozi diri ọtụtụ ihe isi ike tara akpụ n’ihi ozi ọma. (2 Kọr. 11:23-28) Olee otú o si kwụsie ike ma ghara ịda mbà n’oge ihe ndị ahụ na-eme? Ọ bụ site n’ịtụkwasị Jehova obi nakwa site n’ikpeku ya ekpere. Mgbe a na-akpagbu Pọl, bụ́ nke e megidere ruo mgbe e gburu ya, o dere, sị: “Onyenwe anyị guzoro m nso ma nye m ike, ka e wee site n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, ka mba niile wee nụkwa ya; a napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.” (2 Tim. 4:17) Ya mere, Pọl chetara ihe ndị ọ gabigara wee dụọ ụmụnna ya ọdụ ka ha ghara ‘ichegbu onwe ha banyere ihe ọ bụla.’—Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.

16, 17. Nye ihe atụ nke na-egosi otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka idi ihe isi ike ndị na-abịara ha n’oge a.

16 Ihe mere otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Roxana mere ka ọ ghọta otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka. Mgbe Roxana rịọrọ nwoke ọ na-arụrụ ọrụ ka o nye ya abalị ole na ole ya ga-eji gaa mgbakọ, nwoke ahụ ji iwe gwa ya na ya ga-achụ ya n’ọrụ ma ọ gaa mgbakọ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Roxana gara mgbakọ ahụ. O kpesikwara ekpere ike ka Jehova ghara ikwe ka a chụọ ya n’ọrụ. Ọ kwụsịrị ichegbu onwe ya mgbe o kpechara ekpere ahụ. Mgbe ọ lọtara mgbakọ ahụ wee ga ọrụ na Mọnde ya, nna ya ukwu mere ihe o kwuru wee chụọ ya n’ọrụ. Nke a nyere Roxana nsogbu n’obi. N’agbanyeghị na a naghị akwụ ya ezigbo ụgwọ n’ọrụ ahụ, ọ dị ya mkpa n’ihi na o ji ya akpata ihe o ji azụ ezinụlọ ya. O kpekuru Chineke ekpere ọzọ wee na-eche na ebe ọ bụ na o nyere ya nri ime mmụọ mgbe ya gara mgbakọ na ọ ga-enyekwa ya nri anụ ahụ́. Ka Roxana nọ na-ala ebe o bi, ọ hụrụ ebe e dere na otu ụlọ ọrụ chọrọ onye ọ bụla jirila nnukwu ígwè e ji akwa ákwà rụọ ọrụ ọtụtụ afọ. O tinyere akwụkwọ ka e wee ya n’ọrụ ahụ. Onyeisi ụlọ ọrụ ahụ were ya n’ọrụ n’agbanyeghị na ọ nabughị arụ ụdị ọrụ ahụ, wee kwe nkwa ịkwụ ya ego ji okpukpu abụọ karịa ihe a na-akwụ ya n’ebe ahụ a chụrụ ya n’ọrụ. Roxana matara na Chineke azala ekpere ya. Ma, ihe kacha ihe ọma niile si na nke a pụta bụ na ọ na-ezi ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ha ozi ọma. Ise n’ime ha, tinyere onyeisi ụlọ ọrụ ha, natara eziokwu, e meekwa ha baptizim.

17 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka Chineke anaghị aza ekpere anyị, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, na ọ naghị aza ya ozugbo ma ọ bụkwanụ na ọ naghị aza ya otú anyị si chọọ. Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na o nwere ezigbo ihe kpatara ya. Jehova ma ihe ahụ kpatara ya, ma, anyị nwere ike ịma ka oge na-aga. Otu ihe doro anyị anya bụ na Chineke anaghị eleghara ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi anya.—Hib. 6:10.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Imeri Ihe Isi Ike na Ọnwụnwa

18, 19. (a) Olee ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya ihe isi ike na ọnwụnwa? (b) Olee otú i nwere ike isi merie ihe isi ike?

18 Ọ naghị atụ ndị Jehova n’anya ma e nwee ihe kụdara ha mmụọ, ma ọnwụnwa bịara ha, ma a kpagbuwe ha, ma ọ bụkwanụ ma ndị ọgbọ ha nyewe ha nsogbu. Ụwa kpọrọ anyị asị. (Jọn 15:17-19) Ma, mmụọ nsọ na-enyere anyị aka imeri ihe isi ike ọ bụla nwere ike igbochi anyị ijere Chineke ozi. Jehova agaghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị ga-edili. (1 Kọr. 10:13) Ọ gaghị ahapụ anyị, ọ gaghịkwa agbahapụ anyị. (Hib. 13:5) Ime ihe dị n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee na-echebe anyị ma na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ọzọ bụ na mmụọ Chineke nwere ike ime ka nwanna anyị nyere anyị aka mgbe ọ bụla enyemaka dị anyị ezigbo mkpa.

19 Ka anyị niile nọgide na-achọ mmụọ nsọ site n’ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl. Ka anyị nọgide na-abụ ndị ‘e ji ike niile na-eme ka ha dị ike dị ka ike Chineke dị ebube si dị, ka anyị wee tachie obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’—Kọl. 1:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Dị ka ihe atụ, gụọ Ụlọ Nche nke May 1, 2001, peeji nke 16.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú ị ga-esi kwadebe idi mkpagbu?

• Olee ihe ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka ị ghara ime ka a mara mmehie o mere?

• Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike mgbe ihe isi ike ọ bụla bịaara gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Jọshụa na Keleb?

[Foto dị na peeji nke 29]

Olee otú i nwere ike isi nyere enyi gị mere mmehie aka?