Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-echebara Ihe Jehova Meere Gị Echiche

Na-echebara Ihe Jehova Meere Gị Echiche

Na-echebara Ihe Jehova Meere Gị Echiche

OBERE oge ka a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya si Jeruselem na-aga Emeọs. Oziọma Luk kwuru, sị: “Ka ha na-akparịta ụka ma na-ekwurịta okwu, Jizọs bịaruru nso wee soro ha na-aga; ma e mechiri anya ha ka ha ghara ịmata onye ọ bụ.” Jizọs wee sị ha: “‘Gịnị bụ ihe ndị a unu na-arụ ụka ya ka unu na-aga n’ụzọ?’ Ha wee gbarụọ ihu, guzoro otu ebe.” Gịnị mere ha ji gbarụọ ihu? Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs chere na Jizọs ga-anapụta Izrel n’aka ndị Jentaịl n’oge ahụ, ma, ọ napụtaghị ha. Kama Jizọs ga-anapụta ha, e gburu ya. Ọ bụ nke a mere na obi adịghị ha mma.—Luk 24:15-21; Ọrụ 1:6.

Jizọs malitere ịgwa mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya okwu. “Ọ kọwaara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ dum banyere onwe ya, malite n’ihe Mozis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.” N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe pụrụ iche nakwa ihe ndị na-eme ka okwukwe mmadụ sie ike, bụ́ ndị mere mgbe Jizọs na-eje ozi. Ka ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu, obi malitere ịdị ha mma. Ha mechara gwa ibe ha n’abalị ahụ, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, mgbe ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?” (Luk 24:27, 32) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere?

Olee Otú Obi Na-adị Anyị Mgbe Ihe Ndị Anyị Tụrụ Anya Ha Na-emezughị?

Ihe mere obi ji jọọ mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị na-aga Emeọs, njọ bụ na ihe ndị ha tụrụ anya ha emezughị. Ihe mere ha bụ ihe ahụ e kwuru n’Ilu 13:12, bụ́ nke sịrị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.” Ụfọdụ n’ime anyị, bụ́ ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ, nwekwara ike iche na “oké mkpagbu” ekwesịla ịbịa kemgbe. (Mat. 24:21; Mkpu. 7:14) Ọ bụghị ihe ijuanya ma ihe ndị a a na-atụ anya ha, bụ́ ndị na-emezubeghị, mee ka obi jọọ mmadụ njọ.

Ma, cheta na mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs maliteghachiri inwe ọṅụ mgbe Jizọs chetaara ha amụma ndị mezurula, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha mezudịrị n’oge ahụ. Anyị nwekwara ike ịnọgide na-enwe ọṅụ ma ghara ịna-enwe mwute n’ihi ihe ndị na-emezubeghị ma ọ bụrụ na anyị echeta amụma ndị mezurulanụ. Otu okenye nọterela aka n’ọgbakọ, onye aha ya bụ Michael, kwuru, sị: “Echegbula onwe gị banyere ihe Jehova na-emezubeghị. Kama nke ahụ, na-eche banyere ihe ndị o merela.” Ihe a nwanna a kwuru bụ eziokwu.

Ihe Jehova Merela

Tụlee ihe ụfọdụ pụrụ iche Jehova merela. Jizọs sịrị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụ ga-arụkwa ọrụ m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a.” (Jọn 14:12) Taa, ndị ohu Chineke na-arụ ọrụ kacha mkpa. Ihe karịrị nde mmadụ asaa na-atụ anya na ha ga-alanahụ oké mkpagbu ahụ. N’eziokwu, e nwetụbeghị ọnụ ọgụgụ ndị ohu Jehova ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejechi ozi ọma anya n’ụwa niile otú e nwere ya taa. Jehova emezuola amụma ahụ Jizọs buru na ndị na-eso ụzọ ya ‘ga-arụ ọrụ karịrị ọrụ ndị a.’

Olee ihe ọzọ Jehova meerela anyị? O meela ka ndị nwere ezi obi si n’ụwa ọjọọ a pụta ma banye na paradaịs ime mmụọ o doziiri ha. (2 Kọr. 12:1-4) Chebara ụfọdụ ihe ndị ọ na-emere anyị na paradaịs ahụ echiche. Dị ka ihe atụ, legodị anya n’ọ́bá akwụkwọ gị ma ọ bụ n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Sapegodị akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index, ma ọ bụkwanụ chọọ ihe na Watchtower Library. Gee ihe nkiri si na Baịbụl, bụ́ nke e tinyere na teepụ. Chegodị banyere ihe ndị e kwuru n’otu mgbakọ e nwere n’oge na-adịbeghị anya nakwa ihe ndị mere ebe ahụ. Cheekwa banyere otú anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị si na-emekọrịta ihe nke ọma. Ihe a niile na-egosi na Jehova na-enye anyị nri ime mmụọ n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee ọtụtụ ụmụnna anyị ndị hụrụ anyị n’anya. N’eziokwu, anyị nọ na paradaịs ime mmụọ!

Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị.” (Ọma 40:5) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-echebara ihe ndị dị ebube Jehova meerela anyị echiche, tinyere ihe ọma ndị o bu n’obi imere anyị, nke a ga-enyere anyị aka inweta ume anyị ga-eji nọgide na-ejere Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ozi.—Mat. 24:13.

[Foto dị na peeji nke 31]

Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ichebara ihe Jehova meerela ha echiche

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

Chegodị banyere ihe ndị e kwuru n’otu mgbakọ e nwere n’oge na-adịbeghị anya nakwa ihe ndị mere ebe ahụ