Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Dị M Ụtọ na m Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M

Obi Dị M Ụtọ na m Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M

Obi Dị M Ụtọ na m Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M

Dị ka Maatje de Jonge-van den Heuvel si kọọ

ADỊ M iri afọ itoolu na asatọ. Ejirila m iri afọ asaa n’ime ya jeere Jehova ozi, ọtụtụ ule abịakwarala m. Oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, a tụrụ m mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ, bụ́ ebe ịda mbà n’obi mere ka m mee otu ihe m mechara kwaara ụta. Mgbe afọ ụfọdụ gara, e nwere ihe ọzọ mere m nke mere ka obi jọọ m njọ. Ma, m na-ekele Jehova na m nwere ihe ùgwù nke ijere ya ozi, n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.

Ndụ m gbanwere n’Ọktoba 1940. M bi na Hilvasọm, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Amstadam. Isi ebe ahụ gaa Amstadam nke dị na Nedalandz dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na anọ. Ọ bụ ndị Nazi na-achị mba ahụ n’oge ahụ. O meela afọ ise mụ na di m ọma bụ́ Jaap de Jonge gbara akwụkwọ, anyị mụkwara ọmarịcha nwa anyị nwaanyị nke dị afọ atọ n’oge ahụ, onye aha ya bụ Willy. Anyị na otu ezinụlọ dara ogbenye gbara agbata obi. N’agbanyeghị na ezinụlọ a na-adọga ka ha wee kpata ihe ha ga-eji na-azụ ụmụ asatọ ha mụrụ, ọ bụ ha na-enye otu nwa okorobịa bi n’ụlọ ha nri. M jụrụ onwe m, sị: ‘Gịnị mere ha ji bukwasịkwuo onwe ha ibu ọzọ?’ Mgbe m gara bugara ha nri, m chọpụtara na nwa okorobịa ahụ bụ ọsụ ụzọ. Ọ gwara m banyere Alaeze Chineke na ihe ọma ndị ọ ga-eweta. Ihe ọ gwara m ruru m n’obi, mụ ekweta ozugbo na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ n’afọ ahụ ka m raara onwe m nye Jehova, e meekwa m baptizim. Mgbe otu afọ gachara ka e mere m baptizim, di m ghọrọ Onyeàmà Jehova.

N’agbanyeghị na amatachabeghị m ihe Baịbụl na-akụzi, o doro m nnọọ anya na ebe ọ bụ na mụ aghọọla Onyeàmà Jehova, esorola m ná ndị a machibidoro okpukpe ha iwu. M makwa na a tụọla ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, m bidoro ozugbo kwusawa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mụ na di m wepụtakwara ụlọ anyị ka ọ bụrụ ebe ndị ọsụ ụzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga na-arahụ. Ụlọ anyị ghọkwara ebe a na-ebusa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị ụmụnna si Amstadam na-ebutere anyị. Ha na-ebuju ọtụtụ akwụkwọ n’ígwè ha nke a rụrụ otú ọ ga na-ebu ibu, ha na-ejikwa tapolin ekpuchi akwụkwọ ndị ahụ. N’eziokwu, ụmụnna ndị ahụ nwere ịhụnanya na obi ike. Ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi ụmụnna ha.—1 Jọn 3:16.

“Mama, Ị̀ Ga-alọtakwa Ngwa Ngwa?”

Ihe dị ka ọnwa isii ka e mechara m baptizim, ndị uwe ojii atọ bịara n’ụlọ anyị. Ha banyere n’ime ụlọ na-achọgharị ihe. N’agbanyeghị na ha ahụghị kọbọd anyị kwanyejuru akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, ha hụrụ ụfọdụ akwụkwọ ndị anyị zoro n’okpuru àkwà anyị. Ha gwara m ozugbo ka m soro ha gawa n’ụlọ ọrụ ha dị na Hilvasọm. Mgbe m makụrụ Willy, bụ́ nwa m nwaanyị, ka m sị ya nọọ nke ọma, ọ jụrụ m, sị, “Mama, ị̀ ga-alọtakwa ngwa ngwa?” M sịrị ya: “Ee, nwa m, m ga-alọta ngwa ngwa.” Ma, ọnwa iri na asatọ ga-aga tupu mụ amakụọ ya ọzọ.

Otu onye uwe ojii kpọọrọ m banye ụgbọ okporo ígwè nke bugara m Amstadam ka a gbaa m ajụjụ. Ndị na-agba m ajụjụ gbara mbọ ime ka m kweta na mmadụ atọ si Hilvasọm bụ Ndịàmà Jehova. M gwara ha, sị: “Ọ bụ naanị otu onye n’ime ha ka m ma onye ọ bụ. Ọ na-eresị anyị mmiri ara ehi.” Ihe ahụ m kwuru bụ eziokwu n’ihi na nwanna ahụ na-ere mmiri ara ehi. M gwara ha, sị: “Ma, ọ bụ ya ga-ekwu ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova, ọ bụghị m.” Mgbe m na-ekweghị ekwu ihe ọzọ, ha mara m aka ntị, ma kpọchie m ebe m nọrọ ọnwa abụọ. Mgbe di m matara ebe m nọ, ọ chịtaara m uwe, wetakwara m ihe oriri. N’Ọgọst 1941, a kpọgara m Ravensbrọk, bụ́ ajọ ogige ịta ahụhụ ụmụ nwaanyị, nke dị n’ebe ugwu Belin dị na Jamanị. Ọ dị ihe dị ka iri kilomita asatọ ma e si Belin gawa ya.

“Nne, Mesaa Ihu”

Mgbe anyị rutere ebe ahụ, a gwara anyị na a ga-ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị abịanye aka n’akwụkwọ iji gosi na anyị abụghịzi Ndịàmà Jehova. Ma, abịanyeghị m aka n’akwụkwọ ahụ. Kama ime otú ahụ, m bunyere ha ibu m, ma gaa yipụ uwe m n’otu ụlọ a na-anọ asa ahụ́, bụ́ ebe m hụrụ ụfọdụ ụmụnna nwaanyị si Nedalandz. Ha chịnyere anyị uwe ndị mkpọrọ a dụnyere purple triangle, nyekwa anyị efere, iko, na ngaji. N’abalị mbụ anyị nọrọ ebe ahụ, a kpọchiri anyị ebe a na-akpọchi ndị mkpọrọ ruo nwa oge. Kemgbe a kpụụrụ m, ọ bụ n’ebe ahụ bụ ebe mbụ m bere ákwá. M ji ákwá kwuo, sị, “Gịnị ka ha ga-eme m? Olee mgbe m ga-esi ebe a pụọ?” Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ahụ, mmekọrịta mụ na Jehova esichabeghị ike, n’ihi na m ka natara eziokwu ọnwa ole na ole gara aga. O nwere ọtụtụ ihe m na-amatabeghị. Mgbe a nọ na-akpọ aha ndị mkpọrọ n’echi ya, otu nwanna nwaanyị onye Nedalandz chọpụtara na obi adịghị m mma. Ọ gwara m, sị: “Nne, mesaa ihu, ebezila! E nweghị ihe ga-eme anyị.”

Mgbe a kpọchara aha anyị, a kpọgara anyị n’ogige ịta ahụhụ ọzọ, bụ́ ebe anyị hụrụ ọtụtụ ụmụnna nwaanyị si Jamanị na Nedalandz. Ụfọdụ n’ime ụmụnna nwaanyị ndị ahụ si Jamanị anọọla ebe ahụ ihe karịrị otu afọ. Otú mụ na ha si na-emekọrịta ihe gbara m ume, n’eziokwu, o mere ka m mesaa ihu. Obi dịkwa m mma mgbe m chọpụtara na ebe ụmụnna anyị ndị nwaanyị nọ ka ebe ndị ọzọ dịrị ọcha. E wezụga na ebe ahụ anyị nọ dị ọcha, ihe e ji mara ya bụ na ndị bi ebe ahụ anaghị ezu ohi, ha anaghị akpọ mmadụ iyi, ha anaghịkwa alụ ọgụ. N’agbanyeghị ahụhụ niile a na-ata anyị, ebe ahụ anyị bi dị ka agwaetiti dị ọcha nke oké osimiri ruru unyi gbara gburugburu.

Otú Ihe Si Aga n’Ogige Ịta Ahụhụ

N’ogige ịta ahụhụ, a na-arụ oké ọrụ ma na-eri obere nri. Anyị na-ebili n’elekere ise nke ụtụtụ, ọ naghịkwa adị anya akpọwa aha ndị mkpọrọ. Ndị na-eche anyị nche na-eme ka anyị guzoro n’èzí ruo ihe dị ka otu awa, ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha. Ọ kụọ elekere ise nke mgbede, mgbe anyị rugbuchara onwe anyị n’ọrụ, a na-akpọ aha ndị mkpọrọ ọzọ. A kpọchaa aha, anyị na-ata obere bred, raakwa obere ofe tupu anyị alakpuo. Ike na-agwụrukwa anyị n’ọkpụkpụ.

E wezụga na Sọnde, ebe m na-arụ ọrụ kwa ụbọchị bụ n’ugbo, bụ́ ebe m na-ebe ọka wit, na-agwọcha ọwa mmiri, na-asachakwa ụlọ ézì. N’agbanyeghị na ọrụ ahụ bụ ọrụ ike na ọrụ na-asọ oyi, m na-arụ ya kwa ụbọchị n’ihi na m bụ nwa agbọghọ ike ka dị n’ahụ́. Ihe ọzọ m na-eji agba onwe m ume ma m na-arụ ọrụ bụ ịbụ abụ Alaeze. Ma, m na-echeta di m na nwa m kwa ụbọchị.

A na-enye anyị obere nri, ma, ụmụnna nwaanyị niile na-edobe otu ibé bred kwa ụbọchị ka anyị wee nwee ike ịhụ ihe anyị ga-eri na Sọnde, bụ́ ụbọchị anyị na-ezukọ kwurịta ihe ndị dị na Baịbụl. Anyị enweghị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ma, m na-ege ntị nke ọma mgbe ụmụnna nwaanyị ndị ahụ si Jamanị, ndị tọrọ m, bụ́ ndị kwesịkwara ntụkwasị obi, na-atụle ihe ndị dị na Baịbụl. Anyị nọdị ebe ahụ mee Ncheta Ọnwụ Kraịst.

Nsogbu, Ịkwa Ụta, na Ihe Gbara M Ume

Mgbe ụfọdụ, a na-agwa anyị ka anyị rụọ ọrụ na-akwado agha ndị Nazi na-alụ. Ebe ọ bụ na anyị anaghị etinye aka n’ọchịchị, ụmụnna nwaanyị niile na-ajụ ịrụ ọrụ ahụ, m na-esokwa ha ajụ. Ahụhụ ha na-ata anyị bụ na ha anaghị enye anyị nri ọtụtụ ụbọchị, anyị na-eguzokwa ọtọ ọtụtụ awa mgbe ọ bụla a na-akpọ aha ndị mkpọrọ. N’oge oyi, e nwere oge e tinyere anyị n’ọnụ ụlọ na-enweghị ihe na-ekpo ya ọkụ, anyị nọrọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ.

A gwara anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ugboro ugboro na a ga-ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị abịanye aka n’akwụkwọ iji gosi na anyị abụghịzi Ndịàmà Jehova. Mgbe m nọrọ ihe karịrị otu afọ na Ravensbrọk, adara m ezigbo mbà n’obi. Ọ gụsiri m agụụ ike ịhụ di m na nwa m nwaanyị, n’ihi ya, m gakwuuru ndị na-eche anyị nche, nara ha akwụkwọ ahụ e dere ihe gosiri na m gaghị abụzi Onye Mmụta Baịbụl wee bịanye aka na ya.

Mgbe ụmụnna nwaanyị ahụ matara ihe m mere, ụfọdụ n’ime ha malitere ize m eze. Ma, Hedwig na Gertrud, bụ́ ụmụnna nwaanyị abụọ katarala ahụ́, ndị si Jamanị, kpọrọ m wee gwa m na ha ka hụrụ m n’anya. Mgbe mụ na ha na-arụ ọrụ n’ebe ahụ a na-azụ ézì, ha na-eji obiọma akọrọ m ihe mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova isi. Ha na-agwakwa m na otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịkwụsi ike n’ebe ọ nọ. Otú ha si jiri ọmịiko gwa m okwu ka ebe nne na-agwa nwa ya okwu metụrụ m n’ahụ́. * Ama m na ihe m mere adịghị mma, m chọkwara ịkagbu aka ahụ m bịanyere n’akwụkwọ. N’otu anyasị, agwara m otu nwanna nwaanyị na m chọrọ ịkagbu aka ahụ m bịanyere n’akwụkwọ. Ọ ga-abụrịrị na otu onye na-arụ n’ogige ahụ nụrụ mgbe anyị na-ekwu banyere nke a n’ihi na n’abalị ahụ, a hapụrụ m ozugbo ma tinye m n’ụgbọ okporo ígwè bulara m Nedalandz. Otu n’ime ndị na-elekọta anyị, bụ́ onye m ka na-echeta otú ọ dị, gwara m sị: “Ị ka bụ Onye Mmụta Baịbụl, ị ga-anọgidekwa na-abụ ya.” M zara ya, sị: “Ee m ka ga-abụ ma ọ bụrụ uche Jehova.” Ma, ihe m na-eche mgbe niile bụ, ‘Olee otú m ga-esi gwa ha ka ha kagbuo aka ahụ m bịanyere n’akwụkwọ?’

Otu n’ime ihe ndị e dere n’akwụkwọ ahụ bụ: “M ji nke a na-eme ka a mara na esoghịzi m Ndị Mmụta Baịbụl.” M ma ihe m ga-eme! Ozugbo m ruru ụlọ na Jenụwarị 1943, m maliteghachiri ịga ozi ọma. N’eziokwu, a sị na ndị ọchịchị Nazi jidere m ọzọ ebe m na-ekwusa banyere Alaeze Chineke, ha gaara echi m ọnụ n’ala.

Ka m wee gosikwuo Jehova na m ji obi m niile chọọ ijere ya ozi, mụ na di m nyeghachiri ụlọ anyị ka ndị na-ebutere anyị akwụkwọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arahụ na ya. Obi dị m ezigbo ụtọ na m nwere ohere ọzọ m ga-eji gosi na m hụrụ Jehova na ndị ya n’anya.

Ihe nke Gbawara Anyị Obi

Mgbe ọ fọrọ ọnwa ole na ole ka agha bie, e nwere otu ihe mere mụ na di m, nke gbawara anyị obi. N’Ọktoba 1944, nwa anyị nwaanyị bụ́ Willy malitere ịrịa ọrịa na mberede. Ọ malitere ịrịa ọrịa akpịrị nke na-ama ya oké oyi. Ọrịa ahụ jisiri ya ike, gbuokwa ya mgbe abalị atọ gachara. Ọ dị naanị afọ asaa mgbe ahụ.

Ọnwụ otu mkpụrụ nwa anyị mụrụ gbawara anyị obi. N’eziokwu, ihe niile e mere m na Ravensbrọk enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere mwute m nwere mgbe nwa anyị nwụrụ. Ma, ihe e kwuru n’Abụ Ọma 16:8 gbara anyị ume n’oge ahụ niile anyị nwere nsogbu. Ebe ahụ sịrị: “Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile. N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.” Obi siri mụ na di m ike na Jehova ga-eme ihe o kwere ná nkwa banyere mbilite n’ọnwụ. Anyị bịara jikwuo ọgbakọ kpọrọ ihe ma na-agachi ozi ọma anya. Ruo mgbe di m nwụrụ n’afọ 1969, o nyeere m aka iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi.

Ọṅụ na Ngọzi Ndị M Nwetara

Otu n’ime nnukwu ihe na-enye m ọṅụ kemgbe ọtụtụ iri afọ gara aga bụ na mụ na ndị nọ n’ozi oge niile na-akpachi anya. Mgbe ọ bụla ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha bịara ileta ọgbakọ anyị, ha na-anọ n’ụlọ anyị, otú ahụ anyị na-eme mgbe ahụ a na-alụ agha. Maarten Kaptein, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, na nwunye ya bụ́ Nel, nọrọ n’ụlọ anyị afọ iri na atọ! Mgbe ọrịa jisiri Nel ike, enwere m ihe ùgwù nke ilekọta ya ọnwa atọ n’ụlọ anyị ruo mgbe ọ nwụrụ. Otú mụ na ha na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị si eme na-eme ka paradaịs ime mmụọ anyị nọ na ya ugbu a na-atọ m ụtọ.

Otu n’ime ihe ndị m na-agaghị echefu ná ndụ m mere n’afọ 1995. A kpọrọ m òkù ka m bịa otu ihe omume e mere na Ravensbrọk. N’ebe ahụ, ahụrụ m ụmụnna nwaanyị ndị mụ na ha nọkọrọ n’ogige ịta ahụhụ, bụ́ ndị m na-ahụbeghị kemgbe ihe karịrị iri afọ ise. Mụ na ha ịnọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ nke m na-enweghị ike ichefu echefu, anyị jikwara oge ahụ gbarịta ibe anyị ume ka anyị na-atụ anya ụbọchị ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ.

Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Rom 15:4 na anyị ga-esi “ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” M na-ekele Jehova na o mere ka anyị nwee olileanya a, bụ́ nke merela ka m jiri obi ụtọ na-ejere ya ozi, ọbụna mgbe ọnwụnwa bịaara m.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 N’oge ahụ, ụmụnna na-eji aka ha akọwa okwu ndị metụtara ịnọpụ iche otú ha nwere ike n’ihi na e nweghị otú a ga-esi akpọtụrụ isi ụlọ ọrụ anyị. N’ihi ya, otú otu nwanna si ele okwu a anya na-adị iche n’otú nwanna ọzọ si ele ya anya.

[Foto dị na peeji nke 10]

Mụ na Jaap, n’afọ 1930

[Foto dị na peeji nke 10]

Nwa anyị nwaanyị bụ́ Willy, mgbe ọ dị afọ asaa

[Foto dị na peeji nke 12]

N’afọ 1995, mgbe m hụrụ ndị m na-ahụbeghị anya kemgbe ọtụtụ afọ. E si n’aka ekpe gụwa ya, ọ bụ m bụ onye nke abụọ ná ndị nọ ọdụ n’oche