Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Kpọrọ Mmebi Iwu Asị?

Ị̀ Kpọrọ Mmebi Iwu Asị?

Ị̀ Kpọrọ Mmebi Iwu Asị?

‘Ị [ya bụ, Jizọs] kpọrọ mmebi iwu asị.’—HIB. 1:9.

1. Gịnị ka Jizọs kụziri banyere ịhụnanya?

JIZỌS KRAỊST gosiri na ịhụnanya dị mkpa mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha nwee ụdị ịhụnanya nke ga-eme ka ha dị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka a ga-eji amara ha. Jizọs gwakwara ha, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.”—Mat. 5:44.

2. Olee ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịkpọ asị?

2 E wezụga na Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ibe ha n’anya, ọ kụzikwaara ha ihe ha ga-akpọ asị. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị.” (Hib. 1:9; Ọma 45:7) Nke a na-egosi na anyị kwesịrị ịhụ ezi omume n’anya, kpọọkwa mmehie, ma ọ bụ mmebi iwu, asị. Ọ bụ ya mere Jọn onyeozi ji kwuo hoo haa, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme mmehie na-emebikwa iwu, n’ihi ya, mmehie bụ mmebi iwu.”—1 Jọn 3:4.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a banyere ịkpọ mmebi iwu asị?

3 N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ kpọrọ mmebi iwu asị?’ Ka anyị tụlee ụzọ ebe anọ anyị nwere ike igosi na anyị kpọrọ ihe ọjọọ asị: (1) otú anyị si ele ịṅụbiga mmanya ókè anya, (2) otú anyị si ele ime anwansi anya, (3) otú anyị si ele omume rụrụ arụ anya, na (4) otú anyị si were ndị hụrụ mmebi iwu n’anya.

Ekwela Ka Mmanya Na-aba n’Anya Na-achị Gị

4. Gịnị mere ọnụ ji kaa Jizọs mgbe ọ na-enye ndụmọdụ banyere ịṅụ oké mmanya?

4 Jizọs ṅụrụ mmanya mgbe ụfọdụ, ọ ma na o so n’onyinye si n’aka Chineke. (Ọma 104:14, 15) Ma, o nweghị mgbe ọ ṅụrụ oké mmanya. (Ilu 23:29-33) N’ihi ya, ọnụ kara Jizọs mgbe ọ na-enye ndụmọdụ na ịṅụ oké mmanya adịghị mma. (Gụọ Luk 21:34.) Ịṅụbiga mmanya ókè nwekwara ike ime ka mmadụ mee mmehie ndị ọzọ dị oké njọ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee, sị: “Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè, nke ndụ ịla n’iyi dị na ya, kama na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ.” (Efe. 5:18) Ọ dụkwara ndị agadi nwaanyị nọ n’ọgbakọ ọdụ ka ha ghara ịna-aṅụ “oké mmanya.”—Taị. 2:3.

5. Olee ajụjụ ndị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya nwere ike ịjụ onwe ha?

5 Ọ bụrụ na i kpebiri na ị ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, i kwesịrị ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ele ịṅụ oké mmanya anya otú Jizọs si lee ya? Ọnụ ọ̀ ga-aka m ma m chọọ inye ndị ọzọ ndụmọdụ banyere ịṅụ oké mmanya? Ihe m ji aṅụ mmanya ọ̀ bụ ka m kwụsị ichegbu onwe m? Olee otú mmanya m na-aṅụ n’izu hà? Gịnị ka m na-eme ma ọ bụrụ na mmadụ agwa m na m na-aṅụ oké mmanya? M̀ na-azọwa onwe m ma ọ bụdị wewe iwe?’ Ọ bụrụ na anyị na-aṅụ oké mmanya, o nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eche echiche nke ọma, meekwa ka anyị ghara ịna-eme mkpebi ndị ziri ezi. Ndị na-eso ụzọ Kraịst na-agba mbọ ka ha chekwaa ikike iche echiche ha.—Ilu 3:21, 22.

Zere Ime Anwansi

6, 7. (a) Olee otú Jizọs si mesoo Setan na ndị mmụọ ọjọọ ihe? (b) Gịnị mere ime anwansi ji ju ebe niile taa?

6 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nweghị ihe jikọrọ ya na Setan na ndị mmụọ ọjọọ. O kweghị ka Setan mee ka o nupụrụ Chineke isi. (Luk 4:1-13) Ọ matakwara ụzọ aghụghọ Setan chọrọ iji mee ka o mee ihe na-adịghị mma, o kweghịkwa ka ọ nwata ya. (Mat. 16:21-23) O mekwara ka ndị mmụọ ọjọọ hapụ ndị chọrọ ime uche Chineke.—Mak 5:2, 8, 12-15; 9:20, 25-27.

7 Mgbe Jizọs nọkwasịchara n’ocheeze n’afọ 1914, ọ chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ n’eluigwe ka ha ghara iduhie ndị mmụọ ozi ndị ọzọ. N’ihi ya, Setan eforola ntutu taa ugbu a na ya ‘ga-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Mkpu. 12:9, 10) Ọ bụ ya mere na o kwesịghị iju anyị anya na ime anwansi juru ebe niile. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka a ghara ịnwata anyị ime anwansi?

8. Olee ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya banyere ụdị ihe o ji atụrụ ndụ?

8 Baịbụl mere ka nsogbu ime anwansi na-akpata doo anya. (Gụọ Diuterọnọmi 18:10-12.) Taa, Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-eji fim, akwụkwọ, na egwuregwu kọmputa ndị na-akwado anwansi eme ka ndị mmadụ na-eche na ime anwansi abụghị ihe ọjọọ. N’ihi ya, mgbe anyị na-ahọrọ ụdị ihe anyị ji atụrụ ndụ, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Kemgbe ọtụtụ ọnwa, m̀ na-ekiri fim na ihe ndị a na-eme na tiivi, ma ọ bụ soro m chịa ndị na-akwado ime anwansi, ma ọ bụkwanụ na-egwu egwuregwu kọmputa ndị na-akwado ya? M̀ ghọtara ihe mere m ji kwesị izere ime anwansi, ka m̀ na-ewere na o nweghị ihe o mere? M̀ tụleela otú ihe m ji atụrụ ndụ ga-adị Jehova? Ọ bụrụ na m na-eme ihe ndị a, ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ nakwa otú m si hụ iwu ya ziri ezi n’anya ọ̀ ga-eme ka m mee ihe ozugbo wee kwụsị ha?’—Ọrụ 19:19, 20.

Gee Ntị n’Ihe Jizọs Kwuru Banyere Omume Rụrụ Arụ

9. Olee otú mmadụ nwere ike isi hụ mmebi iwu n’anya?

9 Jizọs kwadoro iwu Jehova nyere banyere mmekọahụ. Ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:4-6) Jizọs ma na ihe anyị na-ekiri nwere ike imetụta obi anyị. N’ihi ya, o kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Mat. 5:27, 28) N’eziokwu, ndị jụrụ ịṅa ntị n’ihe a Jizọs kwuru hụrụ mmebi iwu n’anya.

10. Kọọ ihe mere otu nwanna, bụ́ nke na-egosi na mmadụ nwere ike ịkwụsị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.

10 Setan na-eji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ akwado mmekọahụ rụrụ arụ. Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ juru ebe niile taa. Ọ na-esiri ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ike ichefu omume rụrụ arụ ha kiriri. Ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-amakwa ha ahụ́. Were ihe mere otu Onye Kraịst dị ka ihe atụ. Ọ sịrị: “M na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na nzuzo. Ọ na-adị m ka ihe a m na-eme enweghị ihe jikọrọ ya na ofufe m na-efe Jehova. M ma na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ adịghị mma, ma m na-agwa onwe m na Chineke ka ga-anabata ozi m na-ejere ya.” Gịnị mere ka nwanna a gbanwee echiche ya? Ọ sịrị: “M gara kọọrọ ndị okenye nsogbu m n’agbanyeghị na ọ bụ ihe kacha taa akpụ m metụrụla.” Nwanna a mechara kwụsị àgwà a na-eme ihere. O kwuru, sị: “M nwere akọnuche dị ọcha mgbe m kwụsịrị omume ọjọọ a.” Ndị kpọrọ mmebi iwu asị ga-akpọrịrị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ asị.

11, 12. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kpọrọ mmebi iwu asị mgbe anyị na-ahọrọ egwú anyị ga-akpọ?

11 Ụda egwú na ihe a gụrụ na ya nwere ike iru mmadụ n’ahụ́, o nwekwara ike imetụta obi ihe atụ onye ahụ. Egwú bụ onyinye si n’aka Chineke, ọ dịkwala anya e jiwere ya na-efe Jehova. (Ọpụ. 15:20, 21; Efe. 5:19) Ma ụwa ọjọọ Setan na-akụpụta egwú ndị na-akwado omume rụrụ arụ. (1 Jọn 5:19) Olee otú ị ga-esi ama ma egwú ị na-ege ọ̀ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị mma?

12 Ihe mbụ i nwere ike ime bụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Egwú ndị m na-egere hà na-egosi na igbu ọchụ, ịkwa iko, na nkwulu dị mma? Ọ bụrụ na mụ agụọrọ mmadụ ihe ndị a gụrụ n’egwú m na-ege, onye ahụ ọ̀ ga-eche na m kpọrọ mmebi iwu asị, ka ọ̀ ga-aghọta na e merụọla obi m?’ Anyị agaghị ekwu na anyị kpọrọ mmebi iwu asị ma ọ bụrụ na anyị na-ege egwú na-akwado mmebi iwu. Jizọs kwuru, sị: “Ihe ndị na-esi n’ọnụ apụta na-esi n’obi, ọ bụ ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.”—Mat. 15:18, 19; tụlee Jems 3:10, 11.

Were Ndị Hụrụ Mmebi n’Anya Otú Jizọs Si Were Ha

13. Olee otú Jizọs si were ndị kpọrọ ekwo nkụ na-eme mmehie?

13 Jizọs kwuru na ya bịara ịkpọ ndị mmehie, ma ọ bụ ndị na-emebi iwu, ka ha chegharịa. (Luk 5:30-32) Ma, gịnị ka Jizọs kwuru banyere ndị kpọrọ ekwo nkụ na-eme mmehie? Jizọs dọsiri anyị aka ná ntị ike ka anyị ghara ikwe ka ndị dị otú ahụ duhie anyị. (Mat. 23:15, 23-26) O kwukwara hoo haa, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ [ya bụ n’ụbọchị Chineke ga-ekpe ndị ajọ omume ikpe], ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’” Ọ ga-agwa ndị nọgidere na-emebi iwu ma jụ ichegharị, sị: “Sinụ n’ebe m nọ pụọ.” (Mat. 7:21-23) Gịnị mere ọ ga-eji chụpụ ha? Ọ bụ n’ihi na ha anaghị asọpụrụ Chineke, ihe ọjọọ ndị ha na-eme na-akpatakwara ndị ọzọ nsogbu.

14. Gịnị mere e ji achụpụ ndị mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ?

14 Okwu Chineke nyere iwu ka a chụpụ ndị mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:9-13.) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere ihe atọ mere a ga-eji chụpụ onye mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ: (1) ka a ghara ịkọcha aha Jehova, (2) ka ọ ghara imerụ ọgbakọ, na (3) ka e wee nyere onye mmehie ahụ aka ichegharị ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.

15. Olee ajụjụ ndị dị mkpa anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-erubere Jehova isi?

15 Ànyị na-ele ndị mmebi iwu na-achọghị ichegharị ná mmehie ha anya otú Jizọs si ele ha anya? Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘M̀ ga-achọ ka mụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ onye kewapụrụ onwe ya n’ọgbakọ na-akpa? Gịnị ka m na-eme ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ezinụlọ m nke na-anọghịzi n’ụlọ?’ E nwere ike iji ihe anyị ga-eme mgbe ụdị ihe a mere mara ma ànyị hụrụ ezi omume n’anya ma ọ bụ na anyị ahụghị ya nakwa ma ànyị na-erubere Chineke isi ma ọ bụ na anyị anaghị erubere ya isi. *

16, 17. Olee ihe siiri otu nwanna nwaanyị ike omume, oleekwa ihe nyeere ya aka ịkwado ndokwa e mere ka a chụpụ onye mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ?

16 Ka anyị tụlee banyere otu nwanna nwaanyị nke nwa ya nwoke torola eto hụburu Jehova n’anya. Nwa ya nwoke a mechara mewe ihe ọjọọ, ọ chọghịkwa ichegharị. N’ihi ya, a chụrụ ya n’ọgbakọ. Ebe ọ bụ na nwanna anyị nwaanyị a hụrụ ma Jehova ma nwa ya nwoke n’anya, o siiri ya ike ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, nke bụ́ ka ya na nwa ya nwoke ahụ ghara imekọ ihe.

17 A sị gị nye nwanna nwaanyị a ndụmọdụ, gịnị ka ị ga-agwa ya? Otu okenye nyeere ya aka ya aghọta na Jehova ma na obi adịghị ya mma. Nwanna ahụ gwara ya ka o chee echiche banyere otú o si wute Jehova mgbe ndị mmụọ ozi ụfọdụ nupụụrụ ya isi. Ọ gwakwara ya na ọ bụ ezie na Jehova ma otú ihe ahụ merenụ si na-ewute ya, ọ chọrọ ka a chụpụ ndị mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ. Ọ nabatara ihe okenye ahụ gwara ya, ya na nwa ya nwoke ahụ akwụsịkwa imekọ ihe. * Jehova na-aṅụrị ọṅụ ma e si otú a rubere ya isi.—Ilu 27:11.

18, 19. (a) Ọ bụrụ na anyị na onye na-emebi iwu akwụsị imekọ ihe, gịnị ka anyị na-egosi na anyị kpọrọ asị? (b) Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi ma na-akwado ndokwa o mere?

18 Ọ bụrụ na ụdị ihe a mere nwanna nwaanyị a emee gị, biko cheta na Jehova ma ihe gị na ya na-alụ. Ọ bụrụ na gị na onye ezinụlọ gị a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ onye nke kewapụrụ onwe ya n’ọgbakọ akwụsị ịna-emekọ ihe, ị na-egosi na ị kpọrọ àgwà onye ahụ kpara asị. Ị na-egosikwa na ị hụrụ onye ahụ mere mmehie n’anya ma chọọ ime ihe ga-akacha baara ya uru. Ọ bụrụ na i rubere Jehova isi, nke a nwere ike ime ka onye ahụ chegharịa ma lọghachikwute Jehova.

19 Otu onye a chụrụ n’ọgbakọ nke e mechara nabata kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na Jehova hụrụ ndị ya n’anya nke ukwuu nke mere o ji ahụ na e mere ka ọgbakọ ya dị ọcha. Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ nwere ike iwere na nke a bụ ntaramahụhụ, e kwesịrị ime ya, ime ya na-egosikwa na a hụrụ onye ahụ n’anya.” Ma, a sị na onye a na ụmụnna nakwa ndị ezinụlọ ya na-emekọ ihe oge ahụ a chụrụ ya n’ọgbakọ, ì chere na a gaara enwe ike inyere ya aka ya emechaa kwuo ihe a o kwuru? Ọ bụrụ na anyị akwado ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ịchụ mmadụ n’ọgbakọ, ọ na-egosi na anyị hụrụ ezi omume n’anya nakwa na anyị ghọtara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịgwa anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà.

‘Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị’

20, 21. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpọ mmebi iwu asị?

20 Pita dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche.” Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ ọ ga-eripịa? Ọ bụ otú ị kpọruru mmebi iwu asị ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abụ gị ma ọ bụkwanụ na ọ gaghị abụ gị.

21 Ịkpọ ihe ọjọọ asị adịghị mfe. Anyị bu mmehie pụta ụwa, anyị bikwa n’ụwa nke na-agba ndị mmadụ ume ka ha na-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ. (1 Jọn 2:15-17) Ma, ọ bụrụ na anyị eṅomie Jizọs ma jiri obi anyị dum hụ Jehova Chineke n’anya, anyị ga-enwe ike ịkpọ mmebi iwu asị. Ka anyị kpebisie ike na anyị ‘ga-akpọ ihe ọjọọ asị,’ ma nwee obi ike na Jehova “na-eche . . . ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche; ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.”—Ọma 97:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ ebe a kọwara nke ọma ihe i kwesịrị ime ma a chụpụ onye ikwu gị n’ọgbakọ, gụọ Ụlọ Nche December 15, 1981, peeji nke 26-31.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ichebara otú anyị si aṅụ mmanya na-aba n’anya echiche?

• Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka a ghara ịnwata anyị ime anwansi?

• Gịnị mere ile ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ji dị njọ?

• Olee otú anyị si egosi na anyị kpọrọ mmebi iwu asị mgbe a chụrụ onye anyị hụrụ n’anya n’ọgbakọ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Ọ bụrụ na ị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị?

[Foto dị na peeji nke 30]

Kpachara anya ka Setan ghara iji ntụrụndụ nwata gị

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee ihe onye na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ hụrụ n’anya?