Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe mere Mozis ji wesa ụmụ Erọn, bụ́ Elieza na Ịtama iwe mgbe ụmụnne ha, bụ́ Nedab na Abaịhu nwụchara, oleekwa otú e si mee ka obi ya jụrụ?—Lev. 10:16-20.

Obere oge ka a họpụtachara ndị nchụàjà ga na-eje ozi n’ụlọikwuu Chineke, Jehova gburu ụmụ Erọn abụọ, bụ́ Nedab na Abaịhu, n’ihi na ha sureere ya ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị. (Lev. 10:1, 2) Mozis gwara ụmụ Erọn abụọ ahụ dị ndụ ka ha ghara iruru ụmụnne ha uju. Obere oge ka nke a gachara, Mozis wesara Elieza na Ịtama iwe n’ihi na ha erighị ewu e ji chụọ àjà mmehie. (Lev. 9:3) Olee ihe mere iwe ji wee Mozis?

Iwu Jehova nyere Mozis kwuru kpọmkwem na onye nchụàjà nke chụrụ àjà mmehie kwesịrị iso rie anụ ahụ e ji chụọ àjà n’ogige ụlọikwuu nzute. E lere ime otú a anya ka ikpuchi mmehie nke ndị chụrụ àjà ahụ. Ma, a gaghị eri anụ ahụ e ji chụọ àjà ma ọ bụrụ na e weere ụfọdụ ọbara ya banye n’Ebe Nsọ, bụ́ ọnụ ụlọ nke mbụ nke ụlọikwuu ahụ. Kama nke ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.—Lev. 6:24-26, 30.

O yiri ka mgbe e gbuchara mmadụ abụọ ahụ, Mozis mere ihe iji hụ na e mere ihe niile Jehova nyere n’iwu. Mgbe ọ chọpụtara na a kpọrọ ewu ahụ e ji chụọ àjà ọkụ, o ji iwe jụọ Elieza na Ịtama ihe mere na ha erighị ya eri otú a gwara ha, ebe ọ bụ na e burughị ọbara ya banye n’Ebe Nsọ wee chee ya n’ihu Jehova.—Lev. 10:17, 18.

Erọn gwara Mozis ihe mere ha ji mee otú ahụ, ebe ọ bụ yanwa gwara ha erila ya. Mgbe e gbuchara ụmụ ya abụọ, Erọn nwere ike ịnọ na-eche ma ò nwekwara onye nchụàjà akọnuche ya ga-ekwe ka o rie anụ e ji chụọ àjà mmehie n’ụbọchị ahụ. Ikekwe, o chere na iwe ga-ewe Jehova ma ọ bụrụ na ha erie ya, ọ bụ eziokwu na ọ bụghị hanwa mere Nedab na Abaịhu ji mee ihe ha mere.—Lev. 10:19.

O nwekwara ike ịbụ na Erọn chere na ndị ezinụlọ ya kwesịrị ịhụ nnọọ na ha mere ihe Chineke chọrọ, karịchaa n’ụbọchị mbụ ahụ ha malitere ịrụ ọrụ ịchụ àjà. Ma, Nedab na Abaịhu emetọọla aha Jehova, o wesakwara ha iwe. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Erọn chere na ndị ezinụlọ ndị nchụàjà, bụ́ ndị ndị ahụ mere mmehie si n’etiti ha, ekwesịghị iri ihe e ji chụọ àjà dị nsọ.

O yiri ka Mozis ọ̀ nabatara ihe a nwanne ya nwoke zara ya n’ihi na amaokwu nke ikpeazụ kwuru, sị: “Mgbe Mozis nụrụ nke ahụ, ọ dị mma n’anya ya.” (Lev. 10:20) O yikwara ka Jehova ọ̀ nabatara ihe ahụ Erọn zara.