Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”

“Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”

“Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”

SỌL bụ eze mbụ chịrị Izrel. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ezi Chineke họọrọ ya, o mechara nupụrụ ya isi.

Olee ihe ọjọọ Sọl mere? Ọ̀ gaara ahapụ ime ihe ndị ahụ o mere? Olee ihe anyị ga-amụta n’ịtụle akụkọ banyere ya?

Jehova Emee Ka A Mara Onye Ọ Họọrọ Ka Ọ Bụrụ Eze

Samuel onye amụma na-anọchite anya Chineke n’Izrel tupu Sọl aghọọ eze. Ma ugbu a, Samuel emeela agadi, ụmụ ya anaghịkwa eme uche Jehova. N’oge ahụ, ndị iro ndị Izrel na-eyi mba Izrel egwu. Mgbe ndị okenye Izrel gwara Samuel ka ọ họpụtara ha eze ga na-achị ha ma na-edu ha aga agha, Jehova gwara Samuel ka ọ họpụta Sọl ka ọ bụrụ onye ndú ha. Jehova kwukwara, sị: “Ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia.”—1 Sam. 8:4-7, 20; 9:16.

Sọl bụ “nwa okorobịa mara mma.” O nwekwara àgwà ọma ma e wezụga mma ọ maara. Ọ dị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, Sọl jụrụ Samuel, sị: “Ọ̀ bụ na mụ abụghị onye ebo Benjamin nke kasị nta n’ebo niile nke Izrel, ọ̀ bụkwa na ezinụlọ m abụghị nke kasị nta n’ezinụlọ niile nke ebo Benjamin? Gịnịzi mere i ji gwa m ihe dị otú a?” Sọl ebulighị onwe ya na ezinụlọ ya elu, n’agbanyeghị na nna ya, bụ́ Kish, “bara ezigbo ọgaranya.”—1 Sam. 9:1, 2, 21.

Tụleekwa ihe Sọl mere mgbe Samuel mere ka ndị Izrel mata onye Jehova họọrọ ka ọ bụrụ eze ha. Samuel bu ụzọ tee Sọl mmanụ mgbe naanị ha abụọ nọ ma gwa ya, sị: “Mee ihe i nwere ike ime, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.” Mgbe e mechara, Samuel onye amụma kpọkọtara ụmụ Izrel ka ọ gwa ha onye Jehova họọrọ. Ma, o nweghị onye hụrụ Sọl anya mgbe e kwuru na ọ bụ ya. Sọl gara zoo n’ihi na ọ bụ onye ihere. Jehova gosiri ha ebe ọ nọ, a gwakwara onye ọ bụla na Sọl aghọọla eze.—1 Sam. 10:7, 20-24.

N’Ọgbọ Agha

Sọl egbughị oge gosi onye ọ bụla nwere obi abụọ ma ò rukwara eru ịbụ eze na ya ruru eru. Mgbe ndị Amọn yiri otu obodo dị n’Izrel egwu, “mmụọ Chineke wee kpawa ike n’ahụ́ Sọl.” Ọ kpọkọtara ndị agha Izrel niile, hazie ha, ma duru ha gaa merie ndị iro ha. Ma, Sọl kwuru na ọ bụ Chineke nwe mmeri ahụ. Ọ sịrị: “Jehova emewo ka e nwee nzọpụta n’Izrel taa.”—1 Sam. 11:1-13.

Sọl nwere àgwà ndị dị mma, Chineke nọnyekwaara ya. O kwekwara na Jehova dị ike. Ma, ọ bụrụ na ndị Izrel na eze ha chọrọ ịna-emeri ndị iro ha, o nwere otu ihe dị ezigbo mkpa ha ga na-eme. Samuel gwara ndị Izrel, sị: “Ọ bụrụ na unu atụọ egwu Jehova ma jeere ya ozi, rubekwa isi n’ihe o kwuru, unu agharakwa inupụ isi n’iwu Jehova, ma unu ma eze unu nke ga-achị unu ga-abụ ndị na-eso Jehova bụ́ Chineke unu.” Gịnị ka ụmụ Izrel ga-ejide n’aka na a ga-emere ha ma ọ bụrụ na ha na-eme uche Chineke? Samuel kwuru, sị: “Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya, n’ihi na Jehova ekpebiwo ime ka unu bụrụ ndị ya.”—1 Sam. 12:14, 22.

Ọ bụrụ na ha chọrọ ka Chineke na-agọzi ha, ha ga na-erubere ya isi, otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Jehova na-agọzi ndị ohu ya ma ọ bụrụ na ha erubere ya isi. Oleekwanụ ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi?

“I Zuzuru Nzuzu”

Ihe ọzọ Sọl mere ndị Filistia mere ka ha bịa ibuso Izrel agha. Ụsụụ ndị agha “dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri” bịara ibuso Sọl agha. “Ndị Izrel wee hụ na ha nọ n’oké ihe isi ike, n’ihi na ihe taara ha akpụ; ha wee na-ezo onwe ha n’ọgba nakwa n’oghere dị na nkume nakwa na nkume ndị dị elu nakwa n’oghere ndị dị n’okpuru ala nakwa n’olulu mmiri.” (1 Sam. 13:5, 6) Gịnị ka Sọl ga-eme?

Samuel gwara Sọl ka ọ bịakwute ya na Gilgal, bụ́ ebe ya ga-anọ chụọ àjà. Sọl chere Samuel, ma ọ bịaghị n’oge, ndị agha ya nọkwa na-agbasasị. Nke a mere ka Sọl jiri aka ya chụọ àjà ahụ. Samuel bịara ozugbo ọ na-emecha nke a. Mgbe ọ nụrụ ihe Sọl mere, ọ gwara ya, sị: “I zuzuru nzuzu. I debeghị ihe Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu, nke ọ gwara gị mee, n’ihi na, ọ bụrụ na i debere ya, Jehova gaara eme ka alaeze gị n’Izrel guzosie ike ruo mgbe a na-akaghị aka. Ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka. Jehova ga-achọtara onwe ya nwoke obi ya nabatara; Jehova ga-ahọpụtakwa ya ịbụ onye ndú nke ndị ya, n’ihi na i debeghị ihe Jehova nyere gị n’iwu.”—1 Sam. 10:8; 13:8, 13, 14.

Sọl gosiri na ya enweghị okwukwe mgbe o buliri onwe ya elu wee nupụ isi n’iwu Chineke nyere ya ka o chere ka Samuel bịa chụọ àjà. Ihe Sọl mere dị nnọọ iche n’ihe Gidiọn, onye bụ́bu ọchịagha ndị Izrel, mere. Jehova gwara Gidiọn ka o gbubilata ọnụ ọgụgụ ndị agha ya dị puku iri atọ na abụọ ka ha dịrị narị atọ, Gidiọn mekwara ihe a gwara ya. Ọ̀ bụ gịnị mere o ji mee otú a? Ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe na Jehova. Chineke nyeere ya aka ya emerie ndị agha dị otu narị puku na puku iri atọ na puku ise. (Ikpe 7:1-7, 17-22; 8:10) Jehova gakwaara enyere Sọl aka. Ma, ọ bụ isi Sọl nupụụrụ Jehova mere ka ndị Filistia merie ndị Izrel.—1 Sam. 13:17, 18.

Ọ bụrụ na anyị enwee nsogbu, olee ihe anyị na-ekpebi ime? Ndị na-enweghị okwukwe nwere ike iche na o nweghị ihe o mere ma ha leghara iwu Chineke anya. Ọ ga-abụ na mgbe Samuel na-anọghị ya, Sọl chere na ihe ya mere bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ma, mgbe e nwere nsogbu, ndị chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma ga-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ ya ka e kwesịrị ime banyere ihe ahụ.

Jehova Ajụ Sọl

Sọl mere mmehie ọzọ mgbe ha na ndị Amalek na-alụ agha. Chineke mara ndị Amalek ikpe ọnwụ n’ihi na ha lụsoro ndị Izrel na-enweghị ihe ha mere ha ọgụ mgbe ha si n’Ijipt na-apụta. (Ọpụ. 17:8; Diut. 25:17, 18) Ihe ọzọkwa bụ na ndị Amalek so mba ndị ọzọ busoo ndị ohu Chineke agha n’oge Ndị Ikpe. (Ikpe 3:12, 13; 6:1-3, 33) Ihe ndị a mere ka Jehova maa ndị Amalek ikpe ọnwụ ma gwa Sọl ka o bibie ha.—1 Sam. 15:1-3.

Kama Sọl ga-eme ihe Jehova gwara ya wee laa ndị Amalek niile na ihe ha niile n’iyi, ọ kpọọrọ eze ha lọta, chịrịkwa ụmụ anụmanụ ndị kacha mma lọta. Gịnị ka Sọl mere mgbe Samuel jụrụ ya ihe mere o ji mee ihe o mere? Sọl bulaara ndị ọzọ ụta wee sị: “Ndị agha m nweere anụ ndị kasị mma n’ìgwè ewu na atụrụ ọmịiko, tinyere ìgwè ehi, maka iji ha chụọrọ Jehova bụ́ Chineke gị àjà.” Ma, Sọl ọ̀ chọrọ iji anụ ndị ahụ achụ àjà n’eziokwu ma ọ̀ bụ na ọ chọghị, ihe bụ́ isiokwu bụ na o nupụụrụ Chineke isi. Sọl adịghịzi ‘ntakịrị n’anya onwe ya.’ N’ihi ya, Samuel gwara Sọl na o nupụrụla Chineke isi. O kwukwara, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru? Lee! Irube isi dị mma karịa àjà . . . Ebe ọ bụ na ị jụwo okwu Jehova, ya onwe ya ajụwo gị ka ị ghara ịbụkwa eze.”—1 Sam. 15:15, 17, 22, 23.

Mgbe Jehova wepụrụ mmụọ nsọ ya n’ahụ́ Sọl ma kwụsị inyere ya aka, “mmụọ na-adịghị mma” malitere inye Sọl nsogbu. Nke a mere ka ọ malite inyo Devid enyo, bụ́ onye Jehova mechara mee eze. Ọ malitekwara imere ya anyaụfụ. Sọl gbalịrị ihe karịrị otu ugboro igbu Devid. Baịbụl kwuru na mgbe ‘Sọl hụrụ na Jehova nọnyeere Devid,’ o “wee bụrụ onye iro Devid mgbe niile.” Sọl chụwara Devid ka o gbuo ya, o nyedịrị iwu ka e gbuo ndị nchụàjà iri asatọ na ise na ndị ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji hapụ Sọl!—1 Sam. 16:14; 18:11, 25, 28, 29; 19:10, 11; 20:32, 33; 22:16-19.

Mgbe ndị Filistia busoro ndị Izrel agha ọzọ, Sọl gakwuuru onye na-agba afa ka o nyere ya aka, ma nke a enyereghị ya aka. N’echi ya, e merụrụ ya ezigbo ahụ́ n’ihu agha, o gbukwara onwe ya. (1 Sam. 28:4-8; 31:3, 4) Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere eze mbụ a chịrị Izrel, bụ́ onye nupụụrụ Chineke isi, sị: “Sọl wee si otú a nwụọ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya nke o ji enweghị okwukwe meso Jehova n’ihe metụtara okwu Jehova nke ọ na-edebeghị nakwa n’ihi ịgwa onye na-agba afa ka ọ jụọrọ ya ase. Ọ jụghịkwa Jehova ase.”—1 Ihe 10:13, 14.

Ihe nlereanya ọjọọ Sọl setịpụrụ gosiri na irubere Jehova isi ka mma karịa ịchụrụ ya àjà ọ bụla. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Ka anyị ghara ichefu eziokwu a dị ezigbo mkpa: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke na-abụ enyi, anyị aghaghị ịna-erubere ya isi.

[Foto dị na peeji nke 21]

Sọl dị umeala n’obi mgbe ọ malitere ịchị

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị mere Samuel ji gwa Sọl na “irube isi dị mma karịa àjà”?