Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Obi Gị Dum Hụ Ezi Omume n’Anya

Jiri Obi Gị Dum Hụ Ezi Omume n’Anya

Jiri Obi Gị Dum Hụ Ezi Omume n’Anya

“Ị hụrụ ezi omume n’anya.”—ỌMA 45:7.

1. Gịnị ga-enyere anyị aka ije ije “n’ụzọ ezi omume”?

JEHOVA ji Okwu ya na mmụọ nsọ ya na-edu ndị ya “n’ụzọ ezi omume.” (Ọma 23:3) Ma ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị na-akwụsị ije ije n’ụzọ ezi omume mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nke a emee, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị wee maliteghachi ime ihe ziri ezi. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmaliteghachi ime ihe ziri ezi? Anyị ga-ahụrịrị ezi omume n’anya otú ahụ Jizọs si hụ ya n’anya.—Gụọ Abụ Ọma 45:7.

2. Gịnị bụ ‘ụzọ ezi omume’?

2 Gịnị bụ ‘ụzọ ezi omume’? Ihe e ji ama ụzọ ezi omume bụ iwu Jehova nyere banyere ihe ziri ezi. N’asụsụ Hibru na nke Grik, “ezi omume” pụtara “ihe ziri ezi,” ya bụ, omume ọma. Ebe ọ bụ na Jehova bụ “ebe obibi nke ezi omume,” ndị ohu ya na-eji obi ụtọ atụkwasị ya obi ka ọ gwa ha ụzọ dị mma ha ga-eso.—Jere. 50:7.

3. Olee otú anyị nwere ike isi matakwuo banyere ezi omume Chineke?

3 Ọ bụ naanị mgbe anyị ji obi anyị niile na-agbasi mbọ ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke ka a ga-ekwu na anyị na-eme nnọọ ihe ọ chọrọ. (Diut. 32:4) Ihe mbụ anyị ga-eme ka anyị wee mee nke a bụ ịma ihe niile anyị ga-amatali banyere Jehova Chineke n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu banyere Chineke, na-abịarukwu ya nso kwa ụbọchị, anyị ga-ahụkwu ezi omume ya n’anya. (Jems 4:8) Anyị kwesịkwara ịtụle ihe e kwuru n’Okwu Chineke nke e dere n’ike mmụọ nsọ mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ.

Na-achọ Ezi Omume Chineke

4. Gịnị ka ịchọ ezi omume Chineke pụtara?

4 Gụọ Matiu 6:33. Ịchọ ezi omume Chineke abụghị naanị iwepụta oge na-ekwusa ozi ọma Alaeze. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ozi dị nsọ anyị na-ejere ya, anyị ga na-akpa àgwà kwa ụbọchị otú o si chọọ. Olee ihe ndị niile na-achọ ezi omume Jehova ga-emerịrị? Ha ‘ga-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’—Efe. 4:24.

5. Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịda mbà?

5 Ka anyị na-agba mbọ ime ihe ziri ezi n’anya Chineke, anyị nwere ike ịda mbà mgbe ụfọdụ n’ihi ihe ndị anyị mehiere. Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịda mbà, meekwa ka anyị mụta ịhụ ezi omume n’anya ma na-eme ezi omume? (Ilu 24:10) Anyị ‘ga-ejirịrị ezi obi na-ekpeku Jehova ekpere mgbe niile, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe.’ (Hib. 10:19-22) Ma ànyị bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, anyị kwesịrị inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst nakwa n’ọrụ Jizọs, bụ́ nnukwu Onye Nchụàjà anyị, na-arụrụ anyị. (Rom 5:8; Hib. 4:14-16) Jọn onyeozi dere, sị: “Ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara [Chineke] na-asachapụ anyị mmehie niile.” (1 Jọn 1:6, 7) Baịbụl kwukwara na ọ bụrụgodị na mmehie anyị ‘na-acha uhie uhie, a ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.’ N’eziokwu, ndokwa a Jehova ji àjà mgbapụta Ọkpara ọ hụrụ n’anya mee maka anyị magburu onwe ya.—Aịza. 1:18.

Lebara Ekike Agha Gị nke Si n’Aka Chineke Anya

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ilebara ekike agha anyị nke si n’aka Chineke anya?

6 Mgbe niile, anyị kwesịrị ‘iyiri ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume’ n’ihi na ọ bụ otu n’ime ekike agha ndị dị mkpa si n’aka Chineke. (Efe. 6:11, 14) Ma ànyị ka malitere ife Chineke ọhụrụ ma ànyị na-efe ya kemgbe ọtụtụ afọ, anyị kwesịrị ịna-elebara ekike agha anyị nke si n’aka Chineke anya kwa ụbọchị. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na a chụdatala Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpu. 12:7-12) Setan na-ewe oké iwe, ọ makwa na ya nwere oge dị mkpirikpi. N’ihi ya, ọ na-alụsosi ndị ohu Chineke ọgụ ike ugbu a. Ị̀ hụlanụ ihe mere anyị ji kwesị iyiri “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume.”

7. Olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ma ọ bụrụ na anyị aghọta na anyị kwesịrị inwe “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume”?

7 Ezi omume na-echebe obi ihe atụ anyị otú ahụ ihe mgbochi obi si echebe obi nkịtị. Obi anyị dị aghụghọ, na-esikwa ike njite n’ihi na anyị ezughị okè. (Jere. 17:9) Ebe ọ bụ na obi anyị na-achọkarị ime ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịzụ ya ma na-achịkwa ya. (Jen. 8:21) Ọ bụrụ na anyị aghọta na anyị kwesịrị inwe “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume,” anyị agaghị ewepụtụ ya jiri ihe Chineke kpọrọ asị na-atụrụ ndụ; anyị agaghịkwa eche echiche ime ihe ọjọọ. Anyị agaghị eji ọtụtụ awa anyị kwesịrị iji mee ihe bara uru na-ele tiivi. Kama ime otú ahụ, anyị ga na-agba mbọ na-eme ihe dị Jehova mma. Ọ bụrụgodị na echiche anyị agbaga n’ihe ndị na-adịghị mma, Jehova ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-eche banyere ha.—Gụọ Ilu 24:16.

8. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume”?

8 “Ọta ukwu bụ́ okwukwe” bụ otu n’ime ekike agha ndị si n’aka Chineke. Ọ na-eme ka anyị nwee ike “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Efe. 6:16) Ọ bụrụkwa na anyị enwee okwukwe ma jiri obi anyị dum hụ Jehova n’anya, anyị ga-enwe ike ime ezi omume ma na-eje ije n’okporo ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu banyere otú anyị ga-esi hụ Jehova n’anya, anyị ga-ejikwu ezi omume ya kpọrọ ihe. Oleekwanụ banyere akọnuche anyị? Olee otú o si enyere anyị aka ná mbọ anyị na-agba ịhụ ezi omume n’anya?

Na-enwe Ezi Akọnuche

9. Olee otú inwe ezi akọnuche si abara anyị uru?

9 Oge a na-aga ime anyị baptizim, anyị rịọrọ Jehova ka o nye anyị “ezi akọ na uche.” (1 Pita 3:21) Ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs, ọbara Jizọs na-ekpuchi mmehie anyị. Nke a na-emekwa ka Chineke gụọ anyị ná ndị ezi omume. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma, anyị kwesịrị ịna-enwe ezi akọnuche. Ọ bụrụ na akọnuche anyị na-ama anyị ikpe mgbe ụfọdụ ma ọ bụ na-agbara anyị àmà, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na ọ na-arụ ọrụ nke ọma. Nke a na-egosi na a daghị akọnuche anyị ígwè ọkụ ka ọ ghara ime ihe ziri ezi n’anya Jehova. (1 Tim. 4:2) Ma, e nwere ihe ọzọ akọnuche nwere ike imere ndị chọrọ ịhụ ezi omume n’anya.

10, 11. (a) Kọọ otu ihe merenụ nke na-egosi na anyị kwesịrị ige akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ ntị. (b) Gịnị mere ịhụ ezi omume n’anya ga-eji na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu?

10 Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọjọọ, akọnuche anyị nwere ike ịma anyị ikpe ma ọ bụ na-ata anyị ụta. Otu onye na-eto eto kwụsịrị ije ije “n’ụzọ ezi omume.” Ọ malitere ịna-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, malitekwa ịṅụ wii wii. Obi ya na-ama ya ikpe ma ọ gaa ọmụmụ ihe. Ọ na-adịkwa ya ka ọ bụ onye ihu abụọ ma ọ gaa ozi ọma, n’ihi ya, ọ kwụsịrị ịga ma ọmụmụ ihe ma ozi ọma. O kwuru, sị: “Amaghị m na akọnuche m ga-ama m ikpe maka ihe m na-eme.” O kwukwara, sị, “M biri ụdị ndụ iberiibe a ihe dị ka afọ anọ.” Ọ maliteziri iche banyere otú ọ ga-esi alọghachi n’ọgbakọ. N’agbanyeghị na o chere na Jehova agaghị anụ ekpere ya, o kpekuru Jehova ekpere ma rịọ ya ka ọ gbaghara ya. O rughị nkeji iri o kpechara ekpere ahụ mama ya abịa leta ya ma gbaa ya ume ka ọ maliteghachi ịga ọmụmụ ihe. Ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze wee gwa otu okenye ka ọ mụwara ya Baịbụl. Ka oge na-aga, e mere ya baptizim, obi dịkwa ya ụtọ na Jehova napụtara ya.

11 Ị́ hụghị na ime ihe ziri ezi na-enye ọṅụ dị ukwuu? Ọ bụrụ na anyị amụta ịhụ ezi omume n’anya ma na-emekwa ya, ime ihe dị Nna anyị nke eluigwe mma ga na-atọkwu anyị ụtọ. Chegodị banyere nke a! Oge na-abịa mgbe mmadụ niile ga na-enwe akọnuche dị ọcha; ha ga na-eme naanị ihe ziri ezi otú ahụ Chineke na-eme. N’ihi ya, ka anyị jiri obi anyị dum hụ ezi omume n’anya ugbu a ma mee ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 23:15, 16.

12, 13. Olee otú anyị nwere ike isi zụọ akọnuche anyị?

12 Olee otú anyị nwere ike isi zụọ akọnuche anyị? Mgbe anyị na-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, anyị kwesịrị icheta na “obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.” (Ilu 15:28) Ka anyị tụlee otú nke a si aba uru ma a bịa n’ihe banyere ọrụ anyị ji akpata ihe anyị na-eri. Ọtụtụ n’ime anyị anaghị egbu oge n’ime ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, kwuru ma ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ọrụ a chọrọ inye anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị amaghị ma Akwụkwọ Nsọ ọ̀ kwadoro ụdị ọrụ a chọrọ inye anyị ma ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya, anyị kwesịrị ịchọ ihe Baịbụl kwuru banyere ụdị ọrụ ahụ ma kpee ekpere banyere ya. * Otú ahụkwa ka ọ dị n’ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru anyị na-ekwesịghị ime, dị ka ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. (1 Kọr. 10:31-33) Nke ka mkpa bụ na anyị ekwesịghị ichefu iwu ndị e nyere maka mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụrụ na anyị na Jehova dị ná mma, anyị ga-ajụ onwe anyị, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ arụwa ọrụ a, ọ̀ ga-ewute Jehova ma mee ka obi ghara ịdị ya mma?’—Ọma 78:40, 41.

13 Mgbe anyị na-akwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, anyị ga-eburu n’uche na anyị kwesịrị ichebara ihe anyị na-amụ echiche. Ihe anyị na-eme ọ̀ bụ ime ngwa ngwa kanye ihe n’azịza ajụjụ nke paragraf anyị nọ na ya ma gafee na paragraf ọzọ? O yiri ka isi otú a na-akwadebe ọmụmụ ihe agaghị eme ka anyị hụkwuo ezi omume n’anya, ọ gaghịkwa eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ ezi omume n’anya, anyị kwesịrị ịna-amụchi ihe anya ma na-echebara ihe anyị na-amụ n’Okwu Chineke echiche. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị wee hụ ezi omume n’anya.

Agụụ na Akpịrị Ịkpọ Nkụ Maka Ezi Omume

14. Olee otú Jehova Chineke na Jizọs Kraịst chọrọ ka obi dị anyị n’ozi dị nsọ anyị na-eje?

14 Jehova Chineke na Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị jiri obi ụtọ na-eje ozi dị nsọ anyị na-eje. Gịnị ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ? Ọ bụ ịhụ ezi omume n’anya. Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha.” (Mat. 5:6) Olee ihe ndị chọrọ ịhụ ezi omume n’anya kwesịrị iburu n’uche n’ihi ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru?

15, 16. Olee otú a ga-esi mee ka afọ ju ndị agụụ na-agụ nakwa ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume?

15 Ọ bụ ajọ onye ahụ na-achị ụwa anyị bi na ya. (1 Jọn 5:19) Ihe juru n’akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta ná mba dị iche iche bụ akụkọ banyere ndị a na-emekpọ ọnụ na ndị na-eme ihe ike. Otú ndị mmadụ si na-emekpọ ibe ha ọnụ na-enye ndị ezi omume nsogbu n’obi. (Ekli. 8:9) Anyị bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya maara na ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ka ya na ndị chọrọ ime ihe ziri ezi dịrị ná mma. N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, ndị na-eleda iwu anya na ihe ọjọọ ha na-eme agakwaghị na-ekowe ndị hụrụ ezi omume n’anya obi n’elu. (2 Pita 2:7, 8) Ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-enwere onwe ha n’ezie.

16 Anyị bụ́ ndị ohu Jehova, ndị bụ́kwa ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ma na ‘afọ ga-eju’ ndị niile agụụ na-agụ nakwa ndị niile akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume. Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ha,’ bụ́ ndokwa Chineke mere, ga-eme ka afọ ju ha nke ọma. (2 Pita 3:13) N’ihi ya, ka anyị ghara ịda mbà ma ọ bụ chee na mmegbu na ime ihe ike emeela ka a ghara inwe ezi omume n’ụwa Setan. (Ekli. 5:8) Jehova, bụ́ Onye Kacha Ihe Niile Elu, ma ihe na-emenụ, ọ ga-anapụtakwa ndị hụrụ ezi omume n’anya n’oge na-adịghị anya.

Ịhụ Ezi Omume n’Anya Ga-abara Gị Uru

17. Olee ụfọdụ uru ịhụ ezi omume n’anya bara?

17 Abụ Ọma 146:8 kwuru uru pụrụ iche iso ụzọ ezi omume na-aba. Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.” Chegodị banyere nke a! Ọkaakaa eluigwe na ụwa hụrụ anyị n’anya n’ihi na anyị hụrụ ezi omume n’anya! Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, obi siri anyị ike na ọ ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-arụ ọrụ ndị metụtara Alaeze ya. (Gụọ Abụ Ọma 37:25; Ilu 10:3.) Ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-emecha keta ụwa a niile. (Ilu 13:22) Ihe a ga-eji kwụọ ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke ụgwọ maka ezi omume ha na-eme bụ ọṅụ dị ukwuu na ndụ ebighị ebi na paradaịs mara mma a ga-enwe n’ụwa a. Ọbụna ugbu a, ahụ́ na-eru ndị hụrụ ezi omume Chineke n’anya ala, bụ́ nke na-eme ka ezinụlọ ha nakwa ọgbakọ dịrị n’otu.—Fil. 4:6, 7.

18. Olee ihe ndị anyị ga na-eme ka anyị na-eche ụbọchị Jehova?

18 Ka anyị na-eche oké ụbọchị Jehova, anyị ga-anọgiderịrị na-achọ ezi omume ya. (Zef. 2:2, 3) N’ihi ya, ka anyị jiri obi anyị niile hụ ụzọ ezi omume nke Jehova Chineke n’anya. Otú anyị ga-esi na-eme nke a bụ iji “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume” na-egbochi obi ihe atụ anyị. Anyị kwesịkwara ịna-enwe ezi akọnuche, ya bụ, akọnuche nke ga-eme ka obi dị anyị ụtọ, meekwa ka obi Chineke anyị ṅụrịa.—Ilu 27:11.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) Ihe a Baịbụl kwuru na-akasi anyị nnọọ obi ka anyị na-agba mbọ ime ihe ziri ezi n’ụwa a nke ọgba aghara, ime ihe ike, na mmebi iwu juru. N’eziokwu, àgwà ọma anyị nwere ike ịna-eju ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma anya. Ma, anyị ga-abara onwe anyị ezigbo uru ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ezi omume otú Jehova chọrọ. (Aịza. 48:17; 1 Pita 4:4) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị ga-eji obi anyị niile na-ahụ ezi omume n’anya ma na-eme ya eme. Ma, iji obi anyị dum na-ejere Chineke ozi pụtakwara na anyị ga-akpọ mmebi iwu asị. Anyị ga-atụle ihe nke a pụtara n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]]

^ par. 12 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ajụjụ ụfọdụ i kwesịrị ịjụ onwe gị mgbe ị na-achọ ọrụ ị ga-arụ, gụọ Ụlọ Nche April 15, 1999, peeji nke 28-30.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ ezi omume n’anya, gịnị mere anyị ji kwesị iji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe?

• Gịnị mere anyị ji kwesị iyiri “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume”?

• Olee otú anyị nwere ike isi zụọ akọnuche anyị?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Akọnuche a zụrụ azụ na-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme banyere ọrụ anyị ji akpata ihe anyị na-eri