Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbọ Ọ Bụla A Gbara Maka Ya Efughị Ọhịa!

Mbọ Ọ Bụla A Gbara Maka Ya Efughị Ọhịa!

Mbọ Ọ Bụla A Gbara Maka Ya Efughị Ọhịa!

Ọ BỤRỤ na ndị nne na nna chọrọ ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova,” ha ga na-enwe ofufe ezinụlọ na ọmụmụ Baịbụl. (Efe. 6:4) Ma, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị manụ na ọ naghị ara ahụ́ ike agwụ ụmụaka mgbe a na-amụrụ ha ihe. Olee otú i nwere ike isi mee ka uche ha dịgide n’ihe unu na-amụ? Tụlee ihe ndị nne na nna ụfọdụ mere.

George, bụ́ onye bi na Kalifonia nke dị n’Amerịka, kwuru, sị: “Mgbe ụmụ anyị ka dị obere, anyị na-agba mbọ na-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na-enwe na-atọ ha ụtọ. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-ejikecha ka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma jiri otu akụkọ a kọrọ n’Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible mee ihe nkiri. Anyị rụrụ ihe ndị anyị ga-eji na-eme ha, dị ka mma agha, mkpanaka, nkata, na ihe ndị ọzọ. Anyị na-ejikwa ihe ndị dị na Baịbụl eme gwam gwam gwam, ụfọdụ na-adị mfe, ebe ndị ọzọ na-esi ike. Anyị nwekwara ọrụ ndị anyị na-arụkọ ọrụ, dị ka iwu ụgbọ Noa, ma ọ bụkwanụ ịchọpụta oge ihe dị iche iche a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anọkọ na-ese ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma ọ bụkwanụ ebe ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ugbu a, anyị na-achọ ise ihe agha ime mmụọ ndị a kọwara ná Ndị Efesọs 6:11-17. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akọwa ihe otu n’ime ha na-anọchi anya ya. Ihe ndị a emeela ka ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na-enwe na-atọ anyị ụtọ.”

Debi, bụ́ otu nne nke bi na Michigan nke dị n’Amerịka, kwuru, sị: “O siiri mụ na di m ike ime ka uche nwa anyị nwaanyị dịrị n’ihe anyị na-amụ mgbe ọ dị ihe dị ka afọ atọ. Ma, otu ụbọchị, mgbe m na-agụrụ ya akụkọ banyere Aịzik na Ribeka n’Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible, eji m nwa bebi abụọ nọchie anya Aịzik na Ribeka. Ugbu a, ọ na-ege ntị nke ọma. Ka oge na-aga, bebi abụọ ahụ na-anọchi anya ndị dị iche iche a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Anyị gụchaa otu akụkọ na Baịbụl, nwa anyị nwaanyị na-achọgharị ebe niile n’ụlọ anyị ma ọ̀ ga-ahụ nwa bebi na ihe ndị ọzọ o nwere ike iji gosi ihe ahụ a kọrọ n’akụkọ. O yiri ebe mmadụ na-achọ ihe dị oké ọnụ ahịa. Igbe a na-ekponye akpụkpọ ụkwụ na-anọchi anya ụlọ Rehab, ebe eriri na-acha ọbara ọbara e kenyere na ya na-anọchi anya eriri uhie ahụ e kenyere n’ụlọ Rehab. Agwọ e ji rọba mee nke dị otu mita na ọkara n’ogologo nke a tụhịrị n’osisi, na-anọchi anya agwọ ahụ a kọrọ akụkọ ya n’Ọnụ Ọgụgụ 21:4-9. Anyị na-etinye ihe ndị a anyị ji eme ihe nkiri ná nnukwu akpa. Obi na-atọ anyị ụtọ ka anyị na-ahụ nwa anyị nwaanyị ka ọ na-achọgharị ihe n’akpa ahụ. Ọ na-enyekwa anyị ọṅụ ịhụ ka ọ na-agbalị iji ihe ndị a kọrọ n’akụkọ eme ihe ngosi otú o nwere ike.”

Ọ dịghị mfe ịzụlite ụmụaka, ọ bụghị naanị ịmụrụ ha ihe kwa izu ga-eme ka ha nwee ọchịchọ ife Jehova. Ma, ọ bụrụ na ezinụlọ na-enwe ofufe ezinụlọ na ọmụmụ Baịbụl, ha ga-enwe ike ime nke a. O doro anya na mbọ ọ bụla a gbara iji na-eme nke a efughị ọhịa.