Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Nsọ—E Ji Ya Rụọ Ọrụ Mgbe a Na-eke Ihe!

Mmụọ Nsọ—E Ji Ya Rụọ Ọrụ Mgbe a Na-eke Ihe!

Mmụọ Nsọ—E Ji Ya Rụọ Ọrụ Mgbe a Na-eke Ihe!

“Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe, ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.”—ỌMA 33:6.

1, 2. (a) Olee otú ndị mmadụ si na-amatakwu banyere mbara igwe na ụwa ka oge na-aga? (b) Olee ajụjụ nke e kwesịrị ịchọta azịza ya?

N’AFỌ 1905, ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Albert Einstein na ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ndị ọzọ kweere na ọ bụ naanị otu ụyọkọ kpakpando ka e nwere, ya bụ, ụyọkọ nke ụwa a dị na ya. Nke a na-egosi na ha aghọtachaghị otú mbara igwe na ụwa hà. Ugbu a, ndị ọkachamara na-ekwu na e nwere ihe karịrị otu narị ijeri ụyọkọ kpakpando na mbara igwe nakwa na ụfọdụ n’ime ụyọkọ ndị ahụ nwere ọtụtụ ijeri kpakpando. Ndị ọkachamara ejirila ọkpọka onyokomita ndị e nwere taa e ji ahụ ihe dị anya chọpụtakwuo ọtụtụ ụyọkọ kpakpando.

2 Otú ahụ ndị ọkà mmụta sayensị na-amachaghị banyere mbara igwe n’afọ 1905, ka ha na-amachaghịkwa banyere ụwa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị biri n’ụwa a ihe dị ka otu narị afọ gara aga ka ndị nna nna ha mara banyere ihe ndị dị ma na mbara igwe ma n’ụwa. Ma, taa, ndị mmadụ na-aghọta ihe dị iche iche dị ebube dị n’ụwa nakwa otú ha si enyere ndụ aka karịa ka ha maara na narị afọ gara aga. O dokwara anya na ọ ka nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a ga-achọpụta na mbara igwe nakwa n’ụwa n’ọdịnihu. Ma, ọ dị mma ka anyị jụọ, sị: Olee otú ihe a niile si malite ịdị? Anyị ga-amata azịza ajụjụ a n’ihi na Onye kere anyị mere ka ọ dịrị n’Akwụkwọ Nsọ.

Ihe Ndị E Kere Eke Bụ Ọrụ Ebube

3, 4. Olee otú Chineke si kee eluigwe na ụwa, oleekwa otú ihe ndị o kere si ewetara ya otuto?

3 Amaokwu malitere Baịbụl gwara anyị otú eluigwe na ụwa si malite. Ọ sịrị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jen. 1:1) Mgbe ọ na-adịghị ngwá ọrụ ọ bụla dị adị, Jehova ji mmụọ nsọ ya, ya bụ, ike ya nọ n’ọrụ, malite ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha. Omenkà bụ́ mmadụ na-eji aka ya na ngwá ọrụ ya emepụta ihe, ma, Chineke na-ezipụ mmụọ nsọ ma ọ chọọ ịrụ nnukwu ọrụ ọ na-arụ.

4 Akwụkwọ Nsọ kpọrọ mmụọ nsọ “mkpịsị aka” Chineke. (Luk 11:20; Mat. 12:28) “Ọrụ aka ya,” ya bụ, ihe Jehova ji mmụọ nsọ ya kee, na-ewetara ya otuto. Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ abụ, sị: “Eluigwe na-akọsa ebube Chineke; mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.” (Ọma 19:1) Ihe e kere eke anyị na-ahụ anya na-egosi na mmụọ nsọ Chineke dị ezigbo ike. (Rom 1:20) Olee otú ihe e kere eke si eme nke a?

Chineke Nwere Ike Na-enweghị Atụ

5. Olee ihe atụ na-egosi na mmụọ nsọ Jehova dị ike nke na e nwere ike iji ya kee ihe?

5 Eluigwe na ụwa anyị ndị sara mbara nke ukwuu na-egosi na Jehova nwere ike na-enweghị atụ. (Gụọ Aịzaya 40:26.) Cheedị banyere anyanwụ anyị, nke bụ́kwa kpakpando. Ọ dị ihe karịrị otu narị nde kilomita na iri nde ise ma e si n’ụwa gawa ya, dịrịkwa ihe dị ka nde digrii iri na ise n’ọkụ. Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụrụ na a ga-enwe ike isi n’etiti anyanwụ wepụta ihe ga-aha ka isi ndụdụ ma tụsa ya n’ụwa ebe a, ị gaghị enwe ike ịnọ ihe dị ka otu narị kilomita na iri anọ site n’ebe a tụsara ntakịrị ihe ahụ. N’agbanyeghị na anyanwụ dị ọkụ otú a, ọ dị n’ebe kwesịrị ekwesị nke ga-eme ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa ghara ịla n’iyi. O doro anya na onye kere ma anyanwụ ma ọtụtụ ijeri kpakpando ndị ọzọ ga-enwerịrị ike na-enweghị atụ. Jehova nwere ike a chọrọ iji nwee ike ike ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

6, 7. (a) Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na Chineke ji mmụọ nsọ ya kee ihe otú ha ga-adị n’usoro? (b) Gịnị na-egosi na eluigwe na ụwa amaliteghị n’enweghị onye kere ha?

6 E nwere ọtụtụ ihe na-egosi anyị na Chineke ji mmụọ nsọ ya kee ihe niile otú ha ga-adị nnọọ n’usoro. Ka e were ya na ị chịnyere bọl ndị nwere ụcha dị iche iche n’otu igbe. Gị eburu ụzọ yọgharịa ha nke ọma wee wụpụta bọl ndị ahụ niile n’ala otu mgbe. Ò nwere ihe ga-eme ka bọl nke ọ bụla jiri aka ya gakwuru nke na-acha otú ọ na-acha, ya bụ, ndị na-acha anụnụ anụnụ adịrị otu ebe, ndị nke na-acha odo odo adịrịkwa otu ebe, n’enweghị onye haziri ha? Ọ gaghị ekwe omume! Ihe a na-ahazighị ahazi anaghị adị n’usoro. Ndị mmadụ ma na ọ bụ otú a ka ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa dị. *

7 Ọ bụrụ na anyị elee anya na mbara igwe, ma ọ bụkwanụ jiri onyokomita lee ya, gịnị ka anyị ga-ahụ? Anyị ga-ahụ ụyọkọ kpakpando, kpakpando ndị dị n’ime ha, na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe ka ha dị nnọọ n’usoro, ha anaghị agahie ụzọ. Nke a enweghị ike iji aka ya dịrị otú a n’enweghị onye haziri ya. Nke a ga-eme ka anyị jụọ, sị: Olee ike e ji kee eluigwe na ụwa nke mere ka ha dị n’usoro otú a? Sayensị na nkà na ụzụ agaghị enwe ike inyere ụmụ mmadụ aka ịchọpụta ike ahụ. Ma, Baịbụl mere ka anyị mara na ike ahụ bụ mmụọ nsọ Chineke, bụ́ ike kacha ike niile e nwere ma n’eluigwe ma n’ụwa. Devid bụrụ abụ, sị: “Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe, ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.” (Ọma 33:6) Ọ bụrụ na anyị elee anya n’eluigwe n’abalị, ihe anyị na-ahụ bụ naanị kpakpando ole na ole n’ime kpakpando “niile” dị n’eluigwe!

Otú E Si Jiri Mmụọ Nsọ Kee Ụwa

8. Ihe anyị ma banyere ihe Jehova kere eke ọ̀ hà otú olee?

8 Ihe niile anyị ma ugbu a banyere ihe ndị e kere eke enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ndị nke anyị na-amaghị banyere ha. Dị ka Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, kwuru, anyị amachaghị banyere ihe niile Chineke kere eke. Job sịrị: “Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile, leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị!” (Job 26:14) Ka ọtụtụ narị afọ gafere ka Job kwuchara nke a, Eze Sọlọmọn, bụ́ onye amamihe, leruru ihe dị iche iche Jehova kere eke anya wee sị: “[Chineke emewo] ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya. O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha, ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.”—Ekli. 3:11; 8:17.

9, 10. Olee ike Chineke ji kee ụwa, oleekwa ihe ndị o kere n’ụbọchị nke mbụ ruo ụbọchị nke atọ?

9 N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova emeela ka anyị mata ihe ndị anyị kwesịrị ịmata banyere ihe o kere eke. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na mmụọ nsọ Chineke anọwo na-arụ ọrụ n’ụwa kemgbe ọtụtụ ijeri afọ. (Gụọ Jenesis 1:2.) N’oge ahụ, ala akọrọ na ìhè adịghị. Ọ ga-abụkwa na ezigbo ikuku adịghị n’ụwa n’oge ahụ.

10 Baịbụl kwukwara ihe Chineke mere n’ụbọchị ndị o ji kee ihe. Ụbọchị ndị a abụghị ụbọchị nkịtị, kama, ha bụ ogologo oge. Jehova mere ka ìhè malite ịdị n’ụwa n’ụbọchị nke mbụ. Ọ bụ mgbe ìhè anyanwụ na ọnwa mechara rute n’ụwa ka nke a mezuru. (Jen. 1:3, 14) N’ụbọchị nke abụọ, Chineke mere ka mbara dị n’etiti mmiri na mmiri. (Jen. 1:6) Mmiri, ìhè, na ikuku wee dị n’ụwa, ma, ala akọrọ adịghị. Ná mmalite ụbọchị nke atọ, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka ala akọrọ malite ịdị. Ọ ga-abụ na o mere nke a site n’ime ka ala akọrọ si na mmiri pụta. (Jen. 1:9) O nwekwara ihe ndị ọzọ pụrụ iche Jehova kere n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị ndị ọzọ sochiri ya.

Otú E Si Jiri Mmụọ Nsọ Kee Ihe Ndị Dị Ndụ

11. Gịnị ka otú ihe ndị dị ndụ si maa mma ma nwee ọdịdị dị iche iche, a haziekwa ha nke ọma na-egosi?

11 Chineke jikwa mmụọ nsọ ya kee ihe ndị dị ndụ a haziri nke ọma. N’ụbọchị nke atọ ruo n’ụbọchị nke isii, Chineke kere osisi, ahịhịa, na anụmanụ dị iche iche mara mma. (Jen. 1:11, 20-25) Ihe ndị a niile na-egosi otú ihe ndị dị ndụ si maa mma ma nwee ọdịdị dị iche iche, bụ́cha ihe ndị na-egosi na otú dị mma e si hazie ha enweghị atụ.

12. (a) Gịnị ka ihe a na-akpọ DNA na-arụ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’otú DNA si arụ ọrụ kemgbe ụwa n’enweghị nkwụsị?

12 Tụlee otu n’ime ihe ndị na-eme ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ yie nne ya ma ọ bụ nna ya, nke na-emekwa ka osisi yie osisi ya na ya bụ otu, nke a na-akpọ DNA. Ihe a na-enyere ihe ọ bụla dị ndụ n’ụwa aka. Ya bụ, tupu ahịhịa epute ahịhịa ọzọ, tupu nje ma ọ bụ azụ̀ eyie àkwá ma ọ bụ tupu enyí ma ọ bụkwanụ mmadụ amụọ nwa, ihe a aghaghị inyere ha aka. N’agbanyeghị na ihe ndị e kere eke dị n’ụwa dịgasị iche, ihe a nke dị n’ihe ọ bụla dị ndụ ma na-eme ka nwa yie nne ya ma ọ bụ nna ya, anaghị agbanwe otú o si arụ ọrụ kemgbe ụwa. Ya mere, ihe niile dị ndụ n’ụwa na ibe ha ga-anọgide na-arụkọ ọrụ ọnụ otú Jehova bụ́ Chineke si kee ha. (Ọma 139:16) Otú e si hazie ihe ndị a, ha ana-agakwa n’usoro, bụ ihe ọzọ na-egosi na ọ bụ “mkpịsị aka” Chineke, ma ọ bụ mmụọ nsọ ya, ka o ji kee ihe niile.

Ihe Kacha Ihe Niile E Kere Eke n’Ụwa

13. Olee otú Chineke si kee mmadụ?

13 Mgbe ọtụtụ ijeri afọ gachara ka Chineke kechara ọtụtụ ihe, ma ndị na-eku ume ma ndị na-anaghị eku ume, ụwa abụghịzi ebe ‘ihe na-adịghị na ebe tọgbọ n’efu.’ Ma, Jehova ka nwere ihe ọ ga-eji mmụọ ya eke. Ọ ka ga-eke ihe kacha ihe niile o kere n’ụwa. Chineke kere mmadụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ụbọchị nke isii gwụ. Olee otú Jehova si mee nke a? O ji mmụọ nsọ ya nakwa ihe ndị dị n’ala.—Jen. 2:7.

14. Olee otú dị mkpa ụmụ mmadụ si dị iche n’ụmụ anụmanụ?

14 Jenesis isi mbụ amaokwu iri abụọ na asaa kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.” Okike Jehova kere anyị n’onyinyo ya pụtara na o kere anyị otú anyị ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-eme ihe ọ bụla anyị chọrọ ime, nakwa otú anyị ga na-eme ihe ga-eme ka anyị na ya dị ná mma. Ọ bụ nke a mere ụbụrụ anyị ji dị nnọọ iche na nke anụmanụ. Ihe mere Jehova ji kee ụbụrụ anyị ka ọ dị iche na nke anụmanụ bụ ka anyị wee jiri ọṅụ na-amụ banyere ya ruo mgbe ebighị ebi, na-amụkwa banyere ihe ndị ọzọ o kere.

15. Olee ihe Chineke zubere maka Adam na Iv?

15 Mgbe Chineke kere nwoke mbụ bụ́ Adam, nakwa Iv nwunye ya, o nyere ha ụwa na ihe niile dị ịtụnanya dị n’ime ya ka ha wee na-amụ banyere ha ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ha. (Jen. 1:28) Jehova nyere ha nri n’ụba, nyekwa ha paradaịs ka ọ bụrụ ebe obibi ha. Ha nwere ohere ịdị ndụ ebighị ebi, nweekwa ohere ịmụ ọtụtụ ijeri ụmụ ndị ha ga-ahụ n’anya, bụ́kwa ndị ga-ezu okè. Ma, ihe agaghị otú Chineke si zube ya.

Ịnabata Ọrụ Mmụọ Nsọ Na-arụ

16. Olee ihe anyị na-atụ anya ya n’agbanyeghị isi Adam na Iv nupụụrụ Chineke?

16 Kama Adam na Iv ga-enwe obi ụtọ n’ihe Onye kere ha meere ha, ha malitere ịchọ ọdịmma onwe ha naanị wee nupụrụ ya isi. Mmadụ niile, bụ́ ụmụ ha na-ezughị okè, na-ata ahụhụ n’ihi isi ahụ ha nupụrụ. Ma, Baịbụl kwuru otú Chineke ga-esi emezi nsogbu niile isi nne na nna anyị mbụ nupụụrụ ya kpatara. Akwụkwọ Nsọ mekwara ka anyị mara na Jehova ga-emezu ihe o zubere imere ụmụ mmadụ. Ụwa ga-aghọ paradaịs nke ụmụ mmadụ ndị na-enwe obi ụtọ ga-ejupụta, bụ́ ndị ga-adị ndụ ebighị ebi, ha agaghịkwa arịa ọrịa ọ bụla. (Jen. 3:15) Anyị chọrọ enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-atụ anya nkwa a nke na-eme obi ụtọ.

17. Olee ozizi anyị na-ekwesịghị ịnabata?

17 Anyị kwesịrị ikpeku Jehova ekpere ka o nye anyị mmụọ nsọ. (Luk 11:13) Ime nke a ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ bụ Chineke kere ihe niile e kere eke. Taa, e nwere ọtụtụ ndị na-akụziri ndị mmadụ na Chineke adịghị nakwa na ihe niile dị n’ụwa malitere ịdị n’enweghị onye kere ha. Ozizi a bụ ụgha, o nweghịkwa isi. Anyị ekwesịghị ikwe ka ozizi ụgha a tigharịa anyị anya. Ndị Kraịst niile kwesịrị ịdị njikere imeri ọnwụnwa a, ha agaghịkwa ekwe ka ndị ọzọ mee ka ha nabata ya.—Gụọ Ndị Kọlọsi 2:8.

18. Olee ihe o ji jọgbuo onwe ya mmadụ ikwu na ọ bụghị Onye nwere ọgụgụ isi kere eluigwe na ụwa na mmadụ?

18 Anyị ga-atụkwasịkwu ma Baịbụl ma Chineke obi ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum tụlee ihe niile na-egosi na ọ bụ Chineke kere ihe niile. Ọtụtụ ndị anaghị ekweta ihe ọzọ na-egosi otú eluigwe na ụwa si malite ịdị ma e wezụga ihe ọ bụla sayensị nyeere ha aka ịchọpụta. Ma, anyị agaghị amatacha ihe anyị kwesịrị ịma ma ọ bụrụ na anyị ekwere naanị ihe e ji sayensị chọpụta. Ihe ọzọ bụ na nke a ga-eme ka anyị na-eleghara ihe e kere eke “a na-apụghị ịgụta ọnụ” anya, bụ́ ndị a haziri nke ọma, ndị jukwara ebe niile ma baara anyị uru. (Job 9:10; Ọma 104:25) Anyị bụ́ Ndị Kraịst ma nke ọma na ọ bụ mmụọ nsọ ka Jehova Chineke anyị nke nwere amamihe ji kee ihe niile.

Otú Mmụọ Nsọ Si Eme Ka Anyị Nwee Okwukwe na Chineke

19. Gịnị mere i ji kweta na Chineke dị nakwa na mmụọ nsọ na-arụsi ọrụ ike?

19 Anyị agaghị echere ruo mgbe anyị matara ihe niile banyere ihe e kere eke tupu anyị amalite inwe okwukwe na Chineke, malitekwa ịhụ ya n’anya na irubere ya isi. Dị ka ọ na-adị na mmadụ abụọ bụ enyi, ọ bụghị naanị ihe anyị ma banyere Jehova ga-eme ka anyị nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Dị ka adịm ná mma enyi na enyi na-esikwu ike ka ha na-amatakwu ibe ha otú ahụ ka okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-esikwu ike ka anyị na-amatakwu banyere ya. N’eziokwu, ọ na-edo anyị anya na Chineke dị mgbe ọ zara ekpere anyị nakwa mgbe anyị na-ahụ ihe ọma si n’ime ihe ọ gwara anyị apụta. Anyị na-abịarukwu Jehova nso ma anyị na-ahụ ọtụtụ ihe na-egosi na ọ na-edu anyị, na-echebe anyị, na-agọzi mbọ anyị na-agba n’ozi ya ma na-egbo mkpa anyị. Ihe a niile na-egosi nnọọ na Chineke dị nakwa na mmụọ nsọ ya na-arụsi ọrụ ike.

20. (a) Olee ihe mere Chineke ji kee eluigwe na ụwa na mmadụ? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ Chineke na-edu anyị?

20 Baịbụl bụ otu n’ime ihe pụrụ iche na-egosi otú Jehova si eji mmụọ nsọ arụ ọrụ n’ihi na ndị dere ya “kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Ịmụ Baịbụl nke ọma ga-eme ka anyị kwetasie ike na ọ bụ Chineke kere ihe niile. (Mkpu. 4:11) Jehova kere ihe niile n’ihi na o nwere ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) N’ihi ya, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ka ha mara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Enyi anyị hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyịnwa anọgide na-ekwe ka mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke ịmụ banyere ya ruo mgbe ebighị ebi. (Gal. 5:16, 25) Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-amụ banyere Jehova na nnukwu ihe ndị o kere eke, ka anyị na-echetakwa ịhụnanya na-enweghị atụ o nwere n’ebe anyị nọ nke mere ka o jiri mmụọ nsọ ya kee eluigwe, ụwa, na ụmụ mmadụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Gụọ akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? peeji nke 24 na nke 25.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Gịnị ka eluigwe na ụwa na-akụziri anyị banyere otú Chineke si eji mmụọ nsọ arụ ọrụ?

• Olee ihe ùgwù ndị anyị nwere n’ihi na Chineke kere anyị n’onyinyo ya?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara ihe ndị na-egosi na ọ bụ Chineke kere ihe niile echiche?

• Olee ihe ga-eme ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 7]

Olee ihe otú eluigwe na ụwa si dị n’usoro na-akụziri anyị banyere ihe niile e kere eke?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Kpakpando: Anglo-Australian Observatory/David Malin Images

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Olee otú DNA si arụ ọrụ n’ihe a niile?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ dị njikere ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere?