Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ n’Eziokwu Maka Ihe Niile Jehova Na-emere Gị?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ n’Eziokwu Maka Ihe Niile Jehova Na-emere Gị?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ n’Eziokwu Maka Ihe Niile Jehova Na-emere Gị?

ỤMỤ Izrel nwere obi ụtọ mgbe Jehova rụrụ ọrụ ebube wee napụta ha n’Ijipt ebe ha na-agba ohu, ka ha wee nwee ike ife ya. (Ọpụ. 14:29–15:1, 20, 21) Ma, n’oge na-adịghị anya, ha gbanwere. Ha malitere ime mkpesa banyere ọnọdụ ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha chefuru ihe Jehova meere ha ma na-eche naanị banyere ọnọdụ ha nọ na ya n’ala ịkpa. Ha gwara Mozis, sị: “Gịnị mere unu ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka anyị nwụọ n’ala ịkpa a? N’ihi na nri adịghị, mmiri adịghịkwa, mkpụrụ obi anyị akpọwokwa ihe oriri a [ya bụ, mana] na-enweghị isi asị.”—Ọnụ Ọgụ. 21:5.

Ka ọtụtụ narị afọ gafechara, Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie bụrụ abụ, sị: “Ma mụ onwe m, n’obiọma gị ka m tụkwasịrị obi; ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị. M ga-abụku Jehova abụ, n’ihi na o mesowo m mmeso ọma.” (Ọma 13:5, 6) Devid echefughị ihe ọma Jehova meere ya. Kama nke ahụ, ọ na-eche banyere ha mgbe niile. (Ọma 103:2) Jehova emeekwarala anyị ihe ọma, anyị ekwesịghịkwa ichefu ihe ndị o meere anyị. Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ọma Chineke na-emere anyị taa.

‘Ndị Ha na Jehova Na-enwe Mmekọrịta Chiri Anya’

Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Ọma 25:14) Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù mmadụ na-ezughị okè na Jehova inwe mmekọrịta chiri anya. Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị etinye oge anyị niile n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị nke na anyị anaghị enwechazi ohere ikpe ekpere? Cheedị ihe nke a ga-eme mmekọrịta anyị na Jehova. Ebe Jehova bụ enyi anyị, ọ na-atụ anya ka anyị tụkwasị ya obi ma na-agwa ya ihe niile dị anyị n’obi, ya bụ, ihe ndị na-atụ anyị egwu, ihe ndị anyị chọrọ ime, na ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. (Ilu 3:5, 6; Fil. 4:6, 7) Nke a ó kwesịghị ime ka anyị chebara otú ekpere anyị na-adị echiche?

Mgbe otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ́ Ikenna chebaara otú ekpere ya na-adị echiche, ọ chọpụtara na ya kwesịrị ime ka ekpere ya ka mma. * Ọ sịrị, “M na-ekwukarị otu ụdị ihe mgbe m na-ekpeku Jehova ekpere.” Mgbe Ikenna mechara nchọnchọ na Watch Tower Publications Index, ọ chọpụtara na e nwere ihe dị ka ekpere otu narị na iri asatọ e dere na Baịbụl. N’ekpere ndị a, ndị fere Jehova n’oge ochie gwara ya okwu otú ọ dị ha n’obi. Ikenna kwuru, sị: “Ịtụgharị uche n’ekpere ndị a e dere n’Akwụkwọ Nsọ mere ka m mụta ịkpọ okwu aha mgbe m na-ekpe ekpere. Nke a emeekwala ka m na-agwa Jehova otú ihe dị m n’obi. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a ikpeku ya ekpere.”

‘Ọ Na-enye Anyị Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’

Ihe ọma ọzọ Jehova na-emere anyị bụ eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị o mere ka anyị mụta. Ka anyị na-eri nri ime mmụọ hiri nne nke na-edozi ahụ́, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji ‘na-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị anyị mma.’ (Aịza. 65:13, 14) Ma, anyị kwesịrị ilezi anya ka ihe ndị nwere ike imebi okwukwe anyị ghara ime ka anyị kwụsị inwe obi ụtọ maka eziokwu anyị na-amụta. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-ege ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị, ha nwere ike ime ka anyị chewe echiche na-ezighị ezi, nke a ga-emekwa ka anyị ghara iji ‘nri Jehova si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche’ na-enye anyị kpọrọ ihe.—Mat. 24:45-47.

Ihe mere André, bụ́ onye jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ, kụziiri ya ihe ọjọọ na-esi na mmadụ ige ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị apụta. O chere na ọ dịghị ihe ga-eme ya ma ya nyonyetụ anya n’ebe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-edebe ihe n’Ịntanet. O kwuru, sị: “Na mbụ, ihe ha sị na ọ bụ eziokwu nke ha na-ekwu dọọrọ mmasị m. Ka m na-agụ ihe ha kwuru, ka m na-eche na m kwesịrị ịhapụ ọgbakọ Jehova. Ma, mgbe m mechara mee nchọnchọ n’ihe ndị ahụ ndị si n’ezi ofufe dapụ ji ekwugide Ndịàmà Jehova, achọpụtara m na ndị ozizi ụgha a dị ezigbo aghụghọ. Ihe ha sịrị na ọ bụ ihe ha ji ejide Ndịàmà Jehova bụ ihe ndị ha hịgharịrị otú ọzọ. Nke a mere ka m maliteghachi ịgụ akwụkwọ anyị na ịga ọmụmụ ihe. Achọpụtara m n’oge na-adịghị anya na ọtụtụ ihe efunahụla m.” Ọ dị mma na André lọghachiri n’ọgbakọ.

“Òtù Ụmụnna Dum”

Òtù ụmụnna anyị dị n’otu, ndị hụrụ anyị n’anya, bụ ihe ọma ọzọ Jehova meere anyị. (Ọma 133:1) E nwere ezigbo ihe mere Pita onyeozi ji dee, sị: “Hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya.” (1 Pita 2:17) N’òtù ụmụnna anyị, anyị nwere ndị nna, ndị nne, ụmụnne ndị nwoke, na ụmụnne ndị nwaanyị hụrụ anyị n’anya ma na-enyere anyị aka.—Mak 10:29, 30.

Ma, e nwere ihe ụfọdụ ndị na-eme ka anyị na ụmụnna anyị na-enwe nghọtahie. Dị ka ihe atụ, nwanna anyị na-ezughị okè nwere ike ịkpasu anyị iwe, nke a nwekwara ike ime ka anyị na-akatọ ya. Ọ bụrụ na nke a emee, ọ́ gaghị aka mma ka anyị cheta na Jehova hụrụ ndị ohu ya n’anya n’agbanyeghị na ha bụ ndị mmehie? Ihe ọzọkwa bụ na “ọ bụrụ na anyị asị: ‘Anyị enweghị mmehie,’ anyị na-eduhie onwe anyị, eziokwu adịghịkwa n’ime anyị.” (1 Jọn 1:8) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbasi mbọ ike ‘na-ediri ibe anyị ihe ma na-agbaghara ha kpamkpam’?—Kọl. 3:13.

Ihe mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ann kụziiri ya na ọ dịghị mma mmadụ ịhapụ ụmụnna ya. O mere ihe yiri ihe nwa mmefu ahụ Jizọs ji mee ihe atụ mere wee hapụ ọgbakọ. Ka oge na-aga, ọ ghọtara onwe ya wee lọghachi. (Luk 15:11-24) Olee ihe Ann mụtara n’ihe mere ya? O kwuru, sị: “Ugbu a m lọghachiri ná nzukọ Jehova, ejizi m ụmụnna m niile kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Mgbe mbụ, ọ naghị ara ahụ́ mụ akatọwa ha. Ma ugbu a, ekpebisiela m ike na agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla napụ m obi ụtọ m na-enwe ma mụ na ụmụnna m nọrọ. O nweghị ihe dị n’ụwa a nke ruru ime ka mmadụ si na paradaịs ime mmụọ anyị nọ na ya pụọ.”

Na-enwe Obi Ụtọ Mgbe Niile Maka Ihe Ọma Chineke Na-emere Gị

Olileanya anyị nwere na Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu niile bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke na-enweghị atụ. Obi tọgburu anyị atọgbu mgbe anyị malitere inwe olileanya a. Obi dị anyị otú ahụ ọ dị onye ahịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, bụ́ onye ‘rere ihe niile o nwere ka o wee zụta otu nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa.’ (Mat. 13:45, 46) Jizọs ekwughị na e nwere mgbe onye ahịa ahụ kwụsịrị iji pel ahụ kpọrọ ihe. N’otu aka ahụ, ya adịkwala mgbe anyị ga-akwụsị iji olileanya a magburu onwe ya anyị nwere kpọrọ ihe.—1 Tesa. 5:8; Hib. 6:19.

Tụlee ihe banyere Jean, bụ́ onye na-ejere Jehova ozi kemgbe ihe karịrị afọ iri isii. O kwuru, sị: “Ihe na-enyere m aka iburu Alaeze Chineke n’obi mgbe niile bụ ịkọrọ ndị ọzọ banyere ya. Mgbe m hụrụ otú ihu ha si egbukepụ mgbe ha ghọtara ihe Alaeze Chineke bụ, ọ na-eme ka okwukwe m sikwuo ike. Ịhụ otú eziokwu si na-agbanwe ndụ ndị m na-amụrụ Baịbụl na-eme ka m na-agwa onwe m na ‘eziokwu a m na-akụziri ndị ọzọ enweghị atụ.’”

Anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nwee obi ụtọ maka ọtụtụ ihe ọma Chineke na-emere anyị. Ọ bụ eziokwu na anyị na-enwe ọtụtụ nsogbu, ndị dị ka mkpagbu, ọrịa, nkà, ịda mba n’obi, ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya, na ụkọ ego, anyị ma na ha agaghị adịte aka. E wezụga ihe ọma ndị anyị na-enweta n’ọgbakọ Jehova ugbu a, mgbe Alaeze Chineke ga-abịa, Chineke ga-ewepụrụ anyị nsogbu ndị anyị na ha na-alụ taa. Ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a agaghị adị n’ụwa ọhụrụ.—Mkpu. 21:4.

Ka ọ dị ugbu a, ka anyị na-echeta ihe ọma niile Jehova na-emere anyị ma na-enwe obi ụtọ maka ha dị ka otu ọbụ abụ mere, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị; ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị. Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha, ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.”—Ọma 40:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụmụnna anyị na-enyere anyị aka mgbe anyị nwere nsogbu