Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mkpụrụ Nke Mmụọ Nsọ” Na-ewetara Chineke Otuto

“Mkpụrụ Nke Mmụọ Nsọ” Na-ewetara Chineke Otuto

“Mkpụrụ Nke Mmụọ Nsọ” Na-ewetara Chineke Otuto

“A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu.”—JỌN 15:8.

1, 2. (a) Olee oge ndị anyị nwere ike ịgba ndị ọzọ ume? (b) Olee ihe Jehova nyere anyị nke na-eme ka ozi anyị na-ejere ya ka mma?

TỤLEGODỊ ihe atụ abụọ a: Otu nwanna nwaanyị nke katarala ahụ́ chọpụtara na ọ dị ka è nwere ihe na-enye nwanna nwaanyị ọzọ na-akatabeghị ahụ́ nsogbu n’obi. Ya emee ndokwa ka ha abụọ rụọ n’ozi ọma. Ka ha na-akparịta ụka mgbe ha si n’ụlọ ha ziri ozi ọma pụta, nwanna nwaanyị ahụ na-akatabeghị ahụ́ malitere ịkọrọ ya ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Mgbe e mechara n’ụbọchị ahụ, o kpekuru Jehova ekpere ma kelee ya maka otú nwanna nwaanyị ahụ si gosi ya ịhụnanya; bụ́kwanụ ihe dị ya ezigbo mkpa. N’ebe ọzọ, otu di na nwunye ka si nnọọ mba ọzọ ha gara ikwusa ozi ọma lọta. N’otu nnọkọ ha nwere, ka ha ji obi ụtọ na-akọ ahụmahụ ndị ha nwere, otu nwanna nwoke nke na-eto eto nọdụrụ jụụ na-egere ihe ha na-akọ. Mgbe afọ ụfọdụ gara, ka nwanna nwoke ahụ na-achọ ịga jewe ozi ná mba ọzọ, o chetara di na nwunye ahụ na ihe ahụ ha kọrọ, bụ́kwanụ ihe mere ka ọ chọọ ịbụ onye ozi ala ọzọ.

2 Ikekwe ihe ndị a a kọrọ na-echetara gị otu onye nyeere gị aka ime mkpebi ndị baara gị uru ná ndụ ma ọ bụkwanụ onye i nyeere aka. N’eziokwu, o siri ike ịhụ onye gị na ya kparịtara ụka naanị otu ugboro nke ahụ agbanwee ndụ ya, ma, kwa ụbọchị, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume, meekwa ka okwukwe ha sie ike. Weregodị ya na e nwere ihe ga-eme ka ị na-akpakwu àgwà ọma, bụ́ nke ga-eme ka ị na-enyekwuru ụmụnna gị aka ma bakwuoro Chineke uru. Í cheghị na nke ahụ ga-amagbu onwe ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova na-enye anyị ihe ahụ, ya bụ, mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ka mmụọ nsọ Chineke na-arụ ọrụ n’ime anyị, ọ na-eme ka anyị na-akpa àgwà ndị mara mma, bụ́ ndị na-enyere anyị aka eme ka ozi ọ bụla anyị na-ejere Chineke ka mma. N’eziokwu, mmụọ nsọ bụ onyinye na-enweghị atụ!—Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.

3. (a) Olee otú anyị ga-esi ewetara Chineke otuto ma ọ bụrụ na anyị enwee “mkpụrụ nke mmụọ nsọ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Àgwà dị iche iche mmụọ nsọ na-eme ka anyị na-akpa yiri àgwà Jehova Chineke, bụ́ Onye nwe mmụọ ahụ. (Kọl. 3:9, 10) Jizọs mere ka a ghọta ihe mere Ndị Kraịst ji kwesị ịgba mbọ na-eṅomi Chineke mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu.” * (Jọn 15:8) Ka anyị na-agba mbọ inwe “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” Chineke, a ga-ahụ ya n’otú anyị si ekwu okwu na n’otú anyị si akpa àgwà, bụ́kwanụ nke ga-ewetara Chineke anyị otuto. (Mat. 5:16) Olee otú mkpụrụ nke mmụọ nsọ si dị iche n’otú ụwa Setan si akpa àgwà? Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ? Gịnị mere inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ nwere ike iji na-esiri anyị ike? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a ka anyị na-atụle ihe atọ mbụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ha bụ, ịhụnanya, ọṅụ, na udo.

Ịhụnanya nke Yiri Ịhụnanya Chineke

4. Olee ụdị ịhụnanya Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee?

4 Ịhụnanya mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee dị ezigbo iche n’ịhụnanya e nwere n’ụwa. Olee otú o si dị iche? O yiri ịhụnanya Chineke. Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu, o mere ka a mata ihe dị iche n’ịhụnanya abụọ a. (Gụọ Matiu 5:43-48.) O kwuru na ọbụna ndị mmehie na-emeso ndị ọzọ ihe otú ndị ahụ si emeso ha. Ụdị “ịhụnanya” a achọghị oké ihe n’aka mmadụ, naanị ihe onye nwere ụdị ịhụnanya a na-eme bụ imere onye meere ya ihe ọma ihe ọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịbụ ụmụ nke Nna anyị nọ n’eluigwe,’ ọ bụghị naanị ndị meere anyị ihe ọma ka anyị ga-emere ihe ọma. Kama imeso ndị ọzọ ihe otú ha si emeso anyị, anyị ga na-ele ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha, na-emesokwa ha ihe otú o si emeso ha. Ma, olee otú anyị nwere ike isi hụ ndị iro anyị n’anya otú ahụ Jizọs kwuru?

5. Olee otú anyị nwere ike isi hụ ndị na-akpagbu anyị n’anya?

5 Ka anyị tụlee otu ihe atụ dị na Baịbụl. Mgbe Pọl na Saịlas na-ekwusa ozi ọma na Filipaị, e jidere ha, tie ha ezigbo ihe ma tụba ha n’ụlọ nga dị n’ime ime, bụ́ ebe a kpọchiri ụkwụ ha n’ọtọsị. Ka ihe a na-eme, ọ ga-abụ na onye na-elekọta ụlọ nga ahụ mesikwara ha ike. Mgbe e ji ala ọma jijiji tọhapụ ha na mberede, hà ṅụrịrị ọṅụ na nke ahụ bụ ohere ha nwere imegwara nwoke ahụ ihe o mere ha? Mbanụ. Otú ha si hụ nwoke ahụ n’anya mere ka ha nyere ya aka ozugbo, bụ́kwanụ ihe mere ka ya na ezinụlọ ya dum ghọọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 16:19-34) Ọtụtụ ụmụnna anyị taa ‘na-agọzi ndị na-akpagbu ha’ otú ahụ Pọl na Saịlas mere.—Rom 12:14.

6. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi ụmụnna anyị ụdị ịhụnanya nke nwere ike ime ka anyị dị njikere ịnwụchitere ha ọnwụ ma ọ dị mkpa? (Gụọ igbe dị na peeji nke 21.)

6 E nwere ụzọ ọzọ anyị si ahụ ụmụnna anyị n’anya. ‘Anyị ji ụgwọ ịtọgbọ mkpụrụ obi anyị n’ihi ụmụnna anyị.’ (Gụọ 1 Jọn 3:16-18.) Ma, e nwere obere ihe ndị anyị ga na-eme iji gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekwuo ihe were nwanna anyị iwe ma ọ bụ mee ihe were ya iwe, anyị ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya ma ọ bụrụ na anyị agakwuru ya ka anyị na ya kpezie. (Mat. 5:23, 24) Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ akpasuo anyị iwe? Ànyị dị “njikere ịgbaghara” ya, ka ànyị na-eburu ya iwe n’obi mgbe ụfọdụ? (Ọma 86:5) Ezigbo ịhụnanya nke mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee na-eme ka anyị ghara ịgụkọ obere amaghị eme ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịgbaghara ha kpamkpam ‘ọbụna dị ka Jehova gbaghaara anyị kpamkpam.’—Kọl. 3:13, 14; 1 Pita 4:8.

7, 8. (a) Olee otú ịhụ Chineke n’anya ga-esi mee ka anyị hụ ndị mmadụ n’anya? (b) Olee otú anyị ga-esi hụkwuo Jehova n’anya? (Lee foto dị na peeji nke 19.)

7 Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe ụdị ịhụnanya nke ga-eme ka anyị dị njikere ịnwụchitere ụmụnna anyị ọnwụ? Ọ bụ anyịnwa ịhụkwu Chineke n’anya. (Efe. 5:1, 2; 1 Jọn 4:9-11, 20, 21) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, ya bụ, ịgụ Baịbụl, ịtụgharị uche, na ikpe ekpere, ha ga-agba anyị ume, anyị ga-ahụkwukwa Nna anyị nke eluigwe n’anya. N’eziokwu, anyị kwesịrị iwepụta oge ka anyị wee bịaruo Chineke nso.

8 Dị ka ihe atụ: Were ya na e nwere oge e wepụtara kwa ụbọchị ka anyị jiri na-agụ Okwu Chineke, na-atụgharị uche na ya ma na-ekpeku Chineke ekpere. Ọ̀ bụ na ị gaghị elezi anya jiri oge ahụ mee ihe ndị e bu n’obi wepụta ya ka a ghara inwe ihe ga-eri oge e wepụtara ka gị na Jehova nọrịa? N’eziokwu, o nweghị onye ga-egbochili anyị ikpeku Chineke ekpere, ọtụtụ n’ime anyị nwekwara ike ịgụ Baịbụl mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Ma, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka ọtụtụ ihe anyị na-eme kwa ụbọchị ghara ime ka anyị na Chineke ghara ịnọrị n’oge anyị na ya kwesịrị ịnọrị. Kwa ụbọchị, ị̀ na-ewepụta oge otú o kwere gị mee ka i wee bịaruo Jehova nso?

“Ọṅụ nke Mmụọ Nsọ Na-enye”

9. Gịnị ka e ji ama ọṅụ nke mmụọ nsọ na-enye?

9 Anyị nwere ike ịnọgide na-enwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ ọbụna mgbe ihe na-esiri anyị ike. Ọṅụ, bụ́ ihe nke abụọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ́ nke anyị ga-atụle, gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọṅụ yiri ihe ọkụkụ nke nwedịrị ike ime nke ọma n’ala na-anaghị eme ihe. N’ụwa niile, ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke ‘ejila ọṅụ nke mmụọ nsọ na-enye nabata okwu Chineke mgbe ha nọ ná mkpagbu dị ukwuu.’ (1 Tesa. 1:6) Ihe na-esiri ndị ọzọ ike. Ma, Jehova na-eji mmụọ nsọ enye ha ike ka ha “wee tachie obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.” (Kọl. 1:11) Gịnị na-enye anyị ọṅụ?

10. Gịnị na-enye anyị ọṅụ?

10 Akụ̀ Jehova nyere anyị na-adịru ebighị ebi, ọ dịghị ka “akụnụba ndị a na-ejighị n’aka” nke ụwa Setan. (1 Tim. 6:17; Mat. 6:19, 20) Jehova kwere anyị nkwa na-enye ọṅụ, ya bụ na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Obi dị anyị ụtọ na anyị so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Ihe kacha enye anyị ọṅụ bụ na anyị na Chineke dị ná mma. Obi dị anyị otú ahụ ọ dị Devid, bụ́ onye ji abụ too Jehova n’agbanyeghị na ọ gbapụrụ n’obodo ya. Ọ bụrụ abụ, sị: “N’ihi na obiọma gị dị mma karịa ndụ, egbugbere ọnụ m ga-aja gị mma. N’ihi ya, m ga-agọzi gị ụbọchị ndụ m niile.” (Ọma 63:3, 4) Ọ bụrụgodị na ihe na-esiri anyị ike, iji ọṅụ na-abụku Chineke abụ otuto na-eme ka obi dị anyị mma.

11. Olee ihe mere anyị ji kwesị iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi?

11 Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!” (Fil. 4:4) Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi? Ọ bụ n’ihi ihe Setan kwuru banyere ọbụbụeze Jehova. Setan kwuru na o nweghị onye na-eji obi ya dum efe Chineke. (Job 1:9-11) Ọ bụrụ na anyị na-ejere Jehova ozi naanị ka anyị wee mezuo iwu, àjà otuto anyị na-achụrụ ya ezughị ezu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe otu ọbụ abụ gwara anyị mgbe ọ sịrị: “Jirinụ ọṅụ jeere Jehova ozi. Jirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.” (Ọma 100:2) Ozi ọ bụla anyị ji ọṅụ na obi dum na-ejere Chineke na-ewetara ya otuto.

12, 13. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị enwee nkụda mmụọ?

12 N’agbanyeghị nke a, o doro anya na anyị, bụ́ ndị ji obi ha dum na-ejere Jehova ozi, nwere ike inwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ, bụ́ nke ga-eme ka o siere anyị ike iji ọṅụ na-ejere ya ozi. (Fil. 2:25-30) Gịnị ga-enyere anyị aka ma anyị nwee nkụda mmụọ? Ndị Efesọs 5:18, 19 sịrị: “Na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ, jirinụ abụ ọma na ito Chineke na abụ ime mmụọ na-agwa ibe unu okwu, na-abụ abụ ma na-agụ egwú olu ụtọ n’obi unu nye Jehova.” Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe a e kwuru n’amaokwu ndị a?

13 Ọ bụrụ na anyị enwee nkụda mmụọ, anyị nwere ike ikpeku Jehova ekpere ka o nyere anyị aka ma gbaa mbọ na-atụgharị uche n’ihe ndị kwesịrị otuto. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6-9.) Ụfọdụ achọpụtala na ha na-enwe obi ụtọ ma na-echefu ihe na-enye ha nsogbu ma ọ bụrụ na ha esoro na-abụ abụ Alaeze ka ngwá egwú na-akpọ ya. Otu nwanna nwoke nwere nsogbu nke na-emekarị ka ọ na-enwe nkụda mmụọ kwuru, sị: “E wezụga na m na-ekpe ekpere mgbe niile, m bu abụ Alaeze anyị ụfọdụ n’isi. Obi na-adị m mma mgbe m na-abụku Jehova abụ otuto ndị a dị ụtọ, ma m̀ na-abụpụta ha abụpụta ma m̀ na-abụ ha n’obi m. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka e wepụtara akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. N’afọ ya ọzọ, agụrụ m akwụkwọ ahụ ugboro abụọ site n’isi ruo ná ngwụcha. O mere ka ahụ́ ruo m ala. Ama m na Jehova gọziri mbọ niile a m gbara iji kwụsị inwe nkụda mmụọ.”

“Ihe Nkekọ nke Bụ́ Udo”

14. Olee otu n’ime ihe ndị e ji ama udo nke mmụọ nsọ na-enye?

14 Ụmụnna ndị si ná mba dị iche iche na-enwe obi ụtọ ka ha na ụmụnna ha na-akpakọrịta ná mgbakọ mba niile. Nke a na-egosi na ndị Chineke dị n’otu n’ụwa niile, bụ́kwanụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka ha dịrị n’udo. Ọ na-eju ndị mmadụ anya ma ha hụ ka ndị ha tụrụ anya na ha kwesịrị ịdị n’iro “na-agbasi mbọ ike ka [ha] nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Efe. 4:3) Ọ bụrụ na anyị echeta mbọ ọtụtụ ndị na-agba iji hụ na ha na ibe ha dị n’otu otú a, anyị ga-ekweta na ịdị n’otú a pụrụ iche n’eziokwu.

15, 16. (a) Olee ihe a kụziiri Pita mgbe ọ bụ nwata, oleekwa nsogbu nke a mere ka o nwee? (b) Olee otú Jehova si nyere Pita aka ịgbanwe otú o si ele ndị Jentaịl anya?

15 Ọ dịghị mfe ndị si n’ebe dị iche iche ịdị n’otu. Iji ghọta mbọ ọtụtụ ndị na-agba ka ha na ibe ha dị n’otu, ka anyị tụlee otu ihe atụ e nwere na narị afọ mbụ, ya bụ, ihe banyere Pita onyeozi. Ihe o kwuru na-egosi otú o si were ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. Ọ sịrị: “Unu maara nke ọma na iwu akwadoghị ka onye Juu na onye agbụrụ ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụ ka ọ bịa ya nso; n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gosiri m na ekwesịghị m ịkpọ mmadụ ọ bụla onye rụrụ arụ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha.” (Ọrụ 10:24-29; 11:1-3) N’ihi otú ọtụtụ ndị si ele ihe anya n’oge ahụ, ikekwe ọ bụ mgbe Pita bụ nwata ka a kụziiri ya na Iwu ji ya ịhụ naanị ndị Juu ibe ya n’anya. Ọ ga-abụ na o chere na ndị Jentaịl bụ ndị iro o kwesịrị ịkpọ asị. *

16 Chegodị otú ọ ga-abụ na ọ dị Pita mgbe ọ bara n’ụlọ Kọnịliọs. Nwoke a na-elebu ndị Jentaịl anya ọjọọ na ndị Jentaịl hà nwere ike ịbụ ndị “e jikọrọ ọnụ n’otu” “n’ihe nkekọ nke bụ́ udo”? (Efe. 4:3, 16) Ha nwere ike, n’ihi na ọ dịbeghị anya mmụọ nsọ mere ka Pita gbanwee otú o si ele ndị Jentaịl anya ma kwụsị ịkpọ ha asị. Jehova mere ka o doo ya anya n’ọhụụ na ọ bụghị agbụrụ mmadụ ma ọ bụ ebe mmadụ si ga-ekpebi otú Chineke ga-esi na-ele onye ahụ anya. (Ọrụ 10:10-15) Ọ bụ ya mere Pita ji gwa Kọnịliọs, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Pita gbanwere otú o si ele ndị Jentaịl anya, nke mere ka ya na “òtù ụmụnna dum” dị n’otu.—1 Pita 2:17.

17. Olee otú ịdị n’otu e nwere n’etiti ndị Chineke si pụọ iche?

17 Ihe a a kọrọ banyere Pita na-eme ka anyị ghọta mgbanwe pụrụ iche ndị Chineke na-eme. (Gụọ Aịzaya 2:3, 4.) Ọtụtụ nde “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta” agbanweela otú ha si eche echiche ma mee ka o kwekọọ “n’uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Mkpu. 7:9; Rom 12:2) E nwere mgbe ọtụtụ n’ime ha kpọrọ ndị ọzọ asị, na-ebu iro, na-akpakwa ókè, bụ́cha ihe ndị e ji mara ụwa Setan. Ma, Okwu Chineke ha na-amụ na mmụọ nsọ emeela ka ha “na-achụso ihe na-eweta udo.” (Rom 14:19) Otú ha si dịrị n’otu na-ewetara Chineke otuto.

18, 19. (a) Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi mee ka ọgbakọ dịrị n’udo ma dịrị n’otu? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi mee ka ndị Chineke dịrị n’udo ma dịrị n’otu? N’ọtụtụ ọgbakọ e nwere taa, e nwere ndị si mba ọzọ nọ na ha. Ụfọdụ n’ime ha nwere omenala dị iche na nke anyị, asụsụ ha dịkwa iche. Ànyị na-agba mbọ ka anyị mara ha nke ọma? Okwu Chineke gwara anyị ka anyị na-eme nke a. Mgbe Pọl na-edegara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ, nke ndị nọ na ya bụ ma ndị Juu ma ndị Jentaịl, o dere, sị: “Na-anabatanụ ibe unu, dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị, ka e wee nye Chineke otuto.” (Rom 15:7) È nwere onye nọ n’ọgbakọ unu nke i nwere ike ịgba mbọ mata nke ọma?

19 Gịnị ọzọ ka anyị ga-eme ka Chineke wee nye anyị mmụọ nsọ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ, bụ́ ebe anyị ga-atụle ihe ndị ọzọ sọ ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Mkpụrụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ma “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” ma “mkpụrụ egbugbere ọnụ,” bụ́cha àjà Ndị Kraịst na-achụrụ Chineke mgbe ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze.—Hib. 13:15.

^ par. 15 Levitikọs 19:18 sịrị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” Ndị ndú okpukpe ndị Juu na-ekwu na “ụmụ ndị gị” na “mmadụ ibe gị” bụ naanị ndị Juu. Iwu Mozis gwara ụmụ Izrel ka ha na ndị mba ọzọ ghara ịna-emekọrịta ihe. Ma, ọ kwadoghị ihe ahụ ndị ndú okpukpe na-ekwu na narị afọ mbụ, ya bụ na ndị niile na-abụghị ndị Juu bụ ndị iro e kwesịrị ịkpọ asị.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi ụmụnna anyị ụdị ịhụnanya nke nwere ike ime ka anyị dị njikere ịnwụchitere ha ọnwụ ma ọ dị mkpa?

• Gịnị mere anyị ji kwesị iji ọṅụ na-ejere Chineke ozi?

• Olee otú anyị ga-esi mee ka ọgbakọ dịrị n’udo ma dịrị n’otu?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe dị na peeji nke 21]

“Ndị a Bụ Ezigbo Ndị Kraịst”

N’otu akwụkwọ e dere banyere Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị na Nuyingọme, e dere ihe otu nwa okorobịa onye Juu a tụrụ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ahụ kwuru banyere Ndịàmà Jehova ya na ha nọrọ n’ogige ahụ, sị:

“Ozugbo anyị bụ́ ndị Juu si Dakawụ batara ebe ndị Juu nọ, ndị Juu ndị ọzọ malitere izo ihe ndị ha nwere n’ihi na ha achọghị inyetụ anyị ihe ọ bụla. . . . Ma, tupu anyị abata n’ogige ịta ahụhụ ahụ, anyị na-enyerịtara ibe anyị aka. Ma ebe a anyị nọ n’ọnụ ọnwụ, onye ọ bụla na-eche banyere onwe ya, ọ chọghị ịma banyere ndị ọzọ. Ma, Ndị Mmụta Baịbụl mere ihe dị iche. N’oge ahụ, a na-amanye ha ịrụ ọrụ siri ike, dị ka ịrụzi paịpụ mmiri ndị mebiri emebi. N’agbanyeghị na oyi na-atụ, ha na-anọ na mmiri na-ajụ oké oyi site n’ụtụtụ ruo n’abalị. O nweghị onye ma otú ha si edi ihe a niile. Ha sịrị na Jehova na-enye ha ike ha ji edi ahụhụ ha na-ata. Bred dị ha mkpa otú o si dị anyị n’ihi na ezigbo agụụ na-agụ ha. Ma, gịnị ka ha na-eme ma e nye ha bred? Ha na-ewekọta bred niile e nyere ha, kee ha ụzọ abụọ wee taa otu ụzọ, ma nye ụmụnna ha ndị ka si Dakawụ bịa nke ọzọ. Ha na-anabata ha nke ọma, sutụkwa ha ọnụ. Ha na-ekpe ekpere tupu ha erie nri. Afọ na-eju ha ma ha richaa, obi na-adịkwa ha ụtọ. Ha na-ekwu na agụụ anaghịzi agụ ha. Ọ bụ mgbe ahụ ka m gwara onwe m, sị: Ndị a bụ ezigbo Ndị Kraịst.”

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ị̀ na-esi n’ihe ndị ị na-eme ewepụta oge kwa ụbọchị ka i wee bịaruo Jehova nso?