Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ụwa Ndị Na-anaghị Eme Ihe n’Eziokwu Juru

Otú Ị Ga-esi Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ụwa Ndị Na-anaghị Eme Ihe n’Eziokwu Juru

Otú Ị Ga-esi Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ụwa Ndị Na-anaghị Eme Ihe n’Eziokwu Juru

NDỊ na-anaghị eme ihe n’eziokwu juru ebe niile ka ikuku. E nwere ndị ụgha, ndị na-aghọgbu ndị mmadụ anara ha ego karịrị akarị, ndị ohi, ndị na-anaghị akwụ ụgwọ ha ji, na ndị wayo. Ebe ndị dị otú a gbara anyị gburugburu, ọ na-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ime ihe n’eziokwu. Olee otú anyị ga-esi nọgide na-eme ihe n’eziokwu? Ka anyị tụlee ihe atọ ga-enyere anyị aka ime nke a. Ha bụ, ịtụ egwu Jehova, inwe akọnuche dị ọcha, na ihe mmadụ nwere iju ya afọ.

Ịtụ Egwu Jehova

Aịzaya onye amụma dere, sị: “Jehova bụ Onyeikpe anyị, Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ Eze anyị.” (Aịza. 33:22) Ọ bụrụ na anyị echeta na Jehova bụ ihe ndị a, ọ ga-eme ka anyị na-atụ egwu imejọ ya, nke a ga-emekwa ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị abụ ndị na-anaghị eme ihe n’eziokwu. Ilu 16:6 kwuru, sị: “Egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ hapụ ihe ọjọọ.” Ụdị egwu a abụghị ụdị egwu a na-atụ Chineke ka ọ ghara imesi anyị ike, kama ọ bụ na anyị achọghị ime ihe ga-ewute Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma.—1 Pita 3:12.

E nwere otu ihe merenụ nke na-egosi otú ụdị egwu a si eme ka mmadụ na-eme ihe n’eziokwu. Ricardo na nwunye ya bụ́ Fernanda, dọọrọ ihe ha ka narị dọla asaa n’ego ha dewere n’ụlọ akụ̀. * Fernanda tinyere ego ahụ n’akpa n’agụghị ya agụ. Mgbe ha laruru, ka ha kwụchara ụgwọ ụfọdụ ha ji, ọ tụrụ ha n’anya na ego fọrọnụ ka hà ka ego ha dọọrọ n’ụlọ akụ̀. Ha kwuru na ọ ga-abụ na onye na-akwụ ụgwọ n’ụlọ akụ̀ nyefere ha ego. Obi ha gwara ha ka ha ghara iweghachi ya ebe ha ka nwere ọtụtụ ụgwọ ha ga-akwụ. Ricardo kwuru, sị: “Anyị rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị obi anyị ga-eji weghachi ego ahụ. Ọchịchọ anyị chọrọ ime ihe na-amasị ya na ihe e dere n’Ilu 27:11, bụ́kwanụ nke anyị chọrọ ime, mere ka anyị weghachi ego ahụ.”

Inwe Akọnuche E Ji Baịbụl Zụọ

Anyị ga-azụ akọnuche anyị ma ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl ma gbaa mbọ na-eme ihe anyị mụtara. Ọ bụrụ na anyị na-eme nke a, ‘okwu Chineke, bụ́ nke dị ndụ ma na-akpa ike,’ ga-eru anyị n’uche na n’obi. Nke a ga-eme ka anyị “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Hib. 4:12; 13:18.

Tụlee ihe banyere João. O ji ụgwọ hiri nne, ihe ruru puku dọla ise. Ma, ọ kwagara obodo ọzọ n’akwụghị ụgwọ o ji. Mgbe afọ asatọ gachara, João natara eziokwu, akọnuche ya e ji Baịbụl na-azụ mekwara ka ọ bịakwute onye o ji ụgwọ wee kwụọ ụgwọ o ji ya. Ebe ọ bụ na João nwere nwunye na ụmụ anọ o ji obere ego ọ na-enweta enye nri, onye ahụ o ji ụgwọ kwere ka ọ na-akwụ ya obere obere kwa ọnwa.

Inwe Afọ Ojuju

Pọl onyeozi dere, sị: “Nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu. . . . Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Tim. 6:6-8) Ọ bụrụ na anyị emee ihe a a dụrụ anyị n’ọdụ, ọ ga-eme ka anyị ghara itinye aka n’achụmnta ego ndị a na-enyo enyo ma ọ bụkwanụ ndị nke zụọ taa baa echi. (Ilu 28:20) Anyị mee ihe a Pọl dụrụ anyị n’ọdụ, anyị ga-ebute Alaeze Chineke ụzọ, obi ga-esikwa anyị ike na a ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị.—Mat. 6:25-34.

Ma, n’ihi “ike dị aghụghọ nke akụnụba,” anyị ekwesịghị iche na anyị enweghị ike ịbụ ndị anyaukwu. (Mat. 13:22) Cheta otu nwoke a na-akpọ Ekan. Ọ hụrụ mgbe Chineke rụụrụ ụmụ Izrel ọrụ ebube wee mee ka ha gafee Osimiri Jọdan. N’agbanyeghị nke a, o nwere anyaukwu, akpịrị ogologo emeekwa ka o zuru ụfọdụ ọlaọcha na ọlaedo na uwe ndị dị oké ọnụ ahịa n’ihe ndị e kwesịrị ibibi na Jeriko. Nke ahụ tara isi ya. (Jọsh. 7:1, 20-26) Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji dọọ anyị aka ná ntị n’oge ọ bịara n’ụwa, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.”—Luk 12:15.

Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ebe Ị Na-arụ Ọrụ

Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịnọgide na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile. Otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi na anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ebe anyị na-arụ ọrụ bụ ma anyị “ghara ịdị na-ezu ohi,” ọ bụrụgodị na e nwere ọtụtụ ndị na-ezu ohi. (Taị. 2:9, 10) Jurandir, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti, na-ekwu eziokwu mgbe ọ na-ede ego ole o ji gbaa ụgbọ. Ma, ndị ọrụ ibe ya na-ede ihe karịrị ihe ha mefuru. Ha na-eme otú a n’ihi na onyeisi ọrụ ha na-ekwe ka ha na-eme ya. E nwedịrị mgbe onyeisi ọrụ ha ahụ baara Jurandir mba n’ihi na ọ na-eme ihe n’eziokwu, kwụsịkwa iziga ya ọrụ ebe ọ ga-agba ụgbọ aga. Ma, ka oge na-aga, e nyochara ihe ndekọ ego nke ụlọ ọrụ ahụ, a jakwara Jurandir mma n’ihi na ọ na-eme ihe n’eziokwu. E bulikwara ya n’ọkwá.

Onye André na-erere ahịa gwara ya ka o jiri aghụghọ na-ana ndị mmadụ ego ugboro abụọ. Nwanna anyị nwoke a kpekuru Jehova ekpere ka o mee ka ọ kata obi mee ihe Baịbụl kwuru. (Ọma 145:18-20) Ọ gbalịrị ka ọ gwa onye ahụ ọ na-erere ahịa ihe mere na ọ gaghị eme ihe ọ sịrị ya mee, ma o kweghị. Nke a mere ka André kpebie ịgba arụkwaghịm n’ọrụ ahụ nke na-enye ya ezigbo ego. Ma, mgbe ihe dị ka otu afọ gafere, onye ahụ weburu ya n’ọrụ kpọrọ ya ka ọ bịaghachi rụwara ya ọrụ, kwekwa ya nkwa na ha anaghịzi ana ndị ahịa ha ihe karịrị ihe ha kwesịrị ịkwụ. E buliri André n’ọkwá, ya aghọọ manịja.

Kwụọ Ụgwọ I Ji

Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla.” (Rom 13:8) Anyị nwere ike ịchọ ihe anyị ga-akụdo aka ghara ịkwụ ụgwọ anyị ji site n’ikwu na onye ahụ anyị ji ụgwọ bara ọgaranya, n’ihi ya, ego ahụ adịghị ya mkpa. Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye ajọ omume na-agbaziri ihe ma ọ dịghị akwụghachi ya.”—Ọma 37:21.

Ma, gịnị ma ọ bụrụ na “ihe a na-atụghị anya ya” emee ka anyị ghara ịkwụ ụgwọ anyị ji? (Ekli. 9:11) Francisco biiri Alfredo ihe ha ka puku dọla asaa iji kwụọ ụgwọ ụlọ o bi. Ma n’ihi nsogbu ego o nwere, ọ kwụlighị ụgwọ ahụ mgbe o kwesịrị. Francisco gakwuuru Alfredo ka ha kwurịta ya, Alfredo kwekwara ka ọ kwụọ ya ụgwọ ahụ ntakịrị ntakịrị.

Emela Ka Ị Bụ Ihe Ị Na-abụghị

Cheta ihe àgwà ọjọọ Ananayas na Safaịra, bụ́ di na nwunye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ kpatara. Ha rere ala ha ma wetara ndịozi ụfọdụ n’ihe ha retara ma gwa ha na ọ bụ ihe niile ha retara ka ha wetara. Ha chọrọ ime ka ndị ọzọ too ha na ha na-emesapụ aka nke ukwuu. Ma, Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka Pita onyeozi mee ka a mata ihe ha mere, Jehova gbukwara ha.—Ọrụ 5:1-11.

Ndị dere Baịbụl mere ihe dị iche n’ihe Ananayas na Safaịra mere, ha kwuru eziokwu. Mozis ezoghị ọnụ n’ikwu mgbe o were iwe ọkụ, bụ́ nke mere ka ọ ghara ịba n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:7-13) N’otu aka ahụ, Jona ekpuchighị ebe ọ na-emeteghị, ma tupu ya agaa ikwusa ozi ọma na Ninive ma mgbe o kwusachara. Kama nke ahụ, o dere ha ede.—Jona 1:1-3; 4:1-3.

N’eziokwu, mmadụ ga-akata obi ka o wee nwee ike ikwu eziokwu, dị ka ihe mere Nathalia, bụ́ onye dị afọ iri na anọ, n’ụlọ akwụkwọ na-egosi. Mgbe ọ lọtara n’ụlọ, ọ gụgharịrị ule ha lere ma chọpụta na e nwere ebe ya na-emeghị nke ọma ma onye nkụzi ha edee na ya mere nke ọma n’amaghị ama. N’agbanyeghị na ọ ma na nke a ga-eme ka akara ule ya gbadaa, o gbughị oge ịgwa onye nkụzi ha. O kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-agwa m mgbe niile na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe na-amasị Jehova, m ga na-eme ihe n’eziokwu. Obi m gaara ama m ikpe ma ọ bụrụ na agwaghị m onye nkụzi m ihe ahụ. Onye nkụzi ahụ jara Nathalia mma n’ihi na ọ na-eme ihe n’eziokwu.

Anyị Ga-ewetara Jehova Otuto Ma Anyị Na-eme Ihe n’Eziokwu

Giselle, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, hụrụ obere akpa nke ihe ruru dọla iri atọ na ise na akwụkwọ dị n’ime ya. O si n’aka ndị isi ụlọ akwụkwọ ya weghachiri onye nwe akpa ahụ akpa ya. Mgbe otu ọnwa gachara, osote onyeisi ụlọ akwụkwọ ha gụụrụ ndị klas ha akwụkwọ ozi nke e ji jaa Giselle mma maka na o mere ihe n’eziokwu, jaakwa ezinụlọ ya na okpukpe ya mma maka otú e si zụọ ya nke ọma. “Ọrụ ọma” ya wetaara Jehova otuto.—Mat. 5:14-16.

Ọ dịghị mfe ime ihe n’eziokwu n’ihi na ndị gbara anyị gburugburu bụ ‘ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, na ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe.’ (2 Tim. 3:2) Ma, ịtụ egwu Jehova, inwe akọnuche e ji Baịbụl zụọ, na inwe afọ ojuju ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eme ihe n’eziokwu n’ụwa a ndị na-anaghị eme ihe n’eziokwu juru. Nke a ga-emekwa ka anyị na Jehova, bụ́ ‘onye ezi omume na onye hụrụ ezi omume n’anya,’ dịrị n’ezigbo mma.—Ọma 11:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Aha ndị a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Jehova, nke a ga-eme ka anyị na-eme ihe n’eziokwu

[Foto dị na peeji nke 8]

Anyị ga-ewetara Jehova otuto ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe n’eziokwu