Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Kacha Mkpa Ná Ndụ Gị?

Ònye Kacha Mkpa Ná Ndụ Gị?

Ònye Kacha Mkpa Ná Ndụ Gị?

“Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—ỌMA 83:18.

1, 2. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị, gịnị mere na o zughị ezu ịma naanị aha Chineke?

IKEKWE mgbe mbụ ị hụrụ aha Chineke bụ mgbe e gosiri gị ya n’Abụ Ọma 83:18. Ọ ga-abụ na o juru gị anya mgbe ị gụrụ, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Kemgbe ahụ, o doro anya na i jila amaokwu Akwụkwọ Nsọ a nyere ndị ọzọ aka ka ha mara Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova.—Rom 10:12, 13.

2 N’agbanyeghị na ndị mmadụ kwesịrị ịma aha Chineke, ọ bụghị naanị aha ya ka ha kwesịrị ịma. Ọbụ abụ ahụ kwuru ihe ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ịma ka e wee zọpụta anyị mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” N’eziokwu, ọ bụ Jehova kacha mkpa n’eluigwe na n’ụwa. Ebe ọ bụ ya kere ihe niile, o ruru eru ịchọ ka ihe niile o kere rubere naanị ya isi. (Mkpu. 4:11) N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ònye kacha mkpa ná ndụ m?’ Anyị kwesịrị ichebara azịza nke ajụjụ a echiche nke ọma!

Esemokwu E Nwere n’Ogige Iden

3, 4. Olee ihe mere ka Setan nwee ike iduhie Iv, gịnịkwa ka nke a kpatara?

3 Ihe mere n’ogige Iden gosiri na ajụjụ ahụ dị mkpa. N’ogige Iden, otu mmụọ ozi nke nupụụrụ Chineke isi, onye e mechara kpọwa Setan bụ́ Ekwensu, ratara nwaanyị mbụ ahụ bụ́ Iv ka o bute ọdịmma onwe ya ụzọ kama ime ihe Jehova kwuru, bụ́ ka ha ghara iri mkpụrụ si n’otu osisi. (Jen. 2:17; 2 Kọr. 11:3) O kwere ka Setan jiri mkpụrụ osisi ahụ rata ya, si otú a gosi na ya anaghị erubere ọchịchị Jehova isi. Iv ekwetaghị na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ ya. Ma, olee ihe mere ka Setan nwee ike iduhie Iv?

4 Setan ji ụzọ aghụghọ dị iche iche gwa Iv okwu mgbe ha abụọ na-akparịta ụka. (Gụọ Jenesis 3:1-5.) Nke mbụ bụ na Setan akpọghị Jehova, nke bụ́ aha Chineke, mgbe ọ na-agwa Iv okwu. Naanị ihe ọ kpọrọ ya bụ “Chineke.” Ma, onye dere akwụkwọ Jenesis dere aha Chineke, ya bụ Jehova, n’amaokwu mbụ nke Jenesis isi atọ. Nke abụọ bụ na kama Setan ikwu banyere “iwu” Chineke nyere, naanị ihe ọ jụrụ Iv bụ banyere ihe Chineke “kwuru.” (Jen. 2:16) Ọ ga-abụ na Setan chọrọ iji ụzọ aghụghọ a mee ka o chee na iwu Chineke adịchaghị mkpa. Nke atọ bụ na n’agbanyeghị na ọ bụ Iv ka Setan na-agwa okwu, ihe o kwuru bụ “unu.” O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kwuo nke a bụ ka o mee ka Iv chewe na ya dị mkpa, dị ka à ga-asị na ọ bụ ya na-ekwuchite ọnụ ya na di ya. Gịnị ka nke a kpatara? Ọ ga-abụ na Iv ji mpako kwuchite ọnụ ya na di ya mgbe ọ gwara agwọ ahụ, sị: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a.”

5. (a) Gịnị ka Setan mere ka Iv na-eche banyere ya? (b) Gịnị ka mkpụrụ osisi ahụ Iv riri na-egosi banyere ya?

5 Setan ghakwara ụgha. Ihe o kwuru gosiri na Chineke mere ihe na-adịghị mma mgbe ọ gwara Adam na Iv “erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a.” Ihe ọzọ Setan mere bụ ime ka Iv malite iche banyere onwe ya nakwa otú ọ ga-esi mee ka ihe dịkwuoro ya mma, ya adịrị “ka Chineke.” Mbọ niile ọ gbara mere ka Iv na-eche banyere osisi ahụ na mkpụrụ ya, kama iche banyere adịm ná mma ya na Onye nyere ya ihe niile. (Gụọ Jenesis 3:6.) Ọ dị mwute na Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, si otú ahụ gosi na ọ bụghị Jehova kacha mkpa ná ndụ ya.

Esemokwu E Nwere n’Oge Job Dị Ndụ

6. Gịnị ka Setan kwuru na ọ bụ ya mere Job ji na-efe Chineke, gịnịkwa ka a hapụrụ Job ka o mee?

6 Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, nwere ohere ime ka a mata Onye kacha mkpa ná ndụ ya. Mgbe Jehova gwara Setan otú Job si na-eme ihe ziri ezi, Setan jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” (Gụọ Job 1:7-10.) Setan ekwughị na Job anaghị erubere Chineke isi. Kama, ihe ọ na-enyo enyo bụ ihe Job bu n’obi na-efe Chineke. O ji aghụghọ boo Job ebubo na ihe mere o ji na-efe Jehova abụghị na ọ hụrụ ya n’anya, kama ọ bụ n’ihi ihe ọ na-erite n’aka ya. Ọ bụ naanị Job ga-emeli ka a mata na Setan ghara ụgha, a hapụkwara ya ka o mee otú ahụ.

7, 8. Olee ọnwụnwa bịaara Job, gịnịkwa ka otú o si tachie obi na-egosi?

7 Jehova kwere ka Setan wetara Job ọdachi dị iche iche, otu bịapụ ọzọ esochie. (Job 1:12-19) Gịnị ka Job mere oge niile ahụ ọ na-ata ahụhụ? Baịbụl gwara anyị na Job “emehieghị, o kwujọghịkwa Chineke.” (Job 1:22) Ma, Setan akwụsịghị ebe ahụ. O kwukwara, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” * (Job 2:4) Setan kwuru na ọ bụrụ na Job ataa ahụhụ, ọ ga-egosi na Jehova abụghị Onye kacha mkpa ná ndụ ya.

8 E tiri Job ọrịa na-asọ oyi n’ahụ́ ya dum, nwunye ya agwakwa ya ka ọ kọchaa Chineke nwụọ. Mmadụ atọ bịara ịkasi ya obi mechara boo ya ebubo na ọ na-eme ihe ọjọọ. (Job 2:11-13; 8:2-6; 22:2, 3) Ma, ahụhụ a niile Job tara emeghị ka o mehie. (Gụọ Job 2:9, 10.) Otú o si tachie obi gosiri na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ ya. Job gosikwara na ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-ezughị okè, nwere ike igosi na ebubo ahụ Ekwensu boro bụ ụgha otú ha nwere ike.—Tụlee Ilu 27:11.

Otú Jizọs Si Gosi Ebe Ọ Kwụ

9. (a) Olee otú Setan si jiri ihe na-akpa Jizọs nwaa ya? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ nwara ya?

9 Obere oge e mechara Jizọs baptizim, Setan gbara mbọ ịrata ya ka o mee ihe ga-abara naanị onwe ya uru kama ime ihe gosiri na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ ya. Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa atọ. Nke mbụ, o ji ihe ndị na-akpa Jizọs nwaa ya, ọ gwara ya ka o mee ka nkume ghọọ achịcha. (Mat. 4:2, 3) Ezigbo agụụ ji Jizọs n’ihi na ọ ka buchara ọnụ ụbọchị iri anọ. N’ihi ya, Ekwensu gwara ya ka o jiri ikike o nwere ịrụ ọrụ ebube mee ka agụụ na-agụ ya kwụsị. Gịnị ka Jizọs mere? Kama ime ka Iv, ọ gwara Setan ihe e dere n’Okwu Jehova ma jụ ozugbo ime ihe ọ gwara ya.—Gụọ Matiu 4:4.

10. Gịnị mere Setan ji gwa Jizọs ka o si n’elu ihe a rụbichiri ná mgbidi ụlọ nsọ wụda?

10 Setan gbakwara mbọ ịnwa Jizọs ka o gosi onye ọ bụ. Ọ gwara Jizọs ka o si n’elu ihe a rụbichiri ná mgbidi ụlọ nsọ wụda. (Mat. 4:5, 6) Gịnị ka Setan bu n’obi eme ihe a? O kwuru na ọ bụrụ na Jizọs emerụghị ahụ́ ma ọ wụda, ọ ga-egosi na ọ bụ “ọkpara Chineke.” O doro anya na Ekwensu chọrọ ka Jizọs chewe banyere otú ọ ga-esi mee ka a na-anụ aha ya, ka ndị mmadụ mara na ya sokwa biri. Setan ma na nganga nwere ike ime ka mmadụ sọọ anya mee ihe ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ ka ndị mmadụ wee ghara ịkwụsị ịkwanyere ya ùgwù. Setan rọgharịrị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ma, Jizọs gosiri na ya ma Okwu Jehova nke ọma. (Gụọ Matiu 4:7.) Ọjụjụ Jizọs jụrụ ime ihe Setan kwuru gosikwara na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ Jizọs.

11. Gịnị mere Jizọs anaraghị alaeze niile nke ụwa Setan kwere nkwa inye ya?

11 N’ọnwụnwa ikpeazụ kacha taa akpụ Setan nwara Jizọs, o kwere nkwa inye ya alaeze niile nke ụwa. (Mat. 4:8, 9) Jizọs egbughị oge ịjụ ihe a Setan kwere nkwa inye ya. Ọ ghọtara na ọ bụrụ na ya ekwere ime ihe Setan chọrọ, ọ pụtara na ọ jụla ọchịchị Chineke, ya bụ, o kwetaghị na ọ bụ Jehova bụ Onye Kacha Ihe Niile Elu. (Gụọ Matiu 4:10.) Na nke ọ bụla n’ime ọnwụnwa atọ ahụ Setan nwara Jizọs, Jizọs ji amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị aha Chineke dị zaa Setan okwu.

12. Olee mkpebi siri ike Jizọs ga-eme mgbe ọ fọrọ obere ka o jechaa ozi ya n’ụwa, gịnịkwa ka ihe o kpebiri ime na-akụziri anyị?

12 Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs jechaa ozi ya n’ụwa, o nwere otu mkpebi siri ezigbo ike ọ ga-eme. Oge niile ọ na-eje ozi, o gosiri na ya dị njikere iji ndụ ya chụọ àjà. (Mat. 20:17-19, 28; Luk 12:50; Jọn 16:28) N’agbanyeghị nke a, Jizọs ghọtakwara na a ga-ebo ya ebubo ụgha, ndị ikpe ndị Juu amaa ya ikpe ọnwụ, e gbuokwa ya na o kwuluru Chineke. Ụdị ọnwụ a ọ na-aga ịnwụ churu ya ụra. O kpere ekpere, sị: “Nna m, ọ bụrụ na o kwere omume, ka iko a gabiga m.” O kwukwara, sị: “Ma, ọ bụghị dị ka m si chọọ, kama dị ka i si chọọ.” (Mat. 26:39) Otú Jizọs si rubere Chineke isi ruo ọnwụ gosiri n’eziokwu Onye kacha mkpa ná ndụ ya!

Ebe Anyị Kwụ n’Esemokwu Ahụ

13. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe anyị tụlere banyere Iv, Job, na Jizọs Kraịst?

13 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe a niile anyị tụlerela? N’ihe anyị kọrọ banyere Iv, anyị mụtara na ọ bụrụ na mmadụ adịrị anyaukwu ma ọ bụ chọọ ka a na-anụ aha ya, ọ na-egosi na ọ bụghị Jehova kacha mkpa ná ndụ ya. Ma, ihe anyị tụlere banyere otú Job si nọgide na-eme ihe ziri ezi na-akụziri anyị na ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-ezughị okè, nwedịrị ike igosi na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ ha ma ọ bụrụ na ha atachie obi mgbe ihe na-esiri ha ike, ọbụna mgbe ha na-aghọtachaghị ihe mere ha ji na-ata ahụhụ. (Jems 5:11) Nke ikpeazụ bụ na ihe a kọrọ banyere Jizọs na-akụziri anyị na anyị ga-adị njikere ka e mee anyị ihe ihere, ọ bụghị ịna-eche banyere aha anyị. (Hib. 12:2) Ma, olee otú anyị ga-esi na-eme ihe ndị a?

14, 15. Olee otú ihe Jizọs mere mgbe a nwara ya ọnwụnwa si dị iche n’ihe Iv mere, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs? (Kọwaa ihe osise dị na peeji nke 18.)

14 Ekwela ka ọnwụnwa mee ka i chefuo Jehova. Iv kwere ka ọnwụnwa bịaara ya megharịa ya anya. Ọ hụrụ na mkpụrụ osisi ahụ “dị mma oriri nakwa na ọ na-agụsi anya agụụ ike, ee, osisi ahụ mara mma ile anya.” (Jen. 3:6) Ma, Jizọs emeghị ka Iv n’ọnwụnwa atọ ahụ a nwara ya. O kweghị ka ọnwụnwa nke ọ bula mee ka o chefuo ihe inupụrụ Chineke isi ga-akpata. O kwuru ihe e dere n’Okwu Chineke, o jikwara aha Chineke, nke bụ́ Jehova, mee ihe.

15 Olee ebe obi anyị na-adị ma a chọọ ka anyị mee ihe Jehova kpọrọ asị? Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ọnwụnwa ahụ, ọ ga-adị anyị ka ọ̀ bụ anyị mee ihe ahụ. (Jems 1:14, 15) Anyị kwesịrị ime ihe ozugbo kwụsị iche banyere ihe ahụ, ya bụ, ghụpụ ma ọ bụ gbujipụ akụkụ ahụ́ anyị dị ka e nwere ike isi kwuo ya. (Mat. 5:29, 30) Anyị kwesịrị ịna-eche banyere ihe ihe anyị mere ga-akpata otú ahụ Jizọs mere, ya bụ, ihe ihe anyị mere ga-eme adịm ná mma anyị na Jehova. Anyị kwesịrị icheta ihe Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kwuru. Ọ bụ naanị mgbe anyị mere nke a ka anyị ga-egosi na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ anyị.

16-18. (a) Gịnị nwere ike ime ka obi jọọ anyị njọ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka idi ahụhụ anyị na-ata?

16 Ekwela ka ọdachi ndị bịaara gị mee ka ị na-eweso Jehova iwe. (Ilu 19:3) Ka ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a na-eru nso, ọtụtụ ndị na-efe Jehova ga na-enwe ọdachi na ihe isi ike dị iche iche. Anyị anaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube chebe anyị n’oge a. Ma, ọ bụrụ na ndị anyị hụrụ n’anya anwụọ ma ọ bụkwanụ anyị enwee ihe isi ike ndị ọzọ, obi nwere ike ịjọ anyị njọ otú ahụ ọ jọrọ Job.

17 Job aghọtaghị ihe mere Jehova ji kwe ka ihe ụfọdụ mee, mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike anyị agaghị aghọta ihe mere ọdachi ji bịara anyị. Ma eleghị anya, anyị anụla banyere ụmụnna ndị ala ọma jijiji ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ na-emere onwe ha gburu, dị ka o mere ụmụnna bi na Heiti. Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike ịma otu nwanna nke ji obi ya dum na-efe Jehova, onye a rụsara arụrụala ma ọ bụkwanụ onye nwụrụ n’ihe ọghọm. O nwekwara ike ịbụ na anyị na-ata ahụhụ ma ọ bụkwanụ na e kpere anyị ikpe na-ezighị ezi. Ahụhụ anyị na-ata nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: ‘Jehova, gịnị mere ihe a ji na-eme m? M̀ mere gịnị?’ (Hab. 1:2, 3) Gịnị ga-enyere anyị aka idi ụdị ihe a ma ha bịara anyị?

18 Anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara ichewe na ihe na-eme anyị na-egosi na anyị na Jehova adịghịzi ná mma. Jizọs kwutere okwu nke a mgbe ọ na-ekwu banyere ọdachi abụọ mere n’oge ọ nọ n’ụwa. (Gụọ Luk 13:1-5.) Ihe na-akpata ọtụtụ ahụhụ bụ “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.” (Ekli. 9:11) Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara ahụhụ anyị na-ata, anyị ga-edi ya ma ọ bụrụ na anyị enwee obi ike na “Chineke nke nkasi obi niile” ga-enyere anyị aka. Ọ ga-enye anyị ume anyị ga-eji nọgide na-ejere ya ozi.—2 Kọr. 1:3-6.

19, 20. Gịnị nyeere Jizọs aka idi ihe ihere ndị e mere ya, gịnịkwa nwere ike inyere anyị aka idi ihe ihere?

19 Ekwela ka nganga ma ọ bụ ka a ghara imenye gị ihere mee ka ị ghara ime ihe ziri ezi. Ihe mere Jizọs ji nwee ike ‘ime onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu’ bụ n’ihi na ọ dị umeala n’obi. (Fil. 2:5-8) Ihe mere o ji dilie ọtụtụ ihe ihere e mere ya bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (1 Pita 2:23, 24) Jizọs si otú a bute ime uche Jehova ụzọ, bụ́ nke mere ka e bulie ya n’ọkwá. (Fil. 2:9) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dịrị umeala n’obi.—Mat. 23:11, 12; Luk 9:26.

20 Mgbe ụfọdụ, ule ụfọdụ na-abịara anyị nwere ike imenye anyị ihere. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike otú o siri Pọl onyeozi, bụ́ onye sịrị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka m na-atakwa ahụhụ ndị a, ma ihere adịghị eme m. N’ihi na amaara m onye m kweere na ya, enwekwara m obi ike na o nwere ike iche ihe m nyefere n’aka ya nche ruo ụbọchị ahụ.”—2 Tim. 1:12.

21. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’agbanyeghị na àgwà e ji mara ụwa bụ ibute ọdịmma onwe ha ụzọ?

21 Baịbụl buru amụma na n’oge anyị a ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:2) Ọ bụ ya mere ndị na-ebute ọdịmma onwe ha ụzọ ji gbaa anyị gburugburu. Ka anyị jisie ike ghara ịdị ka ha. Kama nke ahụ, ka anyị niile gbalịsie ike gosi na Jehova bụ n’eziokwu Onye kacha mkpa ná ndụ anyị, ma à na-anwa anyị ọnwụnwa, ma ànyị nwere ọdachi, ma à na-emenye anyị ihere!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na okwu ahụ bụ́ “akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́” nwere ike igosi na Job ga-ahapụ ụmụ ya na ụmụ anụmanụ ya ka ha nwụọ, ọ bụrụhaala na yanwa ga-adị ndụ. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe okwu ahụ pụtara bụ na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịdị ndụ, ọ ga-adị njikere ịghụpụ ma ọ bụ igbujipụ akụkụ ahụ́ ya ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike iji aka ya gbochie ihe a chọrọ iti ya n’isi, si otú a nye akpụkpọ ahụ́ ya ụfọdụ n’ọnọdụ ụfọdụ. Ihe ọ sọrọ akpaala okwu ahụ ya pụta, o doro anya na ọ na-egosi na Job ga-eji obi ụtọ hapụ ihe niile ọ bụrụhaala na ime otú a ga-eme ka ọ dịrị ndụ.

Gịnị Ka Anyị Na-amụta . . .

• n’otú Setan si duhie Iv?

• n’ihe Job mere mgbe ọdachi bịaara ya?

• n’otú ime uche Jehova ji bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ Jizọs?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Iv ebuteghị adịm ná mma ya na Jehova ụzọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Jizọs ekweghị ka Setan nwata ya, ihe bụ́ mkpa ya bụ ime uche Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ebe a na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ntu ruo n’ụlọ ntu mgbe ala ọma jijiji mechara na Heiti

Mgbe e nwere ọdachi, anyị nwere ike ịtụkwasị “Chineke nke nkasi obi niile” obi na ọ ga-enyere anyị aka