Ịtụkwasị Jehova Obi Kpamkpam Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike
Ịtụkwasị Jehova Obi Kpamkpam Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike
“Jehova ga-anụ mgbe m kpọkuru ya.”—Ọma 4:3.
1, 2. (a) Olee ihe isi ike Devid nwere? (b) Olee abụ ọma ndị anyị ga-atụle?
EZE DEVID achịala Izrel ruo ọtụtụ afọ, ma ugbu a, ọ nọ n’ezigbo nsogbu. Nwa ya nwoke bụ́ Absalọm, onye nọ na-akpa nkata ịnaghara ya ọchịchị, ekwuola na ọ bụ ya bụzi eze, Devid wee gbapụ na Jeruselem. Onye ndụmọdụ ya ọ tụkwasịrị obi agbaala ya mgba okpuru, ọ bụzi mmadụ ole na ole dụnyeere ya. Ọ nọ na-ebe ákwá ka ọ gba ụkwụ ọtọ na-arị Ugwu Oliv. Ihe ọzọ bụ na ka Devid si na Jeruselem na-apụ, Shimiaị, bụ́ nwoke nke si n’ezinụlọ Eze Sọl, malitere ịtụ ya nkume, na-ekpo ya aja, na-akpọkwa ya iyi.—2 Sam. 15:30, 31; 16:5-14.
2 Ihe a niile e mere Devid, ọ̀ ga-eme ka ọ nwụọ ọnwụ mwute na ọnwụ ihere? Mbanụ, ọ bụ nwoke tụkwasịrị Jehova obi. Abụ Ọma nke atọ, bụ́ ebe Devid dere otú o si gbapụ n’ihu Absalọm, gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ bụkwa Devid dere Abụ Ọma nke anọ. Ihe e dere n’Abụ Ọma abụọ a na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke na-anụ ekpere, na-azakwa ekpere. (Ọma 3:4; 4:3) Abụ ọma abụọ a na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova agaghị ahapụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi, ọ ga-akwado ha, mee ka ha nwee udo, obi eruokwa ha ala. (Ọma 3:5; 4:8) N’ihi ya, ka anyị tụlee abụ ọma ndị a ma hụ otú ha si eme ka obi sie anyị ike, nakwa otú ha si eme ka anyị tụkwasị Chineke obi.
Mgbe ‘Ọtụtụ Ndị Biliri Imegide Anyị’
3. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 3:1, 2, olee nsogbu Devid nọ na ya?
3 Otu onye mgbaàmà gwara Devid, sị: “Obi ndị Izrel dịzi n’ebe Absalọm nọ.” (2 Sam. 15:13) Devid nọ na-eche otú Absalọm si melie ka ọtụtụ mmadụ soro ya. Ọ jụrụ, sị: “Jehova, gịnị mere ndị iro m ji dị ọtụtụ? Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-ebili imegide m? Ọtụtụ ndị na-ekwu banyere mkpụrụ obi m, sị: ‘Chineke agaghị azọpụta ya.’” (Ọma 3:1, 2) Ọtụtụ ndị Izrel nọ na-eche na Jehova agaghị anapụta Devid n’aka Absalọm na ndị òtù ya.
4, 5. (a) Olee ihe obi siri Devid ike na Jehova ga-eme? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “Onye na-ebuli isi m elu” pụtara?
4 Ma, Devid ma na o nweghị ihe ga-eme ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ọ bụrụ abụ, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ ọta nke gbara m gburugburu, ebube m na Onye na-ebuli isi m elu.” (Ọma 3:3) Obi siri Devid ike na Jehova ga-echebe ya otú ahụ ọta si echebe onye agha. Ọ bụ eziokwu na eze a nke merela agadi, nọ na-agba ọsọ, kpuchiekwa isi ya ma kpudo ihu n’ala n’ihi ihere, Onye Kacha Ihe Niile Elu ga-agbanwe ọnọdụ ya ma mee ka o nwee mmeri. Jehova ga-eme ka ọ kwụrụ chịm, buliekwa isi ya elu ọzọ. Devid kpọkuru Chineke n’ihi na ọ ma na ọ ga-aza ya. Ọ̀ bụ otú a ka i si tụkwasị Jehova obi?
5 Devid ma na ọ bụ Jehova ga-enyere ya aka, ọ bụkwa ya mere o ji kpọọ Jehova “Onye na-ebuli isi m elu.” Bible Nsọ Ọhụu kwuru, sị: “Ma gị onwe gị, Yawe, bụ ọta gburugburu m, onye na-enye m mmeri, na onye na-agbà m ume.” Otu akwụkwọ kwuru banyere okwu ahụ bụ́ “Onye na-ebuli isi m elu,” sị: “Ọ bụrụ na Chineke ebulie . . . ‘isi’ mmadụ elu, ọ na-eme ka onye ahụ nwee olileanya na obi ike.” Obi kwesịrị ịjọ Devid njọ n’ihi na a chụpụrụ ya n’ocheeze Izrel. Ma, ‘ibuli isi ya elu’ ga-eme ka o nweghachi obi ike, meekwa ka ọ tụkwasị Chineke obi ya dum.
‘Jehova Ga-aza!’
6. Gịnị mere Devid ji kwuo na Jehova ga-esi n’ugwu nsọ ya zaa ekpere ya?
6 Ebe ọ bụ na Devid tụkwasịrị Jehova obi, nweekwa obi ike na ọ ga-anapụta ya, o kwuru, sị: “M ga-eji olu m kpọkuo Jehova, ọ ga-esikwa n’ugwu nsọ ya za m.” (Ọma 3:4) E bugara igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ igbe na-egosi na Chineke nọ n’etiti ndị Izrel, n’Ugwu Zayọn otú Devid nyere iwu ka e mee. (Gụọ 2 Samuel 15:23-25.) N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na Devid kwuru na Jehova ga-esi n’ugwu nsọ ya za ekpere ya.
7. Gịnị mere na Devid atụghị ụjọ?
7 Devid atụghị ụjọ n’ihi na obi siri ya ike na Chineke ga-aza ekpere o kpekuru ya. Kama ịtụ ụjọ, ọ bụrụ abụ, sị: “Ma mụ onwe m ga-edina ala rahụ ụra; M ga-eteta, n’ihi na Jehova na-akwado m.” (Ọma 3:5) Devid atụghị ụjọ ihi ụra n’abalị, nke bụ́dị oge ndị iro na-awakpokarị mmadụ na mberede. Ọ ma na ya ga-eteta, n’ihi na ihe ndị merela ya emeela ka o doo ya anya na Chineke ga-enyere ya aka. Anyịnwa nwekwara ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị esoro “ụzọ Jehova,” gharakwa ịhapụ ya.—Gụọ 2 Samuel 22:21, 22.
8. Olee otú Abụ Ọma 27:1-4 si gosi na Devid tụkwasịrị Chineke obi?
8 N’abụ ọma ọzọ Devid dere, o gosiri na ya anaghị atụ ụjọ nakwa na ya tụkwasịrị Chineke obi ya niile. O dere, sị: “Jehova bụ ìhè m na nzọpụta m. Ònye ka m ga-atụ egwu? Jehova bụ idé ji ndụ m. Ònye ka m ga-atụ ụjọ? . . . Ọ bụrụgodị na ndị agha amaa ụlọikwuu ibuso m agha, obi m agaghị atụ egwu. . . . Otu ihe ka m rịọrọ Jehova—ọ bụ ihe m ga-achọ, ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ m, ka m wee na-ahụ ịdị mma Jehova, ka m wee jirikwa obi ekele na-ele ụlọ nsọ ya anya.” (Ọma 27:1-4) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú a ọ dị Devid, ọ bụrụkwa na ọnọdụ gị ekwe gị, i kwesịrị iso ụmụnna gị na-abịachi ọmụmụ ihe anya.—Hib. 10:23-25.
9, 10. N’agbanyeghị ihe e kwuru n’Abụ Ọma 3:6, 7, gịnị mere ị ga-eji kwuo na Devid abọrọghị onwe ya ọbọ?
9 N’agbanyeghị na Absalọm gbara Devid mgba okpuru, ọtụtụ ndị obodo ya ahapụkwa ya, ọ bụrụ abụ, sị: “M gaghị atụ puku mmadụ iri Ọma 3:6, 7.
egwu, bụ́ ndị gbara m gburugburu imegide m. Jehova, biko, bilie! Chineke m, biko, zọpụta m! Tie ndị iro m niile ihe n’agba. Kụpụsịa ndị ajọ omume ezé.”—10 Devid anaghị abọrọ onwe ya ọbọ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e ‘tie ndị iro ya ihe n’agba,’ ọ bụ Chineke ga-eme ya. Ọ bụ Eze Devid ji aka ya depụtara onwe ya Iwu e nyere mba Izrel, ọ makwa na Jehova kwuru n’iwu ahụ, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ na ịkwụ ụgwọ.” (Diut. 17:14, 15, 18; 32:35) Ọ bụkwa Chineke ka ọ dịịrị ‘ịkụpụsị ndị ajọ omume ezé.’ Ịkụpụsị ha ezé pụtara na ọ ga-eme ka ha ghara inwekwa ike ha ga-eji merụọ ndị ọzọ ahụ́. Jehova ma ndị bụ́ ndị ajọ omume n’ihi na ọ “na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Sam. 16:7) Obi dị anyị ụtọ na Chineke na-eme ka anyị nwee okwukwe na ike. Ihe ndị a na-eme ka anyị guzogide Setan, bụ́ onye bu ajọ omume n’isi, onye dịkwa ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ nke na-enweghị ezé, nke naanị ihe na-echere ya bụ mbibi, onye a ga-atụba n’abis n’oge na-adịghị anya.—1 Pita 5:8, 9; Mkpu. 20:1, 2, 7-10.
“Jehova Nwe Nzọpụta”
11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere maka ụmụnna anyị?
11 Devid ghọtara na ọ bụ naanị Jehova ga-anapụtali ya, bụ́kwanụ ihe ọ na-atụsi anya ya ike. Ma, ọ naghị eche naanị banyere onwe ya. Oleekwanụ banyere ndị ohu Jehova, bụ́ ndị ha na ya dị ná mma? Otú Devid si mechie akwụkwọ ya dabara nnọọ adaba. Ọ sịrị: “Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta. Ngọzi gị dị n’ahụ́ ndị gị.” (Ọma 3:8) N’eziokwu, Devid nwere ihe isi ike ndị tara akpụ, ma, o chetara ndị Jehova niile, obi sikwara ya ike na Chineke ga-agọzi ha. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-echeta ụmụnna anyị? Ka anyị na-echeta ha n’ekpere anyị, na-arịọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ ya, bụ́ nke ga-eme ka obi kaa ha, meekwa ka ha jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma.—Efe. 6:17-20.
12, 13. Gịnị mere Absalọm, gịnịkwa ka Devid mere?
12 Absalọm nwụrụ ọnwụ ihere. Ndị niile na-emeso ndị ọzọ ihe ike, karịchaa ndị Chineke tere mmanụ otú ahụ o tere Devid, kwesịrị ịmụta ihe na nke a. (Gụọ Ilu 3:31-35.) Agha dara n’etiti ndị ohu Devid na ndị òtù Absalọm, e merikwara ndị agha Absalọm. Mgbe Absalọm nọ n’elu ịnyịnya ibu o ji na-agbapụ n’ihu ndị agha Devid, isi ya konyere ná nnukwu osisi. O kooro n’ebe ahụ, ya bụ, ọ dị ndụ ma o nweghị onye ga-enyere ya aka, ruo mgbe Joab manyere ya ube atọ n’obi, ya anwụọ.—2 Sam. 18:6-17.
13 Obi ọ̀ dị Devid ụtọ mgbe ọ nụrụ na nwa ya anwụọla? Mba. Kama ịṅụrịwa ọṅụ, o ji mwute na-aga ihu na azụ na-ebe ákwá, sị: “Nwa m Absalọm, nwa m, nwa m Absalọm! Ọ gaara akara m mma ma a sị na ọ bụ m nwụrụ kama gị onwe gị ịnwụ, Absalọm nwa m, nwa m!” (2 Sam. 18:24-33) Ọ bụ ihe Joab gwara Devid mere ka ọ kwụsị iru uju. N’eziokwu, Absalọm nwụrụ ọnwụ ihere. Ọ bụ oké ọchịchọ mere ka o buso nna ya, bụ́ onye Jehova tere mmanụ, agha ma wetara onwe ya ọdachi!—2 Sam. 19:1-8; Ilu 12:21; 24:21, 22.
Devid Atụkwasị Chineke Obi Ọzọ
14. Gịnị ka e nwere ike ikwu banyere ihe mere e ji dee Abụ Ọma nke anọ?
14 Dị ka Devid mere n’Abụ Ọma nke atọ, n’Abụ Ọma nke anọ, o ji obi ya dum kpekuo Jehova ekpere, bụ́ ihe na-egosi na ọ tụkwasịrị ya obi ya dum. (Ọma 3:4; 4:3) Ọ ga-abụ na ihe mere Devid ji dee abụ a bụ ka o wee gosi na obi eruola ya ala nakwa ka o wee kelee Chineke maka ime ka nkata Absalọm kpara ịkwatu ọchịchị ya kụọ afọ n’ala. O nwekwara ike ịbụ na ndị o bu n’obi dee ya bụ ndị Livaị na-abụ abụ. Nke ọ bụla ọ bụ, ichebara ihe o dere echiche ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi.
15. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike isi n’aha Jizọs na-ekpeku Jehova ekpere?
15 Devid gosiri ọzọ na ya ma na Jehova na-anụ ekpere nakwa na ọ zara ekpere ya. Ọ bụrụ abụ, sị: “Mgbe m kpọkuru gị, biko, za m, Chineke m bụ́ onye ezi omume. N’oge ahụhụ, meere m ohere sara mbara. Meere m amara, nụkwa ekpere m.” (Ọma 4:1) Ọ bụrụ na anyị na-eme ezi omume, obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere anyị. Ọ bụrụ na anyị aghọta na Jehova, bụ́ ‘Chineke nke bụ́ onye ezi omume,’ na-agọzi ndị niile na-erubere ya isi, obi ga-aka anyị isi n’aha Ọkpara ya na-ekpeku ya ekpere, anyị ga-enwekwa okwukwe na ọ ga-aza ya n’ihi àjà mgbapụta e ji Jizọs chụọ. (Jọn 3:16, 36) N’eziokwu, nke a na-eme ka obi ruo anyị ala.
16. Gịnị nwere ike ịbụ ya mere ka obi jọọ Devid njọ?
16 Mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka obi koro anyị n’elu. O nwere ike ịbụ na ụdị ihe a mere Devid, n’ihi na ọ bụrụ abụ, sị: “Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga na-akpụ ùgwù m n’ala, ebe unu nọ na-ahụ ihe efu n’anya, ebe unu nọ na-achọ okwu ụgha.” (Ọma 4:2) Ọ ga-abụ na ndị ọ kpọrọ “ụmụ mmadụ” bụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ndị iro Devid ‘hụrụ ihe efu n’anya.’ Otú Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society si sụgharịa ya bụ: “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-agbaso ihe na-enweghị isi? Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-akpọ isi ala nye chi ndị ahụ unu maara na ha abụghị chi n’ezie?” Ọ bụrụgodị na ihe ndị ọzọ mere emee ka obi jọọ anyị njọ, ka anyị nọgide jiri obi anyị dum na-ekpe ekpere ma tụkwasị onye naanị ya bụ ezi Chineke obi kpamkpam.
17. Kwuo otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru n’Abụ Ọma 4:3.
17 Ihe ọzọ Devid kwuru gosiri na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ọ sịrị: “Ya mere, maranụ na Jehova ga-emeso onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ mmeso pụrụ iche; Jehova ga-anụ mgbe m kpọkuru ya.” (Ọma 4:3) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkwụsị ike n’akụkụ Jehova, anyị kwesịrị ịkata obi na-eme ihe ziri ezi ma tụkwasị ya obi kpamkpam. Dị ka ihe atụ, ndị ezinụlọ kwesịrị igosi na ha na-eme ihe ziri ezi nakwa na ha tụkwasịrị Chineke obi mgbe a chụrụ onye ezinụlọ ha nke na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ. Chineke na-agọzi ndị niile na-erubere ya isi. Ọ bụrụkwa na ndị Jehova akwụsie ike n’akụkụ ya ma tụkwasị ya obi kpamkpam, ha ga-adị n’otu.—Ọma 84:11, 12.
18. Dị ka Abụ Ọma 4:4 kwuru, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ihe na-adịghị anyị mma?
18 Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ekwuo ihe were anyị iwe ma ọ bụkwanụ mee ihe were anyị iwe? Anyị ka ga na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe Devid kwuru. Ọ sịrị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela. Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, n’elu ihe ndina unu, ma gba nkịtị.” (Ọma 4:4) Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ihe na-adịghị anyị mma, anyị ekwesịghị ịgwagwara ya onye ahụ ma ọ bụ megwara ya n’ihi na ime otú ahụ bụ mmehie. (Rom 12:17-19) Anyị nwere ike ikwu ihe anyị chọrọ ikwu n’ime obi anyị, mgbe anyị nọ n’elu ihe ndina anyị. Ọ bụrụ na anyị ekpekuo Jehova ekpere banyere okwu ahụ, anyị nwere ike ịgbanwe otú anyị si ele ya anya, bụ́ nke ga-eme ka anyị gbaghara onye ahụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (1 Pita 4:8) Ihe ọzọ anyị nwere ike ime ma ụdị ihe a mee bụ ndụmọdụ Pọl nyere, bụ́ nke yiri ka ebe o si nweta ya ọ̀ bụ n’akwụkwọ Abụ Ọma 4:4. Pọl sịrị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.”—Efe. 4:26, 27.
19. Olee otú Abụ Ọma 4:5 nwere ike isi nyere anyị aka n’ihe banyere ofufe anyị na-efe Chineke?
19 Devid gosiri na anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi. Ọ bụrụ abụ, sị: “Chụọnụ àjà ezi Ọma 4:5) Ọ bụ naanị mgbe ụmụ Izrel bu ezi ihe n’obi chụọrọ Chineke àjà ka ọ na-anara àjà ha chụụrụ ya. (Aịza. 1:11-17) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nabata ofufe anyị na-efe ya, anyị kwesịkwara ibu ezi ihe n’obi na-efe ya, tụkwasịkwa ya obi kpamkpam.—Gụọ Ilu 3:5, 6; Ndị Hibru 13:15, 16.
omume, tụkwasịkwanụ Jehova obi.” (20. Gịnị ka ‘ìhè si n’ihu Jehova’ na-anọchi anya ya?
20 Devid kwukwara, sị: “E nwere ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘Ònye ga-eme ka anyị hụ ihe ọma?’ Jehova, biko, mee ka ìhè si n’ihu gị nwukwasị anyị.” (Ọma 4:6) ‘Ìhè si n’ihu Jehova’ na-anọchite anya ihu ọma ya. (Ọma 89:15) N’ihi ya, mgbe Devid kpere ekpere, sị: “Mee ka ìhè si n’ihu gị nwukwasị anyị,” ihe ọ na-ekwu bụ ka Jehova ‘gosi anyị ihu ọma.’ Ebe ọ bụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị na-enwe ihu ọma ya na ọṅụ dị ukwuu ka anyị ji obi ike na-eme uche ya.
21. Gịnị ka anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị na-arụchi ọrụ owuwe ihe ubi a na-arụ taa anya?
21 Devid tụrụ anya na Chineke ga-eme ka o nwee ọṅụ nke karịrị ọṅụ a na-enwe n’oge owuwe ihe ubi. Ọ bụ ya mere o ji bụkuo Jehova abụ, sị: “Mee ka obi m ṅụrịa ọṅụ karịa ọṅụ ha na-enwe mgbe ọka na mmanya ọhụrụ ha dị ukwuu.” (Ọma 4:7) Taa, ọ bụrụ na anyị esoro na-ejechi ozi ọma anya, o doro anya na anyị ga-enwe ezigbo ọṅụ. (Luk 10:2) N’ihi otú ‘mba bara ụba,’ nke bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, si na-edu ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst, anyị na-aṅụrị ọṅụ ugbu a ka ọnụ ọgụgụ ‘ndị na-ewe ihe ubi’ na-ehikwu nne. (Aịza. 9:3) Ì ji ọṅụ na-arụchi ọrụ owuwe ihe ubi a anya n’eziokwu?
Jiri Obi Ike Na-arụ Ọrụ, Tụkwasịkwa Chineke Obi Kpamkpam
22. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 4:8, gịnị na-eme ma ọ bụrụ na ụmụ Izrel edebe Iwu Chineke?
22 Ihe Devid ji mechie abụ ọma nke anọ bụ: “M ga-edina ala hie ụra n’udo, n’ihi na ọ bụ naanị gị, Jehova, na-eme ka m nọrọ n’obi iru ala.” (Ọma 4:8) Mgbe ụmụ Izrel debere Iwu Jehova, ha na ya dị ná mma, obi rukwara ha ala. Dị ka ihe atụ, ‘Juda na Izrel biri n’obi iru ala’ mgbe Sọlọmọn na-achị. (1 Eze 4:25) Obi ruru ndị tụkwasịrị Chineke obi ala ọbụna mgbe mba ndị ha na ha gbara agbata obi na-emegide ha. Anyị na-ehi ụra n’udo otú ahụ Devid na-ehi, n’ihi na Chineke mere ka obi ruo anyị ala.
23. Gịnị ka anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi kpamkpam?
23 Ka anyị jiri obi ike na-ejere Jehova ozi. Ka anyị gosikwa na anyị nwere okwukwe mgbe anyị na-ekpe ekpere, bụ́ nke ga-eme ka anyị nwee “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Fil. 4:6, 7) Nke a na-eme ka anyị nwee ọṅụ dị ukwuu! Anyị agaghị atụ egwu ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi kpamkpam.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee nsogbu Devid nwere n’ihi Absalọm?
• Olee otú Abụ Ọma nke atọ si eme ka obi sie anyị ike?
• Olee otú Abụ Ọma nke anọ nwere ike isi mee ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi?
• Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi kpamkpam?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 29]
Devid ma na Jehova ga-enyere ya aka ọbụna mgbe ọ gbara ọsọ n’ihi Absalọm
[Foto ndị dị na peeji nke 32]
Ị̀ tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam?