Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”

“Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”

“Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”

JOHN (JACK) BARR, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jechara ozi ya n’ụwa n’ụtụtụ Satọdee Disemba 4, 2010. Ọ dị iri afọ itoolu na asaa tupu ya anwụọ. E nweela onye kpọrọ ya “ezigbo onye nlekọta na ezigbo enyi.”

A mụrụ Nwanna Jack Barr n’Abadin, nke dị na Skọtland. Ọ bụ ọdụdụ nwa n’ime ụmụ atọ nne ya na nna ya mụrụ. Nne ya na nna ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Nwanna Barr na-ejikarị obi ụtọ ekwu banyere otú nne ya na nna ya si zụlite ya; obi dị ya ụtọ na ezigbo nne ya na nna ya setịpụụrụ ya ihe nlereanya magburu onwe ya.

Mgbe Jack gafere afọ iri, ịgwa ndị ọ na-amabughị okwu malitere isiri ya nnọọ ike. Ma, ọ gbasiri mbọ ike ka ọ kwụsị ime nke a. Otu ehihie Sọnde n’afọ 1927, mgbe ọ dị afọ iri na anọ, ọ gwara papa ya na ya chọrọ isoro ya gaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú a ka o si malite. Malite ụbọchị ahụ ruo ụbọchị ọ nwụrụ, ọ nọgidere na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma.

Mgbe Jack dị obere, otu ihe mberede nke fọrọ obere ka ọ taa isi mama ya mere ka Jack chebara ndụ echiche. Nke a mere ka ọ rara ndụ ya nye Jehova n’afọ 1929, e meekwa ya baptizim mgbe ohere ya dapụtara n’afọ 1934. Ọ malitere ije ozi na Betel dị na Lọndọn, Ingland n’afọ 1939. Otú a ka o siri bido ozi oge niile nke o jere iri afọ asaa na otu.

N’Ọktoba 29, n’afọ 1960, Nwanna Barr banyere n’ihe ọ kpọrọ “mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa” mgbe ọ lụrụ Mildred Willett, bụ́ onye ozi ala ọzọ ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ọtụtụ afọ. Nwanna Barr na nwunye ya bụ ezi ihe nlereanya, ha nọgidekwara na-ejekọ ozi ọnụ ruo mgbe Mildred jechara ozi ya n’ụwa n’Ọktoba afọ 2004. Mgbe Nwanna Barr na nwunye ya nọ ndụ, ha na-agụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị.

Ndị ma Jack Barr ga na-echeta ezigbo ndụmọdụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ o ji obiọma enye. Ọ na-arụsi ọrụ ike mgbe ọ nọ ndụ, ọ bụ onye nlekọta hụrụ ndị ọ na-elekọta n’anya, bụrụkwa ezigbo enyi ndị mmadụ. Otú o si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, otú o si ezi ihe n’ọmụmụ ihe, nakwa otú o si ekpe ekpere gosiri na o ji eziokwu kpọrọ ihe nakwa na ya na Jehova dị n’ezigbo mma.

Ọ bụ eziokwu na anyị agaghịzi ahụ Nwanna Barr, obi dị anyị ụtọ na ọ gaala ebe ọ na-agaghị anwụ anwụ, bụ́ ihe ùgwù ọ tụsiri anya ya ike ma na-ekwukarị okwu ya. O jighị ya gwuo egwu.—1 Kọr. 15:53, 54. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ị chọọ ịgụ akụkọ ndụ John E. Barr, gaa n’Ụlọ Nche nke July 1, 1987, peeji nke 26 ruo nke 31.