Ezinụlọ Ndị Kraịst—‘Mụrụnụ Anya’
Ezinụlọ Ndị Kraịst—‘Mụrụnụ Anya’
“Ka anyị mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.”—1 TESA. 5:6.
1, 2. Gịnị ka ndị ezinụlọ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụrụ anya?
PỌL onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka akwụkwọ ozi banyere “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova,” sị: “Unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi, n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie. Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ ụmụ nke ọchịchịrị.” O kwukwara, sị: “Ya mere, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.”—Joel 2:31; 1 Tesa. 5:4-6.
2 Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ndị Tesalonaịka baara Ndị Kraịst bi “n’oge ikpeazụ” a ezigbo uru. (Dan. 12:4) Ka ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a na-eru nso, Setan eforola ntutu taa na ya ga-eme ka ọtụtụ ndị na-efe Chineke kwụsị ife ya. N’ihi nke a, ọ ga-adị mma ma anyị mụrụ anya dị ka Pọl dụrụ anyị ọdụ. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst chọrọ ịmụrụ anya, onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịrụ ọrụ Jehova nyere ya, nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Olee ọrụ di, nwunye, na ụmụaka kwesịrị ịna-arụ iji mee ka ezinụlọ ha “mụrụ anya”?
Ndị Bụ́ Di, Ṅomienụ “Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma” Ahụ
3. Dị ka 1 Timoti 5:8 kwuru, olee ọrụ onyeisi ezinụlọ ga na-arụ?
3 Baịbụl kwuru, sị: ‘Nwoke bụ isi nke nwaanyị.’ (1 Kọr. 11:3) Olee ọrụ nwoke ga na-arụ bụ́ nke na-egosi na ọ bụ onyeisi ezinụlọ? Akwụkwọ Nsọ kwuru otu n’ime ọrụ ndị ọ ga na-arụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Tim. 5:8) N’eziokwu, nwoke kwesịrị inye ndị ezinụlọ ya ihe na-akpa ha. Ma, ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ezinụlọ ya mụrụ anya, ọ ga-eme ihe karịrị inye ha ihe na-akpa ha. O kwesịrị ime ka okwukwe ndị ezinụlọ ya sie ike, ya bụ, o kwesịrị inyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. (Ilu 24:3, 4) Olee otú o nwere ike isi mee nke a?
4. Olee ihe nwoke nwere ike ime ka ezinụlọ ya na Chineke nọgide na-adị ná mma?
4 Ebe ọ bụ na “di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ,” onye bụ́ di kwesịrị ịtụle otú Jizọs si edu ọgbakọ ya ma ṅomie nke a. (Efe. 5:23) Tụlee otú Jizọs si kọwaa otú o si were ụmụazụ ya. (Gụọ Jọn 10:14, 15.) Gịnị ka nwoke ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime ka ezinụlọ ya na Chineke nọgide na-adị ná mma? Ihe ọ ga-eme bụ ịmata ihe Jizọs, bụ́ “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, kwuru na ihe o mere ma “sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 Pita 2:21.
5. Olee otú Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ maruru ọgbakọ ya?
5 E nwere ike ikwu na ihe na-eme ka onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ ya dịrị ná mma bụ na ha maara ibe ha, tụkwasịkwa ibe ha obi. Onye ọzụzụ atụrụ ma atụrụ ya nke ọma, atụrụ ya makwa ya nke ọma, tụkwasịkwa ya obi. Ha ma olu ya, na-emekwa ihe ọ gwara ha. Jizọs kwuru, sị: ‘Amaara m atụrụ m.’ Ọ ma ọgbakọ ya nke ọma. Okwu Grik e si sụgharịta ‘amaara m’ pụtara ‘ịma ihe nke ọma.’ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ma atụrụ ya nke
ọ bụla. Ọ ma mkpa ha n’otu n’otu, mara ebe ndị ha na-anaghị emecha nke ọma, marakwa ebe ha na-eme nke ọma. O nweghị ihe Onye Anyị Kwesịrị Iṅomi na-amaghị banyere atụrụ ya. Atụrụ ya makwa ya nke ọma, tụkwasịkwa ya obi.6. Olee otú ndị bụ́ di nwere ike isi ṅomie Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ?
6 Ọ bụrụ na onye bụ́ di chọrọ ịna-edu ndú ka Kraịst, o kwesịrị ịna-ewere onwe ya ka onye ọzụzụ atụrụ, werekwa ndị ọ na-elekọta ka atụrụ. O kwesịrị ịgba mbọ mara ezinụlọ ya nke ọma. Onye bụ́ di ò nwere ike ịma ezinụlọ ya nke ọma? Ee, o nwere ike ma ọ bụrụ na ọ na-eji olu ọma agwa ndị ezinụlọ ya okwu, na-ege ha ntị mgbe ha na-ekwu ihe na-enye ha nsogbu n’obi, na-ebute ụzọ n’ihe ndị a na-eme n’ezinụlọ, ma na-eme mkpebi ndị dị mma n’ihe banyere ofufe ezinụlọ, ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, nakwa banyere otú ha ga-esi na-atụrụ ndụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst bụ́ di amara Okwu Chineke nke ọma, marakwa ndị ezinụlọ ya nke ọma, ha ga-atụkwasị ya obi, obi ga-adịkwa ya ụtọ ka ọ na-ahụ ka ha na-efekọ Chineke ọnụ.
7, 8. Olee otú onye bụ́ di ga-esi hụ ndị ọ na-elekọta n’anya otú Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ si eme?
7 Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ hụkwara atụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere banyere otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi, anyị ga-enwe obi ụtọ maka otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Ọ ‘tọgbọdịrị mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.’ Ndị bụ́ di kwesịrị iṅomi Jizọs site n’ịhụ ndị ha na-elekọta n’anya. Kama iji aka ike na-achị nwunye ya, di nke chọrọ ime ihe dị Chineke mma na-anọgide na-ahụ ya n’anya “dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya.” (Efe. 5:25) O kwesịrị ịna-agwa ya okwu ọma, n’ihi na o kwesịkwara ka a sọpụrụ ya.—1 Pita 3:7.
8 Mgbe onyeisi ezinụlọ na-enye ụmụ ya ọzụzụ, o kwesịrị ịkwụsi ike n’ihe Chineke kwuru. Ma, o kwesịkwara igosi ụmụ ya na ya hụrụ ha n’anya. O kwesịrị igosi na ya hụrụ ha n’anya mgbe ọ na-adọ ha aka ná ntị ma ha mee ihe na-adịghị mma. Ụfọdụ ụmụaka nwere ike ịghọta ihe a chọrọ ka ha mee ngwa ngwa, ma, o nwere ike iwe ụmụaka ndị ọzọ oge. N’ihi ya, onye bụ́ nna kwesịrị inwe nnọọ ndidi. Ọ bụrụ na ndị bụ́ nna anọgide na-eṅomi Jizọs, ahụ́ ga-eru onye ọ bụla ala n’ụlọ ha. Ezinụlọ ha ga-adị otú ahụ otu ọbụ abụ bụrụ n’abụ.—Gụọ Abụ Ọma 23:1-6.
9. Olee ọrụ Ndị Kraịst bụ́ di nwere taa nke yiri nke nna ochie bụ́ Noa, oleekwa ihe ga-enyere ha aka ịrụ ya?
9 Nna ochie bụ́ Noa biri ndụ n’oge ọgwụgwụ. Ma, Jehova chebere ya “na mmadụ asaa ndị ọzọ, mgbe o ji iju mmiri bibie ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:5) Ọrụ Noa kwesịrị ịrụ bụ inyere ezinụlọ ya aka ka ha ghara ịnwụ n’Iju Mmiri ahụ. Ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ kwesịkwara inyere ndị ezinụlọ ha aka n’ụbọchị ikpeazụ a. (Mat. 24:37) Nke a mere ka ọ dị oké mkpa ka ha na-amụ banyere “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ ma gbaa mbọ na-eṅomi ya.
Ndị Bụ́ Nwunye, ‘Na-ewulitenụ Ụlọ Unu’
10. Gịnị ka nwunye ido onwe ya n’okpuru di ya pụtara?
10 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị.” (Efe. 5:22) Nke a apụtaghị na a na-eleda ụmụ nwaanyị anya. Tupu e kee nwaanyị mbụ, bú Iv, ezi Chineke kwuru, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jen. 2:18) Ọrụ onye “inyeaka” na ‘onye na-eme ka e zuo ezu,’ ya bụ, onye na-enyere di ya aka ka ọ na-arụ ọrụ dịịrị ya n’ezinụlọ, bụ ọrụ dị ùgwù.
11. Olee otú nwaanyị ma ihe si ‘ewulite ụlọ ya’?
11 Nwunye ma ihe na-arụsi ọrụ ike maka ọdịmma nke ezinụlọ ya. (Gụọ Ilu 14:1.) Nwaanyị ma ihe na-akwanyere onyeisi ezinụlọ ùgwù. Ọ dịghị ka nwaanyị nzuzu, bụ́ onye na-anaghị akwanyere onyeisi ezinụlọ ùgwù dị ukwuu. Ọ naghị enupụ isi ma ọ bụkwanụ na-achọ ime otú o si masị ya, bụ́ ihe ọtụtụ ndị na-eme taa n’ụwa. Ọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya. (Efe. 2:2) Nwunye dị nzuzu na-ekwukarị okwu ọjọọ banyere di ya, ma, nwaanyị ma ihe na-eme ihe niile o nwere ike ime ka ụmụ ya na ndị ọzọ na-akwanyekwuru di ya ùgwù. Nwaanyị ma ihe anaghị ekwu ekwurekwu ma ọ bụkwanụ di ya na-ekwu n’elu ya ana-ekwu n’ala, n’ihi na ime otú ahụ na-egosi na ọ na-eleda di ya anya. Ọ naghịkwa emefusị ego. Nwaanyị nzuzu nwere ike ịna-emefusị ego ezinụlọ ya tara ahụhụ kpata. Ma, nwaanyị na-erubere di ya isi anaghị eme otú a. Ọ na-akwado mkpebi di ya mere banyere otú ha ga-esi emefu ego. Ọ naghị emefusị ego site n’ịzụ ihe ọ bụla ọ hụrụ. Ọ naghị enye di ya nsogbu ka ọ na-arụ ọrụ karịa oge o kwesịrị.
12. Olee ihe onye bụ́ nwunye nwere ike ime ka ezinụlọ ya wee “mụrụ anya”?
12 Nwaanyị ma ihe na-enyere ezinụlọ ya aka ka ha “mụrụ anya” site n’inyere di ya aka na-akụziri ụmụ ha banyere Jehova. (Ilu 1:8) Ọ na-agba mbọ hụ na ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Ọ na-akwadokwa di ya mgbe ọ bụla o nyere ụmụ ha ndụmọdụ ma ọ bụ taa ha ahụhụ maka ihe ọjọọ ha mere. Ma, nwaanyị na-anaghị akwado di ya dị nnọọ iche, ụmụ ha anaghị enweta ihe na-akpa ha, ọ naghịkwa akụziri ha banyere Jehova.
13. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka nwaanyị na-akwado di ya n’ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ?
13 Olee otú ọ na-adị nwaanyị na-akwado di ya ma ọ hụ ka di ya na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ? Ọ na-atọgbu ya atọgbu. Ma di ya ọ̀ bụ ohu na-eje ozi, okenye, ma ò so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ma ọ bụ Ndị Na-enyere Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Aka, ọ na-enwe obi ụtọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na nwaanyị chọrọ ịna-akwado di ya site n’ịgwa ya okwu na-agba ume na ime ihe ndị na-egosi na ọ na-akwado ya, ọ ga-achọ ya ọtụtụ ihe n’aka. Ma, ọ ma na ezinụlọ ya ga-amụrụ anya ma ọ bụrụ na di ya esoro na-arụ ọtụtụ ọrụ a na-arụ n’ọgbakọ.
14. (a) Olee ihe nwere ike ime ka o siere nwaanyị ma ihe ike ịkwado di ya, oleekwa ihe ga-enye aka mee ka ọ na-eme nke a? (b) Olee otú onye bụ́ nwunye si eme ka ezinụlọ ya dum na-enwe obi ụtọ?
14 O nwere ike isiri nwaanyị bụ́ ezigbo ihe nlereanya ike ịkwado di ya ma ọ bụrụ na di ya emee mkpebi na-amasịghị ya. Ọ bụrụgodị na nke a emee, ọ na-eji “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ” akwado ya ka mkpebi ya gazie. (1 Pita 3:4) Ezigbo nwunye na-agba mbọ iṅomi ndị inyom ndị tụrụ egwu Chineke n’oge ochie, ndị dị ka Sera, Rut, Abigel, na nne Jizọs, bụ́ Meri. (1 Pita 3:5, 6) Ọ na-eṅomikwa ndị inyom ndị tọrọ ya n’oge a, bụ́ “ndị dị nsọ n’omume ha.” (Taị. 2:3, 4) Ọ bụrụ na nwaanyị ma ihe ahụ di ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù, ya na di ya ga na-ebi n’udo, ezinụlọ ha dum ga na-enwekwa obi ụtọ. Ahụ́ ga-eru onye ọ bụla nọ n’ụlọ ha ala. Nwoke hụrụ Jehova n’anya ma na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ chọrọ ezigbo nwaanyị nke ga na-akwado ya.—Ilu 18:22.
Ndị Na-eto Eto, ‘Lekwasịnụ Anya n’Ihe A Na-adịghị Ahụ Anya’
15. Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi nyere ndị mụrụ ha aka mee ka ezinụlọ ha “mụrụ anya”?
15 Olee otú unu ndị na-eto eto ga-esi nyere ndị mụrụ unu aka mee ka ezinụlọ unu “mụrụ anya”? Chetanụ ihe mgbata n’ọsọ Jehova debere unu n’ihu. Ikekwe, ndị mụrụ gị malitere mgbe ị bụ nwata gosiwe gị ebe e sere paradaịs. Ma eleghị anya, ka ị na-eto, ha ji Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nyere gị aka iji anya nke uche gị hụ otú ndụ ebighị ebi ga-adị n’ụwa ọhụrụ. Ị ‘ga-amụrụ anya’ ma ọ bụrụ na i lekwasị anya n’ozi ị na-ejere Jehova ma na-eme ihe kwekọrọ n’uche ya.
16, 17. Olee ihe ndị na-eto eto nwere ike ime ka ha wee gbata ihe n’ọsọ nke ndụ?
16 Echefula ihe Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 9:24. (Gụọ ya.) Na-agba ọsọ ndụ ahụ ka i wee gbata ihe. Na-eme ihe ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi. Ọtụtụ ndị anọrọla ebe ha na-achụ ihe onwunwe anya ha apụọ n’ihe mgbata n’ọsọ ahụ. Nke a bụ nnọọ iberiibe. Ịchụ ihe onwunwe ka a na-anwụ anwụ anaghị eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Ihe ndị e ji ego azụta anaghị adịte aka. Lekwasị anya “n’ihe a na-adịghị ahụ anya.” N’ihi gịnị ka ị ga-eji eme nke a? Ọ bụ n’ihi na “ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.”—2 Kọr. 4:18.
17 Ihe ọma ndị anyị ga-enweta n’Alaeze Chineke so ‘n’ihe a na-adịghị ahụ anya.’ Gbaa mbọ na-ebi ndụ otú ga-eme ka i nweta ha. Ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma i jiri ndụ gị na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na anyị na-ejere ezi Chineke anyị ozi, anyị ga-enwe ike iru ihe mgbaru ọsọ dị iche iche, ma ndị obere ma ndị nnukwu. * Ọ bụrụ na anyị enwee ihe mgbaru ọsọ ndị anyị ga-eruli, ha ga-eme ka anyị nọgide na-ejere Chineke ozi, meekwa ka anyị nweta ihe mgbata n’ọsọ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.
18, 19. Olee otú onye na-eto eto nwere ike isi kpebie ma ọ̀ ga-eme ka ya na Jehova dịrị ná mma?
18 Ndị na-eto eto, ihe mbụ unu ga-eme iji gosi na unu abanyela n’ụzọ nke ndụ bụ ime ka unu na Jehova dịrị ná mma. Ì meela nke a? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ka ọ̀ bụ ndị mụrụ m mere m ji na-eme ihe ndị m na-eme n’ọgbakọ? M̀ na-agba mbọ ka m wee nwee àgwà ndị ga-eme ka ihe m na-amasị Chineke? Àna m agbasi mbọ ike imechi ihe ndị metụtara ofufe Chineke anya, ndị dị ka ikpechi ekpere anya, ịmụchi ihe anya, ịgachi ọmụmụ ihe anya, na ịgachi ozi ọma anya? Àna m abịaru Chineke nso site n’ime ka mụ na ya dịrị ná mma?’—Jems 4:8.
19 Chebara ihe ndị a kọrọ banyere Mozis echiche. N’agbanyeghị na ya na ndị na-anaghị efe Chineke bi, ọ họọrọ ka a kpọọ ya onye na-efe Jehova kama a ga-akpọ ya nwa ada Ndị Hibru 11:24-27.) Ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst, unu kwesịkwara ikpebisi ike na unu ga na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga na-enwe ezigbo obi ụtọ, bie ndụ kacha mma ugbu a, nweekwa olileanya na unu ‘ga-ejidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’—1 Tim. 6:19.
Fero. (Gụọ20. Olee ndị na-agbata ihe mgbata n’ọsọ n’ọsọ nke ndụ ahụ?
20 Ọ bụ naanị otu onye na-emeri n’ọsọ egwuregwu a na-agba n’oge ochie. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ọsọ nke ndụ. “Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Ọtụtụ ndị bu gị ụzọ agbaruola ọsọ ahụ n’isi, ọtụtụ ndị ọzọ ka sokwa gị na-agba ya. (Hib. 12:1, 2) Ndị niile na-adaghị mbà ga-agbata ihe mgbata n’ọsọ. N’ihi ya, kpebisie ike na ị ga-agbata ihe!
21. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?
21 “Oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova” ga-abịarịrị. (Mal. 4:5) Ụbọchị ahụ ekwesịghị ịda ezinụlọ Ndị Kraịst mberede. Ndị niile nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịrụ ọrụ Akwụkwọ Nsọ nyere ha. Olee ihe ọzọ i nwere ike ime iji mụrụ anya ma mee ka adịm ná mma gị na Chineke sikwuo ike? N’isiokwu na-eso nke a, a ga-atụle ihe atọ ndị ga-eme ka mmadụ niile nọ n’ezinụlọ na Chineke dịrị ná mma.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 Gụọ Ụlọ Nche nke Nọvemba 15, 2010, peeji nke 12-16; July 15, 2004, peeji nke 21-23.
Olee Ihe Ị Mụtara?
• Olee ihe mere ezinụlọ Ndị Kraịst ji kwesị ‘ịmụrụ anya’?
• Olee otú onye bụ́ di nwere ike isi ṅomie Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ?
• Olee ihe nwaanyị ma ihe ga na-eme iji na-akwado di ya?
• Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi nye aka mee ka ezinụlọ ha mụrụ anya?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 9]
Di ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe anaghị eji nwunye na-akwado ya egwu egwu