Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’

‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’

‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’

“Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!”—ROM 11:33.

1. Gịnị bụ ihe ùgwù kacha ihe ùgwù Ndị Kraịst e mere baptizim nwere?

GỊNỊ bụ ihe ùgwù kacha ihe ùgwù niile i nwere? Ihe mbụ nwere ike ịgbata gị n’obi bụ ọrụ ụfọdụ ị na-arụ n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ onyinye e nyere gị maka otú i si eme nke ọma. Ma, ihe ùgwù kacha ihe ùgwù niile anyị bụ́ Ndị Kraịst e mere baptizim nwere bụ na anyị na Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke, dị n’ezigbo mma. Nke a emeela ka ‘ọ mara anyị.’—1 Kọr. 8:3; Gal. 4:9.

2. Gịnị mere ịmata Jehova nakwa Jehova ịmata anyị ji bụrụ ezigbo ihe ùgwù?

2 Gịnị mere ịmara Jehova nakwa Jehova ịmara anyị ji bụrụ ezigbo ihe ùgwù? Ọ bụ n’ihi na Jehova bụ Onye kacha elu n’eluigwe na n’ụwa, ọ bụkwa Onye na-echebe ndị ọ hụrụ n’anya. Nehọm ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Jehova dị mma, ọ bụ ebe e wusiri ike n’ụbọchị ahụhụ. Ọ makwaara ndị na-agbaba n’ime ya.” (Nehọ. 1:7; Ọma 1:6) N’eziokwu, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị amata onye naanị ya bụ ezi Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọn 17:3.

3. Gịnị ka ịmata Chineke pụtara?

3 Ịmata Chineke apụtaghị naanị ịmata aha ya. Anyị ga-amaru ya ala n’ihi na ọ bụ Enyi anyị, anyị ga-amakwa ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya. Ọ bụrụ na anyị amata ihe ndị na-amasị Chineke na ihe ndị na-anaghị amasị ya, ọ na-egosi na anyị amaruola ya ala. (1 Jọn 2:4) Ma, e nwere ihe ọzọ anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata Jehova nke ọma. Anyị kwesịrị ịmata ihe ndị o merela, otú o si mee ha nakwa ihe mere o ji mee ha. Ọ bụrụ na anyị aghọtakwuo nzube Jehova, nke a ga-eme ka anyị nwekwuo mmasị ịchọ ‘ihe ọmụma dị omimi nke Chineke.’—Rom 11:33.

Chineke nke Nwere Nzube

4, 5. (a) Gịnị ka “nzube” Baịbụl kwuru okwu ya pụtara? (b) Nye ihe atụ nke na-egosi otú mmadụ nwere ike isi si ihe karịrị otu ụzọ mezuo nzube ya.

4 Jehova bụ Chineke nke nwere nzube, Baịbụl kwukwara banyere “nzube ebighị ebi” ya. (Efe. 3:10, 11) Gịnị ka nke a pụtara? Okwu bụ́ “nzube,” nke Baịbụl kwuru okwu ya, pụtara ihe mgbaru ọsọ doro anya, ma ọ bụ ihe mmadụ bu n’obi ime, nke o nwere ike isi ihe karịrị otu ụzọ ruo ma ọ bụ mee.

5 Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na mmadụ nwere ebe ọ chọrọ ịga. Ihe mgbaru ọsọ ya, ma ọ bụ nzube ya bụ iru ebe ahụ ọ chọrọ ịga. O nwere ike inwe ọtụtụ ihe ga-akwọga ya ebe ahụ nakwa ọtụtụ ụzọ ọ ga-esi gaa. Ka ọ nọ na-aga n’ụzọ nke ọ họọrọ isi aga ebe ahụ, mmiri nwere ike izowe, ụzọ nwere ike ịkpọchi n’ihi ọtụtụ ụgbọala, ma ọ bụkwanụ e mechie ụzọ ahụ, nke ga-eme ka o si ụzọ ọzọ. Ma, otú ọ bụla ọ̀ sọrọ ya ya si ruo ebe ahụ, ihe bụ isiokwu bụ na o ruola ihe mgbaru ọsọ ya mgbe o ruru ebe ahụ ọ na-aga.

6. Olee otú Jehova sirila gbanwee ihe ụfọdụ ka o wee mezuo nzube ya?

6 Jehova emegharịkwaala ihe ụfọdụ ka o wee mezuo nzube ebighị ebi ya. Ebe ọ bụ na ọ ma na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ o kere nweere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme, ọ na-adị njikere ịgbanwe otú o si emezu nzube ya. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú ihe banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa si gosi otú Jehova si emezu nzube ya. Ná mmalite, Jehova gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jen. 1:28) Isi ahụ e nupụrụ n’ogige Iden ò mere ka Jehova ghara imezu nzube ya? Mbanụ! Jehova mere ihe ozugbo maka nsogbu ahụ biliterenụ site n’ikwu “ụzọ” ọzọ ọ ga-esi emezu nzube ya. O buru amụma na a ga-enwe otu “mkpụrụ” nke ga-emezi ihe ndị nnupụisi ahụ mebiri.—Jen. 3:15; Hib. 2:14-17; 1 Jọn 3:8.

7. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si kọwaa onwe ya n’Ọpụpụ 3:14?

7 Otú Jehova si enwe ike agbanwe ụzọ ọ chọrọ isi mezuo nzube ya ma e nwee ihe dapụtaranụ dabara nnọọ n’otú o si kọwaa onwe ya. Mgbe Mozis gwara Jehova ihe nwere ike ime ka ọ ghara ịrụ ọrụ o nyere ya, Jehova mere ka obi sie ya ike site n’ịgwa ya, sị: “‘M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.’ O kwukwara, sị: ‘Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, “M ga-abụ ezitewo m ka m bịakwute unu.”’” (Ọpụ. 3:14) N’eziokwu, Jehova nwere ike ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ ka o wee mezuo nzube ya! Pọl onyeozi mere ihe atụ dị mma o ji kọwaa nke a nke ọma ná Ndị Rom isi iri na otu. N’ebe ahụ, o kwuru banyere osisi oliv ihe atụ. Ọ bụrụ na anyị atụlee ihe atụ a nke ọma, ọ ga-eme ka anyị nwee mmasị ịmakwu otú amamihe Jehova si dị omimi, ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ebe a.

Nzube Jehova Banyere Mkpụrụ ahụ E Buru n’Amụma

8, 9. (a) Olee isi ihe anọ ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe atụ ahụ e ji osisi oliv mee? (b) Olee ajụjụ nke ịmata azịza ya ga-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si emegharị ihe ụfọdụ ka o wee mezuo nzube ya?

8 Ka anyị wee ghọta ihe atụ ahụ e ji osisi oliv mee, anyị kwesịrị ibu ụzọ mara ihe anọ mere Jehova ji buo amụma banyere mkpụrụ ahụ ọ ga-esi n’aka ya mezuo nzube ya. Nke mbụ bụ na Jehova kwere Ebreham nkwa na “mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha” site ná mkpụrụ ya, ma ọ bụ ụmụ ya. (Jen. 22:17, 18) Nke abụọ bụ na ọ bụ mba Izrel, nke bụ́ ụmụ Ebreham, ka e kwuru na a ga-esi nweta “alaeze nke ndị nchụàjà.” (Ọpụ. 19:5, 6) Nke atọ bụ na mgbe ọtụtụ ụmụ Izrel jụrụ Mesaya, Jehova mere ihe ọzọ ka o wee nweta “alaeze nke ndị nchụàjà.” (Mat. 21:43; Rom 9:27-29) Nke ikpeazụ bụ na n’agbanyeghị na ọ bụ Jizọs bụ onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham, e nyere ndị ọzọ ihe ùgwù ka ha soro ná mkpụrụ ahụ.—Gal. 3:16, 29.

9 Akwụkwọ Mkpughe mere ka ihe anọ a dokwuo anya. O gosiri na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Jizọs bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 14:1-4) A kpọkwara ha “ụmụ Izrel.” (Mkpu. 7:4-8) Ma, mmadụ niile so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ hà bụcha ndị Izrel, ma ọ bụ ndị Juu? Azịza nke ajụjụ a gosiri na Jehova nwere ike imegharị ihe ụfọdụ ka o wee mezuo nzube ya. Ka anyị tụlezie otú akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom nwere ike isi nyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ.

“Alaeze nke Ndị Nchụàjà”

10. Olee ihe ùgwù naanị ụmụ Izrel gaara enwe?

10 Dị ka anyị kwurula, ọ bụ naanị ná mba Izrel ka a gaara esi enweta ndị ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.” (Gụọ Ndị Rom 9:4, 5.) Ma, gịnị ga-eme mgbe Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa bịara? À ga-esili ná mba Izrel nweta “Izrel nke Chineke,” nke dị otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị ọzọ so ná mkpụrụ Ebreham?—Gal. 6:16.

11, 12. (a) Olee mgbe a malitere ịhọrọ ndị ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe, gịnịkwa ka ọtụtụ ndị Juu dị ndụ n’oge ahụ mere? (b) Olee otú Jehova si nwetazuo “ọnụ ọgụgụ” ndị ga-abụ mkpụrụ Ebreham?

11 Gụọ Ndị Rom 11:7-10. Mba Izrel jụrụ Jizọs na narị afọ mbụ. Nke a mere ka mba ndị ọzọ soro ná ndị a ga-esi n’aka ha nweta mkpụrụ Ebreham. Ma, na Pentikọst nke afọ 33 O.A., bụ́ mgbe a malitere ịhọrọ ndị ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà,” a họọrọ ụfọdụ ndị Juu nwere ezi obi. Ebe ọ bụ na ha dị puku ole na ole, ha dị ka “ndị fọdụrụ” ma ọ bụrụ na e jiri ha tụnyere mmadụ ole nọ ná mba Izrel.—Rom 11:5.

12 Ma, olee otú Jehova ga-esi nwetazuo “ọnụ ọgụgụ” ndị ga-abụ mkpụrụ Ebreham? (Rom 11:12, 25) Pọl onyeozi zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ọ bụghị dị ka à ga-asị na okwu Chineke emezughị. N’ihi na ọ bụghị ndị niile si n’Izrel [ya bụ, Izrel anụ ahụ́] pụta bụ ‘Izrel’ n’ezie. Ọ bụghịkwa n’ihi na ha bụ mkpụrụ [ya bụ, ụmụ] Ebreham mere ha niile ji bụrụ ụmụ [ya bụ, ndị so ná mkpụrụ Ebreham] . . . Ya bụ, ndị bụ́ ụmụ n’anụ ahụ́ abụghị ụmụ Chineke n’ezie, kama ndị a na-agụ dị ka mkpụrụ ahụ bụ ndị bụ́ ụmụ site ná nkwa ahụ.” (Rom 9:6-8) N’ihi ya, Jehova ekwughị na ọ bụ iwu na ndị niile ga-eso ná mkpụrụ ahụ ga-abụ ụmụ Ebreham.

Osisi Oliv Ihe Atụ

13. Gịnị ka ihe ndị a na-anọchite anya ha? (a) Osisi oliv, (b) mgbọrọgwụ ya, (ch) ogwe ya, na (d) alaka ya.

13 Pọl onyeozi ji ndị ọzọ sokwa ná mkpụrụ Ebreham tụnyere alaka ndị dị n’osisi oliv. * (Rom 11:21) Osisi oliv a nke a kụrụ n’ubi na-anọchite anya otú Chineke ga-esi emezu ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebreham gbara. Mgbọrọgwụ osisi ahụ dị nsọ, ọ na-anọchikwa anya Jehova, na-egosi na ọ bụ Jehova na-enye Izrel nke Chineke ndụ. (Aịza. 10:20; Rom 11:16) Ogwe osisi oliv ahụ na-anọchite anya Jizọs, onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham. Alaka ya niile bụ ‘ọnụ ọgụgụ zuru ezu’ nke ndị ọzọ so bụrụ mkpụrụ Ebreham.

14, 15. Ole ndị ka “a nyakapụrụ” n’osisi oliv nke ubi ahụ, oleekwa ndị a nyadoro na ya?

14 N’ihe atụ ahụ e ji osisi oliv mee, e ji alaka ya ndị “a nyakapụrụ” anyakapụ tụnyere ndị Juu jụrụ Jizọs. (Rom 11:17) Ọ bụ otú a ka ha si ghara iso ná mkpụrụ Ebreham. Ma, olee ndị ka a ga-eji dochie ha? Ndị Juu, bụ́ ndị na-eme ọnụ na ha bụ ụmụ Ebreham, agaghị echetụ n’echiche na a ga-eji ndị mba ọzọ dochie ha. Ma, Jọn Onye Na-eme Baptizim dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na Jehova chọrọ, ọ ga-eme ka Ebreham nweta ụmụ site na nkume.—Luk 3:8.

15 Ma, gịnị ka Jehova mere iji mezuo nzube ya? Pọl kwuru na a nyadoro alaka ụfọdụ si n’osisi oliv ọhịa n’osisi oliv nke ubi, ka ha wee nọchie alaka ndị a nyakapụrụ n’osisi oliv nke ubi. (Gụọ Ndị Rom 11:17, 18.) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a nyadoro Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị si mba ọzọ, ndị ụfọdụ n’ime ha nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Rom, n’osisi oliv ihe atụ a. Ha si otú a soro ná mkpụrụ Ebreham. Ha dịbu ka alaka osisi oliv ọhịa, ha enwebughị olileanya iso n’ọgbụgba ndụ a pụrụ iche. Ma, Jehova mere ka ha nwee ike ịghọ ndị Juu ime mmụọ.—Rom 2:28, 29.

16. Olee otú Pita onyeozi si kọwaa otú Izrel nke Chineke si malite?

16 Otú Pita onyeozi si kọwaa ihe a merenụ bụ: “Ya mere, ọ [ya bụ, Jizọs Kraịst] dị oké ọnụ ahịa n’ebe unu [ya bụ, Izrel nke Chineke, nke Ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl so na ya] nọ, n’ihi na unu bụ ndị kwere ekwe; ma n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, ‘otu nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọwo isi nkuku,’ na ‘nkume ịsụ ngọngọ na oké nkume mmejọ.’ . . . Ma unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube. N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke; unu bụbu ndị a na-emereghị ebere, ma ugbu a, unu bụ ndị e meere ebere.”—1 Pita 2:7-10.

17. Olee otú o si bụrụ na ihe Jehova mere “megidere okike”?

17 Jehova mere ihe ọtụtụ ndị na-atụghị anya na ọ ga-eme. Pọl kwuru na ihe a merenụ “megidere okike.” (Rom 11:24) Olee otú o si megide okike? A naghị anyadokarị alaka osisi ọhịa n’osisi a kụrụ n’ubi; ma, ọ bụ ihe a ka ụfọdụ ndị ọrụ ugbo na-eme na narị afọ mbụ. * N’otu aka ahụ, Jehova mere ihe a na-anaghị emekarị. Ndị Juu na-ele ndị Jentaịl anya ka ndị na-enweghị ike ịmị mkpụrụ ọma. Ma, Jehova mere ka ndị Jentaịl soro ná “mba” nke mịrị mkpụrụ Alaeze. (Mat. 21:43) Ọ bụ mgbe e tere Kọnịliọs, bụ́ onye Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù nke ghọrọ Onye Kraịst, mmanụ n’afọ 36 O.A., ka a malitere ịnyado ndị a na-ebighị úgwù, ndị na-abụghị ndị Juu, n’osisi oliv ihe atụ a.—Ọrụ 10:44-48. *

18. Olee ihe ndị Juu anụ ahụ́ ka nwere ike ime mgbe afọ 36 O.A. gachara?

18 Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na afọ 36 O.A. gachaa, a gaghịzi enye ndị Juu anụ ahụ́ ohere iso bụrụ mkpụrụ Ebreham? Mba. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ha [ya bụ, ndị Juu anụ ahụ́] anọgideghị n’enweghị okwukwe ha, a ga-anyadokwa ha; n’ihi na Chineke nwere ike ịnyado ha ọzọ. N’ihi na ọ bụrụ na e gbupụrụ gị n’osisi oliv bụ́ nke ọhịa site n’okike ma nyado gị n’ụzọ megidere okike n’osisi oliv nke ubi, lee ka ndị a sitere n’okike ga-esi bụrụ ndị a nyadoro karị n’osisi oliv nke ha!” *Rom 11:23, 24.

‘A Ga-azọpụta Izrel Dum’

19, 20. Gịnị ka Jehova mere, bụ́ nke e ji osisi oliv mee ihe atụ ya?

19 N’eziokwu, Jehova na-emezu nzube ya banyere “Izrel nke Chineke” n’ụzọ magburu onwe ya. (Gal. 6:16) Dị ka Pọl kwuru, ‘a ga-azọpụta Izrel dum.’ (Rom 11:26) Mgbe oge Jehova kara aka ruru, “Izrel dum,” ya bụ, ndị niile so n’Izrel nke Chineke, ga-aghọ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. O nweghị ihe ga-eme ka nzube Jehova ghara imezu!

20 Dị ka e buru n’amụma, “mkpụrụ” Ebreham, ya bụ, Jizọs Kraịst na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, ga-ewetara “ndị mba ọzọ” ngọzi. (Rom 11:12; Jen. 22:18) Ndokwa a ga-esi otú a baara ndị niile na-efe Chineke uru. N’eziokwu, ka anyị na-amụ banyere otú Jehova si na-emezu nzube ebighị ebi ya, anyị ga-echebara “otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi” echiche.—Rom 11:33.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 N’agbanyeghị na Izrel anụ ahụ́ nwere ndị eze na ndị nchụàjà, mba ahụ aghọghị alaeze nke ndị nchụàjà. Iwu kwuru na ndị eze Izrel agaghị abụ ndị nchụàjà. N’ihi ya, Izrel anụ ahụ́ abụghị osisi oliv ihe atụ ahụ. Ihe Pọl mere ihe atụ ya bụ otú Chineke si mezuo nzube ya, nke bụ́ inweta “alaeze nke ndị nchụàjà,” site n’ime ka e nwee Izrel nke Chineke. Ọ bụ nkọwa ọhụrụ a ka a ga-eji dochie anya ihe a kọwara n’Ụlọ Nche February 15, 1984, peeji nke 9-14.

^ par. 17 Nke a mere ná ngwụcha afọ atọ na ọkara ahụ e nyere ndị Juu anụ ahụ́ ohere ka ha soro ná mba ime mmụọ ọhụrụ. E kwuru nke a n’amụma ahụ e buru banyere izu iri asaa nke afọ.—Dan. 9:27.

^ par. 18 Ebe e si nweta okwu ahụ a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ubi” ná Ndị Rom 11:24 bụ n’okwu nke pụtara “ihe mara mma, ihe magburu onwe ya” ma ọ bụ “ihe e jikọtara nke ọma.” A na-ejikarị ya akọwa ihe ndị mezuru ihe e bu n’obi mepụta ha.

Ì Chetara?

• Gịnị ka otú Jehova si emezu nzube ya na-akụziri anyị banyere Jehova?

• Ná Ndị Rom isi iri na otu, gịnị ka ihe ndị a pụtara?

Osisi oliv.

Mgbọrọgwụ ya.

Ogwe ya.

Alaka ya.

• Gịnị mere e ji sị na alaka osisi oliv ọhịa ahụ a nyadoro n’osisi oliv a kụrụ n’ubi bụ ihe “megidere okike”?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

 Gịnị Mere E Ji Anyado Alaka Osisi Oliv Ọhịa n’Osisi Oliv A Kụrụ n’Ubi?

▪ Lucius Junius Moderatus Columella bụ onye agha ndị Rom nakwa onye ọrụ ugbo nke dịrị ndụ na narị afọ mbụ Oge Anyị. Ihe e ji mara ya karịchaa bụ akwụkwọ iri na abụọ o dere banyere otú ndị bi n’ime obodo si ebi ndụ na otú ha si arụ ọrụ ugbo.

N’akwụkwọ nke ise o dere, ọ tụrụ otu ilu a na-atụkarị n’oge ochie. Ilu ahụ bụ: “Onye na-egwu ala gburugburu úkwù osisi oliv ndị dị n’ubi oliv ya, na-agwa ya ka ọ mịara ya mkpụrụ; onye na-awụ ubi oliv ya nri ala, na-arịọ ya ka ọ mịara ya mkpụrụ; onye na-akwachasị ya, na-amanye ya ka ọ mịa mkpụrụ.”

Mgbe o kwuchara banyere osisi ndị na-ama pokopoko ma ha anaghị amị mkpụrụ, ọ tụrụ aro ihe e nwere ike ime. Ọ sịrị: “Ọ na-adị mma ma a ghụpuo ya, tinye ya alaka osisi oliv ọhịa ma kegide ya ihe; nke a na-eme ka ọ malite ịmị mkpụrụ.”

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ ghọtara ihe ihe atụ ahụ Pọl ji osisi oliv mee pụtara?