Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eso Kraịst, Bụ́ Onye Ndú Zuru Okè

Na-eso Kraịst, Bụ́ Onye Ndú Zuru Okè

Na-eso Kraịst, Bụ́ Onye Ndú Zuru Okè

NDỊ na-eso ndị ndú bụ́ mmadụ anaghị enwetakarị ihe ndị ha tụrụ anya ha. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ndị Kraịst na-edu. Jizọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.” (Mat. 11:28, 29) Ndị Jizọs na-edu na-enwe ume ọhụrụ. Nsogbu ndị ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị a na-emegbu emegbu na-emetụ Jizọs n’obi, ọ gwara ha ka ha nyara yok ya, bụ́ nke dị mfe. Ma, olee ihe mmadụ ga-eme ya abụrụ na ọ chọrọ ka Jizọs na-edu ya?

Pita onyeozi dere, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Gịnị mere anyị ji kwesị iso nzọụkwụ Jizọs? Ka e were ya na unu dị ọtụtụ na-agafe ebe e lichara ogbunigwe, ma, ọ bụ naanị otu onye n’ime unu ma otú e si ezere ebe e liri ogbunigwe. Ị́ gaghị eme ihe ọ bụla onye ahụ mere, ikekwe na-azọnyedị ụkwụ ebe ọ bụla ọ zọrọ ụkwụ? Otú ahụ ka anyị ga na-agba mbọ soro nzọụkwụ Jizọs ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu. Otú anyị ga-esi eme nke a bụ ige ya ntị ma na-eme ihe o kwuru, na-emekwa ihe ndị na-anọchite anya ya kwuru.

Nụ Okwu Jizọs ma Na-eme Ya

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs zichaa Ozizi Elu Ugwu ya, o kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume.”—Mat. 7:24, 25.

N’ebe a, Jizọs kwuru na onye na-anụ okwu ya ma na-eme ya “nwere uche.” Ànyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jizọs ùgwù site n’iji obi anyị dum na-eme ihe o kwuru, ka iwu ya ndị anyị na-edebe ọ̀ bụ ndị nke dịrị anyị mfe? Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị [Chineke] mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Ka anyị gbaa mbọ na-eme ihe dị Chineke mma otú ahụ Jizọs na-eme.

Na narị afọ mbụ, ndịozi setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya n’irubere Kraịst isi. E nwere otu oge Pita gwara Jizọs, sị: “Lee! Anyị hapụrụ ihe niile, anyị anọwokwa na-eso gị.” (Mak 10:28) N’eziokwu, ndịozi ma na ọ ga-abara ha ezigbo uru ma Jizọs bụrụ onye ndú ha, ọ bụ ya mere ha ji jiri obi ha dum hapụ ihe ndị ọzọ ka ha nwee ike iso ya.—Mat. 4:18-22.

Na-erubere Ndị Na-anọchite Anya Kraịst Isi

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, o kwuru ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi na-eso ya. Ọ sịrị: “Onye na-anabata onye ọ bụla nke m zitere na-anabatakwa m.” (Jọn 13:20) N’eziokwu, Jizọs kwuru na ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị na-anọchite anya ya, bụ “ụmụnna” ya. (Mat. 25:40) Mgbe Jizọs rịgooro eluigwe oge a kpọlitechara ya n’ọnwụ, a họpụtara “ụmụnna” ya ka ha na-arụ ọrụ ya, ka ha bụrụ ndị nnọchiteanya nọ “n’ọnọdụ Kraịst,” ndị na-agwa ndị ọzọ ka ha na Jehova Chineke dịrị ná mma. (2 Kọr. 5:18-20) Ọ bụrụ na anyị erubere “ụmụnna” Kraịst isi, anyị na-egosi na anyị kwere ka Kraịst na-edu anyị.

Anyị kwesịrị ichebara otú anyị si ewere ndụmọdụ ndị bịara n’oge kwesịrị ekwesị, bụ́ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ echiche, ndị dị n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Akwụkwọ Nsọ, na-agakwa ọmụmụ ihe dị iche iche, a na-echetara anyị ihe dị iche iche Kraịst kwuru. (2 Pita 3:1, 2) Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka nri ime mmụọ ndị a a na-enye anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eri ha mgbe niile. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e kwuo okwu banyere otu ihe ugboro ugboro? Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke gwara Ndị Kraịst ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Ọ karịala otu narị afọ e kwuwere nke a n’Ụlọ Nche. Ụmụnna Kraịst na-egosi na ha hụrụ anyị n’anya nakwa na ha achọghị ka ihe ọ bụla mee adịm ná mma anyị na Chineke site n’ibipụta isiokwu ndị kwuru banyere mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye naanị n’ime Onyenwe anyị nakwa isiokwu ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a ha na-agwa anyị, ọ bụ otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi na anyị na-eso Onye ndú anyị zuru okè, bụ́ Jizọs Kraịst.

Ilu 4:18 kwuru, sị: “Ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” N’eziokwu, Jizọs na-edu anyị na-aga n’ihu. Ụzọ ọzọ anyị si erubere “ụmụnna” Kraịst isi bụ ịnabata mgbanwe ọ bụla e mere n’otú e si ghọta eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta.—Mat. 24:45.

Anyị na-egosikwa na anyị na-erubere “ụmụnna” Kraịst isi ma ọ bụrụ na anyị na-erubere ndị okenye isi. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche.” (Hib. 13:17) Dị ka ihe atụ, okenye nwere ike ịgba anyị ume ka anyị na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya ma ọ bụkwanụ o nwere ike ịgwa anyị ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime ka ozi anyị kakwuo mma. Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere ike iji Akwụkwọ Nsọ gwa anyị ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ụfọdụ e ji mara Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọ gwara anyị, anyị na-egosi na anyị na-eso Jizọs, bụ́ Onye ndú anyị.

Ọ dị mwute na ụwa enweghị ezigbo ndị ndú. Ma, obi dị anyị ụtọ iso Kraịst n’ihi na o ji ịhụnanya na-edu anyị. Ka anyị mee ike anyị niile na-erubere Onye ndú anyị na ndị o ji na-edu anyị taa isi.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ị̀ na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke bụ́ ka gị na onye na-ekweghị ekwe ghara ikekọta onwe unu?