Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Chineke Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ n’Eziokwu?

Okwu Chineke Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ n’Eziokwu?

Okwu Chineke Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ n’Eziokwu?

LORRAINE kwuru, sị: “Mgbe m malitere ịgụchi Baịbụl anya, ọ na-ara m ahụ́, kama ịtọ m ụtọ. Ọ na-esiri m ike ịghọta ihe m na-agụ. Nke a na-emekarị ka uche m ghara ịdị n’ihe m na-agụ.”

Ndị ọzọ kwukwara na ịgụ Baịbụl atọghị hanwa ụtọ mgbe ha malitere ịgụchi ya anya. N’agbanyeghị nke a, ha nwere ndidi na-agụ ya n’ihi na ha ma na ime nke a bụ ihe ziri ezi. Marc kwuru, sị: “Ọ na-adịkarị mfe ihe ndị ọzọ ịdọpụ mmadụ uche mgbe ọ na-agụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ mgbe ọ na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. M kpehiri ekpere nne ma gbasie mbọ ike tupu mụ enwee ike ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị.”

Gịnị ka i nwere ike ime ka i wee jirikwuo Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe? Olee otú ịgụ ya ga-esi na-atọ gị ụtọ? Tụlee aro ndị na-esonụ.

Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị I Nwere Ike Inwe na Otú Ị Ga-esi Eru Ha

Kpee ekpere tupu ị malite ịgụ Baịbụl, ekwekwala ka ihe ọ bụla dọpụta uche gị n’ihe ị na-agụ. Rịọ Jehova ka o mee ka ịmụ Okwu ya na-enu gị enu n’obi. Rịọ ya ka o mee ka i nwee ike ịghọtakwu amamihe ya. (Ọma 119:34) Ọ bụrụ na ị naghị eme ihe abụọ a, i nwere ike ịna-amụ Baịbụl naanị iji mezuo iwu, o nwekwara ike ịgwụ gị ike n’oge na-adịghị anya. Lynn sịrị: “Mgbe ụfọdụ, o nweghị ihe dị mkpa m na-aghọta n’ihe m gụrụ n’ihi na m gụrụ ihe ahụ ọkụ ọkụ. Ọtụtụ mgbe, anaghị m aghọta ọkpụrụkpụ ihe dị n’ihe m na-agụ. Ma, m kpere ekpere ka Jehova mee ka m nwee njide onwe onye, nke a mekwara ka uche m na-adị n’ihe m na-amụ.”

Jiri ihe ị na-amụ kpọrọ ihe. Cheta na ịghọta eziokwu dị na Baịbụl na ime ya eme ga-eme ka i nweta ndụ. N’ihi ya, gbasie mbọ ike ka ị chọpụta ihe ndị ga-enyere gị aka imezi ihe ndị ị na-anaghị emete ma malite ime ha eme. Chris sịrị: “M na-achọ ihe ndị ga-enyere m aka ịmata àgwà ọjọọ m na-akpa nakwa echiche na-ezighị ezi m nwere. Obi na-adị m ụtọ ma m hụ ihe ndị ga-enyere m aka na Baịbụl nakwa n’ọtụtụ akwụkwọ anyị, n’agbanyeghị na ndị dere ha amaghị onye m bụ.”

Nwee ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-eruli. Gbaa mbọ ka ị mụta ihe ọhụrụ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ị ga-ahụ ihe dị mma a kọrọ banyere ọtụtụ n’ime ha ma ọ bụrụ na ị gụọ Insight on the Scriptures ma ọ bụ jiri Watch Tower Publications Index chọta akwụkwọ ị ga-agụ banyere ha. Ọ bụrụ na o doo gị anya na ndị ikom na ndị inyom dị iche iche a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ ndị dị ka anyị n’eziokwu, ịmụ banyere otú ha si bie ndụ ga-abara gị uru.

Chọpụta ụzọ ọhụrụ gị na ndị ị na-ezi ozi ọma ga-esi na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:2, 3) Sophia na-ebu nke a n’uche mgbe ọ na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ sịrị: “M na-achọ ịmara ụzọ ọhụrụ mụ na ndị m na-ezi ozi ọma ga-esi na-atụgharị uche nakwa otú m ga-esi na-eme nke a ma mgbe m nọ ozi ọma ma n’oge ndị ọzọ, ka m wee na-akọwa eziokwu dị na Baịbụl nke ọma. Ụlọ Nche na-enyere m nnọọ aka ime nke a.”—2 Tim. 2:15.

Were ya na ị nọ mgbe ihe a na-akọ mere. Ndị Hibru 4:12 kwuru, sị: “Okwu Chineke dị ndụ.” Ka ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, ka ihe ị na-agụ dịrị gị n’obi. Ihe ga-eme ka ọ dịrị gị n’obi bụ ma i were ya ka ị̀ na-ahụ ihe ndị nọ n’oge ahụ na-ahụ. Gbaa mbọ ka ị nụ ihe ha nụrụ, ka ihe ahụ metụ gị n’ahụ́ otú o si metụ ha n’ahụ́. Jiri ihe mere ha tụnyere ihe merela gị. Mụta ihe n’otú ha si mee ihe ụfọdụ bịara ha ná ndụ. Nke a ga-eme ka ị na-aghọtakwu akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl, na-echetakwa ha.

Wepụta oge iji mụọ ihe ndị siri ike dị n’Akwụkwọ Nsọ ka i wee ghọta ha nke ọma. Jiri oge hiri nne na-amụ ihe mgbe ọ bụla ị chọrọ ịmụ ihe. Ka ị na-eme nke a, i nwere ike ịhụ ihe ndị siri ike nghọta, bụ́ ndị ị ga-emere nchọnchọ. Chọọ okwu ndị ị na-amaghị ihe ha pụtara n’akwụkwọ ọkọwa okwu, tụlee ihe ihe e dere n’ala ala peeji Baịbụl na-ekwu, tụleekwa ntụaka etiti peeji Baịbụl. Ọ bụrụ na ị na-aghọtakwu ihe ị na-agụ ma na-emekwu ya eme, Okwu Chineke ga na-atọkwu gị ụtọ. Nke a ga-eme ka i nwee ike ikwu ka otu ọbụ abụ, bụ́ onye sịrị: “Ewerewo m ihe ncheta gị [Jehova] ka ọ bụrụ ihe onwunwe m ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ọ bụ ihe na-enye obi m aṅụrị.”—Ọma 119:111.

Ị gụwa ihe, agụla ya ọkụ ọkụ. Ejila oge gị niile na-enwe naanị ọmụmụ ihe onwe onye. Wepụta oge ị ga-eji na-atụle ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Raquel kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, ahụ́ anaghị eru m ala, nke a na-emekwa ka uche m ghara ịdị n’ihe m na-amụ. N’ihi ya, iji ntakịrị oge na-amụ ihe na-akara m mma. Nke a na-eme ka m na-erite uru dị ukwuu n’ihe m na-amụ.” Chris kwuru, sị: “Akọnuche m na-ama m ikpe mgbe ọ bụla m gụrụ ihe ọkụ ọkụ n’ihi na o nweghị oké ihe m na-aghọta. Ihe ahụ m gụrụ anaghị aba m n’obi.” Ya mere, jiri ya nwayọọ mgbe ị na-agụ ihe.

Ka Okwu Chineke na-agụkwu gị agụụ. Pita onyeozi kwuru, sị: ‘Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dị n’okwu Chineke na-agụ unu agụụ, ka unu wee site na ya toruo nzọpụta.’ (1 Pita 2:2) Ụmụaka e ku n’aka anaghị amụ otú mmiri ara ga-esi na-agụ ha agụụ. Ọ na-amalite ịgụ ha ozugbo a mụrụ ha. Ma, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na anyị kwesịrị ikwe ka Okwu Chineke na-agụ anyị agụụ. Ọ bụrụ na ị na-agụ naanị otu peeji na Baịbụl kwa ụbọchị, agụụ Okwu Chineke ga-amalite ịgụ gị. N’oge na-adịghị anya, ihe yiri ka ọ na-esiri gị ike na mbụ ga-amalite ịtọ gị ụtọ.

Na-atụgharị uche n’amaokwu ndị ị gụrụ. Ị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na ị na-atụgharị uche n’ihe ị gụrụ. Nke a ga-enyere gị aka ịghọta otú ihe ndị ị mụtara na Baịbụl si kwekọọ n’ibe ha. N’oge na-adịghị anya, ị ga-enwe amamihe hiri nne banyere Chineke, nke bụ́ ihe onwunwe magburu onwe ya.—Ọma 19:14; Ilu 3:3.

Oge I Ji Amụ Ihe Efughị Ọhịa

Mmadụ ga-agbasirịrị mbọ ike tupu ọ malite ịmụchi ihe anya, ma, nke a na-eweta ọtụtụ ngọzi. Ị ga-amalite ịghọta ọtụtụ ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Hib. 5:12-14) Nghọta na amamihe ị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee ga-eme ka i nwee obi ụtọ na udo. Amamihe nke dị n’Okwu Chineke bụụrụ ndị na-agụ Baịbụl ma kwere ka ọ gbanwee ndụ ha “osisi nke ndụ.”—Ilu 3:13-18.

I nwere ike inwe obi nke na-aghọta ihe ma ọ bụrụ na ị na-amụ Okwu Chineke nke ọma. (Ilu 15:14) Nke a ga-enyere gị aka iji obi gị dum nye ndị ọzọ ndụmọdụ sitere na Baịbụl. Ọ bụrụ na ihe na-enyere gị aka ime mkpebi bụ ihe ị gụtara ma n’Akwụkwọ Nsọ ma n’akwụkwọ dị iche iche “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-ebipụta, ị ga na-enwe obi ụtọ, ahụ́ ga-erukwa gị ala otú ọ na-eru ndị Okwu Jehova na-akpa ike n’ahụ́ ha. (Mat. 24:45) Ị ga na-ele ihe anya otú dị mma, na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma, otú i si eche echiche, otú i si eme ihe nakwa otú i si ekwu okwu ga-adị iche na nke onye na-anaghị agụ Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na ihe niile anyị na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma ga-agakwa nke ọma.—Ọma 1:2, 3.

Otú i si hụ nnọọ Chineke n’anya ga-eme ka ị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya. Nke a ga na-emekwa gị ezigbo obi ụtọ. Sophia na-agbasi mbọ ike icheta ọtụtụ amaokwu Baịbụl nakwa iji ha na-ekwusa ozi ọma otú ga-amasị ndị ọ na-ezi ozi ọma, nke a na-eme ka ndị ọ na-ezi ozi ọma na-aghọta ihe ọ na-ekwu, ya ana-atọkwa ha ụtọ. Sophia sịrị: “Obi na-adị m ụtọ mgbe m hụrụ otú ndị mmadụ si nwee aṅụrị mgbe ha nụrụ ihe Baịbụl kwuru.”

E wezụga ihe ndị a niile, uru anyị kacha erite ma Okwu Chineke na-atọ anyị ụtọ bụ na anyị na Jehova na-adị ná mma. Ịmụ Baịbụl ga-enyere gị aka ịmata iwu Chineke, ọ ga-emekwa ka ị ghọtakwuo otú o si hụ anyị n’anya, otú o si emesapụ aka nakwa otú o si ekpe ikpe ziri. O nweghị ihe ọzọ ị ga-eme nke ka nke a mkpa ma ọ bụkwanụ nke ga-aka enye gị obi ụtọ. Na-amụsi Okwu Chineke ike. N’eziokwu, oge i ji eme nke a efughị ọhịa.—Ọma 19:7-11.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 5]

ỊGỤ OKWU CHINEKE: IHE MGBARU ỌSỌ NDỊ I NWERE IKE INWE NA OTÚ Ị GA-ESI ERU HA

▪ Kpee ekpere tupu ị malite ịgụ Baịbụl, ekwekwala ka ihe ọ bụla dọpụ uche gị n’ihe ị na-agụ.

▪ Jiri ihe ị na-amụ kpọrọ ihe.

▪ Nwee ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-eruli.

▪ Chọpụta ụzọ ọhụrụ gị na ndị ị na-ezi ozi ọma ga-esi na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ.

▪ Were na ị nọ ya mgbe ihe a na-akọ mere.

▪ Wepụta oge iji mụọ ihe ndị siri ike dị n’Akwụkwọ Nsọ ka i wee ghọta ha nke ọma.

▪ Ị gụwa ihe, agụla ya ọkụ ọkụ.

▪ Ka Okwu Chineke na-agụkwu gị agụụ.

▪ Na-atụgharị uche n’amaokwu ndị ị gụrụ.

[Foto dị na peeji nke 4]

Were ya na ihe mere onye ahụ ị na-agụ banyere ya na Baịbụl mere gịnwa