Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Ime Ndị Na-eto Eto Baptizim?

È Kwesịrị Ime Ndị Na-eto Eto Baptizim?

È Kwesịrị Ime Ndị Na-eto Eto Baptizim?

CARLOS, * bụ́ nna bụ́ Onye Kraịst nke bi na Filipinz, kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu na nwa m nwaanyị aghọọla ohu Jehova, amakwa m na obi dị yanwa ụtọ.” Otu nna bi na Gris dere, sị: “Obi dị mụ na nwunye m ụtọ na ụmụ anyị atọ ghọrọ Ndịàmà Jehova e mere baptizim mgbe ha ka na-eto eto. Ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ, obi dịkwa ha ụtọ na ha na-ejere Jehova ozi.”

O doro anya na nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-enwe ezigbo ọṅụ mgbe e mere ụmụ ha baptizim, ma, mgbe ụfọdụ, obi na-ekorokwa ha n’elu. Otu nne kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ ma ahụ́ erughị m ala.” Olee ihe mere obi ji dị ya otú a? O kwuru, sị: “Ama m na nwa m nwoke ga-azazi Jehova ajụjụ maka ihe ọ bụla o mere.”

Ndị niile na-eto eto kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha ghọọ Ndịàmà e mere baptizim na-ejere Jehova ozi. Ma, ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ama m na nwa m na-eme nke ọma, ma ọ̀ ga-enwe ike izere omume rụrụ arụ ma na-adị ọcha n’anya Jehova?’ Ndị ọzọ nwere ike ịna-ajụ onwe ha, sị, ‘Ọ bụrụ na e nwee ihe chọrọ ime ka nwa m chụwa akụnụba, ọ̀ ga-anọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ na-ejere Chineke ozi?’ N’ihi ya, olee ihe Baịbụl kwuru nke nwere ike inyere nne na nna aka ịma ma ụmụ ha hà adịla njikere ka e mee ha baptizim?

Iso Ụzọ Jizọs Bụ Ihe Kacha Mkpa

Okwu Chineke ekwughị kpọmkwem afọ ole mmadụ ga-adị tupu e mee ya baptizim, kama o kwuru onye ruru eru ka e mee ya baptizim. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim.” (Mat. 28:19) N’ihi ya, baptizim bụ maka ndị ghọrọla ndị na-eso ụzọ Kraịst.

Ònye bụ onye na-eso ụzọ? Akwụkwọ anyị bụ́ Insight on the Scriptures kọwara nke a. Ọ sịrị: “Ndị a na-akpọkarị ndị na-eso ụzọ bụ ndị niile kweere n’ihe Kraịst kụziri, na-emekwa ha eme.” Ndị na-eto eto hà nwere ike ịghọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst? Otu nwanna nwaanyị nke jerela ozi ala ọzọ ihe karịrị afọ iri anọ na Latịn Amerịka dere banyere ya na ụmụnne ya nwaanyị abụọ, sị: “Anyị etoruola ịma na anyị chọrọ ijere Jehova ozi na ịma na anyị chọrọ ibi na Paradaịs. Nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova mere ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa ndị bịaara anyị mgbe anyị na-eto eto. Anyị anaghị akwa ụta na anyị raara onwe anyị nye Chineke mgbe anyị ka na-eto eto.”

Olee otú ị ga-esi mara ma nwa gị ọ̀ ghọọla onye na-eso ụzọ Kraịst? Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” (Ilu 20:11) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ ọ ga-abụ onye na-eto eto na-eme, ya egosi na ọ bụ onye na-eso ụzọ Kraịst nke na-eme ka ‘ọganihu ya pụta ìhè.’—1 Tim. 4:15.

Ihe Na-egosi na Nwata Aghọọla Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

Nwa gị ọ̀ na-erubere gị isi? (Kọl. 3:20) Ọ̀ na-arụ ọrụ e nyere ya n’ụlọ? Baịbụl kwuru ihe Jizọs na-eme mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Ọ sịrị: “Ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru [nne na nna ya].” (Luk 2:51) O doro anya na e nweghị nwatakịrị na-erubere nne na nna ya isi mgbe niile taa. Ma, e nyere ezi Ndị Kraịst iwu ka ha “sochie nzọụkwụ [Jizọs] anya.” N’ihi ya, ndị na-eto eto, bụ́ ndị chọrọ ka e mee ha baptizim, kwesịrị ịbụ ndị a maara na ha na-erubere ndị mụrụ ha isi.—1 Pita 2:21.

Tụlee ajụjụ ndị a: Nwa gị ọ̀ na-agachi ozi ọma anya, si otú ahụ na-egosi na ‘ò bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ’? (Mat. 6:33) Ọ̀ na-enwe mmasị izi ndị ọzọ ozi ọma, ka ọ̀ na-afọ obere ka ọ bụrụ na ị na-amanye ya amanye ịga ozi ọma na izi ndị mmadụ ozi ọma? Ebe ọ bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ̀ na-eme ihe ndị a chọrọ ya n’aka? Ọ̀ na-enwe mmasị ịga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị o ziri ozi ọma? Ọ̀ na-eme ka ụmụ akwụkwọ ibe ya na ndị nkụzi ya mara na ọ bụ Onyeàmà Jehova?

Ò ji ịga ọmụmụ ihe kpọrọ ihe? (Ọma 122:1) Ọ̀ na-atọ ya ụtọ ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ? Ọ̀ na-eji ịnụ ọkụ n’obi eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?—Hib. 10:24, 25.

Ọ̀ na-agba mbọ ka ya na ndị na-eme omume ọjọọ n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ ghara ịna-akpakọrịta ka o nwee ike ịna-eme omume dị mma? (Ilu 13:20) Olee ụdị egwú ndị ọ na-ege, olee ụdị fim ndị ọ na-ele, olee ụdị ihe ndị ọ na-ekiri na tiivi, olee ụdị egwuregwu vidio ndị ọ na-egwu, na ụdị ebe ọ na-enwe mmasị ịga n’Ịntanet? Okwu ọnụ ya na omume ya hà na-egosi na ọ chọrọ ime ihe Baịbụl kwuru?

Olee otú nwa gị maruru Baịbụl? Ò nwere ike iji okwu nke aka ya kọwaa ihe ọ mụtara n’Ofufe Ezinụlọ unu? Ọ̀ ga-akọwali eziokwu Baịbụl ndị bụ́ isi? (Ilu 2:6-9) Ọ̀ na-atọ ya ụtọ ịgụ Baịbụl na ịmụ akwụkwọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, bipụtara? (Mat. 24:45) Ọ̀ na-ajụ ajụjụ iji ghọta ozizi Baịbụl na amaokwu ndị na-edoghị ya anya?

Ajụjụ ndị a nwere ike inyere gị aka ịghọta otú nwa gị nwerurula ọganihu ime mmụọ. Mgbe ị tụlechara ajụjụ ndị a, i nwere ike ịchọpụta na e nwere ebe ụfọdụ o kwesịrị imezikwu ihe tupu e mee ya baptizim. Ma, ọ bụrụ na otú o si ebi ndụ egosi na ọ ghọọla onye na-eso ụzọ nakwa na ọ rarala ndụ ya nye Chineke, i nwere ike ịhapụ ya ka e mee ya baptizim.

Ndị Na-eto Eto Ga-etoli Jehova

Ọtụtụ ndị ohu Chineke malitere ikwesị ntụkwasị obi na ịkwụsi ike n’akụkụ Chineke mgbe ha na-eto eto. Chee banyere Josef, Samuel, Josaya, na Jizọs. (Jen. 37:2; 39:1-3; 1 Sam. 1:24-28; 2:18-20; 2 Ihe 34:1-3; Luk 2:42-49) Ọ ga-abụkwa na a zụziri ụmụ Filip anọ na-ebu amụma azụzi site na nwata.—Ọrụ 21:8, 9.

Otu Onyeàmà bi na Gris kwuru, sị: “E mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na abụọ. Akwatụbeghị m ụta na m mere mkpebi ahụ. Afọ iri abụọ na anọ agaala kemgbe ahụ, ejikwa m afọ iri abụọ na atọ n’ime ha jee ozi oge niile. Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ nyeere m aka imeri nsogbu niile m nwere mgbe m na-eto eto. Mgbe m dị afọ iri na abụọ, amaghị m Akwụkwọ Nsọ otú m ma ya ugbu a. Ma amaara m na m hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. Obi dị m ụtọ na ọ na-enyere m aka ịnọgide na-ejere ya ozi.”

E kwesịrị ime onye ọ bụla gosirila na ya aghọọla ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst baptizim, ma ọ̀ bụ nwata ma ọ̀ bụ okenye. Pọl onyeozi dere, sị: “Mmadụ na-eji obi enwe okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” (Rom 10:10) Mgbe e mere onye na-eto eto na-eso ụzọ Kraịst baptizim, nke bụ́ ihe dị oké mkpa, ya na ndị mụrụ ya emeela ihe bara ezigbo uru. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị, ma ọ bụ nwa gị, inwe ọṅụ a na-enwe ma e mee mmadụ baptizim.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe dị na peeji nke 5]

Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Baptizim Anya

Ụfọdụ ndị nne na nna na-ewere ya na ọ bara uru ma e mee ụmụ ha baptizim ma na o nwere ike itinye ha ná nsogbu, otú ahụ ịmụta ịnya ụgbọala nwere ike ime ka mmadụ nwee ihe ọghọm okporo ụzọ. Ma, baptizim na ijere Chineke ozi ọ̀ na-egbochi mmadụ inwe ihe ịga nke ọma? Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ dịghị otú ahụ. Ilu 10:22 kwuru, sị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.” Pọl degaara nwa okorobịa bụ́ Timoti akwụkwọ, sị: “N’ezie, nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.”—1 Tim. 6:6.

N’eziokwu, ọ dịghị mfe ijere Jehova ozi. Jeremaya nwere ọtụtụ ihe isi ike mgbe ọ na-ebu amụma n’aha Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, o dere banyere ofufe ọ na-efe Chineke, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha.” (Jere. 15:16) Jeremaya maara na ijere Chineke ozi na-enye ya ọṅụ. Ma, ụwa Setan na-eme ka ihe na-esiri mmadụ ike. Ndị nne na nna kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịghọta nke a.—Jere. 1:19.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Nwa M Ò Kwesịrị Iyigharị Mgbe A Ga-eme Ya Baptizim?

Mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna nwere ike ikpebi iyigharị mgbe a ga-eme ụmụ ha baptizim n’agbanyeghị na ha ruru eru ka e mee ha baptizim. Olee ihe nwere ike ime ka ha mee nke a?

Egwu na-atụ m na ọ bụrụ na e mee nwa m baptizim, o nwere ike ime mmehie dị oké njọ a chụọ ya n’ọgbakọ. Ànyị kwesịrị iche na onye na-eto eto nke na-eyigharị mgbe a ga-eme ya baptizim agaghị aza Chineke ajụjụ maka otú o si kpaa àgwà? Sọlọmọn gwara ndị na-eto eto, sị: “Mara na ezi Chineke ga-ekpe gị ikpe n’ihi [ihe ndị i mere].” (Ekli. 11:9) Pọl chetaara onye ọ bụla, ma nwata ma okenye, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Rom 14:12.

Onye ọ bụla na-efe Chineke, ma onye e merela baptizim ma onye a na-emebeghị, ga-aza Chineke ajụjụ. Echefula na otú Jehova si echebe ndị ohu ya bụ na ‘ọ naghị ekwe ka a nwaa ha gabiga ihe ha pụrụ idi.’ (1 Kọr. 10:13) Ọ bụrụhaala na ha ‘enwee uche ziri ezi’ ma ghara ikwe ka a nwata ha, Chineke ga-enyere ha aka. (1 Pita 5:6-9) Otu nne bụ́ Onye Kraịst dere, sị: “Ụmụaka ndị e mere baptizim nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa a. Nwa m nwoke, bụ́ onye e mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na ise, weere na baptizim na-echebe mmadụ. O kwuru, sị: ‘Ọ na-eme ka mmadụ ghara iche echiche imebi iwu Jehova.’ Baptizim na-eme ka mmadụ kpebisie ike ime ezi omume.”

Ọ bụrụ na ị kụzierela ụmụ gị ka ha na-erubere Jehova isi, gosikwa ha otú ha ga-esi na-eme nke a, obi ga-esi gị ike na ha ga na-eme otú a mgbe e mechara ha baptizim. Ilu 20:7 kwuru, sị: “Onye ezi omume na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ya. Obi ụtọ na-adịrị ụmụ ya ndị ga-anọ mgbe ọ nwụsịrị.”

E nwere ihe ụfọdụ m ga-achọ ka nwa m buru ụzọ mee. Ndị na-eto eto kwesịrị ịdị ike ọrụ ka ha nwee ike ịna-akpata ihe ha ga na-eri mgbe ha biiri onwe ha. Ma, ọ bụrụ na e mee ka ha bute agụmakwụkwọ na inwe ego ụzọ kama ibute ofufe Chineke ụzọ, o nwere ike ịkpatara ha nsogbu. Jizọs kwuru okwu banyere “mkpụrụ” nke Alaeze ahụ, ma ọ bụ okwu banyere Alaeze ahụ, nke na-etoghị eto, sị: “Ma nke ahụ a ghara n’etiti ogwu bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba na-akpagbu okwu ahụ, o wee ghọọ onye na-adịghị amị mkpụrụ.” (Mat. 13:22) Ọ bụrụ na nne na nna agbaa nwa ha ume ka o bute ihe nke ụwa ụzọ kama ihe ime mmụọ, ọ ga-eme ka mmasị o nwere ijere Chineke ozi nyụọ ka ọkụ.

Mgbe otu okenye nke jerela ozi ọtụtụ afọ na-ekwu banyere ndị na-eto eto ruru eru ka e mee ha baptizim ma ndị mụrụ ha ajụ, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na e gbochie onye na-eto eto ime baptizim, nke a nwere ike ime ka o jiri nwayọọ daa mbà n’ozi ọ na-ejere Jehova.” Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị dekwara, sị: “Ahụ́ agaghị na-eru onye ahụ na-eto eto ala, ọ ga na-adịkwa ya ka o nweghị uru ọ bara. O nwere ike itinye isi n’ụwa ka o nwee ike ime ihe a ga-eji na-anụ aha ya.”

[Foto]

È kwesịrị ibute mahadum ụzọ?

[Foto dị na peeji nke 3]

Onye na-eto eto nwere ike igosi na ya aghọọla onye na-eso ụzọ Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ịkwadebe ọmụmụ ihe na ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe

[Foto dị na peeji nke 4]

Irubere nne na nna isi

[Foto dị na peeji nke 4]

Ịga ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 4]

Ikpe ekpere