Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ

E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ

E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ

‘N’eziokwu, ozi ọma ahụ bụ ike Chineke maka nzọpụta.’—ROM 1:16.

1, 2. Gịnị mere i ji na-ekwusa “ozi ọma alaeze Chineke,” oleekwa ihe ndị ị na-ezikarị ndị mmadụ n’ozi ọma?

‘Ọ NA-ATỌ m ụtọ ikwusa ozi ọma kwa ụbọchị.’ Eleghị anya i chetụla ihe dị otú a ma ọ bụkwanụ kwuo ya ekwuo. Ebe ị bụ Onyeàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi, o doro anya na ị ma otú ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” Chineke dịruru mkpa. O nwere ike ị ga-agụli amụma Jizọs buru banyere nke a n’eleghị anya na Baịbụl.—Mat. 24:14.

2 Ọ bụrụ na ị na-ekwusa “ozi ọma alaeze Chineke,” ị na-arụ ọrụ Jizọs malitere. (Gụọ Luk 4:43.) O doro anya na otu n’ime ihe ị na-agwakarị ndị mmadụ bụ na Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya imezi ihe ndị na-adịghị mma n’ụwa a. Mgbe a ga-enwe “oké mkpagbu,” ọ ga-ebibi okpukpe ụgha ma kpochapụ ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa. (Mat. 24:21) O nwekwara ike ị na-agwa ndị mmadụ na Alaeze Chineke ga-eme ka e nweghachi Paradaịs n’ụwa ka udo na obi ụtọ nwee ike ịdị ebe niile. N’eziokwu, “ozi ọma alaeze Chineke” so ‘n’ozi ọma e bu ụzọ zie Ebreham, sị: “A ga-agọzi mba niile site na gị.”’—Gal. 3:8.

3. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na Pọl onyeozi kwusiri okwu ike banyere ozi ọma n’akwụkwọ Ndị Rom?

3 Ma, ọ̀ ga-abụ na e nwere otu ihe dị mkpa anyị na-anaghị elebachara anya banyere ozi ọma ahụ, bụ́kwanụ nke dị ndị mmadụ mkpa? Pọl onyeozi kpọrọ “alaeze” aha naanị otu ugboro n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, ma ọ kpọrọ “ozi ọma” aha ugboro iri na abụọ. (Gụọ Ndị Rom 14:17.) Olee ozi ọma Pọl kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ozi ahụ? Olee ihe mere ozi ọma ahụ ji dị ezigbo mkpa? Oleekwa ihe mere anyị ji kwesị iburu ya n’uche mgbe anyị na-ezi ndị nọ n’ókèala anyị “ozi ọma Chineke.”?—Mak 1:14; Rom 15:16; 1 Tesa. 2:2.

Ozi Ọma Ndị Nọ na Rom Kwesịrị Ịnụ

4. Olee ihe Pọl kwuru okwu ya mgbe mbụ a tụrụ ya mkpọrọ na Rom?

4 Ọ ga-abara anyị uru ma anyị cheta ihe ndị Pọl kwuru okwu ha mgbe mbụ a tụrụ ya mkpọrọ na Rom. Anyị gụrụ na mgbe ọtụtụ ndị Juu bịara leta ya, ọ gbara ‘àmà nke ọma banyere (1) alaeze Chineke, gwakwa ha okwu na-eru n’obi banyere (2) Jizọs.’ Gịnị meziri? “Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ndị a na-ekwu; ndị ọzọ ekweghị.” Mgbe e mechara, Pọl ‘ji obiọma na-anabata ndị niile bịakwutere ya, na-ekwusara ha (1) alaeze Chineke, na-ezikwa ihe banyere (2) Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.’ (Ọrụ 28:17, 23-31) O doro anya na Pọl kwusiri okwu ike banyere Alaeze Chineke. Ma, olee ihe ọzọ o kwusiri okwu ya ike? Ọ bụ ihe dị ezigbo mkpa n’okwu banyere Alaeze Chineke, ya bụ, ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke.

5. N’akwụkwọ Ndị Rom, gịnị ka Pọl kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịnụ?

5 Mmadụ niile kwesịrị ịma banyere Jizọs ma nwee okwukwe na ya. Pọl kwuru ihe mere nke a ji dị mkpa n’akwụkwọ Ndị Rom. Ná mmalite akwụkwọ Ndị Rom, o dere, sị: “Chineke, onye m ji mmụọ m na-ejere ozi dị nsọ site n’izisa ozi ọma banyere Ọkpara ya.” Ọ sịkwara: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” O mechakwara kwuo banyere “mgbe Chineke ga-esi n’aka Kraịst Jizọs kpee ihe nzuzo nke ụmụ mmadụ ikpe, dị ka ozi ọma ahụ m na-ezisa si dị.” O kwukwara, sị: “Malite na Jeruselem gazuo Ilirikọm, ekwusawo m ozi ọma banyere Kraịst nke ọma.” * (Rom 1:9, 16; 2:16; 15:19) Olee ihe i chere mere Pọl ji gwasie ndị Rom okwu ike banyere Jizọs Kraịst?

6, 7. Olee otú anyị chere ọgbakọ dị na Rom si malite, oleekwa ndị anyị chere na ha nọ na ya?

6 Anyị amaghị otú ọgbakọ dị na Rom si malite. Ọ̀ ga-abụ na ndị Juu ma ọ bụ ndị a tọghatara atọghata ndị nọ ya na Pentikọst 33 O.A. ghọrọ Ndị Kraịst ma laghachi na Rom? (Ọrụ 2:10) Ka ọ̀ ga-abụ na Ndị Kraịst na-azụ ahịa na ndị njem kwusara ozi ọma na Rom? Nke ọ bụla ọ sọrọ ya ya bụrụ, otu ihe doro anya bụ na ọ dịla anya ọgbakọ ahụ dịwara tupu Pọl edee akwụkwọ Ndị Rom ihe dị ka n’afọ 56 O.A. (Rom 1:8) Olee ụdị ndị nọ n’ọgbakọ ahụ?

7 Ụfọdụ bụ ndị Juu. Ebe ọ bụ na Pọl kpọrọ Andrọnaịkọs na Junias “ndị ikwu m” mgbe ọ sị ka e kelee ha, o nwere ike ịbụ na ha bụ ndị ikwu ya, bụ́ ndị Juu ibe ya. Akwịla, bụ́ onye na-akpa ákwà ụlọikwuu na Rom, na nwunye ya bụ́ Prisila, bụkwa ndị Juu. (Rom 4:1; 9:3, 4; 16:3, 7; Ọrụ 18:2) Ma, ọ ga-abụ na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ Pọl sị ka e keleere ya bụ ndị Jentaịl. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ ndị ọzọ bụ “ndị ezinụlọ Siza,” ikekwe ha bụ ndị ohu Siza na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụlọ ya.—Fil. 4:22; Rom 1:6; 11:13.

8. Olee nsogbu ndị nọ na Rom nwere?

8 E nwere otu nsogbu Onye Kraịst ọ bụla nọ na Rom nwere, onye ọ bụla n’ime anyị nwekwara nsogbu ahụ taa. Pọl kwuru ihe bụ́ nsogbu ahụ, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Rom 3:23) N’ihi ya, mmadụ niile na-agụ akwụkwọ ozi Pọl kwesịrị ịghọta na ha bụ ndị mmehie nakwa na ha kwesịrị inwe okwukwe n’onye Chineke nyere ha ka nsogbu ahụ nwee ike ịhapụ ha aka.

Ndị Mmadụ Kwesịrị Ịma na Ha Bụ Ndị Mmehie

9. Olee ihe Pọl kwuru na ozi ọma ahụ nwere ike ịrụpụta?

9 Ná mmalite akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Rom, o kwuru ihe ọma ozi ọma ahụ ọ na-ekwusa ga-arụpụta. Ọ sịrị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe, ibu ụzọ zọpụta ndị Juu, tinyere ndị Grik.” N’eziokwu, e nwere ike ịzọpụta ndị mmadụ. Ma, ha ga-ebu ụzọ gosi na ha nwere okwukwe. Nke a kwekọrọ n’eziokwu doro anya e dere na Habakọk 2:4, bụ́ nke Pọl kwughachiri, sị: “Onye ezi omume ga-esi n’okwukwe dị ndụ.” (Rom 1:16, 17; Gal. 3:11; Hib. 10:38) Ma, olee ihe gbasara ozi ọma ahụ nke nwere ike ime ka a zọpụta ndị mmadụ na eziokwu bụ́ na “mmadụ niile emehiewo”?

10, 11. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịghọta ihe ahụ e dere ná Ndị Rom 3:23 ma ọ naghị esiri ndị ọzọ ike?

10 Tupu mmadụ enwee okwukwe nke nwere ike ime ka a zọpụta ya, ọ ga-eburịrị ụzọ kweta na ya bụ onye mmehie. Nke a agaghị esiri ndị si ná nwata kwere na Chineke, marakwa ihe ụfọdụ dị na Baịbụl ike ikweta. (Gụọ Ekliziastis 7:20.) Ma hà kweere ma ọ̀ ka na-eme ha obi abụọ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha ma ihe Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Mmadụ niile emehiewo.” (Rom 3:23) Ma, ka anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị nwere ike ịhụ ọtụtụ ndị na-aghọtaghị ihe ahụ Pọl kwuru.

11 N’ala ụfọdụ, a kụzirighị ọtụtụ ndị na ha bu mmehie pụta ụwa. Ọ bụ eziokwu na ha nwere ike ịma na ha na-emehie ihe, nwee àgwà ụfọdụ na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o nweela mgbe ha mere ihe ọjọọ, hụkwa ka ndị ọzọ mere ihe ọjọọ, ma, n’ihi otú e si zụlite ha, ha aghọtachaghị ihe mere ha na ndị ọzọ ji eme ihe ndị a. N’eziokwu, e nwere asụsụ ụfọdụ ọ ga-abụ ị sị na mmadụ bụ onye mmehie, ndị ọzọ nwere ike iche na ihe ị na-ekwu bụ na ọ bụ omempụ, ma ọ bụkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, na o nwere iwu ọ dara. O doro anya na ọ ga-esiri onye e si otú a zụlite ike iche na ya bụ ụdị onye mmehie Pọl kwuru okwu ya.

12. Gịnị mere ọtụtụ ndị ekweghị na anyị niile bụ ndị mmehie?

12 Ná mba ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, e nwedịrị ndị na-ekweghị na ha bụ ndị mmehie. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, n’agbanyeghị na ha na-aga chọọchị mgbe ụfọdụ, ha weere akụkọ banyere Adam na Iv ka akụkọ ifo. Ndị ọzọ bụ ndị e si na nwata kụziwere na Chineke adịghị. Nke a mere ka ọ na-eme ha obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị, meekwa ka ha ghara ịghọta na Onye Kachasị Elu kwuru ụdị àgwà ụmụ mmadụ kwesịrị ịna-akpa nakwa na onye na-emeghị ihe o kwuru bụ onye mmehie. E nwere ike ikwu na ha dị ka ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ, bụ́ ndị Pọl kwuru na ha ‘enweghị olileanya’ nakwa na ha ‘enweghị Chineke.’—Efe. 2:12.

13, 14. (a) Olee otu ihe mere na ndị na-ekweghị na Chineke dị nakwa na ha bụ ndị mmehie enweghị ihe ngọpụ? (b) Olee ihe ọtụtụ ndị na-eme n’ihi na ha ekweghị na Chineke dị nakwa na ha bụ ndị mmehie?

13 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o kwuru ihe abụọ mere na ndị dịrị ndụ n’oge ya nakwa ndị dị ndụ n’oge a ekwesịghị ikwe ka otú e si zụlite ha mee ka ha kwere na Chineke adịghị. Nke mbụ bụ na ihe ndị e kere eke na-egosi na e nwere Onye Okike. (Gụọ Ndị Rom 1:19, 20.) Nke a kwekọrọ n’ihe Pọl kwuru mgbe ọ nọ na Rom degara ndị Hibru akwụkwọ ozi. Ọ sịrị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Hib. 3:4) Ihe a o kwuru gosiri na e nwere Onye Okike nke rụrụ eluigwe na ala, ma ọ bụ onye mere ka ha dịrị.

14 Ya mere, Pọl nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji kwuo n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom na onye ọ bụla, ma ndị Izrel oge ochie, nke na-efe ihe oyiyi na-adịghị ndụ “enweghị ihe ngọpụ.” Otú ahụkwa ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ha na ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ na-enweghị ihe ngọpụ. (Rom 1:22-27) Ihe Pọl kwuru banyere ihe a ha na-eme bụ eziokwu. Ọ sịrị na “ndị Juu na ndị Grik nọcha n’okpuru mmehie.”—Rom 3:9.

Ihe “Na-agba Àmà”

15. Olee ndị nwere akọnuche, oleekwa ihe nke a na-eme ka ha na-eme?

15 Akwụkwọ Ndị Rom kwuru ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji kwesị ịghọta na ha bụ ndị mmehie, nakwa na e kwesịrị ka a napụta ha n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya. Pọl dere banyere iwu Chineke nyere ndị Izrel oge ochie, sị: “A ga-ekpe ndị niile mehiere n’okpuru iwu ikpe site n’iwu.” (Rom 2:12) O kwukwara na ndị mba ọzọ, ma ọ bụ ndị si n’agbụrụ dị iche iche, bụ́ ndị na-amaghị iwu Chineke, “sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu.” Olee ihe mere ndị a ji kpọọ igbu mmadụ, izu ohi, na mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ asị? Pọl kwuru na ọ bụ n’ihi na ha nwere akọnuche.—Gụọ Ndị Rom 2:14, 15.

16. Olee ihe mere na na mmadụ nwere akọnuche apụtaghị na onye ahụ agaghị eme mmehie?

16 Ma, o nwere ike ị chọpụtala na na mmadụ nwere akọnuche nke na-agbara ya àmà apụtaghị na onye ahụ ga-eme ihe ọ gwara ya. Ihe ndị Izrel oge ochie mere gosiri na nke a bụ eziokwu. N’agbanyeghị na Chineke nyere ha akọnuche, nyekwa ha iwu ka ha ghara izu ohi nakwa ka ha ghara ịkwa iko, ọtụtụ mgbe, ha emeghị ihe akọnuche ha gwara ha na ihe Jehova nyere ha n’iwu. (Rom 2:21-23) Ha mere ihe na-adịghị akọnuche ha mma, mebiekwa iwu Chineke. N’ihi ya, ha bụ ndị mmehie, ha erughịkwa ihe Chineke chọrọ ha n’aka. Nke a mere ka ha na Onye Okike ha ghara ịdị ná mma.—Lev. 19:11; 20:10; Rom 3:20.

17. Olee otú akwụkwọ Ndị Rom si na-agba anyị ume?

17 Ihe ndị a anyị tụlere n’akwụkwọ Ndị Rom nwere ike ime ka anyị chewe na n’anya Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nke anyị na-eme agwụla. Ma, e nwere ihe ọzọ Pọl kwuru n’okwu a. Pọl onyeozi kwughachiri ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 32:1, 2. O dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a gbaghaara mmebi iwu ha na ndị e kpuchiri mmehie ha; obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-agaghị agụkọrọ mmehie ya ma ọlị.” (Rom 4:7, 8) N’eziokwu, Chineke ahaziela otú ọ ga-esi na-agbaghara anyị mmehie n’emebighị iwu ya.

Ozi Ọma Banyere Jizọs

18, 19. (a) Olee ozi ọma Pọl kwusiri okwu ya ike n’akwụkwọ Ndị Rom? (b) Gịnị ka anyị ga-aghọtarịrị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi ndị ga-adị n’Alaeze Chineke?

18 I nwere ike ikwu na ozi ọma banyere Jizọs bụ ozi ọma n’eziokwu. I kwuo otú a, i kwutere ya. Nke a na-echetara anyị ihe Pọl kwuru banyere ozi ọma ahụ n’akwụkwọ Ndị Rom. Dị ka anyị kwuru ná mmalite, Pọl dere, sị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.”—Rom 1:15, 16.

19 Ozi ọma ọ na-ekwu okwu ya bụ banyere ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke. Pọl tụrụ anya ‘ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esi n’aka Kraịst Jizọs kpee ihe nzuzo nke ụmụ mmadụ ikpe, dị ka ozi ọma ahụ si dị.’ (Rom 2:16) Pọl anaghị ekwu na “alaeze nke Kraịst na nke Chineke,” ma ọ bụkwanụ ihe Chineke ga-eji Alaeze ya rụzuo, adịghị mkpa. (Efe. 5:5) Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ma nweta ngọzi niile ga-adị n’Alaeze Chineke, anyị ga-aghọtarịrị na (1) anyị bụ ndị mmehie n’anya Chineke nakwa (2) ihe mere anyị ji kwesị inwe okwukwe na Jizọs Kraịst tupu a gbaghara anyị mmehie anyị. Ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe ndị a ha na nzube Chineke na-agakọ, kwere na ha, ghọtakwa ngọzi ndị ọ ga-enweta n’ọdịnihu, mgbe ahụ ka o nwere ike ikwu na ozi ọma banyere Jizọs bụ ozi ọma n’eziokwu.

20, 21. Mgbe anyị nọ n’ozi, olee ihe mere anyị ji kwesị iburu ozi ọma e kwusiri okwu ya ike n’akwụkwọ Ndị Rom n’uche, oleekwa ihe nke a nwere ike ịrụpụta?

20 Anyị kwesịrị icheta ozi ọma a Pọl kwusiri okwu ya ike mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma taa. Mgbe Pọl na-ekwu banyere Jizọs, o kwughachiri ihe Aịzaya kwuru. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye nwere okwukwe na ya nke a ga-emechu ihu.” (Rom 10:11; Aịza. 28:16) Ozi ọma banyere Jizọs nwere ike ọ gaghị abụrụ ndị maara ihe Baịbụl kwuru banyere mmehie ntị ọhụrụ. Ma, e nwere ndị ọzọ o nwere ike ịbụrụ ntị ọhụrụ n’ihi na ha anụtụbeghị banyere ya n’ebe ha bi, nweekwa ndị nke ha bụ na ha ekweghị na ya. Ọ bụrụ na ndị dị otú a emechaa kwere na Chineke, kwerekwa na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ eziokwu, anyị ga-akọwaziri ha ọrụ Jizọs na-arụ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú isi nke 5 nke akwụkwọ Ndị Rom si mee ka ọrụ Jizọs na-arụ pụta ìhè. Ịtụle nke a nwere ike ịbara gị uru mgbe ị na-aga ozi ọma.

21 N’eziokwu, anyị ga-enwe obi ụtọ ka anyị na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịghọta ozi ọma e kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Ndị Rom, ya bụ, ozi ọma nke bụ́ “n’eziokwu,  . .  ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” (Rom 1:16) E wezụga na nke a ga-eme anyị obi ụtọ, anyị ga-ahụkwa ka ndị ọzọ na-ekwere ihe e kwuru n’akwụkwọ Aịzaya, bụ́ nke Pọl kwughachiri ná Ndị Rom 10:15, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma si maa mma nke ukwuu!”—Aịza. 52:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Okwu ndị yiri okwu a dịkwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl.—Mak 1:1; Ọrụ 5:42; 1 Kọr. 9:12; Fil. 1:27.

Ì Chetara?

• Olee ozi ọma e kwusiri okwu ya ike n’akwụkwọ Ndị Rom?

• Olee ihe anyị kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ịghọta?

• Olee otú “ozi ọma banyere Kraịst” nwere ike isi wetara anyị na ndị ọzọ ngọzi?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ọrụ dị mkpa Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke so n’ozi ọma e kwusiri okwu ya ike n’akwụkwọ Ndị Rom

[Foto dị na peeji nke 9]

E nwere ihe anyị bu pụta ụwa nke na-akpata ọnwụ. Ọ bụ mmehie