Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Nke Unu Na-elekọta”

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Nke Unu Na-elekọta”

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Nke Unu Na-elekọta”

“Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha.”—1 PITA 5:2.

1. Olee nsogbu bịaara Ndị Kraịst n’oge Pita dere akwụkwọ ozi ya mbụ?

PITA onyeozi dere akwụkwọ ozi ya mbụ obere oge tupu Nero akpagbuwe Ndị Kraịst nọ na Rom. Ọ chọrọ iji ya gbaa ụmụnna ya ume. Ekwensu “na-ejegharị,” na-achọ iripịa Ndị Kraịst. Iji guzogide ya, ha ‘ga-enwerịrị uche ziri ezi’ ma ‘weda onwe ha ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.’ (1 Pita 5:6, 8) Ha kwesịkwara ịdị n’otu. Ugbu a abụghị oge ha ga ‘na-atarịta ibe ha arụ ma na-eripịarịta ibe ha,’ n’ihi na nke ahụ nwere ike ime ka ha ‘larịta ibe ha n’iyi.’—Gal. 5:15.

2, 3. Ònye ka anyị na ya kwesịrị ịna-agba mgba, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Anyị na-enwekwa nsogbu yiri nke ahụ taa. Ekwensu na-achọ otú ọ ga-esi eripịa anyị. (Mkpu. 12:12) N’oge na-adịghịkwa anya, a ga-enwe “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere.” (Mat. 24:21) Otú ahụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-ekwesịghị ịna-eserịta okwu ka anyịnwa na-ekwesịghịkwa ịna-eme. Ọ bụrụ na anyị agakwuru ndị okenye mgbe ụfọdụ, ha ga-enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịna-ese okwu.

3 Ka anyị tụlee otú ndị okenye nwere ike isi gosikwuo na ha ji ọrụ ịzụ ‘ìgwè atụrụ Chineke nke ha na-elekọta’ kpọrọ ihe. (1 Pita 5:2) E mechaa, anyị ga-eleba anya n’otú ndị okenye kwesịrị isi na-elekọta atụrụ Chineke. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú ndị nọ n’ọgbakọ ga-esi ‘na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti ha ùgwù, bụ́ ndị na-elekọta’ ha. (1 Tesa. 5:12) Ịtụle ihe ndị a ga-enyere anyị aka iguzogide Onye Mmegide anyị bụ́ isi, n’ihi na anyị ga-amata na ọ bụ ya ka anyị na ya kwesịrị ịgba mgba.—Efe. 6:12.

Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke

4, 5. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-ele ìgwè atụrụ ahụ anya? Nye ihe atụ.

4 Pita gbara ndị okenye e nwere n’ọgbakọ ndị dị na narị afọ mbụ ume ka ha na-ele atụrụ e nyere ha ilekọta anya otú Chineke si ele ha. (Gụọ 1 Pita 5:1, 2.) Ọ bụ eziokwu na e weere Pita ka ogidi n’ọgbakọ, ọ gwaghị ndị okenye okwu ka ọ̀ ka ha. Kama, o nyere ha ndụmọdụ ka ndị okenye ibe ya. (Gal. 2:9) Òtù Na-achị Isi nke taa na-eṅomi Pita. Ha na-agba ndị okenye ọgbakọ ume ka ha gbasie mbọ ike na-arụ ọrụ siri ike e nyere ha, nke bụ́ ịzụ ìgwè atụrụ Chineke.

5 Pita onyeozi dere na ndị okenye kwesịrị ‘ịzụ ìgwè atụrụ Chineke nke ha na-elekọta.’ Ha ekwesịtụghị ichefu na atụrụ ndị ha na-elekọta bụ nke Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Ndị okenye ga-aza Chineke ajụjụ otú ha si lekọta atụrụ ya. Ka e were ya na ezigbo enyi gị gwara gị ka i lekọtara ya ụmụ ya ka ya gaa ihe. Ọ̀ bụ na ị gaghị elekọta ha nke ọma, nyekwa ha nri? Ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa ọrịa, ị́ gaghị ahụ na e nyere ya ọgwụ ga-eme ka ọ gbakee? Otú ahụkwa ka ndị okenye si kwesị ‘ịna-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.’ (Ọrụ 20:28) Ha ekwesịghị ichefu na e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Kraịst Jizọs zụta atụrụ nke ọ bụla ha na-elekọta. Ebe ndị okenye ma na ha ga-aza Chineke ajụjụ, ha na-azụ ìgwè atụrụ ya, na-echebe ha, na-elekọtakwa ha.

6. Olee ihe ndị ọzụzụ atụrụ na-emere atụrụ ha n’oge ochie?

6 Chegodị ihe ndị ọzụzụ atụrụ e nwere n’oge e dere Baịbụl na-emere atụrụ ha. Ma anwụ ọ̀ na-achasi ike ma ezigbo oyi ọ̀ na-atụ, ha na-elekọta atụrụ ha. (Jen. 31:40) Ha na-adịdị njikere ịnwụ n’ihi atụrụ ha. Mgbe Devid dị obere, e nwere anụ ọhịa ndị ọ napụtara atụrụ nna ya n’ọnụ ha, ma ọdụm ma anụ ọhịa bea. Devid kwuru ihe o mere nke ọ bụla n’ime ha. Ọ sịrị na ya “jidere ya n’ọzà wee kụgbuo ya.” (1 Sam. 17:34, 35) Nke a gosiri nnọọ na o nwere obi ike. Ọ ga-abụrịrị na ọ fọrọ obere ka anụ ọhịa ahụ dọgbuo ya. Ma, nke a emeghị ka ọ ghara ịnapụta atụrụ ya.

7. Olee otú ndị okenye si anapụta atụrụ Chineke n’ọnụ Setan?

7 Taa, ndị okenye kwesịrị ịmụrụ anya ka Ekwensu ghara iripịa ìgwè atụrụ Chineke otú ọdụm si eripịa anụ. Mgbe ụfọdụ, ha ga-eji obi ike napụta atụrụ Chineke n’ọnụ Ekwensu. Ha na ụmụnna ndị Setan na-anwa ọnwụnwa nwere ike ịnọ kwurịta otú ha ga-esi merie Setan. (Gụọ Jud 22, 23.) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Jehova na-enyere ndị okenye aka ịnapụta atụrụ ya. Ha na-eji obi ebere enyere atụrụ merụrụ ahụ́ aka. Ha na-eke ya bandeeji, jirikwa Okwu Chineke ete ya ude na-ekpo ekpo.

8. Olee ebe ndị okenye na-edu ìgwè atụrụ ahụ aga, oleekwa otú ha si eme ya?

8 Onye ọzụzụ atụrụ na-eduru atụrụ ya aga ebe kwesịrị ekwesị ha ga-ata ahịhịa ndụ na ebe ha ga-aṅụ mmiri. Ndị okenye na-emere atụrụ Chineke ihe yiri nke a. Ha na-agba ha ume ka ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya ka ha nwee ike ‘inyeju ha afọ n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) E nwee ndị na-arịa ọrịa ime mmụọ, ndị okenye na-ewepụtakwu oge jiri nwayọọ na-agba ha ume ka ha rie nri ime mmụọ si n’Okwu Chineke. Atụrụ kpafuru akpafu nwere ike ịchọ ịlọghachi. Kama ịmaja nwanna ha, ndị okenye na-eji obi umeala akọwara ya ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị ga-enyere ya aka, ma gosi ya otú ọ ga-esi eme ha eme.

9, 10. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi nyere ndị na-arịa ọrịa ime mmụọ aka?

9 Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, olee ụdị dọkịta ị ga-achọ ka ọ gwọọ gị? Ọ̀ bụ onye ga-agwa gị ọgwụ ị ga-aṅụ n’ebughị ụzọ chere ka ị gwachaa ya otú o si eme gị, n’ihi na ọ na-achọ ịhụ onye ọrịa ọzọ na-eche ya? Ka ọ̀ bụ onye nke ga-eji ndidi jụta gị otú o si na-eme gị, kọwaara gị ihe na-enye gị nsogbu, gwazie gị ọgwụ ndị i nwere ike ịṅụ gbakee?

10 N’otú aka ahụ, ndị okenye kwesịrị ige ntị mgbe onye na-arịa ọrịa ime mmụọ na-akọ otú o si eme ya, nyere ya aka ịgbake, si otú ahụ ‘tee ya mmanụ n’aha Jehova.’ (Gụọ Jems 5:14, 15.) Okwu Chineke na-eme ka onye ọrịa gbakee, otú ahụ mmanụ bọlsọm si Gilied si eme. (Jere. 8:22; Ezik. 34:16) Ọ bụrụ na onye na-arịa ọrịa ime mmụọ emee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ya aka ịgbake, ọ ga-agbake. N’eziokwu, ndị okenye ga-aka enyere atụrụ na-arịa ọrịa aka ma ha bu ụzọ gee ntị mgbe ọ na-agwa ha nsogbu ya, ma kpee ekpere n’isi ya.

Ọ Bụghị ná Mmanye, Kama Jirinụ Obi Unu Na-azụ Ha

11. Gịnị mere ndị okenye ji eji obi ha azụ ìgwè atụrụ Chineke?

11 Ihe ọzọ Pita chetaara ndị okenye bụ otú ha kwesịrị isi na-azụ ìgwè atụrụ Chineke na otú ha na-ekwesịghị isi na-azụ ha. Ndị okenye kwesịrị ‘iji obi ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke, ọ bụghị ná mmanye.’ Gịnị na-eme ka ndị okenye jiri obi ha na-ejere ụmụnna ha ozi? Gịnị medịrị Pita ji zụọ atụrụ Jizọs? Ihe bụ́ isi mere o ji mee nke a bụ na ọ hụrụ Onyenwe anyị n’anya. (Jọn 21:15-17) Ndị okenye ‘anaghịzi adịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama, ha na-adịrị onye ahụ nwụrụ n’ihi ha ndụ’ n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ bụ n’ihi na ndị okenye hụrụ ma Jizọs ma Chineke ma ụmụnna ha n’anya mere ha ji ewepụta ume ha, ihe ndị ha nwere, na oge ha ejere ìgwè atụrụ ahụ ozi. (Mat. 22:37-39) Ha ji obi ha ewepụta onwe ha, ọ bụghị ná mmanye.

12. Olee otú Pọl gbaruru mbọ inyere ụmụnna ya aka?

12 Olee otú ndị okenye ga-ewepụtaru onwe ha na-azụ atụrụ Chineke? Ka ha na-azụ atụrụ Chineke, ha na-eṅomi Pọl onyeozi otú yanwa si ṅomie Jizọs. (1 Kọr. 11:1) Ọ masịrị Pọl onyeozi na ndị ha na ya so jee ozi ‘izi ụmụnna ha nọ na Tesalonaịka ozi ọma Chineke, nakwa inye ha mkpụrụ obi ha,’ n’ihi na ha hụrụ ụmụnna ndị ahụ n’anya. Ha na-eji nwayọọ eme nke a, “dị ka mgbe nne nke na-enye nwa ara na-elekọta ụmụ ya.” (1 Tesa. 2:7, 8) Pọl ghọtara otú nwa ọhụrụ si adị nne ya n’obi. Nne ahụ ga-emere nwa ya ihe ọ bụla, o nwedịrị ike ibili n’etiti abalị nye nwa ya ara.

13. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi hụ na ọrụ ọgbakọ egbochighị ha ịrụ ọrụ dịịrị ha n’ezinụlọ?

13 Ndị okenye kwesịrị ịhụ na ha ekweghị ka ọrụ ịzụ atụrụ ha na-arụ gbochie ha ịrụ ọrụ dịịrị ha n’ezinụlọ. (1 Tim. 5:8) Oge ndị okenye na-eji arụ ọrụ ọgbakọ bụ oge dị ezigbo mkpa ha na ezinụlọ ha gaara eji nọkọọ. Otu ụzọ okenye nwere ike isi hụ na ọ na-arụ ọrụ ya ma n’ọgbakọ ma n’ezinụlọ ya bụ ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro ezinụlọ ya mgbe ụfọdụ ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, otu okenye aha ya bụ Masanao, onye bi na Japan, na-akpọ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, nakwa ezinụlọ ndị nna ha na-anọghị n’ọgbakọ, ka ha bịa soro n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị ọmụmụ ihe ahụ nyeere aka ghọrọ ndị okenye ma na-eso ezi ihe nlereanya Masanao.

Ahụla Uru Aghụghọ n’Anya—Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke

14, 15. Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịkpachara anya ka ha ghara ‘ịhụ uru aghụghọ n’anya,’ oleekwa otú ha nwere ike isi ṅomie Pọl n’okwu a?

14 Pita gbakwara ndị okenye ume ka ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke, ‘ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi.’ N’agbanyeghị na ọrụ ndị okenye na-arụ na-ewe nnukwu oge, ha anaghị atụ anya ka a kwụọ ha ụgwọ. Pita chọpụtara na o kwesịrị ekwesị ka e chetara ndị okenye ibe ya ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke n’ihi na ha “hụrụ uru aghụghọ n’anya.” Ihe na-egosi na e nwere ihe nwere ike ime bụ otú ndị ndú okpukpe nke “Babịlọn Ukwu ahụ” si ebi ndụ ndị oké ozu ebe a na-echi ọtụtụ ndị ha na-elekọta ọnụ n’ala, ha abụrụkwa ndị ogbenye ọnụ ntụ. (Mkpu. 18:2, 3) E nwere ezigbo ihe mere ndị okenye taa ji kwesị ịkpachara anya ka a ghara inwe ụzọ ọ bụla ha ga-esi mee ka ndị ndú okpukpe a.

15 Pọl mere ihe ndị okenye niile kwesịrị iṅomi. N’agbanyeghị na ọ bụ onyeozi, nweekwa ike ‘ibo Ndị Kraịst bi na Tesalonaịka oké ibu arọ’ ma ya chọọ, o ‘righị nri onye ọ bụla n’efu.’ Kama nke ahụ, ọ ‘dọgburu onwe ya n’ọrụ, dọlịakwa abalị na ehihie.’ (2 Tesa. 3:8) Ọtụtụ ndị okenye taa, ma ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na-eme nke ọma na nke a. Ọ bụ eziokwu na obi na-adị ha ụtọ ma ụmụnna lee ha ọbịa, ha anaghị ‘ebo onye ọ bụla n’ime ha oké ibu arọ.’—1 Tesa. 2:9.

16. Gịnị ka iji ‘ịnụ ọkụ n’obi’ azụ ìgwè atụrụ Chineke pụtara?

16 Ndị okenye na-eji ‘ịnụ ọkụ n’obi’ azụ ìgwè atụrụ Chineke. Ihe na-egosi na ha na-anụ ọkụ n’obi bụ otú ha si ewepụta onwe ha enyere ìgwè atụrụ Chineke aka. Ma, nke ahụ apụtaghị na ha na-amanye ìgwè atụrụ Chineke ife Jehova; ndị okenye ndị hụrụ ụmụnna ha n’anya anaghịkwa eme ihe ga-eme ka ha na-asọrịta mpi n’ozi ha na-ejere Chineke. (Gal. 5:26) Ndị okenye ma na atụrụ ọ bụla dị iche n’ibe ya. Ọ dị ha ọkụ n’obi inyere ụmụnna ha aka ka ha jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.

Ọ Bụghị Ime Ka Ọ̀ Bụ Unu Nwe Ìgwè Atụrụ ahụ, Kama Ghọọrọnụ Ha Ihe Nlereanya

17, 18. (a) Gịnị mere o ji siere ndịozi Jizọs ike mgbe ụfọdụ ịghọta ihe Jizọs kụziri banyere ịdị umeala n’obi? (b) Oleekwa otú ihe mere ha nwere ike isi mee anyị taa?

17 Dị ka anyị kwurula, ndị okenye kwesịrị iburu n’obi na ìgwè atụrụ ha na-azụ bụ nke Chineke, ọ bụghị nke ha. Ha kwesịkwara ịkpachara anya ka ha ghara ‘ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ ha nwe ha.’ (Gụọ 1 Pita 5:3.) E nwere oge ndịozi Jizọs bu ihe na-adịghị mma n’obi chọọ inwe ihe ùgwù ije ozi. Ha chọrọ ịnọ n’ọkwà dị elu otú ndị na-achị mba dị iche iche si eme.—Gụọ Mak 10:42-45.

18 Taa, ụmụnna ndị ‘na-agbalị ka ha ruo eru ịbụ ndị nlekọta’ kwesịrị ichebara onwe ha echiche iji mara ihe mere ha ji na-agbalị ka ha ruo eru. (1 Tim. 3:1) Ndị ghọrọla ndị okenye kwesịrị ịjụ onwe ha ma hà na-achọ ịnọ n’isi ma ọ bụ ịbụ ndị a ma ama otú ahụ ụfọdụ ndịozi Jizọs chọrọ. Ebe ndịozi Jizọs nwere ụdị nsogbu a, ndị okenye kwesịrị ịma na ha ga-agbasi mbọ ike ka ịchị ndị ọzọ ghara ịna-agụ ha agụụ otú o si agụ ọtụtụ ndị n’ụwa.

19. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị icheta mgbe ha na-eme ihe ụfọdụ iji chebe ìgwè atụrụ Chineke?

19 N’eziokwu, o nwere mgbe ndị okenye kwesịrị ịdụsi ndị ọzọ ọdụ ike, dị ka mgbe ha na-echebe ìgwè atụrụ Chineke ka “anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri” ghara iripịa ha. (Ọrụ 20:28-30) Pọl gwara Taịtọs ka ọ “na-adụsikwa ọdụ ike ma na-adọ aka ná ntị.” (Taị. 2:15) Ma, n’agbanyeghị na ndị okenye nwere ike ime ihe abụọ ndị a, ha kwesịrị ịhụ na ha kwanyeere ndị ọ gbasara ùgwù. Ha kwesịrị ịghọta na iji obiọma na-adụ nwanna ọdụ, kama ịkatọ ya, ga-aka eru ya n’obi, ọ ga-akakwa eme ka ọ mụta ịna-eme ihe dị mma.

20. Olee otú ndị okenye ga-esi bụrụ ezigbo ihe nlereanya ka Jizọs?

20 Ezigbo ihe nlereanya Kraịst na-eme ka ndị okenye hụ ìgwè atụrụ Chineke n’anya. (Jọn 13:12-15) Obi na-atọ anyị ụtọ ka anyị na-agụ otú Jizọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekwusa ozi ọma na otú e si eme ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Otú o si dị umeala n’obi metụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’ahụ́ ma mee ka ha gbalịsie ike ‘ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka ha.’ (Fil. 2:3) Taakwa, ndị okenye na-agba mbọ ime ka Jizọs, ha na-agbakwa mbọ ịghọrọ “ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.”

21. Olee ụgwọ ọrụ ndị okenye na-atụ anya ya?

21 Ihe Pita ji mechie ndụmọdụ o nyere ndị okenye bụ nkwa Chineke kwere nke ọ ga-emezu n’ọdịnihu. (Gụọ 1 Pita 5:4.) Ndị okenye e tere mmanụ ‘ga-eso Kraịst nata okpueze ebube ahụ na-adịghị emebi emebi’ n’eluigwe. Ndị ọzụzụ atụrụ Chineke, ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ, ga-enwe ihe ùgwù nke ịzụ atụrụ Chineke ndị nọ n’ụwa mgbe “onyeisi ọzụzụ atụrụ” ahụ ga na-achị. (Jọn 10:16) N’isiokwu na-eso, anyị ga-atụle otú ndị nọ n’ọgbakọ ga-esi na-akwado ndị a họpụtara ka ha na-edu ndú.

Ntụleghachi

• Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka Pita nye ndị okenye ibe ya ndụmọdụ ka ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke ha na-elekọta?

• Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-azụ ndị na-arịa ọrịa ime mmụọ?

• Gịnị na-eme ka ndị okenye na-azụ ìgwè atụrụ Chineke nke ha na-elekọta?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị okenye nke oge a kwesịrị ịhụ na ha chebere “atụrụ” ndị e nyefere ha n’aka otú ahụ ndị ọzụzụ atụrụ si eme n’oge ochie