Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Banyela N’izu Ike Chineke?

Ị̀ Banyela N’izu Ike Chineke?

Ị̀ Banyela N’izu Ike Chineke?

“Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—HIB. 4:12.

1. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi banye n’izu ike Chineke taa, ma olee ihe mere nke a ji dị mfe ikwu ekwu karịa ime eme?

N’ISIOKWU bu nke a ụzọ, anyị chọpụtara na anyị nwere ike ịbanye n’izu ike Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-erubere ya isi ma na-eme ihe kwekọrọ ná nzube ya. Nke a dị mfe ikwu ekwu karịa ime eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị amata na e nwere ihe na-amasị anyị nke Jehova kpọrọ asị, o nwere ike isiri anyị ike ná mmalite ịhapụ ihe ahụ. Nke a na-egosi na anyị kwesịrị ịmụta ‘ịdị njikere irube isi.’ (Jems 3:17) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ nwere ike ịnwale ma ànyị ga-erubere Chineke isi n’ihe niile.

2, 3. Olee ihe anyị ga-agbasi mbọ ike na-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova na-adị ná mma?

2 Ọ bụrụ na e jiri Baịbụl nye gị ndụmọdụ, ị̀ na-anabata ya? Akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ uche Chineke ịchịkọtara onwe ya “ihe a na-achọsi ike nke mba niile.” (Hag. 2:7) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ n’ime anyị abụghị ihe a na-achọsi ike mgbe anyị malitere ịmụ Baịbụl. Ma, n’ihi na anyị hụrụ Chineke na Ọkpara ya n’anya, anyị gbanwere àgwà ụfọdụ na-adịghị mma anyị na-akpa ka ihe anyị nwee ike ịna-amasị Chineke. Anyị rịọkwara Jehova n’ekpere ka o nyere anyị aka ma gbasie mbọ ike kwụsị ịkpa àgwà ndị ahụ. N’ikpeazụ, e mere anyị baptizim, anyị na Chineke adịrịkwa ná mma.—Gụọ Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

3 Ma, baptizim e mere anyị emeghị ka anyị zuo okè. Anyị ga-anọgide na-agba mbọ ka anyị nwee ike ịna-akpa àgwà dị mma. Ma, Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-enyere anyị aka ime uche ya ma ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike.

Mgbe Ọ Dị Mkpa Ka E Nye Ndụmọdụ

4. Olee ụzọ atọ e nwere ike isi nye anyị ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ?

4 Tupu anyị enwee ike ịkwụsị ihe ụfọdụ na-adịghị mma anyị na-eme, anyị ga-ebu ụzọ mata ha. Okwu ihu ọha e kwuru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ otu isiokwu gbara n’otu n’ime akwụkwọ anyị, nke na-eme ka mmadụ chebara onwe ya echiche, nwere ike ime ka mmadụ mata ebe ọ na-anaghị eme nke ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị ihe e kwuru n’okwu ihu ọha, ma ọ bụkwanụ na anyị emeghị ihe anyị gụtara n’akwụkwọ anyị, Jehova nwere ike isi n’aka nwanna anyị mee ka anyị mata ebe anyị na-anaghị eme nke ọma.—Gụọ Ndị Galeshia 6:1.

5. Kwuo ụzọ ụfọdụ na-adịghị mma anyị nwere ike isi mee omume ma e nye anyị ndụmọdụ, kwuokwa ihe mere ndị okenye ji kwesị ịnọgide na-agba mbọ inyere anyị aka.

5 Ọ naghị adịrị anyị mfe ịnara ndụmọdụ mmadụ na-ezughị okè nyere anyị, n’agbanyeghị otú dị mma onye ahụ si nye ya. Ma, dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:1, Jehova nyere ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ iwu ka ha ‘gbalịa iji mmụọ dị nwayọọ’ na-agbazi anyị. Ọ bụrụ na anyị anabata ndụmọdụ ahụ, anyị ga-aghọkwu ihe a na-achọsi ike n’anya Chineke. Ọ bụ eziokwu na anyị na-agwakarị Chineke n’ekpere na anyị ezughị okè, ma, ọ na-esikarịrị anyị ike ikweta mmejọ anyị mgbe a gwara anyị ya. Ihe mbụ anyị na-achọkarị ime bụ ikwu ihe mere anyị ji mee ihe anyị mere, igosi na ihe anyị mere adịchaghị njọ, iche na onye ahụ bu ihe ọjọọ n’obi na-enye anyị ndụmọdụ, ma ọ bụkwanụ ikwu na otú onye ahụ si nye anyị ndụmọdụ ahụ adịghị anyị mma n’obi. (2 Eze 5:11) Iwe nwekwara ike iwe anyị ma ọ bụrụ na a gwa anyị ihe anyị na-achọghị ịnụ. Dị ka ihe atụ, iwe nwere ike iwe anyị ma a gwa anyị na onye ezinụlọ anyị na-akpa àgwà ọjọọ, na otú anyị si eji ejiji adịghị mma, na Jehova kpọrọ ihe anyị ji atụrụ ndụ asị, ma ọ bụ na anyị kwesịrị ịna-adịkwu ọcha. Ma, mgbe obi dajụrụ anyị, anyị na-achọpụtakarị na ihe ahụ a gwara anyị bụ eziokwu.

6. Olee otú okwu Chineke si eme ka a mata “echiche na ihe mmadụ bu n’obi”?

6 Amaokwu Baịbụl e ji malite isiokwu a na-echetara anyị na okwu Chineke “na-akpa ike.” N’eziokwu, okwu Chineke nwere ike ịgbanwe otú anyị si ebi ndụ. O nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị àgwà ndị na-adịghị mma anyị na-akpa kemgbe e mere anyị baptizim otú ahụ o si nyere anyị aka tupu e mee anyị baptizim. N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Hibru, o kwukwara na okwu Chineke “na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Hib. 4:12) “Mkpụrụ obi” a kpọrọ aha ebe a pụtara otú ndị mmadụ chere na anyị dị, ebe “mmụọ” pụtara otú anyị dị n’eziokwu. N’ihi ya, ihe Pọl na-ekwu bụ na ihe anyị na-eme mgbe anyị ghọtara ihe Chineke chọrọ ka anyị mee na-egosi ihe dị anyị n’obi. È nwere mgbe ihe ndị mmadụ chere na anyị bụ na-adị iche n’ihe anyị bụ n’eziokwu? (Gụọ Matiu 23:27, 28.) Chegodị ihe ị ga-eme n’ihe ndị anyị na-aga ịtụle ugbu a.

Soro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ

7, 8. (a) Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ekweghị ahapụ ihe e dere n’Iwu Mozis? (b) Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ha jụrụ ime ihe kwekọrọ ná nzube Jehova?

7 Ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịgụ ihe e dere n’Ilu 4:18 n’eleghị anya na Baịbụl, ya bụ, “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” Nke ahụ pụtara na ka oge na-aga, anyị ga na-aghọtakwu nzube Chineke, àgwà anyị ga na-akakwukwa mma.

8 Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe Jizọs nwụchara, o siiri ọtụtụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ike ịhapụ Iwu Mozis. (Ọrụ 21:20) Ọ bụ eziokwu na Pọl mere ka o doo anya na ọ bụghị iwu na Ndị Kraịst ga-edebe Iwu Mozis, ụfọdụ ndị ekweghị eme ihe ahụ Jehova chọrọ ka ha mee. (Kọl. 2:13-15) Ikekwe ha chere na ọ bụrụ na ha anọgide na-edebe ihe ụfọdụ e dere n’Iwu ahụ, a gaghị akpagbu ha. Ma, Pọl mere ka o doo Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru anya n’akwụkwọ ozi o degaara ha na ha agaghị abanye n’izu ike Chineke ma ọ bụrụ na ha ajụ ime ihe kwekọrọ ná nzube Chineke. * (Hib. 4:1, 2, 6; gụọ Ndị Hibru 4:11.) Ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na Jehova dịrị ná mma, ha kwesịrị ikweta na o sizi ụzọ ọzọ na-edu ndị ya.

9. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe a gbanwere otú e sibu kọwaa ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ?

9 N’oge a, e nweela ihe ndị e dere na Baịbụl a na-akọwa otú dị iche n’otú e sibu kọwaa ha. Nke a ekwesịghị inye anyị nsogbu n’obi; o kwesịrị ime ka anyị tụkwasịkwuo ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, obi. Ọ bụrụ na ndị na-anọchite anya “ohu” ahụ achọpụta na e nwere ihe ụfọdụ ha kwesịrị ime ka o dokwuo anya, ma ọ bụ na ha kwesịrị ịgbanwe otú ha sibu kọwaa ihe e dere na Baịbụl, ha na-ahụ na ha mere nke a. Ihe bụ mkpa ha bụ ime ihe kwekọrọ ná nzube Chineke, ọ bụghị ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma ha gbanwee ihe ụfọdụ ha kwuru. Olee ihe ị na-eme ma ọ bụrụ na a gbanwee otú e sibu kọwaa ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ?—Gụọ Luk 5:39.

10, 11. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ụfọdụ ụmụnna mere mgbe e kwuru ka a nwalee ụzọ ọhụrụ e si ekwusa ozi ọma?

10 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl ndị maara ekwu okwu nke ọma chere na otú ka mma ha ga-esi kwusaa ozi ọma ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa bụ ịnọ n’ikpo okwu na-ekwu okwu otú ga na-amasị ndị ha na-agwa okwu. Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’ikpo okwu na-agwa ìgwè mmadụ okwu, na-atọkwa ụfọdụ n’ime ha ụtọ ma ndị na-ege ha ntị too ha. Ma, ndị Jehova mechara ghọta na Jehova chọrọ ka ha kwusaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Ụfọdụ ndị ọkà okwu jụwapụrụ isi na ha agaghị eme nke a. Ha na-eme ka hà bụ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ma ọ bụ ndị ji ọrụ Onyenwe anyị kpọrọ ihe. Ma, ọ bụ mgbe o ruru n’ikwusa ozi ọma, bụ́ ihe Chineke chọrọ ka anyị mee, ka a matara ihe dị ha n’obi n’eziokwu. Olee otú ihe ahụ ha mere dị Jehova n’obi? Ọ dịghị ya mma n’obi. Ha mechara si n’ọgbakọ pụọ.—Mat. 10:1-6; Ọrụ 5:42; 20:20.

11 Nke a apụtaghị na ọ dịịrị ndị niile nọsiri ike n’ọgbakọ Jehova n’oge ahụ mfe ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O siiri ọtụtụ ndị ike ná mmalite. Ma, ha rubeere Chineke isi. Ka oge na-aga, obi bịara sikwuo ha ike, Jehova gọzikwara ha nke ukwuu. Olee ihe ị na-eme mgbe e kwuru ka a nwalee ụzọ ọhụrụ e si ekwusa ozi ọma nke ị na-emetụbeghị? Ị̀ na-adị njikere ịnwale ya?

Ọ Bụrụ na Onye Anyị Hụrụ n’Anya Ahapụ Ọgbakọ

12, 13. (a) Olee ihe mere Jehova ji chọọ ka a chụpụ onye mmehie na-achọghị ichegharị n’ọgbakọ? (b) Olee ule na-abịara ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ, oleekwa ihe mere ule a ji esi ezigbo ike?

12 O doro anya na anyị kweere na ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, anyị ga na-eme ihe o nyere anyị n’iwu, nke bụ́ ka anyị na-adị ọcha n’ụzọ niile. (Gụọ Taịtọs 2:14.) Ma, e nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime, bụ́ ndị ga-anwale ma ànyị nọsiri ike n’akụkụ Chineke n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu mkpụrụ nwa nwoke nke di na nwunye na-eme nke ọma n’ọgbakọ hapụrụ ọgbakọ. A chụrụ ya n’ọgbakọ n’ihi na “ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge” dị ya mkpa karịa adịm ná mma ya na Jehova nakwa nke ya na ndị mụrụ ya, bụ́ ndị na-efe Chineke.—Hib. 11:25.

13 Nke a gbawara ndị mụrụ ya obi. Ha maara ihe Baịbụl kwuru a ga-eme banyere onye a chụrụ n’ọgbakọ. Baịbụl sịrị: “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.” (1 Kọr. 5:11, 13) Ha ghọtakwara na onye ezinụlọ ha ọ bụla ha na ya bi so ‘n’onye ọ bụla’ e kwuru okwu ya n’amaokwu a. Ma, ha hụrụ nwa ha ahụ n’anya nke ukwuu. Otú ha si hụ ya n’anya nwere ike ime ka ha chewe, sị: ‘Olee otú anyị ga-esi nyere nwa anyị aka ka ọ laghachikwute Jehova ma ọ bụrụ na anyị na ya anaghị akpakọrịta? Ọ̀ bụ na anyị agaghị aka enyere ya aka ma ọ bụrụ na anyị na ya na-akpachi anya?’ *

14, 15. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị icheta mgbe ha na-achọ ikpebi ma hà na nwa ha a chụrụ n’ọgbakọ hà ga na-akpa?

14 Anyị na-emetere ndị nne na nna ụdị ihe a mere ebere. A sị kwuwe, nwa ha ahụ agaaraghị eme ihe ahụ ma a sị na ọ chọghị. Kama, ọ họọrọ ịna-eme omume ahụ na-adịghị mma kama ịchọ ka ya na nne na nna ya na ụmụnna ya nọgide na-adị ná mma. O nweghịkwanụ ihe ọzọ nne na nna ya gaara eme iji nyere ya aka. Ọ bụ ya mere obi ji chọọ ịgbawa ha.

15 Ma, gịnị ka nne na nna ahụ ga-emezi? Hà ga-eme ihe doro anya Jehova chọrọ ka ha mee? Ka hà ga-ekpebi na ha na nwa ha ahụ a chụrụ n’ọgbakọ ga-anọgide na-akpa, na-ewere ya na ọ bụ ihe ha kwesịrị imere ya n’ihi na ọ bụ onye ezinụlọ ha? Tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme, ha kwesịrị iburu n’uche otú ihe ha na-achọ ime ga-adị Jehova. Nzube ya bụ ime ka ọgbakọ ya dị ọcha na ime ka onye mmehie ghọta onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ya omume. Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-esi kwado Jehova?

16, 17. Gịnị ka ihe mere Erọn na-akụziri anyị?

16 E nwere mgbe nsogbu tara akpụ bịaara nwanne Mozis, bụ́ Erọn, n’ihi ihe mmadụ abụọ n’ime ụmụ ya mere. Chegodị otú obi dị ya mgbe ụmụ ya abụọ, bụ́ Nedab na Abaịhu, sureere Jehova ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị, Jehova egbuo ha. Nke a mere ka ha na ndị mụrụ ha ghara ịkpakọrịta ọzọ. Ma, e nwere ihe ọzọ merenụ. Jehova gwara Erọn na ụmụ ya ndị na-erubere Jehova isi, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi, unu adọwakwala uwe unu [n’ihi iru uju], ka unu ghara ịnwụ, ka [Jehova] gharakwa iweso nzukọ a dum iwe.” (Lev. 10:1-6) Ihe nke a pụtara doro anya. Anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya karịa ndị ezinụlọ anyị na-anaghị erubere ya isi.

17 Taa, Jehova anaghị egbu ndị mebiri iwu ya ozugbo. Ọ na-enye ha ohere ka ha chegharịa n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ma, olee otú ọ ga-adị Jehova ma ọ bụrụ na nne na nna nke onye mmehie na-enweghị nchegharị esoro nwa ha na-akpachi anya, si otú ahụ na-anwa Jehova?

18, 19. Olee otú Jehova nwere ike isi gọzie ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha emee ihe Jehova gwara ha ka ha mee?

18 Ọtụtụ ndị a chụpụburu n’ọgbakọ ekwuola na ihe mere ha ji bataghachi n’ọgbakọ bụ n’ihi na ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha ekweghị ekwunyere ha okwu kama ha nọsiri ike n’akụkụ Jehova. Mgbe ndị okenye na-ede akwụkwọ ka a nabata otu nwa agbọghọ n’ọgbakọ, ha kwuru na ihe so mee ka ọ kwụsị omume ọjọọ ọ na-eme bụ otú “nwanne ya nwoke si meso ya omume e kwesịrị imeso onye a chụrụ n’ọgbakọ.” Ọ sịrị na “otú o si meso ya ihe otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e mesoo onye a chụrụ n’ọgbakọ mere ka ya chọọ ịbataghachi.”

19 Olee ihe nke a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla duhie obi anyị na-ezughị okè, anyị emee ihe Akwụkwọ Nsọ sịrị anyị emela. Anyị kwesịrị ikwenyesi ike na ihe ọ bụla Jehova gwara anyị mee bụ maka ọdịmma anyị.

“Okwu Chineke Dị Ndụ”

20. Olee ihe abụọ ihe e dere ná Ndị Hibru 4:12 nwere ike ịpụta? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

20 Mgbe Pọl dere na “okwu Chineke dị ndụ,” ọ bụchaghị Baịbụl ka o bu n’obi. * Ihe ndị ọzọ o kwuru mgbe ahụ gosiri na ihe o bu n’obi bụ nkwa Chineke kwere. Ihe Pọl na-ekwu bụ na Chineke anaghị ekwe nkwa ghara imezu ya. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gosi na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: ‘Okwu m agaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.’ (Aịza. 55:11) Ya mere, o kwesịghị ịdị anyị ọsọ ọsọ mgbe ihe na-emeghị ngwa ngwa otú anyị tụrụ anya ya. Ka obi sie anyị ike na Jehova “na-arụ ọrụ” iji mezuo ihe ndị o zubere.—Jọn 5:17.

21. Olee otú ihe e dere ná Ndị Hibru 4:12 si na-agba ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ iri afọ, bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ, ume?

21 Ọtụtụ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ejeerela Jehova ozi ọtụtụ iri afọ. (Mkpu. 7:9) Ọtụtụ n’ime ha atụghị anya na ha ga-anọ n’ụwa ochie a mee agadi. Ma, ha adabeghị mbà. (Ọma 92:14) Ha ma na “okwu Chineke dị ndụ,” marakwa na Jehova ga-emezu nkwa ya. Ebe nzube Chineke dị ya ezigbo mkpa, anyị ga-eme ka obi ya ṅụrịa ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe o zubere kpọrọ ihe. Jehova anọwo na-ezu ike kemgbe ụbọchị nke asaa. Ọ makwa na nzube ya ga-emezurịrị nakwa na ndị ohu ya ga na-eme ihe kwekọrọ ná nzube ya. Ị̀ ga na-eme ihe kwekọrọ ná nzube ya? Ị̀ banyela n’izu ike Chineke?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọtụtụ ndị na-edu ndị Juu gbasiri mbọ ike ime ihe niile e dere n’Iwu Mozis, ma, mgbe Mesaya ahụ bịara, ha amataghị ya. Ha emeghị ihe kwekọrọ ná nzube Chineke.

^ par. 13 Gụọ akwụkwọ ‘Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,’ peeji nke 207-209.

^ par. 20 Taa, Chineke na-esi n’Okwu ya e dere ede, bụ́ nke nwere ike ịgbanwe ndụ anyị, agwa anyị okwu. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe Pọl dere ná Ndị Hibru 4:12 gbasakwara Baịbụl.

Ì Chetara?

• Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji banye n’izu ike Chineke taa?

• Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru si egosi na anyị na-eme ihe kwekọrọ ná nzube Chineke?

• Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ma, olee ihe mere anyị ji kwesị irubere Chineke isi?

• Olee ihe abụọ ihe e dere ná Ndị Hibru 4:12 nwere ike ịpụta?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 31]

Obi agbawaala nne na nna a!