Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ ga-eso Nduzi Jehova Ji Obiọma Na-enye Gị?

Ị̀ ga-eso Nduzi Jehova Ji Obiọma Na-enye Gị?

Ị̀ ga-eso Nduzi Jehova Ji Obiọma Na-enye Gị?

“Akpọrọ m ụzọ okwu ụgha niile asị.”—ỌMA 119:128.

1, 2. (a) Ọ bụrụ na ị na-achọ ụzọ ị ga-esi eru ebe ị chọrọ ịga, olee ụdị ịdọ aka ná ntị ị ga-enwe obi ụtọ ma e nye gị, oleekwa ihe mere ị ga-eji enwe obi ụtọ? (b) Olee ụdị ịdọ aka ná ntị Jehova na-enye ndị na-ejere ya ozi, oleekwa ihe mere o ji eme nke a?

KA E were ya na e nwere ebe ị chọrọ ịga. Gị agwa otu enyi gị ị tụkwasịrị obi, nke maara ụzọ e si aga ebe ahụ, ka o zi gị ụzọ. Ka ọ na-agwa gị otú ị ga-esi aga, ya asị gị: “Kpachara anya ma i ruo ebe ahụ ụzọ wara ngalaba, saịn bọọdụ dị ebe ahụ ga-eduhie gị. Ọtụtụ ndị esorola ihe e dere na ya fuo ụzọ.” Obi ọ̀ ga-adị gị ụtọ maka ihe ahụ ọ gwara gị? Ị̀ ga-ege ya ntị? E nwere otú Jehova si dịrị ka enyi gị ahụ. Ọ na-egosi anyị ụzọ anyị ga-esi ruo ebe anyị na-aga, ya bụ, otú anyị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. Ma, ọ na-adọkwa anyị aka ná ntị banyere ihe ndị nwere ike ime ka anyị gahie ụzọ.—Diut. 5:32; Aịza. 30:21.

2 N’isiokwu a na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ Enyi anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-agwa anyị ka anyị zere. Ka anyị cheta na ihe mere Jehova ji na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-ezere bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ chọrọ ka anyị ruo ebe anyị na-aga. Ọ na-ewute ya ma ndị mmadụ mee ihe ndị ha na-ekwesịghị ime ma fuo ụzọ. (Ezik. 33:11) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ nwere ike ime ka anyị fuo ụzọ. Nke mbụ bụ ihe a na-ahụ anya, nke abụọ bụ ihe dị anyị n’ime, ebe nke atọ bụ ihe na-adịghị adị, ma, ọ dị ize ndụ. Anyị kwesịrị ịma ihe ihe ndị a bụ nakwa otú Nna anyị nke eluigwe si enyere anyị aka izere ha. Otu ọbụ abụ e nyere ike mmụọ nsọ gwara Jehova, sị: “Akpọrọ m ụzọ okwu ụgha niile asị.” (Ọma 119:128) Ị̀ kpọrọ ụzọ okwu ụgha niile asị ka ọbụ abụ a? Ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi gosikwuo na anyị kpọrọ ụzọ okwu ụgha niile asị.

Esola “Ìgwè Mmadụ”

3. (a) Ọ bụrụ na ụzọ anyị ga-esi gaa ebe anyị chọrọ ịga agbagwojuo anyị anya, olee ihe mere iso ndị ọzọ ji nwee ike ime ka anyị baa ná nsogbu? (b) Olee ihe e kwuru n’Ọpụpụ 23:2 nke ga-enyere anyị aka?

3 Ọ bụrụ na ị na-aga ebe dị anya, olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụzọ agbagwojuo gị anya? I nwere ike chọwa iso ndị ọzọ na-eme njem tinye isi n’ụzọ ha si, karịchaa ma ọ bụrụ na ha hiri nne. I nwere ike ịba ná nsogbu ma i soro ha. O nwedịrị ike ọ bụghị ebe ị na-aga ka ha na-aga, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na hanwa furu ụzọ. Ihe atụ a ga-enyere gị aka ịghọta otu n’ime iwu Jehova nyere mba Izrel oge ochie. Ọ dọrọ ndị ikpe ma ọ bụ ndị na-agba akaebe mgbe a na-ekpe ikpe aka ná ntị ka ha ghara ‘iso ìgwè mmadụ.’ (Gụọ Ọpụpụ 23:2.) O doro anya na ọ dịịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ime ihe ndị ibe ha na-enye ha nsogbu ka ha mee mgbe a na-ekpe ikpe, ya bụ, ikpe ikpe na-ezighị ezi. Ma, ọ̀ bụ naanị ndị na-ekpe ikpe na ndị na-agba akaebe bụ ndị na-agaghị eso ìgwè mmadụ? Mba.

4, 5. Olee otú e si chọọ ime ka Jọshụa na Keleb soro ìgwè mmadụ, ma gịnị mere ha emeghị nke a?

4 N’eziokwu, ọ na-agụ anyị agụụ ọtụtụ mgbe ‘iso ìgwè mmadụ.’ Nke a nwere ike ime mgbe anyị na-atụghị anya ya, o nwekwara ike isiri anyị ezigbo ike ịghara iso ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere Jọshụa na Keleb. Ha so ná mmadụ iri na abụọ e zigara ka ha gaa ledoo Ala Nkwa ahụ. Mgbe ha lọtara, mmadụ iri n’ime ha kọọrọ ụmụ Izrel akụkọ ọjọọ na-amapụ obi. Ha kwudịrị na ụfọdụ ndị bi n’ala ahụ bụ ndị dike, ụmụ ndị Nefilim. (Jen. 6:4) Ma, nke ahụ enweghị ike ịbụ eziokwu n’ihi na e bibiri ndị Nefilim ahụ obi fere azụ n’Iju Mmiri e nwere n’oge Noa ọtụtụ narị afọ tupu oge ndị Izrel, ọ dịghịkwa ụmụ ha mụrụ. Ma, akụkọ na-abụghị eziokwu nwedịrị ike ime ka obi daa ndị okwukwe ha na-esighị ike mbà. Akụkọ ọjọọ a ndị nledo iri ahụ ji lọta mere ka ụjọ jide ndị Izrel ozugbo. O teghị aka, ọtụtụ n’ime ha malitere ikwu na ha ekwesịghị ịba n’Ala Nkwa ahụ otú Jehova gwara ha. Gịnị ka Jọshụa na Keleb mere otú a ihe dewere ihu?—Ọnụ Ọgụ. 13:25-33.

5 Ha esoghị ìgwè mmadụ. Ọ bụ eziokwu na ndị Izrel achọghị ịnụ nke bụ́ eziokwu, ụjọ atụghị Jọshụa na Keleb ịgwa ha ya, n’agbanyeghị na ha chọdịrị iji nkume tụgbuo ha. Gịnị mere obi ji kaa ha? O doro anya na okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ so mee ka obi kaa ha. Ndị nwere okwukwe na-ama ihe dị iche n’akụkọ na-abụghị eziokwu na nkwa ndị Jehova Chineke kwere. Jọshụa na Keleb mechara kwuo otú obi dị ha maka otú Jehova si mezuo nkwa ya niile. (Gụọ Jọshụa 14:6, 8; 23:2, 14.) Jọshụa na Keleb hụrụ Chineke ha n’anya, tụkwasịkwa ya obi. Ha agaghị ekwo ìgwè mmadụ na-enweghị okwukwe mee ihe ga-ewute Chineke. N’ihi ya, ha kwụsiri ike n’akụkụ Jehova, si otú ahụ ghọọrọ anyị ezigbo ihe nlereanya taa.—Ọnụ Ọgụ. 14:1-10.

6. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ọ dị anyị ka anyị sowe ìgwè mmadụ?

6 È nwere mgbe ọ na-adị gị ka i sowe ìgwè mmadụ? Ndị e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ na ndị na-enweghị ihe ha ji iwu ya kpọrọ karịrị ndị na-eme uche Chineke. Dị ka ihe atụ, ha na-ekwu na omume rụrụ arụ, ihe ike, na mgbaasị a na-egosi mgbe niile na fim, n’egwuregwu vidio, nakwa n’ihe nkiri ndị ọzọ a na-eme na tiivi enweghị ihe ha mere. (2 Tim. 3:1-5) Olee ebe ị na-agbakwasị ụkwụ ekpebi ihe gịnwa ma ọ bụ ezinụlọ gị ga-eji na-atụrụ ndụ? Ị̀ na-elere ihe ndị ọzọ na-anaghị eme nke ọma na-eme ekpebi ihe gịnwa ma ọ bụ ezinụlọ gị ga-eji na-atụrụ ndụ? Nke a ọ́ gaghị abụ iso ìgwè mmadụ?

7, 8. (a) Olee otú anyị si azụ “ikike nghọta” anyị, gịnịkwa mere ịzụ ya ji aka aba uru karịa ịtụ anya ka a na-agwa anyị ihe anyị ga-eme n’ihe niile? (b) Olee ihe mere obi ji adị gị ụtọ ma ị hụ ka ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-eme nke ọma?

7 Jehova enyela anyị onyinye pụrụ iche nke ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ndị anyị ga-eme. Onyinye ahụ bụ “ikike nghọta” anyị. Ma, anyị kwesịrị ịzụ ikike a azụ “site n’iji ya eme ihe.” (Hib. 5:14) Anyị agaghị azụ ikike nghọta anyị ma anyị na-eso ìgwè mmadụ; anyị agaghịkwa azụ ya ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ka a na-agwa anyị ihe anyị ga-eme n’ihe niile. Ọ bụ ya mere e depụtaraghị ndị Jehova fim ndị ha na-agaghị ele, akwụkwọ ndị ha na-agaghị agụ, na ebe ndị ha na-agaghị aga n’Ịntanet. A sị ka e dewe ihe ndị a, ọ ga-abụ e dee ha taa, echi e degharịa ha, n’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa na-agbanwe ngwa ngwa. (1 Kọr. 7:31) Nke ka njọ bụ na ọ ga-eme ka anyị ghara inwe ike ikpe ekpere ma tụlee ihe ndị anyị chọrọ ime iji mara ma hà kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru.—Efe. 5:10.

8 N’eziokwu, ndị ọzọ nwere ike ịkpọ anyị asị ma anyị na-eme mkpebi ndị kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru. Ndị ha na ụmụ anyị na-aga akwụkwọ nwere ike ịna-enye ha nsogbu ka ha na-ekiri ihe ndị ọzọ na-ekiri, ma ọ bụkwanụ ka ha na-eme ihe ndị ọzọ na-eme. (1 Pita 4:4) N’ihi ya, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị hụ ka Ndị Kraịst ibe anyị, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, na-eṅomi okwukwe Jọshụa na Keleb, na-ajụ iso ìgwè mmadụ.

Esola ‘Obi Gị na Anya Gị’

9. (a) Olee ihe mere iso ụzọ ọ bụla obi anyị gwara anyị soro mgbe anyị na-eme njem ji nwee ike ime ka anyị baa ná nsogbu? (b) Olee uru iwu e dere n’Ọnụ Ọgụgụ 15:37-39 baara ndị ohu Chineke n’oge ochie?

9 Ihe nke abụọ anyị ga-atụle, bụ́ nke nwekwara ime ka anyị baa ná nsogbu, dị anyị n’ime. Ka e were ya na e nwere ebe ị na-aga, nweekwa map ga-eduzi gị. Ị̀ ga-edewe map ahụ ma na-etinye isi n’ụzọ ọ bụla yiri gị ka ọ̀ dị mma? O doro anya na ị na-eme nke a, ị gaghị eru ebe ị na-aga. Ihe atụ a ga-enyere gị aka ịghọta iwu ọzọ Jehova nyere ụmụ Izrel oge ochie. O nwere ike isiri ọtụtụ ndị ike taa ịghọta ihe mere e ji gwa ụmụ Izrel ka ha dụnye ihe dị yọrị yọrị na eriri na-acha anụnụ anụnụ n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 15:37-39.) Ma, ị̀ ghọtara ihe mere e ji nye ha iwu ahụ? Irube isi n’iwu ahụ nyeere ndị Chineke aka ịghara iso mba ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị gbara ha gburugburu. Ha ga-emerịrị nke a ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na Jehova na-adị ná mma. (Lev. 18:24, 25) Ma, iwu ahụ na-emekwa ka anyị mata ihe dị anyị n’ime, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị ghara inweta ndụ ebighị ebi anyị chọrọ inweta. Olee otú iwu ahụ si eme nke a?

10. Olee otú Jehova sirila gosi na ya ma ụmụ mmadụ nke ọma?

10 Jehova gwara ndị Izrel ihe mere o ji nye ha iwu ahụ. Ọ sịrị: “Unu esola obi unu na anya unu, bụ́ ihe unu na-eso wee na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ.” Jehova ma ụmụ mmadụ nke ọma. Ọ ma nnọọ otú ihe anya anyị na-ahụ nwere ike isi duhie obi anyị, ma ọ bụ ihe dị anyị n’ime, ngwa ngwa. N’ihi ya, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jere. 17:9) Ị̀ hụlanụ ihe mere iwu Jehova nyere ụmụ Izrel ji kwesị ekwesị? Ọ ma na ha nwere ike ilewe ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị gbara ha gburugburu, nakwa na ihe ha na-ahụ nwere ike ime ka ha mewe ihe na-adịghị mma. Ha nwere ike ịchọwa iji ejiji ka ndị ahụ na-ekpere arụsị, iche echiche ka ha, ma ọ bụkwanụ ịkpa àgwà ka ha.—Ilu 13:20.

11. Olee otú ihe anya anyị na-ahụ nwere ike isi duhie anyị?

11 Ọ kadị mfe taa ihe anya anyị na-ahụ iduhie obi anyị nke dị aghụghọ. Ihe na-atọ anụ ahụ́ ụtọ juru n’ụwa anyị bi n’ime ya. N’ihi ya, olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 15:39? Chegodị banyere nke a: Ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị, ma ọ bụ ndị obodo unu na-eji ejiji otú ga-akpali ndị ọzọ inwe agụụ mmekọahụ, ò nwere ike ịgbasa gị? Ò nwere ike ịdị gị ka i sowe ‘obi gị na anya gị,’ nke ga-eme ka ihe anya gị hụrụ rata gị? Nke ahụ ò nweziri ike ime ka ị chọwa iji ejiji ka ha, hapụzie otú dị mma i si eji ejiji?—Rom 12:1, 2.

12, 13. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anya anyị achọọ ịga ebe ọ na-ekwesịghị ịga? (b) Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịnwa ụmụnna anyị ọnwụnwa?

12 Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-ejide onwe anyị. Ọ bụrụ na anya anyị na-aga ebe ọ na-ekwesịghị ịga, ka anyị cheta ihe Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, kpebisiri ike ime. Ya na anya ya gbara ndụ na ya agaghị anwa anwa lee nwaanyị na-abụghị nwunye ya anya otú ga-eme ka o nwewe mmasị n’ebe nọ. (Job 31:1) Eze Devid kpebikwara, sị: “Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.” (Ọma 101:3) Ihe ọ bụla nke ga-eme ka akọnuche anyị gharazie ịdị ọcha ma ọ bụ nke ga-emebi mmekọrịta anyị na Jehova bụ ‘ihe na-abaghị uru.’ Ihe ndị so na ha bụ ihe ọ bụla na-adịghị mma nke na-adọrọ anya anyị, nke nwekwara ike ịrafu obi anyị anyị emee ihe ọjọọ.

13 Ma, o doro anya na o nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ime ka ndị ọzọ chewe echiche ime ihe ọjọọ nke na e nwere ike ịsị na anyị aghọọrọla ha ‘ihe na-abaghị uru.’ N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-eji ejiji otú Baịbụl kwuru. Ọ gwara anyị ka anyị na-eyi uwe dị mma n’anya na nke na-egosi na anyị na-emeru ihe n’ókè. (1 Tim. 2:9) Ọ bụghị uwe anyị yi dịhaala mma n’anya anyị, anyị ewere ya na ọ na-egosi na anyị na-emeru ihe n’ókè. Ebe ọ bụ na anyị kwesịrị ịna-eme ihe ga-aka amasị ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị otú ha ga-esi ele uwe anyị chọrọ iyi anya. (Rom 15:1, 2) E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-eji ejiji kwesịrị ekwesị. Anyị ji ha eme ọnụ maka na ha jụrụ ‘iso obi ha na anya ha,’ kama, ha họọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ihe ọ bụla ha na-eme, ma n’otú ha si eji ejiji.

Esola “Ihe Efu”

14. Olee ịdọ aka ná ntị Samuel nyere ndị Izrel banyere ịchụ “ihe efu”?

14 Ka e were ya na i si n’ọzara na-aga otu ebe ị chọrọ ịga. Ka ị na-aga, ya adị gị ka ị̀ hụrụ ebe mmiri dọọrọ n’ihu. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ị hapụ ebe ị na-aga ma tinye isi ebe ahụ i chere na ị hụrụ mmiri? Ime nke a nwere ike ịta isi gị. Jehova ma nnọọ ihe nwere ike ime anyị ma anyị soro ihe efu. Ka anyị tụlegodị otu ihe atụ. E nwere mgbe ndị Izrel chọrọ ịdị ka mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị nwere ndị eze na-achị ha. Ihe a ha chọrọ ime jọgburu onwe ya, n’ihi na nke a gosiri na ha achọghịzi ka Jehova bụrụ Eze ha. Ọ bụ eziokwu na Jehova kwere ka ha nwee eze a na-ahụ anya, o mere ka Samuel onye amụma dọọ ha aka ná ntị banyere ihe ga-eme ha ma ha chụwa “ihe efu.”—Gụọ 1 Samuel 12:21.

15. Olee otú ụmụ Izrel si chụsoo ihe efu?

15 Ndị Izrel hà chere na eze a na-ahụ anya ga-aka enyere ha aka karịa Jehova? Ọ bụrụ na ha chere otú ahụ, ha na-achụ ihe efu n’eziokwu. Nke a nwekwara ike ime ka ha chụwa ọtụtụ ihe efu ndị ọzọ si n’aka Setan. Ndị eze a na-ahụ anya nwere ike ime ka ha kpewere arụsị. Ndị na-ekpere arụsị na-eche na ihe ndị ha na-ahụ anya, dị ka chi ndị e ji osisi na nkume mee, nwere ike inyere ha aka karịa Chineke ha na-anaghị ahụ anya, bụ́ Jehova, onye kere ihe niile. Ma, dị ka Pọl onyeozi kwuru, arụsị abụghị “ihe ọ bụla.” (1 Kọr. 8:4) Ha anaghị ahụ ụzọ, ha anaghị anụ ihe, ha anaghị ekwu okwu, ha enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla. I nwere ike ịhụ ha anya, nweekwa ike imetụ ha aka, ma, ọ bụrụ na ị na-efe nke ọ bụla n’ime ha ofufe, ihe ị na-eme bụ ịchụ ihe efu nke ga-ewetara gị ọdachi.—Ọma 115:4-8.

16. (a) Olee otú Setan si eji aghụghọ eme ka ọtụtụ ndị taa na-achụ ihe efu? (b) Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe onwunwe bụ ihe efu, karịchaa ma e jiri ya tụnyere Jehova Chineke?

16 Setan ka ji aghụghọ na-eme ka ụmụ mmadụ na-achụ ihe efu. Dị ka ihe atụ, o meela ka ọtụtụ ndị kwere na akụnụba ga-eme ka ha nwee obi ụtọ, obi eruokwa ha ala. Ha nwere ike ịna-eche na ego, ihe onwunwe, na ọrụ na-enye ezigbo ego ga-egboro ha mkpa ha. Ma, olee otú ihe ndị a ga-abaruru mmadụ uru ma ọrịa bịa, ma ihe e ji akpata ego dakpọọ, nakwa ma e nwee ọdachi ndị na-emere onwe ha? Olee uru ha na-abara onye chere na ndụ ya enweghị isi? Hà nwere ike inyere mmadụ aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ? Hà nwere ike inyere mmadụ aka mgbe onye ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ? Ọ bụrụ na anyị atụkwasị ego na ihe onwunwe obi, anyị ga-akwa mmakwaara. Ha anaghị eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ, ha anaghịkwa eme ka mmadụ ghara ịrịa ọrịa ma ọ bụ ghara ịnwụ. Ha bụ ihe efu. (Ilu 23:4, 5) Ma, Jehova abụghị ihe efu, ọ bụ ezi Chineke. Ọ bụ naanị ma anyị na ya dịrị n’ezigbo mma ka obi ga-eru anyị ala. Nke a bụ ngọzi na-enweghị atụ. Ya adịkwala mgbe anyị ga-ahapụ Jehova chụwa ihe efu.

17. Gịnị ka i kpebiri ime banyere ihe ndị na-eduhie eduhie anyị tụlere n’isiokwu a?

17 Obi dị anyị ụtọ na Jehova bụ Enyi anyị nakwa na ọ na-edu anyị n’ụzọ ga-eduga anyị ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ege ya ntị, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. N’isiokwu a, anyị atụleela ihe atọ na-eme ka ọtụtụ ndị fuo ụzọ. Ha bụ: ìgwè mmadụ, obi anyị, na “ihe efu.” N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe atọ ọzọ Jehova dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iso. Ọ gwara anyị ihe ndị a iji nyere anyị aka ịkpọ ụzọ ọjọọ asị ma ghara iso ya wee fuo ụzọ otú ọtụtụ ndị furu.—Ọma 119:128.

Gịnị Ka I Chere?

Olee otú gịnwa ga-esi mee ihe e kwuru n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a?

Ọpụpụ 23:2

Ọnụ Ọgụgụ 15:37-39

1 Samuel 12:21

Abụ Ọma 119:128

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka i sowe ìgwè mmadụ?

[Foto dị na peeji nke 13]

Gịnị mere o ji dị njọ iso obi anyị?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ò nwere ihe efu ị na-achụ?