Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Bidola Ibipụta Ụlọ Nche Bekee nke E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee

E Bidola Ibipụta Ụlọ Nche Bekee nke E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee

E Bidola Ibipụta Ụlọ Nche Bekee nke E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee

OBI dị anyị ụtọ ịgwa unu na anyị ebidola ibipụta Ụlọ Nche Bekee abụọ a na-amụ amụ n’ọnwa ọ bụla, malite na nke ọnwa Julaị 15, 2011. E ji Bekee dị mfe nghọta dee nke mere ya abụọ. Anyị ga na-ebipụta ya abụọ abụọ otú a ruo otu afọ iji mara otú ọ ga-adị. Nke dị mfe nghọta ga na-ebu isiokwu niile a na-amụ amụ, nakwa isiokwu ndị ọzọ na-adị n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ, ole ọ bụla nwere ike ịba na ya. Obi siri anyị ike na nke a dị mfe nghọta ga-abara ọtụtụ Ndịàmà Jehova nnukwu uru n’ofufe ha na-efe Jehova. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Ọ bụ asụsụ Bekee ka ọtụtụ ụmụnna anyị na-asụ ná mba ndị dị ka Fiji, Gana, Kenya, Laịberịa, Naịjirịa, Papiuwa Niu Gini, na Sọlọmọn Aịlands. N’agbanyeghị na ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ndị a nwere ike ịna-asụ asụsụ obodo ha, ha na-ejikarị asụsụ Bekee amụ ihe n’ọgbakọ, na-ejikwa ya ezi ozi ọma. Ma, ụdị Bekee ha na-asụ na-adị mfe nghọta karịa ndị nke anyị na-ede n’akwụkwọ anyị. E nwekwara ụmụnna anyị ndị kwagara mba ọzọ bụ́ ebe ha ga-ejirịrị asụsụ Bekee na-agwa ndị ọzọ okwu n’agbanyeghị na hanwa amachaghị asụ Bekee. Ihe ọzọ bụ na e nweghị ọgbakọ ji asụsụ ha amụ ihe n’ebe ahụ nke ha ga-asị ka ha soro na-amụ ihe.

Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị na-enwe kwa izu bụ ụzọ bụ́ isi ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, si akụziri anyị ihe taa. N’ihi ya, anyị ebidola ibipụta Ụlọ Nche Bekee nke e ji Bekee dị mfe nghọta dee iji nyere ụmụnna anyị niile nọ n’ọgbakọ Bekee aka ka ha na-aghọta ihe a na-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọma. Ihu Ụlọ Nche ọhụrụ a ga-adị iche. Ma, isiokwu nta ndị ga-adị na ya, paragraf ya niile, ajụjụ ntụleghachi, nakwa ihe osise ndị ga-adị na ya agaghị adị iche. N’ihi ya, onye ọ bụla nwere ike ịna-ele anya na nke ọ bụla n’ime Ụlọ Nche abụọ a, jirikwa ya zaa ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Iji gosi ihe dị iche na Bekee e ji dee ha abụọ, gụọ paragraf abụọ dị n’okpuru ebe a, bụ́ ndị e si na paragraf nke abụọ nke isiokwu nke mbụ a na-amụ amụ nweta.

Anyị na-atụ anya na Ụlọ Nche a e ji Bekee dị mfe nghọta dee ga-egboro ọtụtụ ụmụnna anyị mkpa ha, bụ́ ndị na-arịọ Jehova, sị: “Mee ka m nwee nghọta, ka m wee mụta ihe i nyere n’iwu.” (Ọma 119:73) Obi siri anyị ike na ọ ga na-adịziri ndị na-amachaghị asụsụ Bekee, nakwa ụfọdụ ụmụaka na-asụ Bekee, mfe ịkwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọma kwa izu. Jehova ‘hụrụ òtù ụmụnna anyị dum’ n’anya, anyị na-ekelekwa ya n’ihi na o ji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-enye anyị nri ime mmụọ n’ụba.—Pita 2:17; Mat. 24:45.

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova