Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?

Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?

Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?

“A ka nwere ezumike nke ụbọchị izu ike maka ndị Chineke.”—HIB. 4:9.

1, 2. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe e dere na Jenesis 2:3, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza?

NA JENESIS isi mbụ, anyị mụtara na Chineke ji ụbọchị isii kwadebe ụwa ka ụmụ mmadụ biri n’ime ya. Ma, ụbọchị isii ndị a abụghị ụbọchị isii nkịtị, nke nke ọ bụla n’ime ha bụ awa iri abụọ na anọ, kama, ọ karịrị nnọọ awa ole ahụ. Ná ngwụcha nke ụbọchị ọ bụla, a na-ekwu, sị: “E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ.” (Jen. 1:5, 8, 13, 19, 23, 31) Ma, Baịbụl kwuru banyere ụbọchị nke asaa, sị: “Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ, n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Chineke nọworo na-ezu ike n’ọrụ ya dum nke ike ihe.”—Jen. 2:3.

2 Ebe ọ bụ na e dere n’akwụkwọ Jenesis na Chineke ‘anọwo na-ezu ike,’ ọ pụtara na ụbọchị nke asaa ahụ, ya bụ, “ụbọchị” izu ike Chineke, agwụbeghị mgbe Mozis dere akwụkwọ Jenesis n’afọ 1513 T.O.A. Chineke ọ̀ ka na-ezu ike taa? Ọ bụrụ na ọ ka na-ezu ike, olee otú anyị nwere ike isi banye n’izu ike ya taa? Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata azịza nke ajụjụ ndị a.

Jehova Ọ̀ Ka “Na-ezu Ike”?

3. Olee otú ihe Jizọs kwuru nke e dere na Jọn 5:16, 17 si gosi na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’ụwa?

3 E nwere ihe abụọ mere anyị ga-eji sị na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’ụwa. Nke mbụ bụ ihe Jizọs gwara ụfọdụ ndị iro ya, bụ́ ndị were iwe na ọ gwọrọ mmadụ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. Ha weere na o so n’ọrụ Iwu Mozis kwuru ka a ghara ịrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ma Onyenwe anyị gwara ha, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:16, 17) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? E boro Jizọs ebubo na ọ rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Jizọs zaara ọnụ ya mgbe ọ gwara ha, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ.” E nwere ike ịsị na ihe Jizọs gwara ndị iro ya ahụ bụ: ‘Mụ na Nna m na-arụ otu ọrụ ahụ. Ebe ọ bụ na Nna m ka na-arụ ọrụ kemgbe Ụbọchị Izu Ike ya nke werela ọtụtụ puku afọ, o nweghịkwa ihe o mere ma mụnwa na-arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike.’ Jizọs si otú a gosi na a bịa n’ihe banyere ụwa anyị a, oké Ụbọchị Izu Ike Chineke, ya bụ, ụbọchị nke asaa ahụ, agwụbeghị n’oge Jizọs nọ n’ụwa. *

4. Olee ihe Pọl kwuru nke gosikwara na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa n’oge ya?

4 Ihe nke abụọ mere anyị ga-eji sị na a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ nọ n’ụwa bụ ihe Pọl onyeozi kwuru. Pọl dere banyere izu ike Chineke n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru. Tupu ya e kwughachi ihe e dere na Jenesis 2:2, o dere n’isi nke anọ nke akwụkwọ Ndị Hibru, sị: “Anyị onwe anyị bụ́ ndị nwere okwukwe na-abanye n’izu ike ahụ.” (Hib. 4:3, 4, 6, 9) N’ihi ya, a ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ n’oge Pọl. Olee mgbe ụbọchị nke asaa ahụ ga-agwụ?

5. Gịnị mere e ji nwee ụbọchị nke asaa, oleekwa mgbe a ga-emezucha ihe mere e ji nwee ya?

5 Tupu anyị azaa ajụjụ a, anyị ga-ebu ụzọ ghọta ihe mere e ji nwee ụbọchị nke asaa. Jenesis 2:3 sịrị: “Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ.” E mere ka ụbọchị ahụ “dị nsọ,” Jehova doro ya iche iji mezuo uche ya. Uche ya bụ ka naanị ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi biri n’ụwa ma na-elekọta ụwa na ihe niile dị ndụ dị n’ime ya. (Jen. 1:28) N’ihi ya, ihe mere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, bụ́ “Onyenwe ụbọchị izu ike,” ji “na-arụ ọrụ ruo ugbu a” bụ ka ha nwee ike mezuo ihe ahụ bụ uche Chineke. (Mat. 12:8) Ụbọchị izu ike Chineke agaghị agwụ ruo mgbe ihe bụ́ uche ya n’okwu a ga-emezucha, ya bụ, mgbe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gwụrụ.

‘Adabala n’Ụdị Nnupụisi ahụ’

6. Ole ndị ihe ha mere kwesịrị ịkụziri anyị ihe, oleekwa ihe ihe ha mere na-akụziri anyị?

6 Chineke mere ka ihe bụ uche ya doo Adam na Iv anya, ma ha jụrụ ime uche ya. N’eziokwu, Adam na Iv bụ ụmụ mmadụ mbụ nupụụrụ Chineke isi. Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ nde ndị ọzọ ndị mere ka ha. Ndị Chineke họọrọ, bụ́ mba Izrel, nupụdịịrị Chineke isi. Ọ bụkwa ya mere Pọl ji dọọ Ndị Kraịst nọ n’oge ya aka ná ntị na ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha akpacharaghị anya, ha ga-ama n’ụdị ọnyà ụmụ Izrel oge ochie mara. O dere, sị: “Ya mere, ka anyị gbalịsie ike ịbanye n’izu ike ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịdaba n’ụdị nnupụisi ahụ.” (Hib. 4:11) Ị̀ chọpụtara na Pọl kwuru na nnupụisi ga-eme ka mmadụ ghara ịbanye n’izu ike Chineke? Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na o nwee otú anyị si na-enupụrụ Chineke isi, na e nwere ike anyị agaghị abanye n’izu ike Chineke? Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata ihe bụ azịza nke ajụjụ a, anyị ga-atụlekwu ya n’isiokwu a. Ma, ka anyị burugodị ụzọ kwuo banyere otú ụmụ Izrel si nupụrụ Chineke isi nakwa ihe mere ha abanyeghị n’izu ike Chineke.

“Ha Agaghị Abanye n’Izu Ike M”

7. Gịnị mere Jehova ji napụta ụmụ Izrel n’ohu ha na-agbara ndị Ijipt, oleekwa ihe ọ chọrọ ka ha na-eme?

7 N’afọ 1513 T.O.A., Jehova mere ka ohu ya bụ́ Mozis mata ihe bụ uche ya banyere ụmụ Izrel. Chineke kwuru, sị: “M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ [ya bụ, Ijipt] kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụ. 3:8) Ihe mere Jehova ji napụta ndị Izrel “n’aka ndị Ijipt” bụ ka o mee ka ha bụrụ ndị ya, dị ka o kwere nna nna ha bụ́ Ebreham ná nkwa. (Jen. 22:17) Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ndị e dere ede ndị ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. (Aịza. 48:17, 18) Ọ gwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie [dị ka ihe ndị e dere n’Iwu ahụ si dị], unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ, n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m.” (Ọpụ. 19:5, 6) N’ihi ya, naanị ihe ga-eme ka ụmụ Izrel na Chineke dịrị ná mma bụ ma ha rubere Chineke isi.

8. Olee otú ihe gaara adịrị ụmụ Izrel ma a sị na ha rubeere Chineke isi?

8 Chegodị otú ihe gaara adịrị ụmụ Izrel ma a sị na ha rubeere Chineke isi! Jehova gaara agọzi ubi ha, ubi vaịn ha, ìgwè atụrụ ha, na anụ ụlọ ndị ọzọ ha nwere. Ọ gaaraghị ekwe ka ndị iro ha mee ha ihe ọ bụla. (Gụọ 1 Ndị Eze 10:23-27.) Mba ndị ọzọ agaaraghị achịwa ha, ọbụnadị n’oge Jizọs bịara n’ụwa, bụ́ mgbe ndị Rom na-achị ọtụtụ mba. Jehova chọrọ ka mba Izrel ghọọ mba e ji ama atụ. Ọ chọrọ ka o doo onye ọ bụla anya na ya ga-agọzi ndị na-erubere yanwa, bụ́ ezi Chineke, isi.

9, 10. (a) Gịnị mere ọ dịghị mma na ụmụ Izrel chọrọ ịlaghachi Ijipt? (b) A sị na ụmụ Izrel laghachiri Ijipt, olee ihe ọ gaara eme ofufe ha na-efe Chineke?

9 Ụmụ Izrel nwere ihe ùgwù pụrụ iche, ya bụ, ikwe ka Jehova jiri ha mezuo uche ya. A sị na ha kwere ka Jehova jiri ha mezuo uche ya, ọ gaara agọzi ha, sikwa n’aka ha gọzie mmadụ niile nọ n’ụwa. (Jen. 22:18) Ma, ọtụtụ ndị Izrel gosiri na ha achọghị ịbụ mba Chineke na mba e ji ama atụ. Ha kwudịrị na ha chọrọ ịlaghachi Ijipt. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 14:2-4.) Ma, ọ bụrụ na ha alaghachi Ijipt, hà ka ga-aghọkwa mba e ji ama atụ dị ka Chineke chọrọ? Mbanụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ụmụ Izrel alaghachi gaa gbawara ndị Ijipt na-anaghị efe Chineke ohu, ha agaghị edebeli Iwu Mozis, n’ihi ya kwa, Jehova agaghị agbaghara ha mmehie ha. Ụmụ Izrel gosiri na ihe bụ mkpa ha abụghị ka e mezuo uche Chineke, kama ọ bụ ka e mezuo uche nke ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo banyere ndị nnupụisi ahụ, sị: “M wesoro ọgbọ ahụ iwe wee sị, ‘Ha na-akpafu akpafu n’obi ha mgbe niile, ha onwe ha amaghịkwa ụzọ m.’ Ya mere, aṅụrụ m iyi n’iwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye n’izu ike m.’”—Hib. 3:10, 11; Ọma 95:10, 11.

10 Nlaghachi a mba Izrel chọrọ ịlaghachi Ijipt gosiri na o nweghị ihe ha ji ihe Jehova na-emere ha kpọrọ. Kama nke ahụ, ihe ka ha mkpa bụ ịlaghachi n’Ijipt gaa tawa lik, yabaasị, na galik. (Ọpụ. 11:5) Ndị nnupụisi a mere ka Ịsọ, bụ́ onye na-ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe. Ha dị njikere iji onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere ha gbanwere nri na-atọ ụtọ.—Jen. 25:30-32; Hib. 12:16.

11. Okwukwe ụmụ Izrel ndị nọ n’oge Mozis na-enweghị ò mere ka nzube Chineke ghara imezu?

11 N’agbanyeghị na ụmụ Izrel ndị si n’Ijipt pụta enweghị okwukwe na Chineke, Jehova ji ndidi “na-arụ ọrụ” ndị ga-eme ka uche ya mezuo. O lekwasịziri anya n’ọgbọ ga-anọchi ndị a si n’Ijipt pụta. Ụmụ nke ndị a si n’Ijipt pụta rubere isi karịa ndị nna ha. Ha mere ihe Jehova gwara ha, banye n’Ala Nkwa ahụ, malitekwa imeri mba ndị dị na ya. Na Jọshụa 24:31, anyị na-agụ, sị: “Izrel wee na-efe Jehova ụbọchị niile nke Jọshụa nakwa ụbọchị niile nke ndị okenye dịrị ndụ mgbe Jọshụa nwụsịrị, ya bụ, ndị maara ọrụ niile Jehova rụụrụ Izrel.”

12. Olee otú anyị si mara na e nwere ike ịbanye n’izu ike Chineke taa?

12 Ma, ọgbọ ahụ nke na-erube isi mechara jiri nwayọọ nwayọọ nwụchaa, ọgbọ ọzọ “na-amaghị Jehova ma ọ bụ ọrụ ọ rụụrụ Izrel” nọchikwara ha. N’ihi ya, “ụmụ Izrel wee malite ime ihe dị njọ n’anya Jehova, na-efekwa Bel.” (Ikpe 2:10, 11) Ala Nkwa ahụ aghọghịrị ha ‘ebe izu ike.’ N’ihi isi ha nupụụrụ Chineke, ha na ya adịghịzi n’udo. Pọl mechara dee banyere ọgbọ ọzọ, sị: “Ọ bụrụ na Jọshụa dubara [ndị Izrel] n’ebe izu ike, Chineke agaraghị emesị kwuo banyere ụbọchị ọzọ. Ya mere, a ka nwere ezumike nke ụbọchị izu ike maka ndị Chineke.” (Hib. 4:8, 9) “Ndị Chineke” Pọl na-ekwu okwu ha ebe a bụ Ndị Kraịst. Ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst nwere ike ịbanye n’izu ike Chineke? Ee, ma Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ma ndị nke na-abụghị ndị Juu.

Ụfọdụ Jụrụ Ịbanye n’Izu Ike Chineke

13, 14. Olee ihe jikọrọ idebe Iwu Mozis na ịbanye n’izu ike Chineke (a) n’oge Mozis? (b) n’oge Ndị Kraịst oge mbụ?

13 Mgbe Pọl degaara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi, ọ nọ na-echegbu onwe ya na ụfọdụ n’ime ha anaghị eme ihe kwekọrọ n’uche Chineke. (Gụọ Ndị Hibru 4:1.) Olee otú o si bụrụ na ha anaghị eme ihe kwekọrọ n’uche Chineke? O nwere otú ọ na-ada ịnụ na ọ bụ n’ihi na ha na-edebe Iwu Mozis. Ruo ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise, ihe a chọrọ n’aka onye Izrel ọ bụla chọrọ ime uche Chineke bụ idebe Iwu Mozis. Ma, mgbe Jizọs nwụchara, idebe Iwu ahụ adịghịzi mkpa. Ụfọdụ Ndị Kraịst ekwetaghị, ha siri ọnwụ na ha ga na-edebe ụfọdụ n’ime Iwu ahụ. *

14 Pọl gwara Ndị Kraịst, bụ́ ndị siri ọnwụ na ha ga na-edebe Iwu Mozis, na Jizọs bụ nnukwu onye nchụàjà nke ka nnukwu onye nchụàjà ọ bụla na-ezughị okè. Ihe o kwuru gosikwara na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka nke Chineke na ụmụ Izrel gbara mma, nakwa na ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ ka nke e nwere tupu oge Ndị Kraịst. (Hib. 7:26-28; 8:7-10; 9:11, 12) N’ihi ya, o yiri ka Pọl ò ji Ụbọchị Izu Ike nke Iwu Mozis kwuru ka a na-edebe mee ihe atụ otú Ndị Kraịst nwere ike isi banye n’izu ike Jehova. O dere, sị: “A ka nwere ezumike nke ụbọchị izu ike maka ndị Chineke. N’ihi na onye banyere n’izu ike nke Chineke ezuruwokwa ike n’ọrụ nke ya, dị nnọọ ka Chineke zuru na nke ya.” (Hib. 4:8-10) Ndị Hibru ahụ bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkwụsị iche na Jehova ga-egosi ha ihu ọma ya ma ọ bụrụ na ha ana-arụ ọrụ ndị Iwu Mozis chọrọ ka mmadụ na-arụ. Kemgbe Pentikọst 33 O.A., ọ bụ ndị na-enwe okwukwe na Jizọs Kraịst ka Chineke ji obiọma egosi ihu ọma ya.

15. Gịnị mere nrubeisi ji dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbanye n’izu ike Chineke?

15 Gịnị gbochiri ndị Izrel nọ n’oge Mozis ịba n’Ala Nkwa ahụ? Ọ bụ nnupụisi. Gịnị gbochiri Ndị Kraịst nọ n’oge Pọl ịbanye n’izu ike Chineke? Ọ bụkwa otu nnupụisi ahụ. Ha ekweghị na Iwu ahụ arụzuola ihe mere e ji nye ya, nakwa na Jehova sizi ụzọ ọzọ na-edu ndị ya.

Ịbanye n’Izu Ike Chineke Taa

16, 17. (a) Gịnị ka ịbanye n’izu ike Chineke taa pụtara? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu so nke a?

16 Ọ ga-esi ike taa ịhụ Onye Kraịst ga-esiwe ọnwụ na e kwesịrị ịna-edebe ihe ụfọdụ e kwuru n’Iwu Mozis iji nweta nzọpụta. Ihe Pọl ji ike mmụọ nsọ degara ndị Efesọs doro nnọọ anya. Ọ sịrị: “N’ezie, site n’obiọma a na-erughịrị mmadụ, a zọpụtawo unu site n’okwukwe; nke a esighịkwa unu n’aka, ọ bụ onyinye Chineke. Ee e, o siteghị n’ọrụ, ka mmadụ ọ bụla wee ghara inwe ihe ọ ga-eji na-anya isi.” (Efe. 2:8, 9) Gịnịzi ka ọ pụtara ma e kwuo na Ndị Kraịst banyere n’izu ike Chineke? Jehova wepụtara ụbọchị nke asaa, ya bụ, ụbọchị izu ike ya, ka o nwee ike imezu ihe o zubere maka ụwa na ndị na-erubere ya isi. Otú anyị nwere ike isi banye n’izu ike Jehova, ma ọ bụ soro ya na-ezu ike, bụ ịna-eme ihe kwekọrọ n’uche ya, bụ́ nke nzukọ ya na-eme ka anyị ghọta.

17 Anyị na-egosi na anyị achọghị ka uche Jehova mezuo ma ọ bụrụ na anyị anaghị ejicha ndụmọdụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ji Baịbụl na-enye anyị akpọrọ ihe, na-eme ihe otú o si masị anyị. Ọ bụrụkwa na anyị achọghị ka uche Jehova mezuo, anyị na ya agaghị adị ná mma. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe ole na ole ọ ga-abụ ndị Chineke mee, ha na Chineke aghara ịdị ná mma. Anyị ga-atụlekwa otú mkpebi ndị anyị na-eme, ma ọ̀ bụ ịna-erube isi ma ọ̀ bụkwanụ ịna-eme otú o si masị anyị, ga-esi ekpebi ma ànyị ga-aba n’izu ike Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ndị nchụàjà na ndị Livaị rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike n’ụlọ nsọ ma “bụrụ ndị ikpe na-amaghị.” Ebe Jizọs bụ nnukwu onye nchụàjà n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke, o nwekwara ike ịrụ ọrụ Chineke nyere ya n’echeghị na ya na-ada iwu e nyere ka a ghara ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike.—Mat. 12:5, 6.

^ par. 13 Anyị amaghị ma è nwere onye Juu bụ́ Onye Kraịst nke kwadoro ndokwa ndị a na-eme maka Mkpuchi Mmehie mgbe Pentikọst 33 O.A. gachara. Ọ bụrụ na e nwere onye mere otú ahụ, o gosiri na o jighị àjà Jizọs chụrụ kpọrọ ihe. Ma, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nọ na-eme omenala ndị ọzọ ha na idebe Iwu Mozis na-agakọ.—Gal. 4:9-11.

Ajụjụ Ndị Anyị Ga-echebara Echiche

• Gịnị mere Chineke ji wepụta ụbọchị nke asaa maka izu ike?

• Olee otú anyị si mara na anyị ka nọ n’ụbọchị nke asaa ahụ taa?

• Gịnị gbochiri ụmụ Izrel nọ n’oge Mozis nakwa Ndị Kraịst oge mbụ ịbanye n’izu ike Chineke?

• Gịnị ka ịbanye n’izu ike Chineke taa pụtara?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Otú anyị nwere ike isi banye n’izu ike Jehova, ma ọ bụ soro ya na-ezu ike, bụ ịna-eme ihe kwekọrọ n’uche ya, bụ́ nke nzukọ ya na-eme ka anyị ghọta

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

Gịnị ka dị mkpa ka ndị Chineke na-eme iji banye n’izu ike ya?