Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M Na-atụbu Ụjọ Ọnwụ —Ma, M na-atụzi Anya ‘Inwe Ndụ N’uju’

M Na-atụbu Ụjọ Ọnwụ —Ma, M na-atụzi Anya ‘Inwe Ndụ N’uju’

M Na-atụbu Ụjọ Ọnwụ —Ma, M na-atụzi Anya ‘Inwe Ndụ N’uju’

Dị ka Piero Gatti si kọọ

MKPỌTỤ nke malitere ime ji nwayọọ nwayọọ mesiwe ike. Ihe ọzọ a nụwara bụ ụda saịrin nke e ji agwa onye ọ bụla ka o zere isi ya. Ka a na-eme, a nụ ụda bọmbụ dị egwu nke na-adachi ntị. Bọmbụ ahụ lakwara ọtụtụ ihe n’iyi.

Ihe a mere na Milan nke dị ná mba Ịtali, n’agbata afọ 1943 na 1944. Abụ m onye agha ka na-eto eto mgbe ahụ. Ọrụ a na-enyekarị m bụ ibukọta ozu ndị bọmbụ gburu n’ebe ha nọ na-eze mgbọ. Bọmbụ ahụ gbara ha riirii nke na o siri ike ịmata onye bụ́ onye. Ọ bụghị naanị ndị ọzọ ka m hụrụ otú ọnwụ si na-egbu ha. E nwedịrị mgbe ọ na-afọ obere ka mụnwa nwụọ. N’oge ndị ahụ, m gwara Chineke n’ekpere na ọ bụrụ na e gbughị m otú a e si na-egbu ndị mmadụ aghara aghara, m ga ebido na-eme uche ya.

Otú M Si Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ

Ebe m nọ too bụ n’otu obodo nta dị ihe dị ka kilomita iri ma e si ya gawa Komo, bụ́ obodo ukwu dị n’Ịtali, nke dị nso n’ebe Ịtali na Swizaland gbara ókè. Mgbe m bụ nwata, e nwere ihe ndị gbawara m obi, ụjọ ọnwụ na-atụkwa m mgbe ahụ. Ahụ́ ọkụ si Spen gburu mmadụ abụọ n’ime ụmụnne m ndị nwaanyị. N’afọ 1930 kwa, mgbe m dị naanị afọ isii, mama m, onye aha ya bụ Luigia, nwụrụ. Ebe m bụ onye Katọlik mgbe ahụ, edebere m iwu ndị ụka anyị, na-agakwa Mas a na-edo kwa izu. Ma, ọ bụ ka ọtụtụ afọ gachara ka m kwụsịrị ịtụ ụjọ ọnwụ. Ọ bụghịkwanụ na chọọchị ka m nọ kwụsị ya, kama, ọ bụ n’ebe a na-akpụ isi.

N’afọ 1944, Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-ata isi ọtụtụ mmadụ. Eso m n’ọtụtụ iri puku ndị agha Ịtali bụ́ ndị si n’ihu agha gbaa ọsọ gbaga Swizaland, bụ́ mba na-esoghị na-alụ agha ahụ. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, a kpọgara anyị n’ebe dị iche iche e nwere ogige ndị gbara ọsọ ndụ. A kpọgara m n’otu nke dị nso Steinak, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Swizaland. N’ebe ahụ, e nyere anyị ohere ime ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime. E nwere onye na-akpụ isi na Steinak nke chọrọ onye ga na-enyere ya aka ruo nwa oge. M gara biri na nke ya, mụ na ya arụọkwa naanị otu ọnwa. Ma, n’ime otu ọnwa ahụ, anụrụ m ihe mechara gbanwee ndụ m.

Aha otu n’ime ndị na-abịa ebe ahụ akpụ isi bụ Adolfo Tellini, onye Ịtali bi na Swizaland. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Anụtụbeghị m banyere Ndịàmà Jehova, nke a kwekwara nghọta n’ihi na n’oge ahụ, ha akarịghị otu narị na iri ise n’Ịtali dum. Adolfo gwara m eziokwu ndị magburu onwe ha dị na Baịbụl, na udo ga-adị ebe niile n’ọdịnihu, nakwa na a ga-enwe ‘ndụ n’uju.’ (Jọn 10:10; Mkpu. 21:3, 4) Obi tọgburu m atọgbu mgbe m nụrụ na oge na-abịa mgbe agha na ọnwụ na-agaghịzi adị. Mgbe m laghachiri n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, m kọọrọ Giuseppe Tubini, bụ́ nwa okorobịa si Ịtali, ihe m mụtara, obi tọkwara ya ụtọ. Adolfo na Ndịàmà ndị ọzọ na-abịa ebe ahụ eleta anyị site n’oge ruo n’oge.

Adolfo kpọ m gaa Abon nke dị ihe dị ka kilomita iri ma e si Steinak gawa ya, bụ́ ebe obere ìgwè Ndịàmà na-amụ ihe n’asụsụ Ịtalian. Ihe m nụrụ n’ọmụmụ ihe ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ nke mere na n’izu so ya, m ji ụkwụ gaa ebe ahụ. Emechara m gaa otu mgbakọ Ndịàmà nwere n’otu ụlọ mgbakọ dị na Zurik. Ihe m hụrụ n’otu slaịd e gosiri ná mgbakọ ahụ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. Ahụrụ m otú e si sụọ ndị mmadụ akwụ n’ogige ịta ahụhụ, hụkwa ikpo ozu ndị mmadụ. Anụrụ m na e gburu ọtụtụ Ndịàmà bụ́ ndị Jamanị n’ihi okwukwe ha. Ná mgbakọ ahụ, ahụrụ m Maria Pizzato. Ndị ọchịchị Ịtali tụkwara ya mkpọrọ afọ iri na otu n’ihi na ọ bụ Onyeàmà Jehova.

Mgbe agha biri, m laghachiri Ịtali ma nọrọ n’otu obere ọgbakọ dị na Komo. O nwebeghị onye na-abịa amụrụ m Baịbụl, ma amụtala m eziokwu ndị bụ́ isi dị na Baịbụl. Maria Pizzato nọkwa n’ọgbakọ ahụ. Ọ gwara m na m kwesịrị ịgbalịsi ike ka e mee m baptizim, gwakwa m ka m gaa hụ Marcello Martinelli, bụ́ onye bi na Kastione Andeveno nke dị n’ógbè Sondrio. Marcello bụ nwanna kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, onye a tụrụ mkpọrọ afọ iri na otu mgbe ndị ọchịchị aka ike na-achị. M na-eji ígwè si ebe m bi gbaa kilomita iri asatọ ịga leta ya.

Marcello ji Baịbụl kọwaara m ihe mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim. Mgbe o kwuchara, anyị kpere ekpere ma gawa osimiri Adda, bụ́ ebe a nọ mee m baptizim. Ihe a mere na Septemba 1946. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche ná ndụ m! N’ihi otú obi si dị m ụtọ na mụ ekpebiela ijere Jehova ozi, nakwa n’ihi olileanya m nwere ugbu a na ọdịnihu ga-aka mma, mgbe o ruru ná mgbede, amaghịdị m na ejirila m ígwè gbaa ihe ruru otu narị kilomita na iri kilomita isii n’ụbọchị ahụ.

Na Mee 1947, a nọ n’obodo Milan mee mgbakọ mbụ e nwere n’Ịtali mgbe agha biri. Ihe dị ka narị mmadụ asaa bịara, ọtụtụ n’ime ha nọkwa ya n’oge ahụ ndị ọchịchị aka ike na-akpagbu Ndịàmà. O nwere ihe na-atụ n’anya mere ná mgbakọ ahụ. Ọ bụ Giuseppe Tubini, bụ́ onye m ziri ozi ọma n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, kwuru okwu baptizim. E mekwara yanwa baptizim mgbe o kwuchara okwu ahụ.

Ná mgbakọ ahụ, m nwere ihe ùgwù ịhụ Nwanna Nathan Knorr, bụ́ onye si Betel dị na Bruklin. Ọ gbara mụ na Giuseppe ume ka anyị jiri ndụ anyị jeere Chineke ozi. Ekpebiri m na m ga-ebido ozi oge niile ma otu ọnwa gaa. Mgbe m lọtara, agwara m ndị ezinụlọ anyị ihe m kpebiri ime, ma, ha niile gbalịrị ime ka m ghara ime ya. Ma, ekpebisiri m ike na m ga-emerịrị ya. N’ihi ya, ka otu ọnwa gachara, amalitere m ije ozi na Betel dị na Milan. E nwere ndị ozi ala ọzọ anọ na-eje ozi ebe ahụ. Ha bụ: Giuseppe (Joseph) Romano na nwunye ya, bụ́ Angelina; Carlo Benanti na nwunye ya, bụ́ Costanza. Onye nke ise na-eje ozi ebe ahụ bụ Giuseppe Tubini, bụ́ onye na-anọtebeghị aka, nakwa mụnwa bụ́ onye mere ha isii.

Mgbe m nọrọ otu ọnwa na Betel, a họpụtara m ịbụ onye nlekọta sekit. Ọ bụ m bụ onye Ịtali mbụ ghọrọ onye nlekọta sekit n’Ịtali. Nwanna George Fredianelli, bụ́ onye ozi ala ọzọ mbụ si Amerịka bịa na 1946, abụrụla onye nlekọta na-ejegharị ejegharị tupu mụnwa. Ọ zụrụ m ruo izu ole na ole, amaliteziri m ịna-aga naanị m na-eleta ọgbakọ. Anaghị m echefu ọgbakọ mbụ m letara, bụ́ Ọgbakọ Faenza. Chetụgodị ihe ọ dị ka ya! Ekwutụbeghị m okwu ihu ọha n’ọgbakọ tupu mgbe ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, agbara m ndị bịara ọmụmụ ihe ume, ma ọtụtụ ndị na-eto eto, ka ha chebara ije ozi oge niile echiche. Ka oge na-aga, e zigara ụfọdụ n’ime ndị na-eto eto ahụ m gbara ume ebe dị iche iche ha ga-aga nye aka n’Ịtali.

Ebidola m ịrụ ọrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ọrụ na-enye obi ụtọ. Mgbe m na-arụ ọrụ a, ahụrụ m ọtụtụ ihe tụrụ m n’anya, mee mgbanwe ụfọdụ, nwee nsogbu ụfọdụ, nweekwa ihe ndị mere m obi ụtọ. Ahụkwara m otú ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị si gosi na ha hụrụ m n’anya.

Otú Okpukperechi Si Kwụrụ n’Ịtali Mgbe Agha Biri

Ka m gwa gị otú okpukperechi si kwụrụ n’Ịtali n’oge ahụ. Ndị Chọọchị Katọlik na-achị n’enweghị ndị na-ama ha aka. Ọ bụ eziokwu na gọọmenti mere iwu ọhụrụ na 1948, ọ bụ na 1956 ka a kagburu iwu ndị ọchịchị aka ike tiri ha ji gbochie Ndịàmà ịna-ekwusa ozi ọma otú masịrị ha. Ndị isi okpukpe na-edunyekarị ndị na-abịa akpaghasị ihe omume a na-eme ná mgbakọ sekit. Ma mgbe ụfọdụ, mbọ ndị isi okpukpe na-agba ịkpaghasị mgbakọ anyị na-akụ afọ n’ala. O nwere nke mere otú ahụ na 1948 na Sulmona, bụ́ obodo nta dị n’ebe etiti Ịtali.

A nọ n’ebe a na-anọ eme ihe nkiri n’obodo ahụ mee mgbakọ ahụ. N’ụtụtụ Sọnde, ọ bụ mụnwa bụ onyeisi oche, nwanna Giuseppe Romano ekwuo okwu ihu ọha. Ọtụtụ ndị na-abịa mgbakọ n’oge ahụ. N’oge ahụ, bụ́ mgbe ndị nkwusa e nwere n’Ịtali na-erughịdị narị mmadụ ise, puku mmadụ abụọ bịara mgbakọ ahụ. Mgbe e kwuchawara okwu ihu ọha ahụ, otu nwa okorobịa ndị ụkọchukwu abụọ nọ ebe ahụ dunyere, wụbatara n’elu ebe a nọ na-ekwu okwu. Ọ malitere itisi mkpu ike n’ihi na ọ chọrọ ịkpaghasị ihe a na-eme. Agwara m ya ozugbo, sị, “O nwee ihe i nwere ikwu, gaa kwụọ ụgwọ ebe ọzọ, nọrọzie ebe ahụ kwuwe ihe ọ bụla masịrị gị.” Ihe ahụ o mere adịghị ndị na-ege ntị mma n’obi. Iji gosi na obi adịghị ha mma, ha bidoro iti mkpu otú mere ka a gharazie ịnụ mkpu nke yanwa na-eti. Nwa okorobịa ahụ wụdataziri ma mie ala.

N’oge ahụ, ime njem anaghị adị mfe. Mgbe ụfọdụ, m na-eji ụkwụ si n’otu ọgbakọ gaa leta ọgbakọ ọzọ, ma ọ bụ gbara ígwè m gaa, ma ọ bụ banye ngwọngwọ bọs a na-afaju ndị mmadụ na ya, ma ọ bụkwanụ banye n’ụgbọ okporo ígwè. E nwedịrị oge ndị m biri n’ụlọ anụ ma ọ bụ n’ụlọ a na-akwasa ngwá ọrụ. O tebeghị agha biri, ọtụtụ ndị Ịtali dakwara ogbenye. Ụmụnna e nwere ebe ahụ ehighị nne, ihe ha na-akpata enweghịkwa otú ọ ha. N’agbanyeghị ihe ndị a, ijere Jehova ozi tọrọ m ezigbo ụtọ.

Ọzụzụ E Nyere M na Gilied

Na 1950, a kpọrọ mụ na Giuseppe Tubini ka anyị bịa klas nke iri na isii nke ụlọ akwụkwọ Gilied maka ndị ozi ala ọzọ. Tupudị mụ agawa, ama m na ọ ga-esiri m ike ịmụta Bekee. Emere m ihe niile m nwere ike ime ka m mụta ya, ma ọ bụụrụ m ọgụ na mgba. A gwara anyị na anyị ga-agụcha Baịbụl Bekee. Iji nwee ike ịgụcha ya, ana m agha nri ehihie mgbe ụfọdụ gaa na-agụpụta ya agụpụta ka m na-amụ ya. O mechara ruoro m ikwu okwu n’ihu ụmụ akwụkwọ ibe m. Ihe onye nkụzi anyị gwara m mgbe m kwuchara okwu ahụ anaghị apụ m apụ n’obi. Ọ gwara m, sị: “Otú i si emegharị ahụ́ mgbe ị na-ekwu okwu na otú i si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo ya amaka, ma Bekee gị ekwetụghị nghọta!” N’agbanyeghị nke a, ejisiri m ike gụchaa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe anyị gụchara, e zighachiri mụ na Giuseppe n’Ịtali. Anyị natakwuru ọzụzụ nke nyeere anyị aka ijere ụmụnna anyị ozi otú ka mma.

Na 1955, alụrụ m Lidia, bụ́ onye m kwuru okwu baptizim ya n’afọ 1948. Papa ya, bụ́ Domenico, bụ ezigbo nwanna nke gbara mbọ nyere ụmụ ya asaa aka ịnata eziokwu n’agbanyeghị na ndị ọchịchị aka ike kpagburu ya ma chụpụ ya n’obodo ha ruo afọ atọ. Lidia gbakwara ezigbo mbọ maka eziokwu ahụ. Ọ gara zara ọnụ ya n’ụlọ ikpe ugboro atọ tupu gọọmenti enye anyị ikike ịna-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Afọ isii ka anyị lụchara, anyị mụrụ nwa anyị nwoke mbụ aha ya bụ Beniamino. Na 1972, anyị mụrụ nwa nwoke ọzọ aha ya bụ Marco. Obi dị m ụtọ na ha abụọ nakwa ndị ezinụlọ ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.

Ijere Jehova Ozi n’Akwụsịghị Akwụsị

N’oge ndị a niile m ji obi ụtọ na-ejere ndị ọzọ ozi, e nweela ọtụtụ ihe ndị merenụ m na-agaghị echefu echefu. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 1980 na 1983, nna nwunye m degaara onyeisi ala nke Ịtali, onye aha ya bụ Sandro Pertini, akwụkwọ ozi. N’oge ndị ọchịchị aka ike na-achị, a chụpụrụ ha n’ala ha chụga ha n’agwaetiti Ventotene, bụ́ ebe a na-akpọchi ndị ndị ọchịchị aka ike ahụ weere ka ndị iro ha. Nna nwunye m gwara onyeisi ala anyị na ya chọrọ ịbịa jụtatụ ya ihe ụfọdụ, ma ihe o bu n’obi bụ ka ya jiri oge ahụ zie ya ozi ọma. Mgbe ọ gwara ya bịa, mụ na ya so gaa, a nabatakwara anyị nke ọma. Anyị agatụbeghị na nke onyeisi ala mbụ. Onyeisi ala anyị makụrụ nna nwunye m mgbe ọ hụrụ ya. Anyị gwawaziri ya ihe ndị anyị kweere ma nye ya ụfọdụ akwụkwọ anyị.

Na 1991, akwụsịrị m ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ma tupu mgbe ahụ, ejeela m ozi a ruo afọ iri anọ na anọ, letachaa ọgbakọ niile dị n’Ịtali. Amaliteziri m mgbe ahụ bụrụ onye nlekọta Ụlọ Mgbakọ ruo afọ anọ, ma mechaa selata aka n’ọrụ ndị m na-arụ mgbe m rịawara ọrịa. Ma, obi dịkwa m ụtọ na Jehova meere m amara mụ aka nwee ike ịna-eje ozi oge niile. Ana m ezi ozi ọma otú ike kwere m, na-amụkwara ụfọdụ ndị Baịbụl ugbu a. Ụmụnna ka na-ekwu na m na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwu okwu n’olu na-ada ụda. Ana m ekele Jehova na m ka nwere ume n’agbanyeghị na akatala m ahụ́.

Mgbe m ka na-eto eto, ụjọ ọnwụ na-atụ m nke ukwuu, ma mgbe m mụtara eziokwu ndị dị na Baịbụl, ebidoro m nwewe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi nke Jizọs kpọrọ ‘inwe ndụ n’uju.’ (Jọn 10:10) Ọ bụ ihe m na-atụ anya ya ugbu a, ya bụ, ịdị ndụ mgbe ahụ́ ga-eru onye ọ bụla ala, ha adịrị nnọọ n’udo, nwee obi ụtọ, nwetakwa ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ Jehova ga-eweta. Ka otuto niile gaara Onye kere anyị, nke hụrụ anyị n’anya, onye anyị nwere ihe ùgwù ịza aha ya.—Ọma 83:18.

[Map dị na peeji nke 22, 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SWIZALAND

BEN

Zurik

Abon

Steinak

ỊTALI

ROM

Komo

Milan

Osimiri Adda

Kastione Andeveno

Faenza

Sulmona

Ventotene

[Foto dị na peeji nke 22]

Mgbe anyị na-aga Gilied

[Foto dị na peeji nke 22]

Mgbe mụ na Giuseppe nọ na Gilied

[Foto dị na peeji nke 23]

N’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Kemgbe ihe karịrị iri afọ ise na ise ugbu a, ezigbo nwunye m nọ na-eso m