Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ

Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ

Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ

E BIDORO ikpe ikpe a n’afọ 1995, kpee ya afọ iri na ise. N’oge a niile, ndị mmegide na-akpagbu ezigbo Ndị Kraịst nọ na Rọshịa. Ha fooro ntutu taa na ha ga-ahụ na e tiri iwu ga-egbochi Ndịàmà ikpe okpukpe ha na Mọsko nakwa n’ebe ndị ọzọ. N’agbanyeghị nke a, Jehova mere ka ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa merie n’ikpe ahụ n’ihi na ha guzosiri ike n’ezi ihe. Ma, olee ihe mere e ji gawa ụlọikpe?

NDỊ JEHOVA EMECHAA NWERE ONWE HA

N’afọ 1917, gọọmenti mba Sọviet Yuniọn, nke Rọshịa so na ya, machibidoro ụmụnna anyị iwu ikpe okpukpe ha. Ma, n’agbata afọ 1991 ruo 1995, ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa nweere onwe ha ife Jehova. N’afọ 1991, gọọmenti mba Sọviet Yuniọn debara okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. Mgbe mba Sọviet Yuniọn kewara, e debara aha okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ná mba Rọshịa. Ndị ọchịchị ọhụrụ na-achị Rọshịa kwetakwara na ndị ọchịchị gara aga kpagburu ụmụnna anyị n’eziokwu. N’afọ 1993, Ngalaba Okwu Ikpe Dị n’Aka na Mọsko debara aha okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. N’otu afọ ahụ, Rọshịa tikwara iwu nke mere ka ndị mmadụ nwere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha. Ka a sịkwa ihe mere otu nwanna nwoke ji kwuo sị, “Anyị echetụghị n’echiche na anyị ga-ahụ ụdị nnwere onwe a!” O kwukwara sị, “O ruola afọ iri ise anyị tụwara anya nke a!”

Ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa ji ‘oge ahụ dị mma’ rụpụta ezigbo ihe. Ha malitere ozugbo ikwusasi ozi ọma ike, ọtụtụ ndị gekwara ha ntị. (2 Tim. 4:2) Otu onye kwuru, sị: “Ndị mmadụ nwere ezigbo mmasị n’ihe banyere okpukpe.” N’oge na-adịghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, na ọgbakọ e nwere mụbara. N’eziokwu, site n’afọ 1990 ruo n’afọ 1995, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova e nwere na Mọsko si n’ihe dị ka narị atọ ruo ihe karịrị puku ise. Ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova nọ na Mọsko na-amụba, iwe bịara ndị mmegide. N’ihe dị ka n’afọ 1995, ha gbara Ndịàmà Jehova akwụkwọ n’ụlọikpe. Ikpe a nwere agba anọ ndị were ogologo oge tupu e kpechaa ya.

E BIDO IME NCHỌPỤTA

Agba nke mbụ nke ikpe ahụ malitere na Jun 1995. Otu òtù e nwere na Mọsko, bụ́ nke onye ọ bụla ma na ọ na-akwado Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa, gbara ụmụnna anyị akwụkwọ n’ụlọikpe na ha na-emebi iwu gọọmenti. Ha kwuru na ha na-anọchite anya ezinụlọ ndị obi na-adịghị mma na ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha ma ọ bụkwanụ ụmụ ha aghọọla Ndịàmà Jehova. Na Jun 1996, ndị na-eme nchọpụta malitere ịchọ ihe na-egosi na ụmụnna anyị mere ihe e boro ha n’ebubo, ma o nweghị ihe ha hụrụ. Ma, òtù ahụ gbakwara ụmụnna akwụkwọ ọzọ, na-ebokwa ha ebubo na ha na-emebi iwu gọọmenti. E mekwara nchọpụta ọzọ, ma chọpụtakwa na aka ụmụnna anyị dị ọcha. N’agbanyeghị nke a, ndị mmegide a gbara ụmụnna anyị akwụkwọ nke ugbo atọ, na-ebokwa ha otu ebubo ahụ. E mekwara nchọpụta ọzọ, o nweghịkwa ihe a hụrụ nke ga-eme ka e kpewe ụmụnna anyị ikpe na ha na-emebi iwu gọọmenti. Ma, ndị mmegide a gbakwara akwụkwọ nke ugboro anọ, na-ebokwa ha otu ebubo ahụ. Na nke ugbu a kwa, e nweghị ihe ọ bụla a chọpụtara. Ọ tụrụ onye ọ bụla n’anya na ha kwuru ka e mee nchọpụta ọzọ. N’ikpeazụ, n’Eprel 13, 1998, onye ọhụrụ a họpụtara ka o mee nchọpụta ahụ mechiri okwu ahụ.

Otu ọkàiwu nke so na-eleba anya n’okwu ahụ kwuru na e nwere otu ihe dị ịtụnanya merenụ mgbe e mechichara okwu ahụ. N’agbanyeghị na ndị na-anọchite anya ọkàiwu nke gbara anyị akwụkwọ, bụ́ ndị mere nchọpụta nke ise a, kwetara na e nweghị ihe gosiri na ụmụnna anyị na-emebi iwu gọọmenti, ọkàiwu ahụ kwuru ka a kpụpụ ụmụnna anyị n’ụlọikpe. O kwuru na okpukpe Ndịàmà Jehova e nwere na Mọsko mebiri iwu mba Rọshịa na Iwu Ụwa Dum. Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ obodo ndị dị n’ebe ugwu Mọsko kweere ihe o kwuru ma gbaa ụmụnna anyị akwụkwọ. * Na Septemba 29, 1998, a malitere ikpe ikpe ahụ n’Ụlọikpe Golovinski Distrikti dị na Mọsko. Otú a ka agba nke abụọ si malite.

A GỤỌ BAỊBỤL N’ỤLỌIKPE

Ndị mmadụ juru n’ụlọikpe mgbe a malitere ikpe ikpe ahụ n’ụlọikpe ahụ dị n’ebe ugwu Mọsko. Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ ndị gbara anyị akwụkwọ, bụ́ Tatyana Kondratyeva, ji iwu mba Rọshịa nke e tiri n’afọ 1997 gbaa anyị akwụkwọ. Iwu ahụ kwuru na Chọọchị Ọtọdọks, Alakụba, okpukpe ndị Juu, na okpukpe Buda bụ okpukpe mba Rọshịa nabatara. * Iwu ahụ meziri ka o sie ike ideba aha okpukpe ọ bụla ọzọ n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. O nyekwara ụlọikpe ikike ịmachibido okpukpe ọ bụla na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị iwu. Ọkàiwu ahụ gbakwasịrị ụkwụ n’iwu ahụ boo Ndịàmà Jehova ebubo na ha na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị nakwa na ha etisaala ọtụtụ ezinụlọ, n’ihi ya, na e kwesịrị ịmachibido ha iwu.

Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ ụmụnna anyị jụrụ ya, sị: “Ì nwere ike ịkpọ aha ndị nọ n’Ọgbakọ Mọsko, bụ́ ndị na-ada iwu a?” Ọkàiwu ahụ enweghị otu onye ọ kpọrọ aha ya. Ma, o kwuru na akwụkwọ Ndịàmà Jehova na-eme ka ndị nọ n’otu okpukpe na-akpọ ndị okpukpe ọzọ asị. Iji gosi na ihe ya kwuru bụ eziokwu, ọ gụrụ ihe ụfọdụ e dere n’Ụlọ Nche na Teta! na akwụkwọ anyị ndị ọzọ (lee foto dị n’elu). Mgbe a jụrụ ya otú akwụkwọ ndị ahụ ọ gụrụ si eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị, ọ sịrị: “Ndịàmà Jehova na-akụzi na ọ bụ hanwa na-ekpe ezigbo okpukpe.”

Otu ọkàiwu, bụ́ nwanna anyị, nyere ọkàikpe otu Baịbụl, nyekwa ọkàiwu ahụ, ma gụọ Ndị Efesọs 4:5, bụ́ ebe sịrị: “Otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptizim.” Ka a na-ekwu, ọkàikpe ahụ, ọkàiwu ahụ na-ekpechitere ndị gbara anyị akwụkwọ, na ọkàiwu anyị, jichazi Baịbụl n’aka na-ekwurịta ihe e dere na Jọn 17:18 na Jems 1:27. Ọkàikpe ahụ jụrụ, sị: “Amaokwu Baịbụl ndị a hà na-eme ka ndị nọ n’otu okpukpe na-akpọ ndị nọ n’okpukpe ọzọ asị?” Ọkàiwu ahụ zara ya na Baịbụl edochaghị ya anya. Ọkàiwu anyị gosiri ndị nọ n’ụlọikpe ahụ akwụkwọ ndị Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa bipụtara, bụ́ ndị ha ji katọsịa Ndịàmà Jehova. Ọ jụziri, sị: “Ihe akwụkwọ ndị a kwuru hà megidere iwu ahụ?” Ọkàiwu ahụ zara, sị: “Okwu banyere okpukpe edochaghị m anya.”

ỌKÀIWU NA-EMEGIDE ANYỊ EKEE ONWE YA AGBỤ

Mgbe ọkàiwu ahụ boro Ndịàmà Jehova ebubo na ha na-etisa ezinụlọ, o kwuru na ha anaghị eme ememme ndị ọzọ na-eme, dị ka Krismas. Ma, o mechara kweta na iwu Rọshịa ekwughị na nwa afọ Rọshịa ọ bụla ga-agbarịrị Krismas. Onye Rọshịa ọ bụla, tinyere Onyeàmà Jehova ọ bụla nọ na Rọshịa, nweere onwe ya ikpebi ma ọ̀ ga-agba Krismas ma ọ̀ bụ na ọ gaghị agba. O kwukwara na Ndịàmà Jehova ‘anaghị ekwe ka ụmụaka ha zuru ike ma kporie ndụ ka ibe ha.’ Ma, mgbe a jụrụ ya otú o si mara, o kwetara na o nwebeghị nwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ya jụtụrụla ajụjụ. Mgbe otu ọkàiwu jụrụ ya ma ọ gatụla ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ọ zara, sị: “O nweghị ihe m ji ịga ya eme.”

Ọ kpọtara otu prọfesọ mụrụ banyere isi mgbaka ka ọ bịa gbaa akaebe. Prọfesọ ahụ kwuru na ịgụ akwụkwọ anyị na-akpata isi mgbaka. Mgbe ọkàiwu anyị kwuru na ihe prọfesọ ahụ dere n’akwụkwọ yiri ihe Bishọp Mọsko dere, prọfesọ ahụ kwetara na ụfọdụ ihe ha abụọ dere bụ otu. Ọ sịrị: “M si n’ihe o dere dee nke m.” Ka a na-agbakwu ya ajụjụ, a chọpụtara na ọ gwọtụbeghị Onyeàmà Jehova. Ma, prọfesọ ọzọ mụrụ banyere isi mgbaka gbara akaebe n’ụlọikpe na ya eleela ihe karịrị otu narị Ndịàmà Jehova nọ na Mọsko ahụ́ ma chọpụta na isi dịcha ha mma. Ọ chọpụtakwara na ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova na-akwanyekwuru ndị okpukpe ọzọ ùgwù kemgbe ha ghọchara Ndịàmà Jehova.

ANYỊ ENWEE MMERI, MA OKWU EBIBEGHỊ

Na Mach 12, 1999, ọkàikpe ahụ họpụtara mmadụ ise ma nke a na-akọ ka ha nyochaa akwụkwọ Ndịàmà Jehova. O yigharịziri ikpe ahụ. Ma tupu e zipụ mmadụ ise a, e nweela mgbe Ministri Okwu Ikpe Dị n’Aka na Rọshịa gwara otu ìgwè ndị ọkachamara ka ha nyochaa akwụkwọ anyị. Mgbe ha mechara nnyocha a, ha kọọrọ Ministri ahụ n’Eprel 15, 1999 na o nweghị ihe ha hụrụ n’akwụkwọ anyị nke na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. N’ihi ya, n’Eprel 29, 1999, Ministri Okwu Ikpe Dị n’Aka debaghachiri okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. N’agbanyeghị ihe a a chọpụtara, ụlọikpe ahụ kwuru ka ndị ahụ a họpụtara gaa n’ihu inyocha akwụkwọ anyị. Ihe a niile dị ịtụnanya. Ministri Okwu Ikpe Dị n’Aka na Rọshịa kwuru na Ndịàmà Jehova na-edebe iwu obodo nakwa na iwu gọọmenti kwadoro okpukpe ha, ma n’otu oge ahụ, Ngalaba Okwu Ikpe Dị n’Aka na Mọsko ana-enyocha ha n’ihi ebubo e boro ha na ha na-emebi iwu gọọmenti.

Ọ fọrọ obere ka afọ abụọ gaa tupu a maliteghachi ikpe ahụ. Na Febụwarị 23, 2001, Ọkàikpe Yelena Prokhorycheva kpebiri ikpe ahụ. Mgbe ọ tụlechara ihe kọmitii ahụ ọ họpụtara chọpụtara, ọ sịrị: “E nweghị ihe ọ bụla m hụrụ a ga-eji machibido okpukpe Ndịàmà Jehova dị na Mọsko iwu.” E si otú a gosi n’ikpeazụ na aka ụmụnna anyị dị ọcha n’ebubo niile e boro ha! Ma, ọkàiwu ahụ anabataghị ihe ọkàikpe ahụ kpere, ọ gbakwara akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ n’Ụlọikpe Mọsko Siti. Mgbe ọnwa atọ gachara, na May 30, 2001, ụlọikpe a kagburu ihe ahụ Ọkàikpe Prokhorycheva kpebiri. O nyere iwu ka ọkàikpe ọzọ kpegharịa ya, họpụtakwa ọkàiwu ahụ ka o jiri ikpe ahụ gaa n’ihu. Agba nke atọ na-aga ịmalite.

E MERIE ANYỊ, MA OKWU EBIBEGHỊ

N’Ọktoba 30, 2001, Ọkàikpe Vera Dubinskaya malitere ikpegharị ikpe ahụ. * Ọkàiwu ahụ kwughachiri ebubo ahụ e boro Ndịàmà Jehova na ha na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. O kwukwara na ịmachibido okpukpe Ndịàmà Jehova iwu ga-abụ ịzọtara Ndịàmà Jehova nọ na Mọsko ihe ndị ruuru ha. Iji gosi na ihe ahụ o kwuru enweghị isi, puku Ndịàmà Jehova iri nọ na Mọsko bịanyere aka n’akwụkwọ ozugbo, na-agwa ụlọikpe ahụ na ọ bụghị ha ka ọkàiwu ahụ “na-azọtara.”

Ọkàiwu ahụ kwuru na ọ dịghị mkpa na ya ga-eweta ihe akaebe na-egosi na Ndịàmà Jehova na-ada iwu obodo. O kwuru na ihe e kwo na-ekpe ikpe a bụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova na ihe ha kweere, ọ bụghị ihe ha na-eme. O kwukwara na ya ga-akpọta onye na-ekwuchitere Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa ka ọ bịa gbaa akaebe. N’eziokwu, ihe a o kwuru mere ka o doo anya na ọ bụ ndị ụkọchukwu na-afụ ndị ọchịchị ọkụ ka ha machibido okpukpe Ndịàmà Jehova iwu. Na Mee 22, 2003, ọkàikpe ahụ nyere iwu ka e nyochaakwa akwụkwọ Ndịàmà Jehova ọzọ.

Na Febụwarị 17, 2004, a maliteghachiri ikpe ahụ ka a tụlee ihe ndị ọkachamara ahụ e dunyere ka ha nyochaa akwụkwọ anyị chọpụtara. Ha chọpụtara na akwụkwọ anyị na-agba ndị na-agụ ha ume ka “ha na ezinụlọ ha dịrị n’otu, nakwa ka ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebi nke ọma,” chọpụtakwa na “o nweghị ihe ọ bụla gosiri” na akwụkwọ anyị na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. Ndị ọkachamara ndị ọzọ kwetakwara. A jụrụ otu prọfesọ mụrụ banyere okpukpe, sị: “Olee ihe mere Ndịàmà Jehova ji ekwusa ozi ọma?” Ọ zara, sị: “Onye ọ bụla kpọrọ onwe ya Onye Kraịst ga-ekwusarịrị ozi ọma. Nke ahụ bụ ihe Baịbụl kwuru nakwa ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee mgbe ọ sịrị, ‘Gaanụ kwusaa ozi ọma n’ala niile.’” N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ọkàikpe ahụ machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Mọsko na Mach 26, 2004. Na Jun 16, 2004, Ụlọikpe Mọsko Siti nabatara ihe ahụ o kpebiri. * Otu nwanna jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ kwuru banyere ihe ahụ ọkàikpe ahụ kpebiri. Ọ sịrị: “N’oge ọchịchị Sọviet Yuniọn, onye Rọshịa ọ bụla ga-abụrịrị onye na-ekweghị na Chineke. Taa, onye Rọshịa ọ bụla ga-abụrịrị onye Ọtọdọks.”

Olee ihe ụmụnna anyị mere mgbe a machibidoro ha iwu? Ha mere ihe yiri nnọọ ihe Nehemaya mere n’oge ochie. Mgbe Nehemaya nọ ndụ, ndị iro ndị Chineke ekweghị ka e wughachi mgbidi Jeruselem. Nehemaya na ndị Izrel ibe ya ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ha kwụsị ọrụ ha na-arụ. Kama nke ahụ, ha nọ “na-ewu” mgbidi ahụ ‘na-enwekwa obi ịrụ ọrụ.’ (Nehe. 4:1-6) Ụmụnna anyị ndị nọ na Mọsko ekweghịkwa ka ndị mmegide mee ka ha kwụsị ọrụ e kwesịrị ịrụ taa, ya bụ, ikwusa ozi ọma. (1 Pita 4:12, 16) Obi siri ha ike na Jehova ga-elekọta ha, ha dịkwa njikere ịbanye n’agba nke anọ nke ikpe a nke werela ogologo oge.

MMEGIDE AKA NJỌ

N’Ọgọst 25, 2004, ụmụnna anyị degaara Vladimir Putin, bụ́ onye na-achị Rọshịa n’oge ahụ, akwụkwọ mkpesa. N’ime ya, ha dere otú obi dị ha banyere iwu ahụ a machibidoro ha. Akwụkwọ ahụ dị ùkwù iri asaa na isii, narị puku mmadụ atọ na puku iri na ise bịanyekwara aka na ha. Ka ihe a nọ na-eme, ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa gosiri ụdị ndị ha bụ n’eziokwu. Onye na-ekwuchitere Bishọp nke Mọsko kwuru, sị: “Ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ adịghị anyị mma n’obi.” Otu onye ndú Ndị Alakụba kwuru na iwu a a machibidoro Ndịàmà Jehova bụ “otu n’ime ihe ndị kacha mma metụrụla n’obodo a.”

Ọ bụghị ihe iju anya na ụfọdụ ndị nọ na Rọshịa kwetara na ebubo ndị ahụ e boro Ndịàmà Jehova bụ eziokwu. Nke a mekwara ka ha malite imegide Ndịàmà Jehova. Ha na-akụ ụfọdụ Ndịàmà Jehova ihe mgbe ha nọ ozi ọma. Otu nwoke iwe ji chụpụrụ otu nwanna nwaanyị bịara ikwusa ozi ọma n’èzí. Ụkwụ o ji iwe na-agba ya n’ọkpụkpụ azụ ka ọ na-achụpụ ya mere ka ọ daa ma kụọ isi n’ala. N’agbanyeghị na e kwesịrị ịkpọ ya gaa ụlọ ọgwụ n’ihi na o merụrụ ezigbo ahụ́, ndị uwe ojii enweghị ihe ọ bụla ha mere nwoke ahụ. E nwekwara ụmụnna anyị ndị uwe ojii nwụụrụ ka ndị omempụ ma kpọchie ha. A gwara ndị na-elekọta ebe ndị ụmụnna anyị na-anọ amụ ihe na Mọsko na a ga-achụ ha n’ọrụ ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị inye ụmụnna anyị ebe ha ga-anọ na-amụ ihe. Ọ dịghị anya, ọtụtụ ọgbakọ enweghịzi ebe ha ga-anọ na-amụ ihe. Ọgbakọ iri anọ na-anọzi n’otu ebe e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze anọ na-amụ ihe. Ihe a meziri ka otu n’ime ọgbakọ ndị na-amụ ihe ebe ahụ na-enwe Okwu Ihu Ọha ma o jiri ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-ebili n’elekere ise nke ụtụtụ iji nwee ike ịbịa ọmụmụ ihe, ha jikwa obi ha dum mee nke a ruo ihe karịrị otu afọ.”

“KA Ọ BỤRỤ ÀMÀ”

Iji gosi na iwu ahụ a machibidoro anyị na Mọsko megidere iwu gọọmenti, na Disemba 2004, ndị ọkàiwu anyị rịọrọ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ka ha leba anya n’okwu ahụ. (Gụọ igbe bụ́ “Ihe Mere E Ji Lebagharịa Ikpe E Kpere na Rọshịa Anya na Frans,” bụ́ nke dị na peeji nke 6.) Mgbe afọ isii gachara, ya bụ, na Jun 10, 2010, ndị ọkàikpe niile na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ahụ kpebiri na aka Ndịàmà Jehova dị ọcha. * Ụlọikpe ahụ lebachara anya n’ebubo niile e boro anyị ma chọpụta na o nweghị nke bụ eziokwu n’ime ha. O kwukwara na iwu ji Rọshịa “ịkwụsị ihe a ha na-eme nke megidere ihe ruuru mmadụ na idozi nsogbu ihe a ha mere kpatara.”—Gụọ igbe bụ́ “Ihe Ụlọikpe ahụ Kpebiri,” bụ́ nke dị na peeji nke 8.

Ụlọikpe ahụ kpebiri na Nzukọ Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop kwadoro ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ, ọ bụghị naanị na Rọshịa kamakwa, ná mba iri anọ na isii ndị ọzọ so n’Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop. Ọtụtụ ndị ọkàikpe, ndị omeiwu, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ụwa, bụ́ ndị na-amụ banyere ihe ndị ruuru mmadụ, ga-enwekwa mmasị n’ihe ahụ ha kpebiri. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na tupu ndị ọkàikpe a ekpebie ihe a ha kpebiri, ha kwutere okwu banyere ikpe asatọ ha kpere, bụ́ ndị laara Ndịàmà Jehova, nakwa ikpe itoolu laara Ndịàmà Jehova n’ụlọikpe kacha elu n’Ajentina, Kanada, Japan, Rọshịa, Saụt Afrịka, Spen, Briten, nakwa n’Amerịka. Ndịàmà Jehova n’ụwa niile nweziri ike iji ihe a ụlọikpe a kpebiri gbachitere ihe ha kweere.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.” (Mat. 10:18) Ikpe a nke were afọ iri na ise tupu e kpechaa ya n’afọ 2010, mere ka ụmụnna anyị nwee ohere ime ka a mara aha Jehova karịa ka e metụrụla ya na Mọsko nakwa n’ebe ndị ọzọ. N’eziokwu, otú ihe niile mere n’ikpe a si mee ka okwu banyere Ndịàmà Jehova bụrụ okwu a kpụ n’ọnụ abụrụla “àmà,” o meekwala “ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Fil. 1:12) Ọ na-abụ ụmụnna ndị nọ na Mọsko na-ekwusa ozi ọma taa, ọtụtụ ndị nwe ụlọ ana-ajụ ha, sị: “Ọ̀ kwa a machibidoro ọrụ unu iwu?” Ajụjụ a na-emekarị ka ụmụnna anyị kọọrọ ndị nwe ụlọ ihe ndị anyị kweere. N’eziokwu, ọ dịghị onye iro ọ bụla ga-akwụsịli anyị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị na-ekpe ekpere ka Jehova nọgide na-enyere ụmụnna anyị ndị anyị hụrụ n’anya nọ na Rọshịa aka, bụ́ ndị nwere obi ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 A gbara akwụkwọ ahụ n’Eprel 20, 1998. Mgbe izu abụọ gachara, ya bụ na Mee 5, Rọshịa nabatara ihe Nzukọ Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop kwekọrịtara ma bịanye aka na ya.

^ par. 10 Otu akwụkwọ akụkọ bụ́ Associated Press, nke Jun 25, 1999, kwuru na ọ bụ otú Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa si nye gọọmenti nsogbu mere gọọmenti ji tie iwu ahụ. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara na ihe mere Chọọchị Ọtọdọks ji mee nke a bụ na ha achọghị ka e nwee okpukpe ọzọ na-ama ha aka, nakwa na ha chọrọ ịhụ na a machibidoro okpukpe Ndịàmà Jehova iwu.

^ par. 20 Ọ bụkwa n’otu ụbọchị a n’afọ 1991 ka gọọmenti Rọshịa kwetara na ọchịchị Sọviet Yuniọn kpagburu Ndịàmà Jehova n’eziokwu n’ihi okpukpe ha.

^ par. 22 Iwu a machibidoro okpukpe Ndịàmà Jehova mere ka a gharazie inwe òtù iwu kwadoro nke na-anọchite anya ọgbakọ ndị dị na Mọsko. Ndị mmegide chere na nke a ga-eme ka ụmụnna anyị kwụsị ikwusa ozi ọma.

^ par. 28 Na Nọvemba 22, 2010, ndị ọkàikpe ise so na Kọmitii Kacha Elu nke Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ekweghị anabata akwụkwọ Rọshịa gbara ka Kọmitii ahụ Kacha Elu lebagharịa okwu ahụ anya. Nke a mere ka ihe ahụ e kpebiri na Jun 10, 2010 bụrụ mkpebi ikpeazụ, nke a ga-eme ihe e kpebiri na ya ozugbo.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Mere E Ji Lebagharịa Ikpe E Kpere na Rọshịa Anya na Frans

Na Febụwarị 28, 1996, Rọshịa bịanyere aka n’ihe Nzukọ Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri. (Na Mee 5, 1998, Rọshịa nabatara ihe Nzukọ ahụ kwuru.) Ebe gọọmenti Rọshịa bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ, ihe ọ pụtara bụ na o kwetara na ụmụ amaala ya:

‘nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha, nwere onwe ha ikpe ya n’ụlọ ha na n’ebe ndị ọzọ ga-ahụ ha, nwerekwa onwe ha isi n’okpukpe ha nọ gafee n’okpukpe ọzọ ma ha chọọ.’—Nkeji edemede 9

‘nwere ikike ikwu na ide ihe ha chere n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ịgwa ndị ọzọ okwu.’—Nkeji edemede 10

‘nwere ikike inwe nzukọ ndị a ga-eme n’udo.’—Nkeji edemede 11.

Onye ọ bụla ma ọ bụ òtù ọ bụla a napụrụ ihe ndị ruuru ya e kwuru n’ebe a, nke gacharala ụlọikpe ndị dị ná mba ya ma ihe e kpere adịghị ya mma, nwere ike iweta okwu ya n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, nke dị na Strasbọg, Frans (nke foto ya dị n’elu). E nwere ndị ọkàikpe iri anọ na asaa, nke bụ́ ọnụ ọgụgụ mba ndị bịanyere aka n’akwụkwọ iji gosi na ha kweere n’ihe Nzukọ Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop kwuru. Mba nke ọ bụla ga-ekwerịrị ihe Ụlọikpe a kpebiri. Mba ọ bụla bịanyere aka n’akwụkwọ a ga-emerịrị ihe ụlọikpe a kwuru.

[Igbe dị na peeji nke 8]

Ihe Ụlọikpe ahụ Kpebiri

N’ebe a, e depụtara ihe atọ Ụlọikpe ahụ kpebiri.

Otu n’ime ebubo ndị e boro Ndịàmà Jehova bụ na ha na-etisa ezinụlọ. Ụlọikpe ahụ kpebiri ihe dị iche. Ọ sịrị:

“Ihe na-ebute nsogbu bụ mgbe ndị na-anaghị ekpe okpukpe ọ bụla jụrụ ikwe ka onye ezinụlọ ha nwere onwe ya ikpe okpukpe ọ chọrọ ikpe.”—Para. 111.

Ụlọikpe ahụ ahụghịkwa ihe ọ bụla gosiri na ebubo e boro Ndịàmà Jehova na ha “na-ekpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-eme” bụ eziokwu. O kwuru, sị:

“Ọ tụrụ Ụlọikpe a n’anya na ụlọikpe ndị dị na Rọshịa akpọghị aha otu onye a na-ekweghị ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme, bụ́ onye a sị na a manyere ime ihe megidere akọnuche ya.”—Para. 129.

Ebubo ọzọ e boro Ndịàmà Jehova bụ na ha na-eme ka ọrịa ndị òtù ha na-arịa ka njọ n’ihi na ha anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara. Ụlọikpe ahụ kpebiri ihe dị iche. Ọ sịrị:

“Onye ọ bụla nweere onwe ya ịnabata otú a chọrọ isi gwọọ ya ọrịa ma ọ bụkwanụ ịjụ ya, nwerekwa onwe ya ikwu otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. Nke a kwekọrọ n’ikike mmadụ nwere ikpebiri onwe ya ihe. Dị ka ihe atụ, onye ọrịa ọ bụla torola eto nweere onwe ya ikpebi ma à ga-awa ya ahụ́ ma ọ bụ na a gaghị awa ya, nwere onwe ya ikpebi ma à ga-agwọ ya ma ọ bụ na a gaghị agwọ ya, nwerekwa onwe ya ikwe ka a mịnye ya ọbara ma ọ bụ ịjụ.”—Para. 136.