Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

È nwere ike ikwu kpọmkwem amụma ole e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaya ahụ?

Ị mụọ Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma, ị ga-ahụ ọtụtụ amụma ndị e buru na ya, bụ́ ndị mezuru n’isi Jizọs Kraịst. Amụma ndị a kọwara ezinụlọ Mesaya ahụ ga-esi apụta, oge ọ ga-apụta, ihe ndị ọ ga-eme, otú a ga-esi emeso ya ihe, nakwa ọrụ Jehova Chineke nyere ya iji mezuo uche ya. Amụma ndị a niile nyeere anyị aka ịmata na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ma, o siri ike ịchọpụta kpọmkwem ole amụma niile e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaya ahụ dị.

E nwere amụma ụfọdụ ndị kweere na ọ bụ amụma e buru banyere Mesaya ahụ ma ndị ọzọ ekweghị. Alfred Edersheim kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Life and Times of Jesus the Messiah na ndị rabaị oge ochie dere n’akwụkwọ ha na e nwere nkebi ahịrịokwu dị narị anọ na iri ise na isii n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ndị kwuru banyere Mesaya ahụ, n’agbanyeghị na okwu ahụ bụ́ Mesaya adịghịdị n’ọtụtụ n’ime ha. Onye lerukwuo nkebi ahịrịokwu ndị ahụ anya, ọ ga-ajụwadị ma ọ̀ bụ Jizọs Kraịst n’eziokwu ka ụfọdụ n’ime ha na-ekwu banyere ya. Dị ka ihe atụ, Edersheim kwuru na ndị Juu kweere na Jenesis 8:11 na-ekwu banyere Mesaya ahụ. Ha kwuru na “ọ bụ n’Ugwu Mesaya ka nduru ahụ tụbitara akwụkwọ oliv ahụ ọ kpụ n’ọnụ lọghachite.” Edersheim kwukwara banyere Ọpụpụ 12:42. O dere ihe ndị Juu kwuru nke gosiri na ha ghọtahiere ihe e dere n’amaokwu Baịbụl ahụ. Ha sịrị: “Otú ahụ Mozis si si n’ọzara pụta ka Mesaya ga-esi esi na Rom apụta.” O doro anya na ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ọkà mmụta na ndị ọzọ ike ịhụ ihe jikọrọ amaokwu Baịbụl abụọ ndị a na ihe ndị ahụ na-abụghị eziokwu e kwuru banyere Jizọs Kraịst.

Ọ bụrụgodị na anyị ahapụ amụma ndị ọzọ ahụ ma kwuwe banyere ndị nke mezuru n’isi Jizọs Kraịst n’eziokwu, ọ ga-esi ike ikwu kpọmkwem ole ha dị. Weregodị Aịzaya isi 53 dị ka ihe atụ, bụ́ ebe e dere ọtụtụ amụma banyere Mesaya ahụ. E buru amụma n’Aịzaya 53: 2-7, sị: “Ọ dịghị ka onye ukwu . . . Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya . . . Ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru . . . A mara ya ube n’ihi mmebi iwu anyị . . . A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.” À ga-akpọ ihe a niile e dere n’Aịzaya isi 53 otu amụma, ka à ga-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe a niile a ga-eji amata Mesaya ahụ bụ amụma kwụụrụ onwe ya?

Tụleekwa Aịzaya 11:1, bụ́ ebe e dere, sị: “Alaka ga-esi n’úkwù osisi Jesi puo; ome nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amị mkpụrụ.” Ị ga-ahụkwa amụma ya na nke a yiri n’amaokwu nke 10. Ugbu a, ànyị ga-ekwu na ihe e dere n’amaokwu abụọ a bụ amụma abụọ dị iche iche, ka ànyị ga-ekwu na ha bụ otu amụma e dere ugboro abụọ? Ihe a e kwuru banyere Aịzaya isi 53 na Aịzaya isi 11 gosiri na o siri ike ịmata kpọmkwem ole amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ dị.

N’ihi ya, anyị ekwesịghị inyewe onwe anyị nsogbu ka anyị mata kpọmkwem amụma ole e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaya ahụ. E nweela ọtụtụ ebe anyị depụtara ọtụtụ amụma ndị e buru banyere Jizọs nakwa otú ha si mezuo n’akwụkwọ anyị dị iche iche. * Ebe ndị ahụ e depụtara amụma ndị a nwere ike ịbara anyị ezigbo uru mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ofufe ezinụlọ, nakwa mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Ha nwekwara ike ịgba anyị ume. Ihe ọzọkwa bụ na amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ, ole ọ bụla ọ sọrọ ha ha dịrị, na-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jizọs bụ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Gụọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 1223 na Mpịakọta nke 2, peeji nke 387; “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peeji nke 343-344; Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 200.