Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị a na-ede n’akụkọ ozi anyị kwa afọ pụtara?

Kwa afọ, anyị na-atụ anya ịhụ akụkọ ozi anyị nke na-agba na Yearbook nakwa n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Febụwarị. Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na-agụ ihe ndị Jehova nọ n’ụwa niile rụzuru n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ọrụ izi ihe a na-arụ n’ụwa niile. Ma, akụkọ ozi anyị a ga-akacha abara anyị uru ma anyị ghọta ihe ọnụ ọgụgụ ndị e dere na ya pụtara. Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị kwesịrị ịghọta.

Afọ ije ozi. Nke a na-ebido n’ọnwa Septemba nke otu afọ ruo n’ọnwa Ọgọst nke afọ na-eso ya. Akụkọ ozi a na-ede n’Ozi Alaeze Anyị na-abụ nke afọ ije ozi bu afọ e bipụtara Ozi Alaeze Anyị ahụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, akụkọ ozi e dere n’Ozi Alaeze Anyị nke Febụwarị 2011 bụ nke afọ ije ozi 2010, bụ́ nke bidoro na Septemba 1, 2009, ruo Ọgọst 31, 2010.

Ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị nkwusa na nkezi ndị nkwusa kwa ọnwa. Ndị a na-akpọ “ndị nkwusa” bụ ndị ruru eru ikwusa ozi ọma, ma ndị nke e merela baptizim ma ndị nke a na-emebeghị baptizim. “Ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị nkwusa” bụ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa kachanụ nyere akụkọ ozi ha n’otu n’ime ọnwa ndị dị n’afọ ije ozi. E nwekwara ike ịgụnye akụkọ ozi nke ndị na-enyeghị akụkọ ozi ha n’ọnwa ha kwesịrị inye ya ma nyezie ya n’ọnwa na-eso. Nke a nwekwara ike ime ka a gụọ otu onye nkwusa ugboro abụọ. Ma, ọnụ ọgụgụ ndị jere ozi ọma ma chefuo inye akụkọ ozi ha n’oge anaghị eso n’ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị nkwusa. Ihe a emeela ka anyị mata ihe mere anyị ji kwesị ịna-enye akụkọ ozi anyị n’oge n’ọnwa ọ bụla. “Nkezi ndị nkwusa kwa ọnwa” bụ ọnụ ọgụgụ a na-enweta ma e jiri iri na abụọ kee ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa niile nyere akụkọ ozi ha n’afọ ije ozi.

Ngụkọta awa. Dị ka e dere n’Ozi Alaeze Anyị nke Febụwarị 2011, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na narị nde awa isii jee ozi ọma. Nke a abụghị awa ole anyị ji mee ihe niile anyị na-eme n’ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, oge ndị okenye ji mee nleta ọzụzụ atụrụ esoghị na ya. Oge e ji mụọ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na oge anyị ji nwee ọmụmụ ihe onwe onye, nakwa nke anyị ji tụgharịa uche n’okwu Chineke, esoghị na ya.

Ego e mefuru. N’afọ ije ozi 2010, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu narị nde dọla na nde dọla iri ise na ise lekọta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ndị e zigara ha ije ozi. Ma, ego ndị e ji bipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl esoghị n’ego ole a a kpọrọ aha. Ego e ji lekọta ihe karịrị puku ụmụnna iri abụọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche n’ụwa niile, esoghịkwa na ya.

Ndị tara achịcha ma ṅụọ mmanya mgbe a na-echeta ọnwụ Jizọs. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ ụmụnna ndị e merela baptizim, bụ́ ndị tara achịcha ma ṅụọ mmanya mgbe a na-echeta ọnwụ Jizọs n’ụwa niile. Ọnụ ọgụgụ a ọ̀ bụ ọnụ ọgụgụ ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa? Ọ bụchaghị ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na e nwere ndị ihe ha kweere n’oge ndị gara aga ma ọ bụkwanụ ọrịa mere ka ha chee na a kpọrọ ha ịga eluigwe. N’ihi ya, o nweghị otú anyị ga-esi mara kpọmkwem ọnụ ọgụgụ ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa. Ọ dịghịkwanụ mkpa ka anyị mara. Òtù Na-achị Isi anaghị edekọ aha ndị tara achịcha ma ṅụọ mmanya mgbe a na-echeta ọnwụ Jizọs. *

Ihe doro anyị anya bụ na ụfọdụ “ndị ohu nke Chineke anyị,” bụ́ ndị e tere mmanụ, ka ga-anọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite. (Mkpu. 7:1-3) Ka ọ dịgodị, ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa na-eji ike ha dum na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma na nke izi ndị mmadụ ihe. Akụkọ ozi anyị a na-ebipụta kwa afọ na-eme ka anyị mata otú ndị Jehova si arụ ọrụ a kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Gụọ isiokwu bụ́ “Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, na Òtù Na-achị Isi Na-anọchite Anya Ya,” nke dị n’Ụlọ Nche June 15, 2009, peeji nke 24.