Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya

Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya

Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya

“Ka ndị Juu nọ na-atụ anya, ka mmadụ niile nọkwa na-atụle n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst [ma ọ bụ “Mesaya,” Baịbụl bụ́ The Emphatic Diaglott]?”—LUK 3:15.

1. Olee ọkwà otu mmụọ ozi maara ndị ọzụzụ atụrụ?

KA NDỊ ọzụzụ atụrụ nọ n’èzí na-azụ atụrụ ha, e nwere ihe mere na mberede nke mere ka egwu jide ha. Mmụọ ozi Jehova guzoro n’akụkụ ha, ebube Chineke enwuokwa dị ka ìhè gburugburu ha. Ihe ọzọ ha nụrụ bụ ọkwà pụrụ iche mmụọ ozi ahụ maara ha. Ọ sịrị: “Unu atụla egwu, n’ihi na, lee! ana m ezisara unu ozi ọma banyere oké ọṅụ nke ndị niile ga-enwe, n’ihi na a mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị,” onye ga-abụ Mesaya. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-ahụ nwa ọhụrụ a n’otu obodo dị ha nso ka o dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Na mberede, ‘ndị mmụọ ozi ndị dị ka ụsụụ ndị agha’ malitere ito Jehova, sị: “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.”—Luk 2:8-14.

2. Gịnị ka “Mesaya” pụtara, oleekwa otú a ga-esi mata onye bụ Mesaya ahụ?

2 O doro anya na ndị ọzụzụ atụrụ ahụ bụ́ ndị Juu maara na n’asụsụ Hibru, “Mesaya” ma ọ bụ “Kraịst” pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” (Ọpụ. 29:5-7) Ma, olee otú ha ga-esi mata na nwa ọhụrụ ahụ mmụọ ozi kwuru okwu ya bụ onye Jehova họpụtara ka ọ bụrụ Mesaya, oleekwa otú ha ga-esi mee ka ndị ọzọ kweta? Ha ga-amata nke a ma ha tụlee amụma ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na-ele ma hà ga-emezu n’isi nwa ọhụrụ a.

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Na-atụ Anya Mesaya?

3, 4. Olee otú amụma dị na Daniel 9:24, 25 si mezuo?

3 Ka ọtụtụ afọ gachara, Jọn Onye Na-eme Baptizim malitere ikwusa ozi ọma. Ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere mere ka ụfọdụ ndị chewe ma ọ̀ ga-abụ ya bụ Mesaya ahụ. (Gụọ Luk 3:15.) Ma, ọ ga-abụ na e nwere ụfọdụ ndị ghọtara otu amụma e buru banyere “izu iri asaa,” bụ́ nke kwesịrị inyere mmadụ aka ịmata mgbe Mesaya ahụ ga-apụta. Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ha ma mgbe Mesaya ahụ ga-apụta. Amụma ahụ e buru sịrị: “Malite mgbe e kwuru ka e mee ka Jeruselem dị otú ọ dịbu nakwa ka e wughachi ya ruo mgbe Mesaya bụ́ Onye Ndú ga-abịa, a ga-enwe izu asaa, nweekwa izu iri isii na abụọ.” (Dan. 9:24, 25) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ụbọchị nke ọ bụla dị n’izu a bụ otu afọ, ya bụ, otu izu bụ afọ asaa. Dị ka ihe atụ, nsụgharị Baịbụl bụ́ Revised Standard Version sịrị: “E kpebiwo na izu iri asaa nke [ụbọchị ọ bụla dị na ya nọchiri anya otu] afọ ga-agabiga.”

4 Taa, ndị ohu Jehova ma na izu iri isii na itoolu ahụ, ma ọ bụ narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ, e kwuru okwu ya na Daniel 9:25 malitere n’afọ 455 T.O.A. mgbe Eze Atazaksis nke Peshia nyere Nehemaya ikike ka ọ gaa wughachi Jeruselem. (Nehe. 2:1-8) Izu ndị ahụ gwụrụ n’afọ 29 O.A. mgbe narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ gachara. Ọ bụ mgbe ahụ ka e mere Jizọs onye Nazaret baptizim, jirikwa mmụọ nsọ tee ya mmanụ, ya esi otú ahụ ghọọ Mesaya.—Mat. 3:13-17. *

5. Olee amụma ndị anyị ga-atụle ugbu a?

5 E nwere ọtụtụ amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl, bụ́ ndị e buru banyere Mesaya ahụ. Anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ha n’isiokwu a. Ha bụ amụma ndị e buru banyere ọmụmụ ya, ihe ndị ga-eme mgbe ọ na-eto, na mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa. Anyị ga-ahụ otú amụma ndị a si mezuo n’isi Jizọs. O doro anya na nke a ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ihe ọ bụla Chineke kwuru na Baịbụl ga-emezu, meekwa ka o doo anyị anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ a nọ na-atụ anya ya kemgbe ụwa.

Amụma Ndị E Buru Banyere Ọmụmụ Ya nakwa Banyere Oge Ọ Bụ Nwata

6. Kọwaa otú e si mezuo ihe e dere na Jenesis 49:10.

6 A ga-amụ Mesaya ahụ n’ebo Juda nke dị n’Izrel. Mgbe nna ochie bụ́ Jekọb na-agọzi ụmụ ya mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, o buru amụma, sị: “Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ, mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara; ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.” (Jen. 49:10) N’oge ochie, ọtụtụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu kwuru na ọ bụ Mesaya ahụ ka a na-ekwu okwu ya ebe a. Malite mgbe Eze Devid, bụ́ onye si n’agbụrụ Juda, bidoro ịchị, mkpanaka eze (nke bụ́ ihe na-egosi onye ruru eru ịbụ eze), na mkpara onye na-achị achị (nke bụ́ ihe na-egosi onye e nyere ikike inye iwu) dịgidere na Juda. “Shaịlo” pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya; Onye Ọ Dịịrị.” A gaghịzi enwe eze ọzọ ga-esi n’agbụrụ Juda ma “Shaịlo” bịa. Ọ ga-achịwazi ruo mgbe ebighị ebi. Ihe mere nke a ji bụrụ eziokwu bụ na Chineke gwara Zedekaya, bụ́ eze ikpeazụ si n’agbụrụ Juda, na a ga-enye onye o ruuru ọchịchị. (Ezik. 21:26, 27) Mgbe Zedekaya chịchara, ọ bụ naanị Jizọs ka e kwere nkwa na ọ ga-abụ eze n’ime ndị niile si n’ezinụlọ Devid. Tupu a mụọ Jizọs, mmụọ ozi Gebriel gwara Meri, sị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) Ọ ga-abụrịrị Jizọs Kraịst, bụ́ onye si n’ezinụlọ Devid nke si n’agbụrụ Juda, bụ Shaịlo ahụ.—Mat. 1:1-3, 6; Luk 3:23, 31-34.

7. Olee otú amụma e buru banyere ebe a ga-amụ Mesaya ahụ si mezuo?

7 A ga-amụ Mesaya ahụ na Betlehem. Maịka onye amụma dere, sị: “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, obodo kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda, ọ bụ n’ime gị ka onye ga-aghọ onye ọchịchị n’Izrel ga-esi pụta wee bịakwute m, onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.” (Maị. 5:2) A ga-amụ Mesaya ahụ na Betlehem nke dị na Judia. A na-akpọbu obodo a Efrata. Ọ bụ eziokwu na nne Jizọs bụ́ Meri na nna ya bụ́ Josef bi na Nazaret, iwu onye na-achị Rom nyere ka onye ọ bụla laa n’obodo ya gaa deba aha ya n’akwụkwọ mere ka ha gaa Betlehem, bụ́ ebe a nọ mụọ Jizọs n’afọ nke 2 T.O.A. (Mat. 2:1, 5, 6) Otú a ka e si mụọ Jizọs kpọmkwem n’ebe e buru n’amụma na a ga-amụ ya!

8, 9. Olee ihe e buru n’amụma banyere ọmụmụ Mesaya ahụ, oleekwa ihe e kwuru ga-eme ozugbo a mụchara ya?

8 Ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ Mesaya ahụ. (Gụọ Aịzaya 7:14.) Amaokwu a kwuru na nwa agbọghọ ahụ ga-amụ nwa nwoke. Ihe a na-akpọ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke n’asụsụ Hibru bụ bethu·lahʹ. Ma, ọ bụ n’okwu Hibru ọzọ bụ́ ʽal·mahʹ, nke pụtara “nwa agbọghọ,” ka e si sụgharịta ihe e dere n’Aịzaya 7:14. N’amaokwu a, e buru amụma na “nwa agbọghọ ahụ [ha·ʽal·mahʹ]” ga-amụ nwa nwoke. A kpọkwara Ribeka nwa agbọghọ (ya bụ, ʽal·mahʹ) tupu ya alụọ di. (Jen. 24:16, 43) Matiu ji ike mmụọ nsọ dee na Aịzaya 7:14 mezuru mgbe a mụrụ Jizọs. Ọ bụghị okwu Grik pụtara “nwa agbọghọ” ka o dere, kama o dere okwu Grik bụ́ parthenos nke pụtara “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.” Ma Matiu ma Luk dere na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, nakwa na ọ tụụrụ ime site n’ike mmụọ nsọ Chineke.—Mat. 1:18-25; Luk 1:26-35.

9 A ga-egbu ụmụaka mgbe a mụchara Mesaya ahụ. Ihe yiri nke a mere ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Mesaya ahụ, mgbe Fero nke Ijipt nyere iwu ka a tụba nwa nwoke ọ bụla a mụrụ ọhụrụ bụ́ onye Hibru n’Osimiri Naịl. (Ọpụ. 1:22) Ma, ihe anyị kwesịrị icheta karịchaa bụ ihe e dere na Jeremaya 31:15, 16, bụ́ ebe e kwuru na Rechel na-akwa ákwá n’ihi ụmụ ya a kpọgara “n’ala ndị iro.” A nụrụ ákwá ya na Rema, bụ́ obodo dị anya, nke dị na Benjamin, n’ebe ugwu Jeruselem. Ihe Matiu dere gosiri na e mezuru ihe Jeremaya kwuru mgbe Eze Herọd nyere iwu ka e gbuo ụmụaka niile bụ́ ndị nwoke a mụrụ na Betlehem na obodo ndị dị ya nso. (Gụọ Matiu 2:16-18.) O doro anya na ihe a merenụ gbawara ndị mụrụ ụmụaka ndị a obi.

10. Kọwaa otú Hosia 11:1 si mezuo n’isi Jizọs.

10 Dị ka e si si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, a ga-esikwa n’Ijipt kpọpụta Mesaya ahụ. (Hos. 11:1) Tupu e bido igbu ụmụaka niile bụ́ ndị nwoke dị ka Herọd kwuru ka e mee, otu mmụọ ozi gwara Josef na Meri ka ha kpọrọ Jizọs gbaga Ijipt. Ha nọgidere ebe ahụ “ruo mgbe Herọd nwụrụ, ka e wee mezuo ihe Jehova si n’ọnụ onye amụma ya [bụ́ Hosia] kwuo, sị: ‘N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.’” (Mat. 2:13-15) Ebe ọ bụ na Jizọs ka bụ nwatakịrị, o doro anya na o nweghị otú ọ gaara esi jiri aka ya mee ka ihe ndị e buru n’amụma banyere ọmụmụ ya na ihe ndị ga-eme mgbe ọ bụ nwata mezuo.

Mesaya ahụ Amalite Ozi Ya

11. Olee otú e si kwadebe ụzọ tupu Onye Jehova E Tere Mmanụ abịa?

11 A ga-akwadebere Onye Chineke Tere Mmanụ ụzọ tupu ya abịa. Malakaị buru amụma na ọ bụ “Ịlaịja onye amụma” ga-arụ ọrụ a, ya bụ, inyere ndị mmadụ aka ka ha dị njikere ịnabata Mesaya ahụ ma ọ bịa. (Gụọ Malakaị 4:5, 6.) Jizọs kwuru na ọ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ “Ịlaịja” a. (Mat. 11:12-14) Mak kwukwara na ọ bụ otú Aịzaya buru n’amụma na “Ịlaịja” ahụ ga-esi eje ozi ya ka Jọn si jee ozi ya. (Aịza. 40:3; Mak 1:1-4) Ọ bụghị Jizọs gwara Jọn ka ọ rụọ ọrụ yiri nke Ịlaịja, ya bụ, ka ọ kwadebere Ya ụzọ. Ọ bụ Chineke họọrọ Jọn ka ọ rụọ ọrụ a iji nyere ndị mmadụ aka ịnabata Mesaya ahụ ma ọ bịa.

12. Olee ọrụ a ga-eji amata Mesaya ahụ?

12 Ọrụ Chineke kwuru Mesaya ahụ ga-arụ ga-enyere anyị aka ịmata onye bụ Mesaya ahụ. Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, bụ́ ebe ọ nọ too, gụọ ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaya ma kwuo na ọ bụ ya ka amụma ahụ mezuru n’isi. Ọ gụrụ, sị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa, ikwusa afọ Jehova na-anabata ndị mmadụ.” Ebe Jizọs bụ Mesaya ahụ n’eziokwu, o kwutere ya mgbe o kwuru, sị: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.”—Luk 4:16-21.

13. Gịnị ka e buru n’amụma banyere ozi Jizọs ga-eje na Galili?

13 E buru amụma na Mesaya ahụ ga-ekwusa ozi ọma na Galili. Aịzaya buru amụma banyere “ala Zebulọn” na “ala Naftalaị” nakwa “Galili nke ndị mba ọzọ.” O dere, sị: “Ndị na-eje ije n’ọchịchịrị ahụwo oké ìhè. Ìhè enwukwasịwo ndị bi n’ala nke oké ọchịchịrị.” (Aịza. 9:1, 2) Jizọs malitere ozi ya na Galili, n’obodo a na-akpọ Kapaniọm, bụ́ ebe ọtụtụ ndị bi na Zebulọn nakwa ndị bi na Naftalaị hụrụ oké ìhè nke eziokwu ndị Jizọs kụziiri ha. (Mat. 4:12-16) Ọ bụ na Galili ka Jizọs nọ zie Ozizi Elu Ugwu ya, họpụta ndịozi ya, rụọkwa ọrụ ebube mbụ ya. Ọ bụkwa na Galili ka Jizọs pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya, mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. (Mat. 5:1–7:27; 28:16-20; Mak 3:13, 14; Jọn 2:8-11; 1 Kọr. 15:6) O si otú ahụ mezuo ihe Aịzaya buru n’amụma nke bụ́ na Mesaya ahụ ga-ekwusara ndị bi ‘n’ala Zebulọn na ala Naftalaị’ ozi ọma. Ma, e nwekwara ebe ndị ọzọ Jizọs kwusara ozi ọma Alaeze ahụ n’Izrel.

Ihe Ndị Ọzọ E Buru n’Amụma na Mesaya ahụ Ga-eme

14. Olee otú Jizọs si mezuo ihe e dere n’Abụ Ọma 78:2?

14 Mesaya ahụ ga-eji ilu na ihe atụ kụziere ndị mmadụ ihe. Ọbụ abụ bụ́ Esaf, bụrụ abụ, sị: “M ga-emeghe ọnụ m tụọ ilu.” (Ọma 78:2) Olee otú anyị si mara na amụma a mezuru n’isi Jizọs? Ọ bụ Matiu gwara anyị. Mgbe Matiu kọchara otu ihe atụ Jizọs mere, bụ́ nke o ji Alaeze Chineke tụnyere mkpụrụ mọstad na ihe na-eko achịcha, Matiu sịrị: “[Jizọs adịghị] agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ; ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ onye amụma, bụ́ onye sịrị: ‘M ga-emeghe ọnụ m jiri ihe atụ kwuo okwu. M ga-ekwusa ihe ndị zoro ezo kemgbe a tọrọ ntọala ụwa.’” (Mat. 13:31-35) Ịtụ ilu ma ọ bụ ime ihe atụ so n’ihe ndị Jizọs ji nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ndị ọ na-akụziri ha nke ọma.

15. Kwuo otú Aịzaya 53:4 si mezuo.

15 Mesaya ahụ ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha. Aịzaya buru amụma, sị: “N’eziokwu, ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru; o bukwaara ihe mgbu anyị.” (Aịza. 53:4) Mgbe ahụ́ na-adịghị nne nwunye Pita, Jizọs gara gwọọ ya. O mechakwara gwọọ ọtụtụ ndị ọzọ bịara n’ụlọ Pita. Matiu kwuru na ọrịa a Jizọs gwọrọ ndị mmadụ mezuru ihe Aịzaya buru n’amụma, sị: “Ya onwe ya buuru ọrịa ndị na-arịa anyị, burukwa nrịanrịa anyị.” (Mat. 8:14-17) Ma nke a abụghị naanị mgbe Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa. E nwere ọtụtụ ebe a kọrọ na Baịbụl na Jizọs gwọrọ ndị ọrịa.

16. Olee otú Jọn onyeozi si gosi na ihe e kwuru n’Aịzaya 53:1 mezuru n’isi Jizọs?

16 Ọtụtụ ndị agaghị ekwere na Mesaya ahụ n’agbanyeghị ọrụ ọma niile ọ ga-arụ. (Gụọ Aịzaya 53:1.) Iji gosi na amụma a mezuru, Jọn onyeozi dere, sị: “N’agbanyeghị na [Jizọs] mere ọtụtụ ihe ịrịba ama n’ihu ha, ha enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ, nke mere na e mezuru ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: ‘Jehova, ònye nwere okwukwe n’ihe anyị nụrụ? Ònyekwa ka e kpugheere ogwe aka Jehova?’” (Jọn 12:37, 38) Ka Pọl onyeozi nọkwa na-ekwusa ozi ọma banyere Jizọs, ọ bụ mmadụ ole na ole kweere na Jizọs bụ Mesaya ahụ.—Rom 10:16, 17.

17. Olee otú amụma e buru n’Abụ Ọma 69:4 si mezuo?

17 A ga-akpọ Mesaya ahụ asị na nkịtị. (Ọma 69:4) Jọn onyeozi kwuru na Jizọs sịrị: “A sị na mụ arụghị ọrụ ndị ahụ n’etiti ha, bụ́ nke onye ọ bụla ọzọ na-arụghị, ha agaraghị enwe mmehie; ma ugbu a, ha ahụwo m, kpọọkwa mụ na Nna m asị. Kama ọ bụ ka e wee mezuo okwu ahụ e dere n’Iwu ha, nke sịrị, ‘Ha kpọrọ m asị na nkịtị.’” (Jọn 15:24, 25) “Iwu” a na-ekwu okwu ya ebe a bụ Akwụkwọ Nsọ e nwere n’oge ahụ. (Jọn 10:34; 12:34) Ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere gosiri na ndị mmadụ kpọrọ Jizọs asị, karịchaa ndị ndú okpukpe ndị Juu. Kraịst kwukwara, sị: “Ụwa enweghị ihe mere ọ ga-eji kpọọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị, n’ihi na m na-agba àmà banyere ya na ọrụ ya dị njọ.”—Jọn 7:7.

18. Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a nke ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jizọs bụ Mesaya ahụ?

18 Na narị afọ mbụ, o doro ndị na-eso ụzọ Jizọs anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ n’ihi na ha hụrụ na amụma niile e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaya ahụ mezuchara n’isi ya. (Mat. 16:16) N’isiokwu a, anyị amụtala na ụfọdụ amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ mezuru mgbe a mụrụ Jizọs onye Nazaret na mgbe ọ malitere ije ozi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle amụma ndị ọzọ e buru banyere Mesaya ahụ. Ọ bụrụ na anyị echebara ha echiche nke ọma, obi ga-esikwu anyị ike na Jizọs Kraịst bụ onye Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, họpụtara ka ọ bụrụ Mesaya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ị chọọ ịgụ ebe a kọwara “izu iri asaa” ahụ nke ọma, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee amụma ndị mezuru mgbe a mụrụ Jizọs?

• Olee otú e si kwadebere Mesaya ahụ ụzọ tupu ya abịa?

• Olee amụma ndị e buru n’Aịzaya isi 53, bụ́ ndị mezuru n’isi Jizọs?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]