Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ “Chineke Onye Na-enye Udo”

Jehova Bụ “Chineke Onye Na-enye Udo”

Jehova Bụ “Chineke Onye Na-enye Udo”

“Ka Chineke onye na-enye udo nọnyere unu niile.”—ROM 15:33.

1, 2. Olee otu ihe merenụ nke e dere na Jenesis isi nke 32 na nke 33, oleekwa ihe mechara mee?

E NWERE otu ihe mere n’otu oge. Otu nwoke na-aga izute nwanne ya nwoke nke na-alọta alọta. Ebe ọ ga-ezute ya dị nso na Penuel, nke dị nso na ndagwurugwu Jabọk nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan. Aha ụmụnne abụọ a bụ Isọ na Jekọb. O teela ha hụdebere ibe ha. Afọ iri abụọ agaala kemgbe Isọ resịrị nwanne ya nwoke bụ́ Jekọb ọnọdụ ya dị ka diọkpara. Mgbe Isọ nụrụ na Jekọb alọghachiwela, ọ kpọọrọ narị ndị ikom anọ gawa izute ya. Ụjọ bịara Jekọb mgbe ọ nụrụ na Isọ na-abịa izute ya. O chere na nwanne ya nwoke a ka buuru ya iwe n’obi, nakwa na o nwere ike igbu ya. N’ihi ya, Jekọb nyere ndị ohu ya ọtụtụ anụmanụ ka ha gaa nye Isọ. O kere anụmanụ ndị ahụ o nyere ha n’ìgwè n’ìgwè. Ha nye Isọ Ìgwè anụmanụ nke ọ bụla, ha agwa ya na ọ bụ onyinye nwanne ya sị ka ha nye ya. Anụmanụ niile Jekọb nyere ka e nye Isọ karịrị narị ise na iri ise.

2 Gịnị mere mgbe ụmụnne abụọ a mechara hụ ibe ha? Jekọb gosiri na obi kara ya nakwa na ya dị umeala n’obi. Ọ gakwuuru Isọ nwanne ya ma kpọọrọ ya isiala ugboro asaa. Ma tupu Jekọb emee nke a, o nwere ihe dị oké mkpa o burula ụzọ mee. Ọ gwala Jehova n’ekpere ka ọ napụta ya n’aka Isọ. Jehova ọ̀ zara ekpere ya? Ee. Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Isọ wee gbara ọsọ gaa izute ya, o wee makụọ ya ma dakwasị ya n’olu wee susuo ya ọnụ.”—Jen. 32:11-20; 33:1-4.

3. Gịnị ka akụkọ banyere Jekọb na Isọ na-akụziri anyị?

3 Ihe anyị mụtara n’akụkọ banyere Jekọb na Isọ bụ na anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike na-edozi nsogbu ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nwere ka ọ ghara ịkpaghasị udo e nwere n’ọgbakọ. Jekọb gbalịsiri ike ka ya na Isọ dịrị n’udo, ọ bụghị na o nwere ihe o mere nwanne ya nke kwesịrị ime ka ọ rịọ ya mgbaghara. Ọ bụ Isọ bụ onye na-ejighị ihe ruuru ya kpọrọ ihe, jirikwa maka ofe lentil resị Jekọb ọnọdụ ọkpara ya. (Jen. 25:31-34; Hib. 12:16) Ma, otú Jekọb si gakwuru Isọ ka ha mee udo gosiri otú anyị ga na-agbaru mbọ iji hụ na anyị na ụmụnna anyị dị n’udo. O gosikwara na ọ bụrụ na anyị arịọ ezi Chineke anyị ka o nyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo, ọ ga-aza ekpere anyị. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe nlereanya ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịmụta otú e si eme udo.

Onye Nlereanya Kachanụ Anyị Kwesịrị Iṅomi

4. Olee ndokwa Chineke mere iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ?

4 A bịa n’ime udo, onye nlereanya kachanụ anyị nwere bụ Jehova, bụ́ onye a kpọrọ “Chineke onye na-enye udo.” (Rom 15:33) Chegodị ihe niile Jehova mere iji nyere anyị aka ka anyị na ya dịrị n’udo. Ebe anyị bụ ụmụ Adam na Iv, anyị kwesịrị inweta “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ.” (Rom 6:23) Ma, n’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, o mere ndokwa ịzọpụta anyị. O si n’eluigwe zite Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka a mụọ ya n’ụwa, ya abụrụ mmadụ zuru okè. Ọkpara ya jikwa obi ya kweta. O kwere ka ndị iro Chineke gbuo ya. (Jọn 10:17, 18) Ezi Chineke anyị kpọlitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’ọnwụ. Ọkpara ahụ mechara gaa n’ihu Nna ya gosi ya uru nke ọbara ya a wụfuru, bụ́ nke ghọrọ àjà mgbapụta a ga-eji zọpụta ndị mmehie chegharịrị echegharị ka ha ghara ịnwụ ọnwụ ebighị ebi.—Gụọ Ndị Hibru 9:14, 24.

5, 6. Olee otú ọbara Jizọs a wụsịrị si mee ka Chineke na ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie dịrị n’udo?

5 Mmehie mere ka ụmụ mmadụ ghọọ ndị iro Chineke. Olee otú àjà mgbapụta e ji Ọkpara Chineke chụọ si enyere ụmụ mmadụ aka? Aịzaya 53:5 sịrị: “A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo, a gwọrọ anyị n’ihi ọnyá ya.” Ọ bụ àjà a Jizọs ji ndụ ya chụọ mere o ji kwe omume ka Chineke na ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi dịrị n’udo. Baịbụl kwuru, sị: “E si n’aka [Jizọs] jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị.”—Efe. 1:7.

6 Baịbụl sịrị: “Chineke hụrụ na ọ dị mma ka ihe niile biri n’ime [Kraịst] n’ụzọ zuru ezu.” Nke a bụ n’ihi na Kraịst bụ isi sekpụ ntị n’imezu nzube Chineke. Gịnịkwanụ bụ nzube Jehova? Ọ bụ ime ‘ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma site n’iji ọbara Jizọs Kraịst a wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ mee udo.’ “Ihe ndị ọzọ niile” Chineke ga-eme ka ha na ya dị n’udo bụ “ihe ndị dị n’eluigwe” na “ihe ndị dị n’ụwa.” Olee ihe ndị ha bụ?—Gụọ Ndị Kọlọsi 1:19, 20.

7. Gịnị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe” na “ihe ndị dị n’ụwa” e mere ka ha na Chineke dịrị n’udo?

7 Ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs mere ka a kpọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ “ndị ezi omume” dị ka ụmụ Chineke, ha na ‘Chineke adịrịkwa n’udo.’ (Gụọ Ndị Rom 5:1.) Baịbụl kpọrọ ha “ihe ndị dị n’eluigwe” n’ihi na ha nwere olileanya ịga eluigwe, ha ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze,’ bụrụkwa ndị nchụàjà Chineke. (Mkpu. 5:10) Ma, ndị Baịbụl kpọrọ “ihe ndị dị n’ụwa” bụ ụmụ mmadụ ndị chegharịrị echegharị, bụ́ ndị ga-emecha nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Ọma 37:29.

8. Olee ihe ị mụtara ka ị na-eche banyere ihe niile Jehova mere iji nyere ụmụ mmadụ aka ka ya na ha dịrị n’udo?

8 Pọl kwuru ihe gosiri na obi dị ya ụtọ maka ihe mgbapụta Jehova nyere maka ụmụ mmadụ. O degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’Efesọs akwụkwọ ozi, sị: “Chineke, onye ebere ya dị ukwuu, . . . mere ka anyị na Kraịst dịkọọ ndụ, ọbụna mgbe anyị nwụrụ anwụ ná njehie—e sitewo n’obiọma na-erughịrị mmadụ zọpụta unu.” (Efe. 2:4, 5) Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ànyị nwere olileanya ibi n’ụwa, obi dị anyị niile ụtọ maka ebere Chineke meere anyị nakwa maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke o nwere n’ebe anyị nọ. Obi na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu ka anyị na-echeta ihe niile Jehova mere iji nyere ụmụ mmadụ aka ka ha na ya dịrị n’udo. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị enwee nghọtahie nke chọrọ ịkpaghasị udo e nwere n’ọgbakọ? Anyị kwesịrị icheta ihe nlereanya Chineke gosiri anyị ma mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo.

Mụta Ihe n’Ihe Nlereanya Ebreham na Aịzik

9, 10. Olee otú Ebreham si gosi na ya bụ onye na-eme udo mgbe ndị na-azụrụ ya anụ ụlọ na ndị na-azụrụ Lọt anụ ụlọ sewere okwu?

9 O nwere ihe Baịbụl kwuru banyere Ebreham. Ọ sịrị: “‘Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume,’ e wee kpọọ ya ‘enyi Jehova.’” (Jems 2:23) Otu n’ime ihe ndị gosiri na Ebreham nwere okwukwe na Jehova bụ otú o si eme ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo. Dị ka ihe atụ, mgbe anụ ụlọ Ebreham bịara hiwe nne, ndị na-azụrụ ya anụ ụlọ na ndị na-azụrụ Lọt nwa nwanne ya anụ ụlọ bidoro sewe okwu. (Jen. 12:5; 13:7) O doro anya na ihe ga-akacha mee ka esemokwu ahụ bie bụ Ebreham na Lọt ikewa. Gịnị ka Ebreham ga-eme otú a ihe dewere ihu? Kama ikwo na ya na Chineke dị ná mma nakwa n’ihi na ọ bụ ya tọrọ Lọt gwawa Lọt ihe a ga-eme, Ebreham gosiri na ya bụ ezigbo onye na-eme udo.

10 Ebreham gwara nwa nwanne ya, sị: “Biko, ka mụ na gị nakwa ndị na-azụrụ m anụ na ndị na-azụrụ gị anụ ghara ịnọ na-ese okwu, n’ihi na anyị bụ ụmụnne.” Ọ gwakwara ya, sị: “Ọ̀ bụ na ala a dum adịghịrị gị? Biko, kwapụ n’ebe m nọ. Ọ bụrụ na ị gaa n’aka ekpe, mụ onwe m ga-aga n’aka nri; ma ọ bụrụ na ị gaa n’aka nri, mụ onwe m ga-aga n’aka ekpe.” Lọt họọrọ ebe ala kacha emepụta ihe oriri, ma nke ahụ eweghị Ebreham iwe. (Jen. 13:8-11) Ihe gosiri na nke a eweghị ya iwe bụ na ka oge na-aga, mgbe ndị agha bịara kpụrụ Lọt, Ebreham mere ngwa ngwa gaa napụta ya.—Jen. 14:14-16.

11. Olee otú Ebreham si gbasie mbọ ike ka ya na ndị agbata obi ya bụ́ ndị Filistia dịrị n’udo?

11 Cheekwa banyere otú Ebreham si mee ihe niile o nwere ike ime iji hụ na ya na ndị Filistia, bụ́ ndị agbata obi ya bikwa n’ala Kenan, dị n’udo. Ndị Filistia ‘ji ike weghara’ otu olulu mmiri ndị na-ejere Ebreham ozi gwuru na Bia-shiba. Olee ihe nwoke a kpara ike napụta nwa nwanne ya n’aka ndị eze anọ ga-eme n’ihe a? Kama ịlụso ha ọgụ ma wereghachi olulu mmiri ya, Ebreham kpebiri ịgbachi nkịtị. Ka oge na-aga, Eze ndị Filistia gakwuuru Ebreham ka ya na ya gbaa ọgbụgba ndụ nke udo. Ọ gwụla mgbe eze ahụ gwara Ebreham ka ọ ṅụọrọ ya iyi na ya agaghị eme ụmụ eze ndị Filistia ahụ ihe ọjọọ ka Ebreham kwulitere okwu olulu mmiri ahụ a naghaara ya. Mgbe eze nụrụ ihe a, ọ wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́. O nyeghachikwara Ebreham olulu mmiri ahụ. Ebreham gbasikwara mbọ ike hụ na ya na ndị nwe ala ebe ahụ o bi dị ka ọbịa nọgidere na-adị n’udo.—Jen. 21:22-31, 34.

12, 13. (a) Olee otú Aịzik si mee ka nna ya? (b) Olee otú Jehova si gọzie Aịzik maka ime udo?

12 Nwa Ebreham bụ́ Aịzik mekwara ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo otú nna ya mere. O mere ihe niile o nwere ike ime iji hụ na ya na ndị Filistia dịrị n’udo. N’ihi ụnwụ dị n’ala ahụ, Aịzik na ezinụlọ ya si n’ala Bia-lehaị-rọị kpọrọ nkụ, nke dị na Negeb, kwaga n’ebe ugwu nke ala Gira nke na-emepụta nri, bụ́ nke dịkwa n’ókèala ndị Filistia. Jehova gọziri Aịzik n’ebe ahụ ọ kwagara ma mee ka ubi ya na-emepụta nri nke ọma, meekwa ka anụ ụlọ ya hie nne. Ndị Filistia bidoro mewere ya anyaụfụ. Ebe ndị Filistia na-achọghị ka Aịzik baa ọgaranya ka nna ya, ha sụchiri olulu mmiri niile ndị na-ejere Ebreham ozi gwuru n’ógbè ahụ. N’ikpeazụ, eze ndị Filistia gwara Aịzik ka ọ ‘kwapụ n’ógbè ha.’ Aịzik, bụ́ nwoke na-eme udo, mere ihe eze ahụ gwara ya.—Jen. 24:62; 26:1, 12-17.

13 Mgbe Aịzik kwagara ebe dịtụ anya, ndị na-azụrụ ya atụrụ gwuru olulu mmiri ọzọ. Ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Filistia kwuru na mmiri dị n’olulu mmiri ahụ bụ nke ha. Aịzik mere ka nna ya Ebreham, o kwoghị olulu mmiri lụwa ọgụ. Kama ịlụwa ọgụ, Aịzik gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha gwuo olulu mmiri ọzọ. Ndị Filistia weghakwaara ya. Ka udo wee dị, Aịzik na ezinụlọ ya kwagakwara ebe ọzọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri Aịzik kpọrọ Rehobọt. Ka oge na-aga, ọ kwagara Bia-shiba, bụ́ ebe ala na-aka emepụta nri. Jehova gọziri ya ebe ahụ ọ kwagara ma gwa ya, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị, m ga-agọzikwa gị, meekwa ka mkpụrụ gị mụbaa n’ihi Ebreham ohu m.”—Jen. 26:17-25.

14. Olee otú Aịzik si gosi na ya bụ onye na-eme udo mgbe eze ndị Filistia bịara ka ya na ya gbaa ọgbụgba ndụ udo?

14 O doro anya na Aịzik ga-alụli ọgụ ka a ghara ịnaghara ya olulu mmiri ndị na-ejere ya ozi gwuru. Ihe gosiri na ọ ga-alụli ọgụ ma ọ chọọ bụ na e nwere mgbe eze Filistia na ndị ya na ya so achị gakwuuru ya na Bia-shiba ka ha na ya gbaa ọgbụgba ndụ nke udo. Ọ gwara ya, sị: “N’ezie, anyị ahụwo na Jehova nọnyeere gị.” N’agbanyeghị nke a, iji hụ na udo dị, Aịzik kpebiri ịkwaga ebe ọzọ ihe karịrị otu ugbo kama ịlụ ọgụ. N’oge a kwa, Aịzik gosiri na ya bụ onye na-eme udo. Baịbụl gwara anyị, sị: “O wee meere [ndị ọbịa ya] oriri, ha wee rie, ṅụọkwa. Ha biliri n’isi ụtụtụ echi ya, ha wee ṅụọrọ ibe ha iyi. E mesịa, Aịzik hapụrụ ha ka ha lawa . . . n’udo.”—Jen. 26:26-31.

Mụta Ihe n’Aka Nwa Jekọb nke Jekọb Kacha Hụ n’Anya

15. Gịnị mere ụmụnne Josef enweghị ike iji obiọma na-agwa ya okwu?

15 Nwa Aịzik bụ́ Jekọb bụ “nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.” (Jen. 25:27) Dị ka anyị kwuru ná mmalite, Jekọb gbara mbọ ka ya na Isọ nwanne ya mee udo. O doro anya na Jekọb mụtara otú e si eme udo n’aka nna ya bụ́ Aịzik. Ụmụ Jekọb kwanụ, hà mụtara ime udo? N’ime ụmụ nwoke iri na abụọ Jekọb mụrụ, ọ bụ Josef ka ọ kacha hụ n’anya. Josef bụ nwa na-erubere nna ya isi ma na-akwanyere ya ùgwù, ihe gbasara nna ya na-echukwa ya ụra. (Jen. 37:2, 14) Ma, ụmụnne Josef ndị tọrọ ya mewere ya anyaụfụ nke na ha enweghị ike iji obiọma na-agwa ya okwu. Obi fere ha azụ nke na ha rere Josef ka ọ gaa gbawa ohu ma ghọgbuo nna ha ya ekweta na otu anụ ọhịa adọgbuola Josef.—Jen. 37:4, 28, 31-33.

16, 17. Olee otú Josef si gosi ụmụnne ya na ya hụrụ udo n’anya?

16 Jehova gọziri Josef. Ka oge na-aga, Josef ghọrọ praịm minista ndị Ijipt, ya bụ, onye na-esote Fero. Mgbe ezigbo ụnwụ dara n’ala Kenan, ụmụnne Josef gara Ijipt ịzụta nri. Mgbe ha ruru, ha amataghịdị Josef n’ihi ejiji ya nke gosiri na ọ bụ praịm minista ndị Ijipt. (Jen. 42:5-7) A sị na Josef chọrọ, ọ gaara emegwara ụmụnne ya ndị obi fere azụ ihe ha mere ya na nna ha. Ma, kama imegwara ha, Josef gbara mbọ ka ha na ya dịrị n’udo. Mgbe o doro anya na ụmụnne ya echegharịala, Josef gwara ha onye ọ bụ ma sị ha: “Unu enwela mwute, unu ewesola ibe unu iwe maka na unu refuru m n’ebe a; n’ihi na ọ bụ maka ichebe ndụ ka Chineke ji buru ụzọ zipụ m tupu unu onwe unu.” O susuziri ụmụnne ya niile ọnụ wee dakwasị ha n’olu kwaa ákwá.—Jen. 45:1, 5, 15.

17 Mgbe nna ha bụ́ Jekọb nwụchara, ụmụnne Josef chere na Josef ga-emegwara ha ihe ha mere ya. Mgbe ha gwara Josef ihe bụ ụjọ ha, Josef “wee malite ibe ákwá” ma sị ha: “Unu atụla egwu. Mụ onwe m ga na-enye unu na ụmụntakịrị unu ihe oriri.” Josef, bụ́ onye hụrụ udo n’anya, ‘kasiri ha obi wee gwa ha okwu mesiri ha obi ike.’—Jen. 50:15-21.

“E Dere Ha Iji Nye Anyị Ntụziaka”

18, 19. (a) Olee ihe ị mụtara n’ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a banyere ndị na-eme udo? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

18 Pọl dere, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Olee ihe anyị mụtarala n’ihe nlereanya kachanụ Jehova gosiri anyị n’ime udo nakwa n’akụkọ banyere Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef?

19 Ọ bụrụ na anyị echebara ihe niile Jehova mere iji hụ na anyị na ya dị ná mma echiche, ọ̀ bụ na anyị agaghị eme ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo? Ihe nlereanya Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef gosiri na ọ bụrụ na ndị nne na nna na-eme udo, ụmụ ha nwere ike isi n’aka ha mụta ime udo. Ihe ọzọ akụkọ banyere ndị a na-akụziri anyị bụ na Jehova na-agọzi ndị na-agba mbọ ime ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji kwuo na Jehova bụ “Chineke onye na-enye udo”! (Gụọ Ndị Rom 15:33; 16:20.) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe mere Pọl ji gwa anyị ka anyị na-achụso udo, tụleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme udo.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee ihe Jekọb mere iji mee ka udo dị mgbe ya na Isọ na-aga izute?

• Olee ihe i kpebirila ime n’ihi ihe niile Jehova mere iji nyere ụmụ mmadụ aka ka ha na ya dịrị n’udo?

• Olee ihe ị mụtara n’ihe nlereanya Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef, bụ́ ndị na-eme udo?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Olee ihe kacha mkpa Jekọb mere mgbe ọ chọrọ ka ya na Isọ mee udo?