Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị

Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị

Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị

MGBE e mepụtara ígwè na-ebi akwụkwọ ọtụtụ narị afọ gara aga, o mere ka ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe isi otu ebe ziga ozi ebe ọzọ. Otú ahụ ka Ịntanet merela n’oge a. Ọ bụzi ihe a na-eji ezirịta ozi n’ụwa niile. Ị gaa n’Ịntanet, i nwere ike ịmata ọtụtụ ihe ndị mere eme na ihe ndị mmadụ dere banyere ihe dị iche iche.

E nwere ọmarịcha onyinye Onye kere anyị nyere anyị. Ọ bụ iso ndị ọzọ ekwurịta okwu. Onyinye a na-eme ka anyị nwee ike ịgwa ndị ọzọ ihe dị anyị n’obi, ma ọ bụkwanụ kọọrọ ha ihe ụfọdụ ha na-amaghị. Jehova bụ onye mbụ gwara ụmụ mmadụ okwu. Ọ gwara ha hoo haa ihe ha ga-eme ka ihe gaara ha nke ọma ná ndụ. (Jen. 1:28-30) Ma, ihe mere mgbe e kechara nwoke na nwaanyị mbụ ahụ gosiri na e nwere ike iji onyinye a mee ihe na-adịghị mma. Setan gwara Iv ihe na-abụghị eziokwu. Iv mere ihe Setan gwara ya, gwakwa Adam ihe ahụ Setan sị ya mee. Adam mekwara ihe a gwara ya, bụ́ nke mere ka ụmụ mmadụ banye ná nsogbu.—Jen. 3:1-6; Rom 5:12.

Olee otú nke a si gbasa Ịntanet? Anyị nwere ike isi n’Ịntanet mụta ọtụtụ ihe ndị ga-abara anyị uru, jirikwa nkeji ole na ole si n’Ịntanet mee ihe ndị gaara ewe anyị ọtụtụ awa. E nwekwara ike iji ya mee ihe ndị ọzọ bara uru. Ma, anyị nwekwara ike isi n’Ịntanet mụta ihe nwere ike iduhie anyị. O nwekwara ike iwekọrọ oge anyị, meekwa ka ọ dịrị anyị mfe ikiri ihe ndị rụrụ arụ. Ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi jiri Ịntanet mee ihe bara uru.

Ihe Ndị Dị n’Ịntanet Hà Bụ Eziokwu Ka Hà Bụ Ụgha?

Echekwala na ihe niile dị n’Ịntanet bara uru. E nwere ike iji ebe ndị a na-aga achọta ihe n’Ịntanet tụnyere ebe ero dị iche iche juru, ma ndị nke a na-eri eri ma ndị nke na-egbu mmadụ. Ọ bụrụ na i ruo ebe ahụ, ị̀ ga-eforo nke ọ bụla ị hụrụ n’ebughị ụzọ leruo ya anya? O doro anya na ị gaghị eme otú ahụ. Ihe dị iche iche mmadụ nwere ike ịgụ juru n’Ịntanet, ma ndị bara ezigbo uru ma ndị jọgburu onwe ha. Anyị ga-eji amamihe mata ndị nke dị mma na ndị nke na-adịghị mma, ka anyị ghara iji ihe na-adịghị mma mebie uche anyị.

Na 1993, e nwere otu ihe na-atọ ọchị e sere n’otu magazin a ma ama. Ọ bụ nkịta abụọ nọ n’ihu kọmputa. Otu nọ na-agwa ibe ya, sị: “Ọ̀ kwa ị ma na i nwere ike isi n’Ịntanet zigara mmadụ ozi ọ gaghị ama na ị bụ nkịta.” Ogologo oge gara aga, Setan si n’ọnụ agwọ gwa Iv na o nwere ike ịdị ka Chineke. Taa, onye ọ bụla chọrọnụ nwere ike ịnọ n’Ịntanet na-eme ka ọ̀ bụ prọfesọ n’emeghịdị ka a mara ihe bụ́ ezigbo aha ya. O nweghịkwa iwu ọ bụla ji mmadụ isi n’Ịntanet degara ndị ọzọ ihe masịrị ya na ihe o chere, nakwa isi na ya zigara ha foto ọ bụla masịrị ya.

Ekwekwala ka e jiri Ịntanet rafuo gị otú ahụ e si jiri agwọ rafuo Iv. Leruo ihe ọ bụla e dere n’Ịntanet anya. Tupu i kwere na ọ bụ eziokwu, jụọ onwe gị, sị: (1) Ònye dere ihe a? Onye dere ihe a ọ̀ bụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi? (2) Gịnị mere o ji dee ihe a? Olee ihe o bu n’obi dee ya? Ọ̀ bụ ka o were ihe ndị ọ ma kọjuo ndị ọzọ isi? (3) Olee ebe o si nweta ihe a o dere? Ò kwuru ebe o si nweta ya otú ọ ga-abụ ndị ọzọ chọọ ha agaa ebe ahụ lee ma ọ̀ bụ eziokwu? (4) Ihe a onye a dere ọ̀ ka bụ eziokwu taa? Ndụmọdụ Pọl nyere Timoti na narị afọ mbụ gbasakwara anyịnwa taa. Pọl kwuru, sị: “Chee ihe ndị ahụ e nyefere n’aka gị nche, na-agbakụta okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.”—1 Tim. 6:20.

Ọ̀ Na-eme Ka I Nwekwuo Ohere Ka Ọ̀ Na-ewekọrọ Oge Gị?

Ọ bụrụ na anyị ejiri Ịntanet na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-eme ka anyị nwekwuo ohere ime ihe ndị ọzọ, nwekwuo ike anyị ga-eji mee ihe ndị ọzọ, meekwa ka anyị ghara ịna-emefu nnukwu ego. Anyị nwere ike ịnọ n’ụlọ anyị zụọ ihe n’Ịntanet kama ịgawa n’ahịa. O nwere ike inyere anyị aka ịzụta ihe ọnụ ala. Kama ịgawa n’ụlọ akụ̀, ọtụtụ ndị nweziri ike ịnọ n’ụlọ ha kwụnye ego n’ụlọ akụ̀, ma ọ bụkwanụ mee ihe ndị ọzọ e ji ego eme. Anyị nwere ike iji Ịntanet hazie otú anyị ga-esi eme njem, sikwa na ya gbata tiketi. Anyị nwekwara ike isi na ya mata ụzọ ebe anyị na-aga, jirikwa ya chọta nọmba fon ndị mmadụ na adres ha. Alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-eji Ịntanet eme ọtụtụ n’ime ihe ndị a. Iji Ịntanet eme ihe ndị a na-abakwara ha uru.

Ma, Ịntanet nwekwara ike imebiri anyị ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, o nwere ike iwekọrọ oge anyị. Ụfọdụ ndị na-eji oge buru ibu nọrọ n’Ịntanet na-achọ ihe, na-agba gem, na-azụ ahịa, na-ezipụkwa ozi iimel. Nke a nwekwara ike ime ka ha chefuo ihe banyere ezinụlọ ha, ndị enyi ha, na ọgbakọ. Ịntanet nwere ike isi otú a rie ha ahụ́. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ e bipụtara na 2010 kwuru na Ịntanet eriela ihe dị ka otu onye n’ime ndị na-eto eto ise ọ bụla bi na mba Koria ahụ́. Ndị Jamanị na-eme nchọpụta kwuru na “a na-enwekwu ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị na-eme mkpesa na Ịntanet eriela ndị di ha ahụ́.” Otu nwaanyị kwuru na otú Ịntanet si rie di ya ahụ́ emeela ka àgwà di ya gbanwee n’otu ntabi anya nke na o meela ka ya na di ya gharazie ịdị ná mma.

Otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova natara akwụkwọ ozi nke otu onye sị na Ịntanet eriela ya ahụ́ dere. Onye a na-anọ n’Ịntanet mgbe ụfọdụ ruo awa iri n’ụbọchị. O kwuru, sị: “Ná mbido, o yiri m ka o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla dị na ya, ma, ebidoro m ịgha ọmụmụ ihe ma kwụsịkwa ịna-ekpe ikpere.” Ọ naghịzi akwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu ya agawa. Ya nọrọkwa n’ọmụmụ ihe, ihe ọ ga na-eche abụrụ “mgbe ọzọ ọ ga-agbanye kọmputa ya.” Ma, ka oge na-aga, ọ ghọtara na ya nwere ezigbo nsogbu. Ọ gbakwara mbọ gbanwee àgwà ahụ riri ya ahụ́. Anyị ekwesịghị iji oge buru ibu na-anọ n’Ịntanet ka ọ ghara iri anyị ahụ́.

Olee Ụdị Ihe Ndị Ị Na-ekiri n’Ịntanet?

Anyị na-agụ ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:21, 22, sị: “Na-achọpụtanụ ihe niile; jisiekwanụ ihe dị mma aka ike. Zerenụ ụdị ajọ omume niile.” Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma Chineke ọ̀ kwadoro ụdị ihe ndị anyị na-ekiri n’Ịntanet. Ihe ndị anyị na-ekiri n’Ịntanet kwesịrị ịbụ ihe ndị dị mma na ihe ndị Onye Kraịst kwesịrị ikiri. Ọtụtụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ juru n’Ịntanet. Ọ bụrụkwa na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ikiriwe ha.

Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ihe m na-ekiri n’Ịntanet ọ̀ bụ ihe ọ ga-abụ nwunye m, di m, ma ọ bụ ụmụnna m bata n’ime ụlọ ebe m nọ na-ekiri ya mụ ewepụ ya ozugbo?’ Ọ bụrụ na ọ bụ ya, mara na ọ ga-akacha mma ka ị na-aga n’Ịntanet naanị mgbe ndị ọzọ nọ ya. Ịntanet agbanweela otú ndị mmadụ na ibe ha si akparịta ụka nakwa otú ndị mmadụ si azụ ahịa. O meekwala ka ndị mmadụ mata ụzọ ọhụrụ ha ga-esi ‘na-akwa iko n’obi ha.’—Mat. 5:27, 28.

Olee Ụdị Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ịna-ezigara Ndị Ọzọ?

Ịgụ ihe ndị ọzọ dere na izigara ndị ọzọ ihe anyịnwa dere so n’ihe ndị a na-eji Ịntanet eme. Ọ bụ eziokwu na anyị nweere onwe anyị ịgụ ihe ndị ọzọ dere na izigara ndị ọzọ ihe anyịnwa dere, anyị kwesịrị ịhụ na ihe ndị ahụ bụ eziokwu ma bụrụkwa ihe ndị dị mma. Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: Ànyị ji n’aka na ihe anyị si n’Ịntanet na-ezigara ndị ọzọ bụ eziokwu? È nyere anyị ikike izigara ndị ọzọ ozi ahụ? * Ọ̀ ga-abara ndị ọzọ uru? Gịnị ka anyị bu n’obi na-ezigara ha ozi ahụ? Ihe mere anyị ji na-ezigara ha ya ọ̀ bụ naanị ka ha mara na anyị ma nke a na-akọ?

Iimel nwere ike ịbara anyị ezigbo uru ma anyị jiri ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ma, ndị ọzọ nwekwara ike isi na ya na-ezitere anyị ọtụtụ ozi ndị na-abaghị uru. Anyị ga-ajụ onwe anyị ma ànyị na-ezigara ndị ọzọ ọtụtụ ozi ndị ga-ewe ha oge ịgụcha. Anyị kwesịkwara ịjụ onwe anyị ihe mere anyị ji chọọ izigara ndị ọzọ ozi tupu anyị ezipụ ya. N’oge ndị gara aga, ndị mmadụ na-edere ndị ikwu ha na ndị enyi ha akwụkwọ ozi iji kọọrọ ha otú ha na ije si aga. O kwesịkwara ịbụ ihe a ka anyị ga-ebu n’obi na-ezigara ndị ọzọ ozi iimel. Anyị ekwesịghị izigara ndị ọzọ ihe ndị anyị na-ejighị n’aka na ha bụ eziokwu.

Ugbu a, olee ihe anyị kwesịrị ime banyere Ịntanet? Ànyị ga-ajụ ya kpamkpam? E nwere mgbe ọ ga-adị mkpa ka anyị mee otú ahụ. Onye ahụ Ịntanet riri ahụ́ anyị kwuru okwu ya ná mmalite mere otú ahụ. Ma, Ịntanet nwere ike ịbara anyị uru, ma ọ bụrụhaala na anyị ekwe ka ‘ikike iche echiche na nghọta na-eche anyị nche.’—Ilu 2:10, 11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Otú ahụ ka ọ dịkwa foto. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịna-ekiri foto anyị sere ndị ọzọ, ma o nwere ike ndị nwe foto ndị ahụ agaghị achọ ka anyị kesawara ha ndị ọzọ, ma ya fọdụzie ịgwawa ha aha ndị nọ foto ndị ahụ ma ọ bụ ebe ha bi.

[Foto dị na peeji nke 4]

Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji ihe na-abụghị eziokwu dị n’Ịntanet duhie gị?

[Foto dị na peeji nke 5]

Olee ihe i kwesịrị ịjụ onwe gị tupu gị ezigara onye ọzọ ozi?