Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-achụso udo

Na-achụso udo

Na-achụso udo

“Ka anyị na-achụso ihe na-eweta udo.”—Rom 14:19.

1, 2. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji dịrị n’udo?

EZIGBO udo kọrọ n’ụwa taa. Ndị sidị n’otu obodo ma na-asụ otu asụsụ, na-enwekarị okpukpe dị iche iche ha na-ekpe. Ha na-anọkwa n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche nakwa n’òtù ndị ọzọ dị iche iche. Ma, ndị na-efe Jehova taa dị n’otu n’agbanyeghị na ha si “ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” pụta.—Mkpu. 7:9.

2 Anyị anọkataghị dịrị n’udo, e nwere ihe ndị kpatara ya. Ihe bụ́ isi mere anyị ji dịrị n’udo bụ n’ihi na ‘anyị na Chineke dị n’udo’ n’ihi okwukwe anyị nwere n’Ọkpara ya, bụ́ onye e ji ọbara ya a wụsịrị kpuchie mmehie anyị. (Rom 5:1; Efe. 1:7) Ihe ọzọ bụ na ezi Chineke anyị na-enye ndị ohu ya na-erubere ya isi mmụọ nsọ, udo sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Ihe ọzọkwa mere anyị ji dịrị n’udo bụ na anyị “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) Anyị anaghị etinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ebe ọ bụ na anyị ‘akpụgharịala mma agha anyị ka ha bụrụ mma ogè,’ anyị anaghị etinye aka n’agha ọ bụla.—Aịza. 2:4.

3. Gịnị ka udo anyị nwere na-eme ka anyị nwee ike ime, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ihe mere anyị ji dịrị n’udo abụghị naanị na anyị anaghị eme ihe ndị ga-emerụ ụmụnna anyị ahụ́, kamakwa, anyị na-eme ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka anyị na ha dịrị n’otu. Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ‘na-ahụrịta ibe anyị n’anya’ n’agbanyeghị na ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ nwere ike isi n’agbụrụ dị iche iche, nweekwa otú dị iche iche onye ọ bụla n’ime anyị si eme ihe. (Jọn 15:17) Udo dị n’etiti anyị na-eme ka anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10) Anyị kwesịrị iji paradaịs ime mmụọ anyị nọ na ya, bụ́ ebe udo dị, kpọrọ ihe. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi chụsoo udo n’ọgbakọ.

Mgbe Anyị Sụrụ Ngọngọ

4. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji chụsoo udo mgbe anyị kpasuru mmadụ iwe?

4 Jems onyeozi dere, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè.” (Jems 3:2) N’ihi ya, a ga-enwerịrị mgbe anyị na ụmụnna ga-enwe nghọtahie. (Fil. 4:2, 3) Ma, mmadụ abụọ nwere nghọtahie nwere ike ikpezi n’akpaghasịghị udo dị n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ka anyị gụọ ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị akpasuola mmadụ iwe.—Gụọ Matiu 5:23, 24.

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-achụso udo ma e mejọọ anyị?

5 Oleekwanụ ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ bụ anyịnwa ka a kpasuru iwe? Ànyị kwesịrị ichewe ka onye ahụ mejọrọ anyị bịa rịọ anyị mgbaghara? 1 Ndị Kọrịnt 13:5 kwuru, sị: “[Ịhụnanya adịghị] agụkọ ihe ọjọọ.” E mejọọ anyị, anyị ga-egosi na anyị na-achụso udo ma ọ bụrụ na anyị agbaghara ma chezọọ ihe e mere anyị, ya bụ, ma anyị ‘ghara ịna-agụkọ ihe ọjọọ.’ (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Ọ kacha mma ime otú ahụ ma ọ bụrụ na mmejọ ahụ bụ obere ihe, n’ihi na nke a na-eme ka anyị na ndị anyị na ha na-efekọ Jehova dịrị n’udo, na-emekwa ka obi ruo anyị ala. Otu ilu Baịbụl kwuru, sị: ‘Ileghara mmejọ anya bụ ịma mma.’—Ilu 19:11.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o siere anyị ike ichefu ihe ọjọọ onye ọzọ mere anyị?

6 Ya bụrụkwanụ na ihe ọjọọ e mere anyị ekweghị anyị nchefu? Ịkọsara ya onye ọ bụla kwere ige anyị ntị agaghị egosi na anyị ma ihe. Naanị ihe asịrị a ga-eme bụ ịkpaghasị udo dị n’ọgbakọ. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị na onye ahụ kpezie? Matiu 18:15 kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru.” Ọ bụ eziokwu na Matiu 18:15-17 na-ekwu banyere mmehie dị oké njọ, ihe e kwuru n’amaokwu nke 15 na-egosi na anyị kwesịrị ịgakwuru onye ahụ mejọrọ anyị ka naanị anyị na ya kwurịta ya. Ihe anyị kwesịrị ibu n’obi mee nke a bụ ka anyị na ya dịghachi n’udo. *

7. Gịnị mere anyị ekwesịghị igbu oge dozie okwu anyị na ndị ọzọ nwere?

7 Pọl onyeozi dere, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Jizọs sịrị: “Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ dozie okwu ọsọ ọsọ.” (Mat. 5:25) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo, anyị ga na-edozi okwu ọsọ ọsọ. Gịnị mere anyị ga-eji eme otú a? Ọ bụ n’ihi na ime otú ahụ ga-eme ka nsogbu ahụ ghara ịna-aka njọ otú ahụ ọnyá si abara na-aga ma ọ bụrụ na e meghị ya ọgwụ ngwa ngwa. Ka anyị ghara ikwe ka nganga, anyaụfụ, ma ọ bụ ịhụ ego n’anya mee ka anyị gbuo oge idozi okwu anyị na ndị ọzọ nwere.—Jems 4:1-6.

Mgbe E Nwere Ọtụtụ Ndị Ha na Ibe Ha Na-ese Okwu

8, 9. (a) Olee ihe seere ndị nọ n’ọgbakọ dị na Rom na narị afọ mbụ okwu? (b) Olee ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst nọ na Rom banyere okwu ahụ ha nọ na-ese?

8 O nwere mgbe a na-enwe ọtụtụ ndị ha na ibe ha na-ese okwu n’ọgbakọ. Ụdị ihe a mere Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ dị na Rom, bụ́ ndị Pọl onyeozi ji ike mmụọ degara akwụkwọ ozi. E nwere esemokwu n’etiti ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst. Ọ ga-abụ na e nwere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ ndị na-eleda ndị akọnuche ha na-esighị ike anya, ma ọ bụkwanụ ndị na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ndị a na-ekpe ndị ọzọ ikpe n’okwu mmadụ kwesịrị iji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ndị nọ n’ọgbakọ ahụ?—Rom 14:1-6.

9 Pọl dụrụ ndị niile okwu ahụ gbasara ọdụ. Ọ gwara ndị nke ghọtara na ha anọghị n’okpuru Iwu Mozis ka ha ghara ịna-eleda ụmụnna ha ndị nke ọzọ anya. (Rom 14:2, 10) Ụdị àgwà a nwere ike ime ka Ndị Kraịst ndị ọzọ sụọ ngọngọ, bụ́ ndị ọ ka nwere otú ọ na-adị ha iri ihe ndị Iwu Mozis sịrị ka a ghara iri. Pọl dụrụ ha ọdụ, sị: “Kwụsịnụ ibibi ọrụ Chineke naanị n’ihi ihe oriri. Ọ dị mma ka ị ghara iri anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.” (Rom 14:14, 15, 20, 21) Ma, Pọl dụrụ Ndị Kraịst ndị ọzọ ọdụ, bụ́ ndị nwere ọtụtụ ihe akọnuche ha na-anaghị ekwe ha mee, ka ha ghara ịna-ekpe ndị nke akọnuche ha kwere ha mee ihe ụfọdụ ikpe, na-ewere na ha ekwesịghị ntụkwasị obi. (Rom 14:13) Ọ gwara ‘onye ọ bụla n’etiti ha n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.’ (Rom 12:3) Mgbe Pọl dụchara ndị nke ọ bụla ọdụ maka okwu ahụ ha na-ese, o dere, sị: “Ya mere, ka anyị na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.”—Rom 14:19.

10. Dị ka ndị nọ n’ọgbakọ Rom na narị afọ mbụ mere, gịnị ka ndị nwere nghọtahie taa kwesịrị ime?

10 O doro anya na ndị nọ n’ọgbakọ dị na Rom mere mgbanwe ụfọdụ iji hụ na ha mere ihe Pọl dụrụ ha ọdụ ka ha mee. Ọ bụrụ na e nwee ihe na-esere anyị na ụmụnna anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji obiọma dozie okwu anyị na ha nwere, jirikwa umeala n’obi na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’okwu ahụ? Otú ahụ ndị ha na ụmụnna ha nwere nghọtahie n’ọgbakọ Rom si mee mgbanwe ụfọdụ, ka ndị nwere nghọtahie taa kwesịkwara isi mee mgbanwe ụfọdụ ka ‘ha na ibe ha dị n’udo.’—Mak 9:50.

Mgbe A Chọrọ Ka I Nye Aka

11. Gịnị ka okenye kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ime ma ọ bụrụ na nwanna achọọ ịkọrọ ya nghọtahie ya na nwanna ọzọ nwere?

11 Ya bụrụkwanụ na Onye Kraịst na onye ezinụlọ ya ma ọ bụ nwanna ya nwere ihe na-esere ha nke ọ chọrọ ịkọrọ otu okenye? Ilu 21:13 kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya, ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.” Okenye ahụ agaghị ‘emechi ntị ya.’ Ma, ilu ọzọ sịrị: “Ọ na-adị ka onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese okwu bụ onye ikpe gaara, tutuu ruo mgbe onye nke ọzọ bidoro ịjụ ya ajụjụ.” (Ilu 18:17, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Okenye ahụ kwesịrị iji nwayọọ gee ntị, ma o kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ikwu ihe ga-egosi na ọ dụnyerela onye na-ekpesara ya úkwù. Ya gerechaa ihe onye ahụ kwuru, o nwere ike jụọ ya ma ya na onye kpasuru ya iwe hà ekwurịtala okwu ahụ. Okenye ahụ nwekwara ike ịgwa onye ahụ kpesaara ya nsogbu ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ọ ga-eme ka udo chịa.

12. Olee akụkọ ndị na-egosi na ọ dịghị mma ibi ikpe n’olu otu onye?

12 E nwere akụkọ atọ a kọrọ na Baịbụl bụ́ ndị na-egosi ihe mere na ọ dịghị mma ibi ikpe n’olu otu onye. Mgbe nwunye Pọtịfa gwara Pọtịfa na Josef chọrọ idina ya n’ike, Pọtịfa kweere ihe o kwuru. Ezigbo iwe jidere ya nke mere ka ọ tụba Josef n’ụlọ mkpọrọ n’enweghị ihe o mere. (Jen. 39:19, 20) Mgbe Zaịba gwara Eze Devid na nna ya ukwu bụ́ Mefiboshet adụnyerela ndị iro Devid úkwù, Devid kweere ihe o kwuru ma gwa ya ozugbo, sị: “Lee! Ihe niile bụ́ nke Mefiboshet bụzi nke gị.” (2 Sam. 16:4; 19:25-27) E nwere mgbe a gwara Eze Atazaksis na ndị Juu na-ewughachi mgbidi Jeruselem nakwa na ha na-achọ inupụrụ Alaeze Ukwu Peshia isi. Eze ahụ kweere ihe ahụ na-abụghị eziokwu a gwara ya ma nye iwu ka a kwụsị iwughachi ihe ọ bụla na Jeruselem. Nke a mere ka ndị Juu kwụsị ịrụ ọrụ n’ụlọ nsọ Chineke. (Ezra 4:11-13, 23, 24) Ndị okenye ọgbakọ ga-egosi na ha maara ihe ma ọ bụrụ na ha emee ihe Pọl gwara Timoti ma ghara ibi ikpe mgbe ha na-anụchabeghị otú ihe si mee.—Gụọ 1 Timoti 5:21.

13, 14. (a) Olee ihe anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na nwanna na nwanna enwee nghọtahie? (b) Olee ihe ndị ga-enyere ndị okenye aka ikpe ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na nwanna na nwanna enwee nghọtahie?

13 Ọ bụrụgodị na o yie ka à nụchaala otú ihe si mee n’ọnụ ndị ahụ na-ese okwu, e kwesịrị iburu n’obi na “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ya amatawo ihe ọ bụla, ọ mabeghị ya otú o kwesịrị ịmara ya.” (1 Kọr. 8:2) Ànyị ji n’aka na anyị ma ihe niile kpatara esemokwu ahụ? O nwere ike ịbụ na ọ bụghị ihe niile banyere ndị ahụ na-ese okwu ka anyị ma. Ọ bụrụ na ndị okenye ekpewe ikpe, ọ dị ezigbo mkpa ka ha lezie anya ka ha ghara ịgbakwasị ụkwụ n’ihe na-abụghị eziokwu a kọọrọ ha ma ọ bụkwanụ n’asịrị bie ikpe ahụ. Jizọs Kraịst, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Onyeikpe, na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụghị “naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị.” (Aịza. 11:3, 4) Kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ Jehova na-edu Jizọs. Ndị okenye kwesịkwara ikwe ka mmụọ nsọ na-edu ha mgbe ha na-ekpe ikpe.

14 Tupu ndị okenye ekpebie ikpe gbasara ụmụnna ha, ha kwesịrị ịrịọ Jehova n’ekpere ka o nye ha mmụọ nsọ ya. Ha ga-egosikwa na ha kwere ka mmụọ nsọ na-edu ha ma ọ bụrụ na ha esoro ihe Okwu Chineke na akwụkwọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche kwuru na-ekpe ikpe.—Mat. 24:45.

Ànyị Ga-ekwo Ka Udo Dị Mejọọ Chineke?

15. Olee mgbe anyị kwesịrị ịkọrọ ndị okenye mmehie anyị ma na nwanna anyị mere?

15 A gwara anyị bụ́ Ndị Kraịst ka anyị na-achụso udo. Ma, Baịbụl kwukwara, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo.” (Jems 3:17) N’amaokwu a, e bu ụzọ dee ịdị ọcha, ya bụ, ime ihe Chineke kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi na ime ihe dị ya mma, tupu e dee ime udo. Ọ bụrụ na nwanna amata na nwanna ya mere mmehie dị oké njọ, o kwesịrị ịgwa ya ka ọ gaa gwa ndị okenye ihe o mere. (1 Kọr. 6:9, 10; Jems 5:14-16) Ọ bụrụ na onye ahụ mere mmehie agaghị, nwanna ahụ ma ihe ahụ o mere kwesịrị ịga n’onwe ya kọọrọ ndị okenye. Ma, ya kworo ka ya na onye ahụ nọgide na-adị n’udo ghara ịga gwa ndị okenye, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie onye ahụ.—Gụọ Levitikọs 5:1; Ilu 29:24.

16. Gịnị ka ihe Jihu mere Eze Jehoram na-akụziri anyị?

16 Akụkọ banyere Jihu gosiri na ime ihe ziri ezi n’anya Chineke dị mkpa karịa ime udo. Chineke zigara Jihu ka ọ gaa mee ndị ezinụlọ Eze Ehab ihe O kwuru na a ga-eme ha. Eze ọjọọ bụ́ Jehoram, nwa Ehab na Jezibel, gbaara ụgbọ ịnyịnya ya bịa izute Jihu. Mgbe o rutere, ọ jụrụ Jihu, sị: “Jihu, udo ọ̀ dịkwa?” Gịnị ka Jihu zara ya? Ọ zara ya, sị: “Olee otú udo ga-esi dị ebe ọ bụ na nne gị Jezibel na-akwa iko ma na-agba afa nke ukwuu?” (2 Eze 9:22) Ozugbo Jihu kwuchara nke a, o weere ụta ya gbaa Jehoram n’azụ, akụ̀ ụta ahụ esi ya n’obi mapụta. Otú a Jihu na-ekwoghị ka udo dịrị ghara ime ihe o kwesịrị ime, ka ndị okenye na-ekwesịghịkwa ikwo ka udo dịrị hapụ ndị mmehie na-achọghị ichegharị ka ha nọrọ n’ọgbakọ. Ha na-achụpụ ndị dị otú a n’ọgbakọ ka ọgbakọ na Chineke nwee ike ịnọgide na-adị n’udo.—1 Kọr. 5:1, 2, 11-13.

17. Olee ihe Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-eme ka udo wee dị?

17 Nsogbu nke na-adịkarị n’etiti nwanna na nwanna anaghị abụ n’ihi mmehie dị oké njọ nke e kwesịrị ikwo hiwe òtù ikpe. N’ihi ya, ọ kacha mma ka anyị na-eleghara ihe ndị ọzọ mere anyị anya iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya. Okwu Chineke sịrị: “Onye na-ekpuchi mmejọ na-achọ ịhụnanya, onye na-ekwukwa banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.” (Ilu 17:9) Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka udo dịgide n’ọgbakọ, meekwa ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma.—Mat. 6:14, 15.

Chineke Na-agọzi Ndị Na-achụso Udo

18, 19. Olee otú Jehova si agọzi ndị na-achụso udo?

18 Chineke ga-agọzi anyị nke ukwuu ma ọ bụrụ na anyị ana-achụso “ihe na-eweta udo.” Anyị na Jehova ga-adị n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na anyị na-eṅomi ya, nke a ga-emekwa ka udo dịgide na paradaịs ime mmụọ anyị. Ọ bụrụkwa na anyị na ndị nọ n’ọgbakọ na-adị n’udo, anyị ga-amụta otú anyị na ndị anyị na-ekwusara “ozi ọma nke udo” ga-esi dịrị n’udo. (Efe. 6:15) Nke a ga-emekwa ka anyị nwekwuo ike ‘ịna-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, na-ejide onwe anyị mgbe ọnọdụ dị njọ.’—2 Tim. 2:24.

19 Echefukwala na a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Mgbe ihe a e kwuru ga-emezu n’ụwa a, a ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ si n’agbụrụ dị iche iche na ndị nwere àgwà dị iche iche n’ọnwụ. A ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ malite “mgbe a tọrọ ntọala ụwa” ruo n’oge a! (Luk 11:50, 51) N’eziokwu, ịkụziri ndị e si n’ọnwụ kpọlite otú e si eme udo ga-abụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ọzụzụ a na-enye anyị taa ka anyị bụrụ ndị na-eme udo ga-abara anyị ezigbo uru n’oge ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ị chọọ ịma ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ị ga-eme ma nwanna kwutọọ gị ma ọ bụ gwuo gị wayo, bụ́kwanụ ihe ndị bụ́ mmehie ndị dị oké njọ, gụọ Ụlọ Nche, October 15, 1999, peeji nke 17-22.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee otú anyị nwere ike isi chụsoo udo ma ọ bụrụ na anyị mejọrọ onye ọzọ?

• Olee otú anyị ga-esi achụso udo ma mmadụ mejọọ anyị?

• Gịnị mere anyị ekwesịghị ibi okwu n’olu otu onye?

• Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ikwo ka udo dị mejọọ Chineke?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Jehova hụrụ ndị na-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam n’anya