Nzukọ A Na-agaghị Echefu Echefu
Nzukọ A Na-agaghị Echefu Echefu
“A GBASAA nzukọ a, ị ga-ekwu na ‘Nzukọ a a na-enwe kwa afọ bụ n’eziokwu nzukọ pụrụ iche e ji akwado ofufe Jehova!’” Ihe a Stephen Lett, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kwuru mere ka ndị na-ege ntị tụsiwe anya ike ịnụ ihe ndị a ga-ekwu ná nzukọ ahụ. Nzukọ ahụ bụ nzukọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ. Nke a bụ nke otu narị na iri abụọ na isii ya. E nwere nzukọ a n’Ọktoba 2, 2010, n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Jesi Siti, na Niu Jesi nke dị n’Amerịka. Olee ihe ụfọdụ ndị gbara ọkpụrụkpụ e mere ná nzukọ ahụ pụrụ iche?
Nwanna Lett ji ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu mbụ e kwuru ná nzukọ ahụ. O kwuru banyere ụgbọ ịnyịnya Jehova nke na-agba n’eluigwe, bụ́ nke a kọwara n’akwụkwọ Ezikiel. Nwanna Lett kwuru na nnukwu ụgbọ ịnyịnya ahụ dị ebube na-anọchi anya nzukọ Chineke, bụ́ nke Jehova ji aka ya na-edu. Nzukọ a bụ otu, ma e nwere nke a na-ahụ anya na nke a na-anaghị ahụ anya. Ọ bụ ndị mmụọ ozi mejupụtara nke a na-anaghị ahụ anya, ọ na-agbakwa oké ọsọ ka àmụ̀mà, ya bụ, ọ na-agba oké ọsọ otú Jehova si chọọ ka ọ na-agba. Nke a na-ahụ anya na-agbakwa oké ọsọ. Nwanna Lett kọrọ ụfọdụ ihe ndị na-enye obi ụtọ, bụ́ ndị mere na nso nso a ná nzukọ Jehova a na-ahụ anya.
Dị ka ihe atụ, e nweela alaka ụlọ ọrụ ndị e bukọtara ọnụ. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị na-ejebu ozi na Betel nwekwuo oge ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma. Nwanna Lett gbara ndị niile na-ege ntị ume ka ha na-ekpe ekpere ka Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-anọchite anya ndị e tere mmanụ, nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-enwe uche.—Mat. 24:45-47.
Akụkọ Ndị Na-agba Anyị Ume na Ahụmahụ Ndị Na-enye Obi Ụtọ
Tab Honsberger, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka na Heiti, kwuru okwu na-emetụ nnọọ n’ahụ́ banyere ala ọma jijiji ahụ mere na Heiti na Jenụwarị 12, 2010 nke tara isi ihe dị ka narị puku mmadụ atọ. O kwuru na ndị ụkọchukwu nọ na-agwa ndị mmadụ na ndị ahụ nwụrụnụ bụ ndị Chineke ji ala ọma jijiji ahụ gbuo n’ihi na ha enweghị okwukwe, ebe ndị nke o chebere bụ ndị nke na-eme ihe ọma. Ma, ọtụtụ puku ndị omekome nọ n’otu ụlọ mkpọrọ si n’ụlọ mkpọrọ ahụ gbapụ mgbe ala ọma jijiji ahụ kwaturu ahụ́ ájá ụlọ mkpọrọ ahụ. Ihe ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na Heiti na-amụta na Baịbụl na-akasi ha obi n’ihi na ọ na-eme ka ha mata ihe mere nsogbu ji ju ebe niile n’oge anyị a. Nwanna Honsberger kwughachiri ihe otu nwanna onye Heiti nwunye ya nwụrụ n’ala ọma jijiji ahụ kwuru. Ọ sịrị: “M ka na-ebe ákwá ọnwụ nwunye m ruo taa. Amaghị m mgbe m ga-akwụsị iru újú nwunye m. Ma, ịhụnanya ụmụnna m na-egosi m na-eme m obi ụtọ. Enwere m olileanya. M ga-akụzikwara ndị ọzọ banyere olileanya a m nwere.
Mark Sanderson, bụ́ onye sozi n’ezinụlọ Betel dị na Bruklin, kọrọ otú ozi anyị si aga na Filipinz. O sobu na Kọmitii Alaka dị na Filipinz. Ihu bụ ya ọchị ọchị mgbe ọ na-akọ otú ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze si na-amụba kwa afọ n’obodo ahụ kemgbe afọ iri atọ na abụọ. Ọ kọkwara otú ọnụ ọgụgụ ndị a na-amụrụ Baịbụl si karịa nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e nwere ná mba ahụ. Ọ kọrọ banyere otu nwanna a na-akpọ Miguel, bụ́ onye e gburu nwa nwa ya. Miguel gbara mbọ hụ na e kpere onye ahụ gburu nwa nwa ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ. Ka Miguel nọ na-ezi ọma otu ụbọchị n’ụlọ mkpọrọ, ọ hụrụ onye ahụ gburu nwa nwa ya. N’agbanyeghị na obi jọrọ Miguel njọ ozugbo ọ hụrụ ya, o weturu obi kelee ya. Miguel mechara mụwara nwoke ahụ Baịbụl. Nwoke ahụ mechara gbanwee ndụ ya ma malite ịhụ Jehova n’anya. E meekwala ya baptizim ugbu a. Miguel bụzi ezigbo enyi ya. Miguel na-agbakwa mbọ ugbu a ka onye a bụzi nwanna ya nwoke si n’ụlọ mkpọrọ pụta tupu afọ ole ụlọikpe kwuru na ọ ga-anọ ebe ahụ ezuo.Ihe ọzọ e mere ná nzukọ ahụ bụ ịgba ụmụnna ụfọdụ ajụjụ ọnụ. Ọ bụ nwanna Mark Noumair, bụ́ onye na-akụzi ihe ná Ngalaba Ụlọ Akwụkwọ Ọchịchị Chineke, mere ihe omume a. Ọ gbara dị na nwunye atọ ajụjụ ọnụ. Ha bụ: Alex na Sarah Reinmueller, David na Krista Schafer, na Robert na Ketra Ciranko. Alex Reinmueller, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Mbipụta aka, kọrọ otú o si gbaa mbọ ka mmekọrịta ya na Chineke chikwuo anya mgbe ọ dị afọ iri na ise ma na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ na Kanada. Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ naanị ya na-eso aga ozi ọma. Mgbe a jụrụ ya onye kacha nyere ya aka na Betel, Nwanna Reinmueller kpọrọ aha ụmụnna atọ kwesịrị ntụkwasị obi ma kọọ otú ha atọ sicha nyere ya aka mee ka o nwee ọganihu n’ofufe Jehova. Nwunye ya bụ́ Sarah kọrọ banyere adịm ná mma ya na otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye nọrọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche dị na Chaịna n’ihi okwukwe ya. Sarah kwuru na ya mụtara ịna-akọrọ Jehova mkpa ya n’ekpere.
David Schafer, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Izi Ihe aka, toro mama ya n’ihi okwukwe siri ike mama ya nwere. O kwukwara banyere ụmụnna ndị na-egbutu osisi, bụ́ ndị nyeere ya aka ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka mgbe ọ ka na-eto eto. Nwunye ya, bụ́ Krista, ji obi ụtọ kwuo na ya mụtara ihe n’aka ndị nọrọla ogologo oge na Betel, bụ́ ndị “kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta,” dị ka Jizọs kwuru ka a na-eme.—Luk 16:10.
Robert Ciranko, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Ide Ihe aka, kọrọ banyere ndị nne na nna ochie anọ o nwere, ndị bụ́cha ndị e tere mmanụ, ndị sikwa Họngeri gaa biri ná mba ọzọ. Mgbe ọ ka dị obere, obi tọrọ ya nnọọ ụtọ mgbe a gara mgbakọ ukwu ndị e nwere n’agbata afọ 1950 na 1960 ya achọpụta na nzukọ Jehova buru nnọọ ibu karịa ọgbakọ ọ nọ na ya. Nwunye ya, bụ́ Ketra, kọrọ
otú o si nọgide na-erubere Chineke isi mgbe ọ na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ n’otu ọgbakọ, bụ́ nke ndị na-ezi ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na ya. E nwekwara nsogbu ndị ọzọ n’ọgbakọ ahụ. O diri ihe ndị a. E mechakwara họpụta ya ka ọ bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ziga ya n’ọgbakọ ọzọ. Otú ụmụnna ndị nọ ebe ahụ e zigara ya si emekọrịta ihe ọnụ mere ya ezigbo obi ụtọ.Onye ọzọ kwuru okwu bụ Manfred Tonak. Ọ kọrọ ihe mere n’Itiopia, bụ́ mba dịwara kemgbe oge Baịbụl. E nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa itoolu ná mba ahụ ugbu a. Ọtụtụ n’ime ha bi n’Adis Ababa, bụ́ isi obodo Itiopia, nakwa n’ebe ndị dị ya nso. N’ihi nke a, e nwechaghị ndị nkwusa bi n’ime ime obodo ndị dị ná mba ahụ. E ji maka nke a kpọọ ndị Itiopia bụ́ Ndịàmà, ndị bi na mba ndị ọzọ, ka ha bịa soro jee ozi ọma n’ụfọdụ ime ime obodo ndị ahụ. Ọtụtụ ndị bịara. Ha gbakwara Ndịàmà nọ n’Itiopia ume, nwetakwa ọtụtụ ndị gere ha ntị n’ozi ọma.
Ihe omume kacha daa ụda ná nzukọ ahụ bụ okwu ọtụtụ ndị kwuru, nke bụ́ banyere Ndịàmà Jehova bi na Rọshịa na ikpe dị iche iche e kpere ha. Aulis Bergdahl, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka nke dị na Rọshịa, kọrọ otú e sirila kpagbuo Ndịàmà Jehova bi na Rọshịa, karịchaa ndị nke bi na Mọsko. Philip Brumley, bụ́ onye si ná Ngalaba Okwu Iwu dị n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Amerịka, kwuru ihe ndị na-enye obi ụtọ mere n’ọnwa ole na ole gara aga, mgbe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop nụrụ ebubo itoolu e boro Ndịàmà Jehova. Ndị ọkàikpe niile na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ahụ chọpụtara na o nweghị nke rijuru afọ n’ime ebubo itoolu ndị ahụ. N’okwu ikpe ụfọdụ, ụlọikpe ahụ kwudịrị ihe ndị gosiri na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu. Ọ bụ eziokwu na a ka na-eche ka a mara ihe ga-emecha mee, Nwanna Brumley kwuru na a na-atụ anya na ihe Ụlọikpe a kpebiri nwere ike inyere anyị aka n’ikpe ndị ọzọ anyị nwere ná mba ndị ọzọ.
Mgbe a kọchara akụkọ a na-enye obi ụtọ, Nwanna Lett mara ọkwa na Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ekwetala ileba anya n’ikpe e kpewere kemgbe banyere ịtụ ụtụ isi, bụ́ nke dị n’etiti Ndịàmà Jehova bi na Frans na ndị ọchịchị Frans. Ọ bụghị okwu ikpe niile e wetaara Ụlọikpe a a na-akwanyere ùgwù ka ọ na-ekwe eleba anya na ya. Ka ọ dịgodị, Ụlọikpe a elebala anya n’okwu ikpe iri atọ na itoolu gbasara Ndịàmà Jehova, iri atọ na asaa n’ime ha lakwaara anyị. Nwanna Lett gbara ndị Jehova niile ume ka ha na-etinye okwu ikpe ahụ ka dị ụlọikpe ahụ n’aka n’ekpere.
Richard Morlan, bụ́ onye na-akụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Okenye Ọgbakọ, jizi ịnụ ọkụ n’obi kọọ ihe ndị merela n’ụlọ akwụkwọ ahụ. O kwukwara ihe ndị okenye ndị garala ụlọ akwụkwọ ahụ kwuru, bú nke gosiri na obi dị ha ụtọ.
Okwu Ndị Ọzọ Ndị So n’Òtù Na-achị Isi Kwuru
Guy Pierce, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, si n’ala ala obi ya kwuo okwu nke hiwere isi n’isiokwu dịịrị afọ 2011, nke bụ́: “Gbaba n’aha Jehova.” (Zef. 3:12) O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ihe ọma na-emere ndị Jehova n’oge a, ma, oge a bụkwa oge siri ike na oge anyị kwesịrị ịkpachapụ anya. N’agbanyeghị na oké ụbọchị Jehova dị nso, ndị mmadụ ka na-agbaba n’okpukpe ụgha, na-agbakwuru ndị ọchịchị, na-atụkwasị akụnụba obi, na-ebi ndụ ka à ga-asị na o nweghị ihe na-aga ime, na-emekwa ihe ndị ọzọ yiri ihe ndị a. Ma, naanị ihe ga-eme ka e chebe anyị bụ ịkpọku aha Jehova. Ihe ndị ha na ịkpọku aha Jehova so aga bụ, ịmata Onye nwe aha ahụ, ịna-akwanyere ya nnọọ ùgwù, ịna-atụkwasị ya obi, na ịna-eji ihe niile anyị nwere na-ejere ya ozi.
David Splane, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuziri okwu na-eme ka mmadụ chee echiche, bụ́ nke isiokwu ya bụ: “Ị̀ Banyela n’Izu Ike Chineke?” O kwuru na ike Chineke nọ na-ezu apụtaghị na ọ nọ nkịtị. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Jehova na Ọkpara ya “anọwo na-arụ ọrụ” kemgbe ụbọchị izu ike ihe atụ ahụ, iji mee ka ihe bụ uche Chineke maka ụwa mezuo. (Jọn 5:17) Oleezi otú anyị ga-esi abanye n’izu ike Chineke? Ihe anyị ga-eme abụghị naanị izere ihe ọjọọ na ịghara ịna-achọ ihe anyị ga-eji zọrọ isi anyị mgbe anyị mere ihe ọjọọ. Anyị kwesịrị igosi na anyị nwere okwukwe ma buru nzube Chineke n’obi mgbe niile, na-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime iji kwado ya. N’agbanyeghị na ime nke a na-esi ike mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị ịna-anara ndụmọdụ nzukọ Jehova na-enye anyị ma na-eme ihe o kwuru. Nwanna Splane rịọrọ ndị na-ege ntị ka ha mee ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji banye n’izu ike Chineke.
Isiokwu okwu ikpeazụ e kwuru ná nzukọ ahụ, bụ́ nke Anthony Morris, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru, bụ: “Olee Ihe Anyị Na-echere?” Nwanna Morris kwuru okwu ahụ ka ebe nna na-agwa ụmụ ya okwu. O mere ka ndị na-ege ntị mata na oge adịghịzi. O chetaara ha amụma ndị ka ga-emezu n’ọdịnihu, bụ́ ndị anyị na-atụsi anya ha ike ka ha mezuo. Ụfọdụ n’ime amụma ndị a bụ mkpu a ga-eti maka “udo na obi iru ala!” na mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha. (1 Tesa. 5:2, 3; Mkpu. 17:15-17) Nwanna Morris dọrọ ụmụnna niile aka ná ntị na mgbe ha na-anụ ihe ndị na-emenụ, bụ́ ndị na-anaghị emezu amụma ndị ahụ, ka ha ghara ikwu, sị: “Ihe a ga-abụrịrị Amagedọn.” O kwuru na ihe kacha mma anyị ga-eme bụ iji obi ụtọ na-echere dị ka e kwuru na Maịka 7:7. Ọ gbakwara ndị niile na-ege ntị ume ka ha nọrọ Òtù Na-achị Isi nso otú ahụ ndị agha na-esi anọ ibe ha nso mgbe ha na-abanye ebe agha kacha taa akpụ. O kwuru, sị: “Ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị na-echere Jehova.”—Ọma 31:24.
Ná mmechi, a maara ndị na-ege ntị ọkwa ụfọdụ ndị pụrụ iche, bụ́ ndị na-enye obi ụtọ. Geoffrey Jackson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, mara ọkwa na a na-eme ndokwa ibipụtawa Ụlọ Nche bekee a na-amụ amụ nke e ji bekee dị mfe nghọta dee, maka ndị na-amachaghị bekee. O kwuru na a ga na-ebipụta ya ruo oge ụfọdụ iji mara otú ọ ga-adị. Stephen Lett makwara ọkwa na Òtù Na-achị Isi ga-eme ndokwa ka a na-agara ndị nlekọta distrikti nọ n’Amerịka na ndị nwunye ha nleta ọzụzụ atụrụ. O kwurukwara na ihe a ga na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. Ihe ọzọ o kwuru bụ na e nweela ụlọ akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ndị Di na Nwunye. Ọzụzụ ha ga-enweta n’ụlọ akwụkwọ a ga-eme ka ha bakwuoro nzukọ Jehova uru. Nwanna Lett makwara ọkwa na n’afọ ọ bụla na Petterson, a ga na-enwezi klas abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị na Nwunye Ha nakwa n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha. O kwukwara na a ga-eme ndokwa ka ndị garala ụlọ akwụkwọ ndị ahụ sorokwa gaa ọzọ.
Otú nzukọ a si bịa ná mmechi metụrụ ndị na-ege ntị n’ahụ́ mgbe John E. Barr, bụ́ onye nọterela aka n’Òtù Na-achị Isi, onye dịkwa afọ iri itoolu na isii mgbe ahụ, ji obi umeala kpee ekpere mmechi si ya n’ala ala obi. * Mgbe a gbasara nzukọ a, mmadụ niile bịaranụ kwetara na ọ bụ nzukọ a na-agaghị echefu echefu n’eziokwu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Gụọ 2011 Yearbook of Jehovah’s Witnesses (Akwụkwọ Mgbaafọ), peeji nke 62-63.
^ par. 20 John Barr jechara ozi ya n’ụwa na Disemba 4, 2010.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
Ndị niile na-ege ntị ritere uru n’ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ụmụnna
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]
Jehova agọziela ọrụ ikwusa ozi ọma n’Itiopia