Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ike Ime ka Finihas ma Ọrụ Tara Akpụ Bịara Gị?

Ì Nwere Ike Ime ka Finihas ma Ọrụ Tara Akpụ Bịara Gị?

Ì Nwere Ike Ime ka Finihas ma Ọrụ Tara Akpụ Bịara Gị?

ONYE bụ okenye ọgbakọ kwesịrị iwere ya ka ihe ùgwù pụrụ iche. Ma, ihe Okwu Chineke kwuru gosiri na mgbe ụfọdụ ndị okenye nwekwara ike inwe ọrụ tara akpụ ha ga-arụ. E nwere mgbe ọ na-adị mkpa ka ha leba anya n’okwu onye mere mmehie, ya bụ, mgbe ha ‘ga-ekpere Jehova ikpe.’ (2 Ihe 19:6) O nwekwara mgbe e nwere ike inye okenye ọrụ o chere na ya erughị eru ịrụ, dị ka ọ dị Mozis mgbe a gwara ya ihe ọ ga-arụ. O ji nwayọọ jụọ, sị: “Ònye ka m bụ nke na m ga-agakwuru Fero?”—Ọpụ. 3:11.

N’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke e ji ike mmụọ nsọ e ji ahọpụta ndị okenye dee, a kọrọ banyere ndị okenye ndị rụrụ ọrụ ndị tara akpụ e nyere ha. Otu n’ime ha bụ Finihas. Ọ bụ nwa Elieza, bụrụkwa nwa nwa Erọn. Ebe onye si n’ezinụlọ ha na-abụ nnukwu onye nchụàjà, ọ na-aga ịbụ ya n’oge na-adịghị anya. E nwere ihe atọ mere ná ndụ ya bụ́ ndị gosiri na ndị okenye taa ga-arụli ọrụ tara akpụ e nyere ha ma ọ bụrụ na ha akata obi, ghọta ihe a chọrọ ka ha mee ma tụkwasị Jehova obi.

“O Biliri Ozugbo”

Finihas bụ nwa okorobịa mgbe ndị Izrel mara ụlọikwuu ha n’Ala Dị Larịị nke Moab. Baịbụl kọrọ, sị: “Ha na ndị inyom Moab wee malite inwe mmekọahụ rụrụ arụ. . . . Ndị Izrel wee malite iri ihe oriri na ịkpọrọ chi ha isiala.” (Ọnụ Ọgụ. 25:1, 2) Jehova ji maka mmehie a ndị Izrel mere tie ha ihe otiti nke na-eweta ọnwụ. Chegodị otú ihe ọjọọ ahụ ndị Izrel mere na ihe otiti ahụ Jehova tiri ha si wute Finihas.

Baịbụl kọkwuru ihe merenụ, sị: “Lee! otu nwoke n’ime ụmụ Izrel bịara, ọ kpọkwa nwaanyị Midian na-abịa nso n’ebe ụmụnne ya nọ n’ihu Mozis nakwa n’ihu nzukọ ụmụ Izrel dum, ka ha nọ na-akwa ákwá n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” (Ọnụ Ọgụ. 25:6) Gịnị ka Finihas bụ́ onye nchụàjà ga-eme ugbu a? Ọ bụ nwa okorobịa, ma onye Izrel ahụ kpọ nwaanyị Midian na-abanye n’ụlọikwuu bụ otu n’ime ndị isi Izrel, bụ́ ndị na-ebute ụzọ n’ofufe Jehova.—Ọnụ Ọgụ. 25:14.

Ma, Finihas na-atụ egwu Jehova, ọ bụghị egwu mmadụ. Mgbe ọ hụrụ ha abụọ ka ha na-aga, o weere ube ozugbo sochie nwoke ahụ azụ wee banye n’ụlọikwuu ahụ, magbuo ha abụọ. Olee otú Jehova si lee Finihas anya maka ịkata obi mee ihe ahụ o mere? Jehova kwụsịrị ihe otiti ahụ ọ nọ na-eti ụmụ Izrel ozugbo. Ya na Finihas gbakwara ndụ na ọ bụ n’ezinụlọ ya ka ndị nchụàjà ga na-esi apụta “ruo mgbe a na-akaghị aka.”—Ọnụ Ọgụ. 25:7-13.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị okenye taa anaghị eme ihe ike. Ma, dị ka Finihas mere, ndị okenye kwesịrị ịkata obi mee ihe ha kwesịrị ime n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ naanị ọnwa ole na ole a họpụtachara nwanna Guilherme ka ọ bụrụ okenye ka a họpụtara ya iso na kọmitii ikpe. Onye e kwo hiwe kọmitii ikpe a bụ okenye nke nyeere Guilherme aka mgbe ọ ka na-eto eto. Guilherme kwuru, sị: “Amaghị m ihe m ga-eme eme mgbe a họpụtara m ka m soro ná ndị ga-ekpe ikpe a. Nke a churu m ụra abalị. Anọ m na-eche otú m ga-esi ghara ikwe ka adịm ná mma mụ na okenye ahụ gbochie m ikpe ikpe ahụ otú Jehova chọrọ. Ekpere m ekpere ọtụtụ ụbọchị, jirikwa akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl mee nchọnchọ.” Ihe a Guilherme mere nyeere ya aka ịkata obi mee ihe o kwesịrị ime n’okwu ahụ, ya enweekwa ike inyere nwanna ya mere mmehie aka.—1 Tim. 4:11, 12.

Ọ bụrụ na ndị okenye akata obi mee ihe ha kwesịrị ime n’eleghị mmadụ anya n’ihu ma ihe dị aṅaa mee n’ọgbakọ, ndị nọ n’ọgbakọ ga-amụta inwe okwukwe na iguzosi ike n’ihe ka ha. Ọ bụrụkwa na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anụ ma ọ bụ hụ nwanna mere mmehie dị oké njọ, ha kwesịkwara ịkata obi hụ na ndị okenye nụrụ ya. Ọ bụkwa iguzosi ike n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka ịkwụsị iso enyi anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị a chụrụ n’ọgbakọ na-emekọ ihe.—1 Kọr. 5:11-13.

E Ji Nghọta Dozie Okwu A Gaara Ekwo Lụọ Agha

Na obi kara Finihas apụtaghị na ọ na-eme ihe n’echeghị ya eche dị ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme. Ka anyị tụlee otú o si gosi na ya nwere nghọta, mara ihe, ma dị akọ mgbe ọ nụrụ ihe ọzọ merenụ. Ebo Ruben na Gad nakwa ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụàjà n’akụkụ Osimiri Jọdan. Ndị Izrel ndị ọzọ kwubiri na ndị wuru ebe ịchụàjà ahụ chọrọ iji ya na-efe chi ụgha, ha jikekwaara ịga buso ha agha.—Jọsh. 22:11, 12.

Gịnị ka Finihas mere mgbe ọ nụrụ ihe a? Ya na ndị isi Izrel ji akọ gaa ka ha na ndị wuru ebe ịchụàjà ahụ kwurịta okwu a. Ndị ahụ e boro ebubo kọọrọ ha kpọmkwem ihe merenụ, na ha wuru ebe ịchụàjà ahụ maka ‘ije ozi Jehova.’ Ọ bụ otú a ka e si dozie okwu a gaara ekwo lụọ agha.—Jọsh. 22:13-34.

Ọ bụrụ na Onye Kraịst anụ ebubo e boro otu nwanna ma ọ bụ ihe na-adịghị mma a sị na otu nwanna mere, ọ ga-egosi na ọ ma ihe ma o mee ka Finihas. Ọ bụrụ na anyị nwere nghọta, anyị agaghị ewesawa nwanna anyị iwe n’ihi na anyị nụrụ na o mere ihe na-adịghị mma, anyị agaghịkwa akọsasịwa ebubo ahụ.—Ilu 19:11.

Olee otú nghọta ga-esi nyere ndị okenye aka ime ka Finihas? Jaime, onye bụ́ okenye kemgbe ihe karịrị afọ iri, sịrị: “Ọ na-abụ onye nkwusa kọsawara m ihe na-esere ya na nwanna ọzọ, mụ arịọ Jehova ozugbo ka o nyere m aka ka m ghara ịdụnyere onye ọ bụla n’ime ha úkwù, kama ka m mee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru iji nyere ha aka. O nwere mgbe otu nwanna nwaanyị bịakwutere m ma kọọrọ m otú otu nwanna nwoke a na-akwanyere ùgwù, nke nọ n’ọgbakọ ọzọ, si mejọọ ya. Ebe ọ bụ na mụ na nwanna nwoke ahụ bụ ezigbo enyi, ọ garaghị esiri m ike ịgwa ya okwu. Ma, kama ịga gwawa ya okwu, mụ na nwanna nwaanyị ahụ tụlere ihe dị iche iche Baịbụl kwuru a ga-eme n’ụdị okwu a. O kwetara ibugodị ụzọ gakwuru nwanna nwoke ahụ ka ya na ya kwurịta nsogbu ahụ. (Mat. 5:23, 24) Ha abụọ ekpezighị ozugbo ahụ. N’ihi ya, agwara m ya ka ọ tụlekwuo ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru o kwesịrị ime. O kpebiri ikpe ekpere ọzọ banyere ya, gbalịakwa ịgbaghara nwanna ahụ.”

Olee ihe mechara mee? Jaime kwuru, sị: “Ka ọnwa ole na ole gachara, nwanna nwaanyị ahụ bịakwutere m ma gwa m na nwanna nwoke ahụ mechara kwaa ụta maka ihe ọ gwara ya. Nwanna nwoke ahụ hazikwara ka ya na nwanna nwaanyị ahụ rụọ n’ozi ọma, ya ejirikwa ohere ahụ jaa nwanna nwaanyị ahụ mma. Ọ bụ otú a ka ha abụọ si dozie okwu ahụ. A sị na m tinyere ọnụ n’okwu ahụ, ikekwe ya adị ka o nwere onye m na-ekpelara, ihe ọ̀ gaara aga otú a o si gaa ugbu a?” Baịbụl na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Ejila ọkụ ọkụ akpọ mmadụ ikpe.” (Ilu 25:8) Ihe ndị okenye nwere nghọta na-eme bụ ịgba Ndị Kraịst nwere nghọtahie ume ka ha mee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru iji mee ka udo dị.

Ọ Jụrụ Jehova Ase

Finihas nwere ihe ùgwù ịbụ onye nchụàjà nke ndị Chineke. Dị ka anyị kwuburu, ọ bụ onye obi kara na onye nwere nghọta malite n’oge ọ bụ okorobịa. Ma, ihe mere o ji nwee ike imeri nsogbu ndị bịaara ya bụ n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.

E nwere mgbe ndị ikom Gibia, bụ́ ndị si n’ebo Benjamin, dinara iko nwaanyị nke otu onye Livaị, nwaanyị ahụ anwụọ. Nke a mere ka ebo ndị ọzọ dị n’Izrel jikere ka ha buso ebo Benjamin agha. (Ikpe 20:1-11) N’agbanyeghị na ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka n’agha ahụ, e meriri ha ugboro abụọ, gbuokwa ọtụtụ n’ime ha. (Ikpe 20:14-25) Hà ga-asị na ekpere ahụ ha kpere enweghị isi? Jehova ọ̀ chọrọ n’eziokwu ka ha gaa bibie ndị ahụ mere ihe ọjọọ?

Finihas, onye bụzi nnukwu onye nchụàjà nke Izrel, gosiri na ya tụkwasịrị Jehova obi. Ọ jụrụ Jehova n’ekpere, sị: “Ọ̀ bụ m gaa ọzọ buso ụmụ Benjamin nwanne m agha ka ọ̀ bụ mụ agala?” Jehova zara ekpere ya ma nyefee ụmụ Benjamin n’aka ha. A gbakwara Gibia ọkụ.—Ikpe 20:27-48.

Olee ihe ihe a merenụ na-akụziri anyị? Nsogbu ụfọdụ a na-enwe n’ọgbakọ anaghị ebi ngwa ngwa n’agbanyeghị mbọ ndị okenye na-agbasi ike ka nsogbu ndị ahụ bie nakwa ekpere ha na-ekpe ka Chineke nyere ha aka. Ụdị ihe a mee, ọ ga-adị mma ma ndị okenye cheta ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ [ma ọ bụ na-ekpenụ ekpere], a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu.” (Luk 11:9) Ọ bụrụgodị na ọ dị ndị nlekọta ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ịza ekpere ha, obi kwesịrị isi ha ike na ọ ga-aza ya n’oge nke ya.

Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe otu ọgbakọ dị n’Aịland chọsiri ike ka a rụọrọ ha Ụlọ Nzukọ Alaeze ma onyeisi nke ndị na-ekpebi ebe a ga-arụ ụlọ n’ógbè ahụ ekweghị ka ha rụọ ya. Ọ nabataghị ka ụmụnna rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ha chọtara ala. O yiri ka naanị onye ọzọ ga-enyeli ha ikike ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ha chọtara ala bụ onyeisi nke ndị na-ekpebi ebe a ga-arụ ụlọ ná mba ahụ dum. Ekpere ọ̀ ga-ebi nsogbu a otú o si bie nsogbu e nwere n’oge Finihas?

Otu okenye nọ n’ọgbakọ ahụ sịrị: “Mgbe anyị kpechara ekpere ma rịọsie Chineke arịọrọ ike ka o nyere anyị aka, anyị gbaara gawa n’isi ụlọ ọrụ ndị na-ekpebi ebe a ga-arụ ụlọ. A gwara m na o nwere ike iwe ọtụtụ izu tupu anyị ahụ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ. Ma, e mechara kwe ka anyị hụ ya, anyị na ya ejirikwa nkeji ise kparịta. Mgbe anyị gosiri ya ebe e sere otú Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị chọrọ ịrụ ga-adị, nke na-abụghị otú e si see ya na mbụ, o nyere anyị ikike ozugbo ka anyị gaa bido rụwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Malitezie mgbe ahụ gawa, onyeisi nke ndị na-ekpebi ebe a ga-arụ ụlọ n’ógbè anyị kwetaziri ịna-enyere anyị aka. Ihe a merenụ mere ka anyị matakwuo na ekpere na-akpa ezigbo ike.” N’eziokwu, Jehova ga-aza ekpere ndị okenye tụkwasịrị ya obi ji obi ha niile na-ekpe.

Ọrụ e nyere Finihas ka ọ rụọ n’oge ụmụ Izrel bụ ọrụ tara akpụ. Ma n’ihi na ọ katara obi, nwee nghọta, tụkwasịkwa Jehova obi, ọ rụchara ọrụ ndị ahụ. Otú Finihas si gbaa mbọ nyere ndị Chineke aka masịrị Jehova. Ihe dị ka otu puku afọ ka e mechara, Ezra ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ọ bụ Finihas nwa Elieza bụ onye ndú ha n’oge gara aga. Jehova nọnyeere ya.” (1 Ihe 9:20) Ka Jehova nọnyekwara ndị niile na-edu ndú n’ọgbakọ Chineke taa, nakwa Ndị Kraịst niile ji obi ha dum na-ejere ya ozi.