Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgụ Baịbụl Na-enye M Ume Kemgbe Ụwa M

Ịgụ Baịbụl Na-enye M Ume Kemgbe Ụwa M

Ịgụ Baịbụl Na-enye M Ume Kemgbe Ụwa M

Dị ka Marceau Leroy si kọọ

OTU ụbọchị, ka naanị m nọ n’ime ụlọ m, amalitere m ịgụ, sị: “Ná mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.” Gịnị mere m ji ezo ezo agụ ihe a? Ọ bụ n’ihi na ama m ihe papa m, bụ́ onye na-ekweghị na Chineke, ga-ekwu ma ya hụ m Baịbụl n’aka.

Nke a bụ m mbụ ịgụ Baịbụl, ọ bụ ya mere okwu ndị ahụ e dere ná mbido Jenesis ji ruo m nnọọ n’obi. Obi m gwara m na mụ ahụla ebe a kọwara ihe mere iwu ndị na-achị ihe ndị e kere eke anaghị emegide ibe ha, bụ́ nke na-atụ m n’anya kemgbe ụwa m. Ebe ọ bụ na ihe m na-agụ na-atọ m ezigbo ụtọ, esi m n’elekere asatọ nke abalị gụgide ya ruo n’elekere anọ nke ụtụtụ. Ọ bụ otú a ka ịgụ Okwu Chineke si mechaa mara m ahụ́. Ka m kọọrọ gị otú ịgụ Baịbụl si bụrụ ihe na-enye m ume kemgbe ụwa m.

“Ị Ga Na-agụ Ya Kwa Ụbọchị”

A mụrụ m na 1926 na Vamelis, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu Frans, ebe a na-egwu kol. E jighị kol egwu egwu mgbe a na-alụ agha ụwa nke abụọ. Ebe m so ná ndị na-egwu kol mgbe ahụ, a gụpụrụ m ná ndị ga-eso aga agha. Ma, iji mee ka ọnọdụ m gbagote ná ndụ, amalitere m ịmụ banyere redio na ọkụ eletrik, bụ́ nke mere ka m mata otú ọtụtụ ihe ndị e kere eke si dịrị n’usoro. Mgbe m dị afọ iri abụọ na otu, otu nwa klas m nyere m Baịbụl. Ọ bụ Baịbụl mbụ m nwetara. Ọ gwara m, sị: “Ọ bụ akwụkwọ dị mma ọgụgụ.” Mgbe m gụchara ya, ekwetara m na Baịbụl bụ Okwu Chineke nke o mere ka ụmụ mmadụ mara.

Enwetara m Baịbụl asatọ n’ihi na ebu m n’obi na obi ga-adị ndị agbata obi m ụtọ ịgụ ya. Ma, ọ tụrụ m n’anya na ha bidoro ịchị m ọchị, bidokwa imegide m. Ndị ikwu m dọrọ m aka ná ntị, sị: “I bidohaala ịgụ akwụkwọ a, ị ga na-agụ ya kwa ụbọchị!” Anọkwa m na-agụ ya kwa ụbọchị kemgbe ahụ dị ka ha kwuru, akwatụbeghịkwa m ụta na m na-eme otú ahụ. Ọ bụ otú a ka ịgụ Baịbụl si mara m ahụ́.

Mgbe ụfọdụ ndị agbata obi m chọpụtara na m nwere mmasị na Baịbụl, ha bidoro iwetara m akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova nyerela ha. Akwụkwọ bụ́ One World, One Government (Otu Ụwa, Otu Ọchịchị) * (ọ bụ nke French ya ka e sere ebe a) kọwara ihe mere Baịbụl ji na-ekwu na ọ bụ Alaeze Chineke bụ naanị olileanya ụmụ mmadụ nwere. (Mat. 6:10) O bidoro na-enu m enu n’obi ịkọrọ ndị ọzọ banyere olileanya a.

Noël, bụ́ onye mụ na ya bụ enyi mgbe anyị dị obere, bụ otu n’ime ndị mbụ natara Baịbụl m nyere ha. Ọ bụ onye Katọlik. N’ihi ya, o kwuru ka anyị gaa na nke otu nwoke na-aga ụlọ akwụkwọ ndị fada. Ụjọ jidetụrụ m. Ma, amụtala m n’Abụ Ọma 115:4-8 nakwa na Matiu 23:9,10 na Chineke achọghị ka e jiri ihe oyiyi na-efe ya ofufe nakwa na aha a na-etu ndị ndú okpukpe adịghị ya mma. Ihe ndị a mere ka obi kaa m ịgbachitere ihe ọhụrụ a m kweere. Nke a mere ka Noël mechaa nabata eziokwu ahụ. Ọ ka bụ Onyeàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ruo taa.

Agakwara m leta nwanne m nwaanyị. Di ya nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji eme anwansi, ndị mmụọ ọjọọ na-enyekwa di ya nsogbu. Ọ bụ eziokwu na ná mbụ, ọ dị m ka agaghị m enyeliri nwoke ahụ aka, amaokwu Baịbụl dị ka Ndị Hibru 1:14 mere ka obi sie m ike na ndị mmụọ ozi Jehova kwụ m n’azụ. Mgbe di nwanne m nwaanyị a mere ihe Baịbụl kwuru ma wepụsịa ihe niile metụtara anwansi n’ụlọ ya, ndị mmụọ ọjọọ kwụsịrị inye ya nsogbu. Ma yanwa ma nwanne m nwaanyị mechara ghọọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi.

Na 1947, Arthur Emiot, bụ́ Onyeàmà si Amerịka, bịara n’ụlọ m. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu ịhụ ya. Ajụkwara m ya ebe Ndịàmà na-amụ ihe. Ọ gwara m na e nwere obere ọgbakọ na-amụ ihe na Liévin, nke dị kilomita iri ma e si n’ebe m bi gawa ya. Ịhụ ebe a na-ere ígwè na ihe ndị ọzọ na-ara ezigbo ahụ́ mgbe ahụ. Ruokwa ọnwa ole na ole, m na-eji ụkwụ aga ọmụmụ ihe ma na-alọta. O ruola afọ asatọ a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Frans. Ndịàmà nọ ná mba ahụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Pọland, dị naanị puku abụọ narị atọ na iri asatọ. Ma, na Septemba 1, 1947, e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova nọ na Frans. Alaka ụlọ ọrụ dị na Villa Guibert na Paris bidokwara rụwa ọrụ ọzọ. Ebe ọ bụ na e nweghị onye ọsụ ụzọ ọ bụla nọ na Frans mgbe ahụ, e ji Informant nke Disemba 1947 (a na-akpọzi Informant Ozi Alaeze Anyị) zigara ụmụnna ozi, na-arịọ ha ka ha were ọrụ ịsụ ụzọ oge niile, ya bụ, ha ga na-eji otu narị awa na iri awa ise na-eje ozi ọma kwa ọnwa. Na 1949, e gbubilatara awa ole a chọrọ n’aka onye ọsụ ụzọ oge niile ka ọ bụrụ otu narị awa. Ebe m kwenyesiri ike n’ihe Jizọs kwuru na Jọn 17:17, nke bụ́ na “Okwu [Chineke] bụ eziokwu,” e mere m baptizim na 1948. Amalitekwara m ọrụ ịsụ ụzọ na Disemba 1949.

Esi M n’Ụlọ Mkpọrọ Gaghachi Dọnkak

Anọteghị m aka n’ebe mbụ e zigara m, bụ́ Agen, nke dị n’ebe ndịda Frans. Ebe ọ bụ na ahapụla m ọrụ igwu kol, o nweghịzi ihe a ga-eji sị na mụ agaghị eso gaa agha. Ma, ajụrụ m iso gaa agha, nke a mekwara ka a tụọ m mkpọrọ. Ọ bụ eziokwu na e kweghị ka m nwee Baịbụl, ejisiri m ike nweta peeji ole na ole nke akwụkwọ Abụ Ọma. Ịgụ ha gbakwara m ume. Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, m bịara na-eche ma ọ̀ bụ m kwụsị ozi oge niile a m na-eje ka m nwee ike ibi n’ụlọ nke m ma na-arụ ọrụ m ga-eji na-akpata ego. N’oge a kwa, ihe m gụtara na Baịbụl nyeere m aka. Echebaara m ihe Pọl kwuru ná Ndị Filipaị 4:11-13 echiche. O kwuru, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” Ekpebiri m ịrụrụ ọrụ ịsụ ụzọ m na-aga. Na 1950, e zigara m Dọnkak, bụ́ obodo m ziri ozi ọma na ya n’oge gara aga.

Mgbe m ruru Dọnkak, o nweghị ihe m nwere. Agha ụwa nke abụọ kpara obodo ahụ aka ọjọọ, inweta ụlọ sikwara ezigbo ike. Agawara m n’ụlọ otu ezinụlọ m na-ezibu ozi ọma. Obi tọrọ nwunye nwoke nwe ụlọ ahụ ụtọ nke ukwuu mgbe ọ hụrụ m. Ọ sịrị: “Maazị Leroy, hà ahapụla gị? Di m sịrị na a sị na e nwere ọtụtụ ndị dị ka gị, a gaaraghị alụ agha.” Ha sịkwara m na m nwere ike ibiri n’ọnụ ụlọ ha na-enye ndị ọbịa ruo mgbe ndị ọbịa na-abịa ele ebe ndị mara mma n’obodo ha ga-abịawa. N’ụbọchị ahụ kwa, nwanne Arthur Emiot, bụ́ Evans, chọtaara m ọrụ. * Ọrụ ya bụ ịtụgharịrị ndị mba ọzọ na-abịa n’otu ọdụ ụgbọ mmiri okwu, ọ na-achọkwa onye ga na-eche ụgbọ mmiri nche n’abalị. O du m gaa hụ otu n’ime ndị isi na-arụ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Aha m ka otu mkpụrụ ázị́zà mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta. Mgbe Evans kọwaara onyeisi ahụ ihe mere m ji dị otú ahụ m dị, onyeisi ahụ sịrị m gaa were nri na friji rie. N’otu ụbọchị ahụ, enwetara m ụlọ, nweta ọrụ, nwetakwa nri! Ihe a merenụ mere ka obi sikwuo m ike na ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:25-33 bụ eziokwu.

Mgbe ndị na-abịa nlere n’obodo ahụ bịawara, mụ na onye ọsụ ụzọ ọzọ mụ na ya na-arụkọ ọrụ, bụ́ Simon Apolinarski, chọwara ebe ọzọ anyị ga-ebi. Ma, anyị kpebiri na o nweghị ihe ga-eme ka anyị kwụsị ozi ọma anyị bịara izi n’obodo ahụ. Anyị mechara nweta ụlọ n’ebe a na-edebebu ịnyịnya. Anyị jikwa matarasị ndị e ji ahịhịa mee ehi ụra. Anyị na-aga ozi ọma kwa ụbọchị. Anyị ziri onye nwe ebe ahụ a na-edebebu ịnyịnya ozi ọma, ya emechaakwa ghọọ otu n’ime ọtụtụ ndị natara eziokwu n’obodo ahụ. Ka ihe a nọ na-eme, ọ dịghị anya otu isiokwu agbaa n’otu akwụkwọ akụkọ a na-ede n’obodo ahụ, na-adọ ndị bi na Dọnkak aka ná ntị ka ha kpachara anya n’ihi na ‘Ndịàmà Jehova ehiwele nne n’obodo ha.’ Ma, naanị Ndịàmà nọ n’obodo ahụ bụ mụnwa, Simon na ndị nkwusa ole na ole ndị ọzọ. Ihe gbara anyị ume n’oge a ihe a niile na-eme bụ ịna-atụgharị uche ná nkwa ndị dị na Baịbụl na icheta otú Jehova sirila lekọta anyị. E mechara nwee ihe dị ka ndị nkwusa iri atọ na Dọnkak mgbe m si ebe ahụ na-apụ na 1952.

Ihe Ndị Mere Ka Obi Sikwuo M Ike Ịrụ Ọrụ Ndị Ọzọ

Mgbe m nọtụrụ obere n’Amiens, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ziga m Bulọn-Bilankọt, bụ́ obere obodo dị na Paris. Enwere m ọtụtụ ndị m na-amụrụ Baịbụl mgbe ahụ. Ụfọdụ n’ime ha mechakwara banye n’ozi oge niile ụfọdụ agawa ozi ala ọzọ. Otu nwa okorobịa a na-akpọ Guy Mabilat, natara eziokwu ahụ ma mechaa ghọọ onye nlekọta sekit. Ka oge na-aga, ọ ghọkwara onye nlekọta distrikti. O mechakwara hụ maka iwu ebe a na-anọ ebi akwụkwọ na Betel dị na Luvyas, bụ́ obodo dị nso na Paris. Baịbụl m na-akụziri ndị ọzọ site n’oge ruo n’oge emeela ka Okwu Chineke gbanyekwuo mgbọrọgwụ n’ime obi m. O meela ka m na-enwe obi ụtọ, meekwa ka otú m si ezi ihe na-aka mma.

Na 1953, ọ tụrụ n’anya mgbe a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit n’Alsas-Lọren, bụ́ obodo ndị Jamanị weghaara ugboro abụọ n’agbata afọ 1871 na 1945. Nke a pụtara na m ga-ebidokwa mụwa asụsụ Jaman. Mgbe m bidoro ọrụ ilekọta sekit, a na-agụta televishọn, ụgbọala, ma ọ bụ taịpraịta, dị n’obodo ahụ ọnụ. E nweghịkwa redio ma ọ bụ kọmputa. Ma, nke a emeghị ka obi na-ajọ m njọ ma ọ bụ ka m ghara ịna-enwe obi ụtọ. Ọ bụdị mgbe ahụ ka m kacha nwee obi ụtọ ná ndụ m. Ọ dịịrị m mfe ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ime ka ‘anya m na-ele otu ebe,’ n’ihi na n’oge ahụ, e nwechaghị ihe ndị nwere ike ịdọpụ m uche n’ozi m na-ejere Jehova dị ka e nwere taa.—Mat. 6:19-22.

Ihe mere ná mgbakọ mba niile e nwere na Paris na 1955, nke isiokwu ya bụ: “Triumphant Kingdom” (Alaeze nke Nwere Mmeri), anaghị apụ m apụ n’obi. Ọ bụ ná mgbakọ ahụ ka m hụrụ Irène Kolanski, bụ́ onye mụ na ya mechara lụọ. O ji otu afọ tọọ m n’ozi oge niile. Nne na nna ya, bụ́ ndị Pọland, bụ Ndịàmà ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ọtụtụ afọ tupu ha anwụọ. Adolf Weber, bụ́ nwanna bịara Yurop ikwusa ozi ọma, onye na-elekọtaburu nwanna Russell ugbo ya, gara leta ha mgbe ha bi na Frans. Mụ na Irène mechara gbaa akwụkwọ na 1956, mụ na ya na-esokwa aga eleta ọgbakọ dị iche iche. O nyerela m nnọọ aka kemgbe ọtụtụ afọ ndị a!

Mgbe afọ abụọ gara, ihe ọzọ tụrụ m n’anya mere. A họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta distrikti! Ebe ọ bụ na e nwechaghị ndị nlekọta sekit mgbe ahụ, m ka na-agakwa eleta ọgbakọ ụfọdụ. Ọrụ zuru m ahụ́ mgbe ahụ! E wezụga na m na-eji otu narị awa eje ozi ọma kwa ọnwa, m na-ekwukwa okwu n’ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla, na-aga eleta ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ atọ, na-enyocha faịlụ ọgbakọ iji mara otú ihe si aga, na-edekwa ọtụtụ akwụkwọ ndị m ga-ezipụ. Oleekwanụ otú m ga-esi enwe ohere na-agụ Okwu Chineke? Achọpụtara m otu ihe m ga na-eme. Adọkapụtara m ụfọdụ peeji dị n’otu Baịbụl merela ochie ma na-eji ụfọdụ n’ime ha aga ebe ọ bụla m na-aga. Mgbe ọ bụla m na-eche mmadụ, m na-ewepụta ụfọdụ n’ime ha na-agụ. Obere oge ndị ahụ m ji gụọ Baịbụl mere ka mkpebi m mere ịnọgide n’ozi m sikwuo ike.

Na 1967, a gwara mụ na Irène ka anyị gaa na Betel dị na Bulọn-Bilankọt nọrọzie na-eje ozi. Ebidoro m rụwa ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m ka na-arụ ọrụ kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ. Ihe kacha enye m obi ụtọ n’ọrụ m bụ ịza ndị mmadụ ajụjụ ha na-ajụ banyere ihe ndị dị na Baịbụl. Inyocha ihe e dere n’Okwu Chineke na ‘ịna-akwado ozi ọma’ ahụ na-eme m ezigbo obi ụtọ. (Fil. 1:7) Ihe ọzọ na-eme m obi ụtọ bụ iduzi ihe mmụta dịịrị ụbọchị tupu e rie nri ụtụtụ na Betel. Na 1976, a họpụtara m ka m soro na Kọmitii Alaka nke Frans.

Otú Kacha Mma Mmadụ Ga-esi Bie Ndụ

Ọ bụ eziokwu na enweela m ọtụtụ nsogbu ná ndụ m, ihe kacha enye m nsogbu ugbu a bụ nká na ọrịa, bụ́ ihe ndị merela ka mụ na nwunye m ghara ịna-emeru otú anyị na-emebu. Ma, ịna-amụkọ Okwu Chineke ọnụ na-eme ka olileanya anyị nwere na-esikwu ike. Obi na-adị anyị ụtọ iji ụgbọala aga akọrọ ndị bi n’ókèala ebe anyị na-eje ozi banyere olileanya a. Ihe ndị anyị hụrụla na ọṅụ ndị anyị nwerela kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri afọ abụọ, ya bụ ma a gbakọta oge anyị abụọ jerela ozi oge niile, na-eme ka anyị na-agwa onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ ga-enye ya obi ụtọ na nke ga-abara ya uru ka ọ banye n’ozi oge niile. Mgbe Eze Devid dere Abụ Ọma 37:25 ọ bụ “agadi” otú a mụnwa bụ. Dịkwa ka Eze Devid, “ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam.”

Jehova ji Okwu ya na-enye m ike kemgbe ụwa m. Ndị ikwu m kwuru afọ iri isii gara aga na ịgụ Baịbụl ga-emecha mara m ahụ́. Ihe ahụ ha kwuru mechara mezuo. Ịgụ Baịbụl amarala m ahụ́. O nwebekwaghị mgbe m kwara ụta maka ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 E bipụtara ya na 1944, ma, a naghịzi ebipụta ya.

^ par. 14 Ị chọọ ịgụkwu banyere Evans Emiot, gụọ Ụlọ Nche January 1, 1999, peeji nke 22 na nke 23.

[Foto dị na peeji nke 5]

Mụ na Simon

[Foto dị na peeji nke 5]

Otú Baịbụl mbụ m nwere dị

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbe m bụ onye nlekọta distrikti

[Foto dị na peeji nke 6]

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 6]

Ịgụ Okwu Chineke na-atọ mụ na Irène ụtọ