“Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
“Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
“Jehova etewo m mmanụ . . . ịkasi ndị niile na-eru uju obi.”—AỊZA. 61:1, 2.
1. Gịnị ka Jizọs meere ndị na-eru uju, gịnịkwa mere o ji meere ha otú ahụ?
JIZỌS KRAỊST sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Mgbe Jizọs na-arụ ọrụ Chineke nyere ya, o gosiri na ya nwere àgwà ndị magburu onwe ha Nna ya nwere. Otu n’ime àgwà ndị ahụ bụ ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. (1 Jọn 4:7-10) Pọl onyeozi kọwara otu ụzọ Jehova si egosi ịhụnanya a mgbe ọ kpọrọ ya “Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Kọr. 1:3) Jizọs gosiri na ya nwere ụdị ịhụnanya ahụ mgbe o mere ihe Aịzaya buru n’amụma. (Gụọ Aịzaya 61:1, 2.) Jizọs gụrụ amụma ahụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu na Nazaret ma kwuo na amụma ahụ mezuru n’isi ya. (Luk 4:16-21) N’oge niile Jizọs jere ozi n’ụwa, ọ kasiri ndị na-eru uju obi iji gosi na ya hụrụ ha n’anya, ọ gbakwara ha ume ma mee ka obi ruo ha ala.
2, 3. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Kraịst ji kwesị ịna-akasi ndị ọzọ obi otú Jizọs mere?
2 Ndị niile na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịna-akasi ndị na-eru uju obi dị ka Jizọs mere. (1 Kọr. 11:1) Pọl sịrị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.” (1 Tesa. ) Anyị kwesịrị ịna-akasi ndị ọzọ obi, nke ka nke, n’oge anyị a bụ́ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” ( 5:112 Tim. 3:1) Ka chi na-eji na-abọ, ndị ezigbo mmadụ n’ụwa niile na-ahụ ndị na-agwa ha okwu ndị na-agbawa obi nakwa ndị na-eme ka ha na-ahụsi anya, ma na-enwe mwute.
3 Dị ka Baịbụl buru n’amụma, n’oge ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a, ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” Àgwà ndị a na-aka njọ n’oge a n’ihi na ‘ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie na na-ajọwanye njọ.’—2 Tim. 3:2-4, 13.
4. Olee otú ihe si kwụrụ n’ụwa n’oge anyị a?
4 Àgwà ọjọọ ndị a juru ebe niile taa ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na Okwu Chineke mere ka o doo anya na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ndị so ‘n’ụwa dum’ a bụ ndị ọchịchị, ndị okpukpe, ndị na-azụ ahịa, na ndị na-akpọsa ozizi ụgha na tiivi. Ọ dabara nnọọ adaba na a kpọrọ Setan bụ́ Ekwensu “onye na-achị ụwa” na “chi nke usoro ihe a.” (Jọn 14:30; 2 Kọr. 4:4) Ihe ndị na-eme n’ụwa na-aka njọ n’ihi na Setan na-ewe oké iwe ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi tupu Jehova alaa ya n’iyi. (Mkpu. 12:12) Ọmụma anyị ma na Chineke ga-ebibi Setan na ajọ usoro ihe ya n’oge na-adịghị anya nakwa na a ga-ekpebi okwu Setan welitere nke bụ́ ma Jehova ò ruru eru ịchị ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa na-akasi anyị obi.—Jen., isi nke 3; Job, isi nke 2.
A Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile
5. Olee otú amụma e buru banyere ikwusa ozi ọma si na-emezu n’oge ikpeazụ a?
5 N’oge anyị a nke bụ́ oge kacha taa akpụ, ihe Jizọs buru n’amụma na-emezu. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) A na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile taa otú a na-ekwusatụbeghị ya mbụ. Taa, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa na narị puku ise, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku asaa n’ụwa niile, na-ekwusa banyere Alaeze Chineke otú Jizọs si jiri ya mere isiokwu mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ma na-ezi ihe. (Mat. 4:17) Ozi ọma anyị na-ekwusa taa na-akasi nnọọ ndị na-eru uju obi. Ka a sịkwa ihe mere narị puku mmadụ ise, puku iri asaa, na narị isii na otu, ji ghọọ Ndịàmà Jehova e mere baptizim n’ime afọ abụọ a gara aga!
6. Olee ihe i chere banyere otú ozi ọma ahụ si agbasa?
6 Ezigbo ihe Ndịàmà Jehova ji ekwusara ndị mmadụ ozi ọma a bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl bụ́ ndị a sụgharịrị n’ihe karịrị narị asụsụ ise, ha na-ekesakwa ha. E nwetụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ e metụrụla ụdị ihe a! O nweghị nzukọ dị n’ụwa a nke dị ka nzukọ Jehova nke a na-ahụ anya, o nweghị nke na-arụ ọrụ ka ya, o nweghịkwa nke na-amụba amụba ka ya. E wezụga otú mmụọ nsọ Chineke si eduzi nzukọ a ma na-enyere ndị nọ na ya aka, o nweghị ihe ọ bụla nzukọ a gaara arụpụta n’ụwa a Setan na-achị. Ebe ọ bụ na a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa niile, a na-eji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru akasi onye ọ bụla nụrụ ozi ọma Alaeze ahụ obi, ma ụmụnna anyị ma ndị na-eru uju.
Ịkasi Ụmụnna Anyị Obi
7. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya na Jehova ga-ewepụ ihe niile na-enye anyị nsogbu ugbu a? (b) Olee otú anyị si mara na anyị ga-edili mkpagbu na ahụhụ ndị na-abịara anyị?
7 N’ụwa a nke ihe ọjọọ na ahụhụ juru, anyị agaghị agbanahụ ihe ndị nwere ike ime ka obi ghara iru anyị ala. Anyị anaghị atụ anya na Chineke ga-ewepụ ihe niile na-eme ka obi jọọ anyị njọ na ihe ndị na-eme ka anyị na-eru uju tupu ya ebibie usoro ihe a. Ka ọ dịgodị, a na-akpagbu anyị otú e buru n’amụma na a ga-eme, ọ gaghị adịchara anyị mfe irubere Jehova isi iji kwado na ọ bụ ya ruru eru ịchị eluigwe na ụwa. (2 Tim. 3:12) Ma, ebe ọ bụ na Nna anyị nke eluigwe ga na-enyere anyị aka ma na-akasi anyị obi, anyị ga-adị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Tesalonaịka oge ochie, bụ́ ndị ji ntachi obi na okwukwe die mkpagbu na ahụhụ niile bịaara ha.—Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 1:3-5.
8. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosi na Jehova na-akasi ndị ohu ya obi?
8 O doro anya na Jehova na-akasi ndị ohu ya obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jezibel bụ́ Eze Nwaanyị gwara Ịlaịja onye amụma na ya ga-egbu ya, ụjọ jidere Ịlaịja ya agbaga obodo ọzọ ma kwuodị na ya chọrọ ịnwụ. Ma, Jehova abaraghị Ịlaịja mba, kama, ọ kasiri ya obi ma mee ka obi kaa ya ibu amụma Chineke chọrọ ka ọ na-ebu. (1 Eze 19:1-21) Ihe ọzọ gosiri na Jehova na-akasi ndị ohu ya obi bụ ihe mere n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na e nwere oge “ọgbakọ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu.” Ihe ọzọ bụ na “ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova, na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 9:31) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyịnwa ‘nwekwara nkasi obi si na mmụọ nsọ’!
9. Olee otú ịmụ banyere Jizọs ga-esi akasi anyị obi?
9 A kasiela anyị bụ́ Ndị Kraịst obi n’ihi na anyị amụtala banyere Jizọs Kraịst ma na-eso nzọụkwụ ya. Jizọs sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Ọ bụrụ na e nwee ihe na-echegbu anyị, obi ga-eru anyị ala ma anyị mụta ịna-emeso ndị mmadụ otú dị mma Jizọs si mesoo ndị mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa.
10, 11. Ole ndị nwere ike ịkasi ụmụnna ha obi n’ọgbakọ?
10 Ụmụnna anyị nwekwara ike ịkasi anyị obi. Dị ka ihe atụ, legodị otú ndị okenye si nyere ndị nwere nsogbu n’ọgbakọ aka. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere.” Gịnị ga-emezi? “Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.” (Jems 5:14, 15) Ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwekwara ike ịkasi anyị obi.
Taịtọs 2:3-5.) Ma, ndị okenye na ndị ọzọ nwere ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà,’ ha kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. (1 Tesa. 5:14, 15) Ọ dịkwa mma icheta na Chineke “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi.”—2 Kọr. 1:4.
11 Ọ na-adịkarịrị ụmụ nwaanyị mfe ịkọrọ ụmụ nwaanyị ibe ha nsogbu dị iche iche ha na-enwe. Ụmụnna nwaanyị ndị nọterela aka n’ọgbakọ nwere ike inye ụmụnna nwaanyị ndị na-akatabeghị ahụ́ ndụmọdụ ga-abara ha uru. O nwere ike ịbụ na ụmụnna nwaanyị ndị a katarala ahụ́ enweela ụdị nsogbu ahụ ná ndụ ha. Obi ebere ha na àgwà ọma ndị ọzọ e ji mara ụmụ nwaanyị nwere ike inye aka. (Gụọ12. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-aga ọmụmụ ihe?
12 Otu ụzọ dị mma anyị si enweta nkasi obi bụ n’ọmụmụ ihe, bụ́ ebe a na-eji Baịbụl agba anyị ume. Anyị na-agụ na Judas na Saịlas “gbara ụmụnna ahụ ume, meekwa ka ha sie ike, site n’ịgwa ha ọtụtụ okwu.” (Ọrụ 15:32) Tupu ebido ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara, anyị na ụmụnna anyị na-akparịta ihe ndị na-agba ume. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na o nwere ihe ụfọdụ na-enye anyị nsogbu n’obi, ka anyị ghara ịkpa iche, n’ihi na nke ahụ agatụghị eme ka nsogbu ahụ bie. (Ilu 18:1) Kama ịkpa iche, anyị kwesịrị ime ihe Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Hib. 10:24, 25.
Ka Okwu Chineke Kasie Gị Obi
13, 14. Olee otú Akwụkwọ Nsọ nwere ike isi kasie anyị obi?
13 Ma ànyị bụ Ndị Kraịst e mere baptizim ma ọ̀ bụ ndị ka malitere ịmụ banyere Chineke na nzube ya, Okwu Chineke e dere ede nwere ike ịkasi anyị obi. Pọl dere, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Akwụkwọ Nsọ nwere ike ịkasi anyị obi ma mee ka anyị “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” (2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe Chineke zubere ime, ghọtakwa na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu, nke ahụ ga-akasi anyị nnọọ obi. N’ihi ya, ka anyị na-agụ ma na-amụ Okwu Chineke na akwụkwọ anyị dị iche iche e ji amụ Baịbụl bụ́ ndị ga-akasi anyị obi, baakwara anyị ọtụtụ uru.
14 Jizọs bụ onye anyị kwesịrị iṅomi n’ihe gbasara iji Akwụkwọ Nsọ akụzi ihe na iji ya akasi ndị ọzọ obi. Dị ka ihe atụ, n’otu n’ime Luk 24:32) Pọl onyeozi ṅomiri otú magburu onwe ya Jizọs si zie ihe. Pọl na ndị ọ na-ezi ihe ‘tụgharịrị uche n’Akwụkwọ Nsọ.’ Na Beria, ndị gere ya ntị “ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị.” (Ọrụ 17:2, 10, 11) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, mụta ezigbo ihe n’ihe anyị gụrụ na ya nakwa n’akwụkwọ anyị dị iche iche bụ́ ndị ihe e kwo bipụta ha bụ ka ha na-akasi anyị obi ma na-eme ka anyị nwee olileanya n’oge nsogbu.
oge ndị Jizọs mere ka a hụ ya anya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ ‘kọwaara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’ Ka ọ nọ na-agwa ha okwu, ihe ọ na-ekwu ruru ha nnọọ n’obi. (Otú Ọzọ Anyị Nwere Ike Isi Kasie Ndị Ọzọ Obi
15, 16. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị aka ma kasie ha obi?
15 Anyị nwere ike ịkasi ụmụnna anyị obi ma anyị nyere ha aka ime ihe ndị dị ha mkpa. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgara ndị agadi ma ọ bụ ụmụnna anyị ndị na-arịa ọrịa ahịa zụtara ha ihe ndị ha chọrọ ịzụ. Anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịrụ ọrụ ndị ha na-arụ n’ụlọ, si otú ahụ gosi na anyị bu ọdịmma ha n’obi. (Fil. 2:4) Anyị nwekwara ike ịja ụmụnna anyị mma maka àgwà ọma ndị ha nwere, dị ka otú ha si ahụ ndị ọzọ n’anya, otú ha si arụsi ọrụ ike, nakwa otú ha si egosi na ha nwere obi ike na okwukwe.
16 Ihe anyị nwere ike ime iji kasie ndị agadi obi bụ ịga leta ha ma gee ha ezigbo ntị ma ha kọwara anyị ihe ndị mere ná ndụ ha nakwa ụzọ dị iche iche Jehova sirila gọzie ha. Nke a nwekwara ike ịgba anyịnwa ume ma kasie anyị obi. Anyị nwere ike ịgụrụ ha Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl. Anyị na ha nwere ike ịmụ Ụlọ Nche a ga-amụ n’izu ahụ anyị gara ma ọ bụ mụọ ebe a ga-amụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’izu ahụ. Anyị na ha nwere ike ikiri otu n’ime diiviidi anyị. Anyị nwekwara ike ịgụrụ ha ma ọ bụ ịkọrọ ha ahụmahụ ụfọdụ gbara n’akwụkwọ anyị, bụ́ nke ga-agba ha ume.
17, 18. Gịnị mere obi ji kwesị ịka anyị bụ́ ndị na-erubere Jehova isi na Jehova ga-akwado anyị ma kasie anyị obi?
17 Ọ bụrụ na anyị achọpụta na nwanna nọ n’ọnọdụ kwesịrị ka a kasie ya obi, anyị kpewe ekpere nke anyị, anyị nwere ike itinye ya n’ekpere ka Chineke kasie ya obi. (Rom 15:30; Kọl. 4:12) Ka anyị na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị ma na-agbalịsi ike ịkasi ndị ọzọ obi, anyị ga-enweli ụdị okwukwe otu ọbụ abụ nwere, obi ga-esikwukwa anyị ike otú obi si sie ya. Ọ bụrụ abụ, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” (Ọma 55:22) N’eziokwu, Jehova agaghị akwụsị ịkasi ndị na-erubere ya isi obi ma na-akwado ha.
18 Chineke gwara ndị fere ya ofufe n’oge ochie, sị: “Ọ bụ mụ onwe m bụ Onye na-akasi unu obi.” (Aịza. 51:12) Jehova ga-akasikwa anyị obi ma gọzie anyị maka imere ndị na-eru uju ihe na-akasi ha obi ma na-agwa ha okwu na-akasi ha obi. Ma ànyị nwere olileanya ibi n’ụwa ma ọ̀ bụ ịga eluigwe, ihe Pọl gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ike ịkasi onye ọ bụla n’ime anyị obi. Ọ gwara ha, sị: “Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke bụ́ Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya ma nye nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya site n’obiọma na-erughịrị mmadụ, kasiekwa unu obi ma mee ka unu guzosie ike n’omume ọma niile nakwa n’okwu ọma niile.”—2 Tesa. 2:16, 17.
Ì Chetara?
• Olee ebe a na-ekwusaru ozi ọma anyị nke na-akasi ndị na-eru uju obi?
• Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kasie ndị ọzọ obi?
• Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosi na Jehova na-akasi ndị ohu ya obi?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 28]
Ì so na-akasi ndị na-eru uju obi?
[Foto dị na peeji nke 30]
Ma ndị na-eto eto ma ndị katarala ahụ́ nwere ike ịgba ndị ọzọ ume