Ezigbo Ndụmọdụ Maka Ndị Na-alụbeghị Di Ma Ọ bụ Nwunye Na Ndị Lụrụla
Ezigbo Ndụmọdụ Maka Ndị Na-alụbeghị Di Ma Ọ bụ Nwunye Na Ndị Lụrụla
“Ana m ekwu ihe a . . . ka m kpalie unu ime ihe kwesịrị ekwesị, kpaliekwa unu ijere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche.”—1 KỌR. 7:35.
1, 2. Olee ihe mere mmadụ ji kwesị ịchọ ịma ihe Baịbụl kwuru banyere ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye na banyere ịlụ alụ?
OBI ụtọ, iwe, na nchegbu, bụcha ihe ndị anyị na-enwekarị ka anyị na onye na-abụghị nwoke ibe anyị ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị na-akpa. Anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme banyere ihe ndị a. E nwekwara ihe ndị ọzọ mere anyị ji kwesị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka. O nwere ike ịdị Onye Kraịst ọ na-anaghị enye nsogbu n’obi na ọ lụbeghị di ma ọ bụ nwunye ka ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya hà na-enye ya nsogbu ịlụ di ma ọ bụ nwunye. E nwere Onye Kraịst nwere ike ịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ hụbeghị onye ihe ga-adabara ya na ya. E nwekwara ndị nke hụrụla onye ha ga-alụ ma ha chọrọ ịma otú ha ga-esi kwadebe maka ihe dị n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ihe ọzọkwa bụ na Ndị Kraịst lụrụla di ma ọ bụ nwunye na ndị nke na-alụbeghị na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ịkwa iko.
2 E wezụga na ihe anyị kpebiri ime n’okwu a ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ma ọ bụ ghara inwe, ọ gbasakwara adịm ná mma anyị na Jehova Chineke. N’isi asaa nke akwụkwọ ozi nke mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, o nyere ndụmọdụ banyere ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye na banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ihe o kwo mee nke a bụ ka ọ kpalie ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya ‘ime ihe kwesịrị ekwesị, kpaliekwa ha ijere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche.’ (1 Kọr. 7:35) Ka ị na-atụle ihe o kwuru n’okwu a dị mkpa, ma ị̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ị lụbeghị, gbalịa lee ọnọdụ gị anya ka ohere ị ga-eji jekwuoro Jehova ozi.
Mkpebi nke Dị Ezigbo Mkpa Onye Ọ Bụla Ga-emere Onwe Ya
3, 4. (a) Gịnị na-emekarị mgbe ndị ọzọ na-enye enyi ha ma ọ bụ onye ikwu ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nsogbu ka ọ lụọ? (b) Olee otú ndụmọdụ Pọl nyere ga-esi enyere onye ọ bụla aka ile ịlụ di ma ọ bụ nwunye anya otú kwesịrị ekwesị?
3 N’ọtụtụ ebe, a na-ewere ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ihe dị ezigbo mkpa, dị ka ndị Juu oge ochie si were ya. E nwere afọ ndụ mmadụ ga-eru ma ọ́ lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ndị enyi ya na ndị ikwu ya agwawa ya ka ọ gaa lụọ. Ha nwere ike ịna-agwa ya ka ọ chọsiwe onye ọ ga-alụ ma ọ bụ onye ga-alụ ya ike. Ha nwere ike ịtụrụ ya aro onye dị mma o nwere ike ịlụ. Ha nwedịrị ike iji akọ mee ka mmadụ abụọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye hụ ibe ha. Ụdị ihe a na-emenyekarị ndị e mere ya ihere ma ọ bụdị wute ha nke ukwuu. O nwekwara ike ime ka ndị bụ́ enyi see okwu.
4 Pọl amanyeghị ndị ọzọ ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ka ha ghara ịlụ. (1 Kọr. 7:7) Obi dị ya ụtọ ijere Jehova ozi n’alụghị nwaanyị, ma ọ makwa na ndị ọzọ nweere onwe ha ịlụ. Onye Kraịst ọ bụla nwekwaara onwe ya taa ikpebi ma ọ̀ ga-alụ ma ọ bụ na ọ gaghị alụ. Ndị ọzọ ekwesịghị ịmanye ha ịlụ ma ọ bụ ịghara ịlụ.
Mmadụ Iji Oge Ọ Na-alụbeghị Di ma Ọ Bụ Nwunye Eme Ihe Bara Uru
5, 6. Olee ihe mere Pọl ji na-agba Ndị Kraịst ume ka ha ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
5 Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ndị Kọrịnt bụ otú dị mma o si lee alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt .) N’agbanyeghị na Pọl alụghị nwaanyị, o wereghị na ya ka ndị lụrụ alụ mma, dị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm, bụ́ ndị na-anaghị alụ nwaanyị, na-eme. Kama nke ahụ, ihe o kwuru bụ uru ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-erite. Olee uru ndị ha na-erite? 7:8
6 Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịnara ọrụ ọ bụla e nyere ya ná nzukọ Jehova nke nwere ike isiri onye lụrụla di ma ọ bụ nwunye ike ịnara. Pọl nwere ihe ùgwù pụrụ iche nke ịbụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 11:13) Gụọ Ọrụ Ndịozi isi 13 ruo isi 20, ma were ya na gị na Pọl na ndị ozi ala ọzọ ibe ya so na-aga ebe dị iche iche na-ehiwe ọgbakọ n’ebe ndị ahụ. Mgbe Pọl na-eje ozi, o diri ọtụtụ ihe ọtụtụ ndị na-agaghị edili taa. (2 Kọr. 11:23-27, 32, 33) Ma, ọṅụ o nwetara n’ihi inyere ndị ọzọ aka ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ka o die nsogbu ndị ahụ bịaara ya. (1 Tesa. 1:2-7, 9; 2:19) A sị na ọ lụrụ nwaanyị ma ọ bụ nwee ụmụ, ọ̀ gaara arụzu ihe niile ahụ ọ rụzuru? Eleghị anya, ọ gaaraghị emeli otú ahụ.
7. Kọọ otú ụmụnna nwaanyị abụọ na-alụghị di si jiri oge ha rụọ ọrụ maka Alaeze Chineke.
7 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-eji oge buru ibu ha nwere arụ ihe dị ukwuu n’ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Sara na Limbania, bụ́ ndị ọsụ ụzọ oge niile na-alụbeghị di, gara n’otu ime ime obodo ndị nọ na ya na-anụbeghị ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ. Ọkụ eletrik na-adịghị ebe ahụ ọ̀ ga-eme ka ha daa mbà? Ha sịrị: “E nweghị redio ma ọ bụ tiivi ebe ahụ, n’ihi ya, e nweghị ihe ndị na-egbochi ndị mmadụ ime ihe na-atọkarị ha ụtọ ime, ya bụ, ịgụ akwụkwọ.” Ụfọdụ ndị bi n’obodo ahụ gosiri ndị ọsụ ụzọ ahụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova ha nwere, bụ́ ndị ha ka na-agụ, ma a na-anaghịzi ebipụta ha. Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ndị niile ha gara na nke ha nwere mmasị, o siiri ha ike ịga n’ụlọ niile dị n’obodo ahụ. Otu nwaanyị katarala ahụ́ gwara ha, sị: “Ọ ga-abụ na ọgwụgwụ eruwela nke a Ndịàmà Jehova mechara rute obodo anyị.” Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị nọ n’obodo ahụ amalite ịbịa ọmụmụ ihe.
8, 9. (a) Olee ihe Pọl bu n’obi mgbe ọ gbara ndị ọzọ ume ka ha ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye? (b) Olee uru Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-erite?
8 N’eziokwu, Ndị Kraịst lụrụla di ma ọ bụ nwunye na-arụpụta ezigbo ihe n’ozi ọma n’ókèala ebe ihe siri ike. Ma, e nwere ọrụ ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-arụli bụ́ ndị nwere ike isiri ndị lụrụla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ ndị nwere ụmụ ike ịrụ. Pọl ma na e nwere ọtụtụ ebe a ga-ekwusa ozi ọma n’ókèala ọgbakọ ndị o degaara akwụkwọ ozi.
Ọ chọrọ ka mmadụ niile nwee ọṅụ otú yanwa nwere. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na ọ ga-aka adịrị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mfe ijere Jehova ozi.9 Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ n’Amerịka dere, sị: “Ụfọdụ ndị chere na ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye anaghị enwe obi ụtọ. Ma, achọpụtala m na ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ mgbe niile bụ ma ọ bụrụ na ya na Jehova bụ enyi. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ bụ onyinye n’enweghị atụ ma e jiri ya mee ihe bara ezigbo uru.” O kwukwara sị: “Ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye anaghị egbochi mmadụ inwe obi ụtọ, kama, o nwedịrị ike ime ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ama m na Jehova hụrụ ma ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ndị lụrụla alụ n’anya.” Nwanna nwaanyị a ji obi ụtọ na-eje ozi ugbu a n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ì nwere ike iji ohere a i nwere wepụtakwuo oge gị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma? I nwekwara ike ịchọpụta na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye bụ onyinye pụrụ iche si n’aka Jehova.
Ndị Mechara Chọọ Ịlụ Di ma Ọ Bụ Nwunye
10, 11. Olee otú Jehova si enyere ndị na-achọtabeghị onye dị ha mma ha ga-alụ aka?
10 Mgbe ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nọchara n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ruo oge ụfọdụ, ha na-ekpebi ịlụ. Ebe ha ma na ntụziaka Jehova dị ha mkpa, ha na-arịọ ya ka o nyere ha aka ịchọta onye kwesịrị ekwesị ha ga-alụ.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:36.
11 Ọ bụrụ na i bu n’obi ịlụ onye chọrọ iji obi ya dum na-ejere Jehova ozi ka gị, kpekuo Jehova ekpere ka o nyere gị aka. (Fil. 4:6, 7) N’agbanyeghị ogologo oge nke a ga-ewe gị, ike agwụla gị. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere gị aka, ọ ga-anọnyere gị ma meere gị ihe obi gị chọrọ.—Hib. 13:6.
12. Olee ihe mere Onye Kraịst ji kwesị ichesi echiche ike tupu ya ekweta ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
12 Ọ bụrụ na ị bụ nwanna chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gịnị ka ị ga-eme ma onye na-esighị ike n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ onye na-abụghị onye Jehova abịara gị di ma ọ bụ gwa gị ka ị lụwa ya? Ọ bụrụ na nke a emee, cheta na obi mgbawa ịlụ onye na-ekwesịghị ekwesị na-akpata dị njọ karịa owu na-ama mmadụ n’ihi na ọ lụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Chetakwa na ị lụhaala di ma ọ bụ nwunye, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, ị lụchaala. (1 Kọr. 7:27) Ekwokwala na ị chọsiri ike ịlụ di ma ọ bụ nwunye gaa lụọ onye ị ga-akwara mmakwaara n’ikpeazụ.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:39.
Jikere Maka Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhụ Ma Ị Lụchaa Di ma Ọ Bụ Nwunye
13-15. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata nsogbu nke ndị chọrọ ịlụ ibe ha kwesịrị ikwurịta mgbe ha ka na-akpa?
13 Ọ bụ eziokwu na Pọl kwuru na mmadụ ga-aka ejere Jehova ozi ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ katọghị ndị kpebiri ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Kama nke ahụ, ndụmọdụ o nyere ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ga-enyere ha aka ịma ihe ha ga-eme ma ha nwee nsogbu, marakwa otú ha ga-esi ghara itisa.
14 Ụfọdụ ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị iwepụ ihe ụfọdụ ha na-atụ anya ha n’obi ha. Mgbe ha na onye ha chọrọ ịlụ na-akpa, ha nwere ike ịchọpụta na ha hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu, bụ́ nke ga-eme ka ha tụọ anya na ha agaghị enwe nsogbu ma ha lụọ. Nke a nwere ike ime ka ha chewe na o nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka ha ghara ịna-enwe obi ụtọ ma ha lụọ. Ndị na-eche otú a amaghị nke a na-akọ. Ọ bụ eziokwu na egwuregwu di na nwunye na-egwu na mmekọahụ ha na-enwe na-eme ha obi ụtọ, ma ihe ndị a naanị agaghị enyere ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye aka ịma ihe ha ga-eme banyere mkpagbu di na nwunye ọ bụla na-enwe.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:28. *
15 Ọ na-atụ ọtụtụ ndị lụrụ ọhụrụ n’anya mgbe di ma ọ bụ nwunye ha na-ekwenyeghị n’ihe ụfọdụ ha kwuru mgbe ha na-ekwurịta ihe ndị dị mkpa. Ha nwere ike ịchọpụta na ha anaghị ekwekọrịta n’ihe ha ga-eji ego ha na-eme na ihe ha ga-eji na-atụrụ ndụ, ebe ha ga-ebi, nakwa
ugboro ole ha ga na-aga eleta ndị ọgọ ha. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwekwara àgwà ndị nwere ike ịna-akpasu onye nke ọzọ iwe. Mgbe ha ka na-akpa, ha nwere ike ịna-eleghara ihe ndị a anya, ma ihe ndị a nwere ike ịkpatara ha ezigbo nsogbu mgbe ha lụrụ. Mmadụ abụọ chọrọ ịlụ ibe ha kwesịrị ibu ụzọ dozie ihe ndị a tupu ha alụwa.16. Olee ihe mere di na nwunye ji kwesị ikwekọrịta n’otú ha ga-esi na-edozi nsogbu ndị ha na-enwe?
16 Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ịna-enwe obi ụtọ, ha kwesịrị ịna-agbakọ aka edozi nsogbu ha. Ha kwesịrị ikwekọrịta n’otú ha ga-esi na-agbazi ụmụ ha ma ha mehie ihe na otú ha ga-esi na-elekọta ndị nne na nna ha merela agadi. Ha ekwesịghị ikwe ka nsogbu ha na-enwe n’ezinụlọ mee ka ha na-eme ihe iche iche. Ha ga-enwe ike idozi ọtụtụ nsogbu, die ndị na-ekweghị ha ndozi, ma na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ana-eme ihe Baịbụl kwuru.—1 Kọr. 7:10, 11.
17. Olee ihe mere onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye ji “na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa”?
17 Pọl kwuru banyere ihe ọzọ na-eme n’etiti di na nwunye na 1 Ndị Kọrịnt 7:32-34. (Gụọ.) Onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye “na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa,” dị ka ihe oriri, uwe, ụlọ obibi, na ihe ndị ọzọ na-agbasaghị ofufe Jehova. Gịnị mere o ji dị otú a? Mgbe nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị, o nwere ike iji oge hiri nne na-eje ozi ọma. Ma mgbe ọ lụrụ nwaanyị, ọ na-achọpụta na ya kwesịrị iji oge ya ụfọdụ na ume ya na-elekọta nwunye ya ka o nwee ike ime ihe dị nwunye ya mma. Otú a kwa ka nwaanyị na-achọpụta na ya kwesịrị imere di ya. Jehova ma nke a. Ọ ma na ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ịna-enwe obi ụtọ, ha ga-eji ụfọdụ n’ime oge na ume ha jibu ejere ya ozi mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-elekọta ibe ha.
18. Olee mgbanwe ụfọdụ ndị nwere ike ime mgbe ha lụchara di ma ọ bụ nwunye?
18 Ma, e nwere ihe ọzọ ndị di na nwunye kwesịrị iburu n’uche. Ọ bụrụ na ha kwesịrị iji ụfọdụ n’ime oge na ume ha ji ejeburu Chineke ozi na-elekọta ibe ha, ọ̀ bụ na ha ekwesịghị iji ụfọdụ Efe. 5:31.
n’ime oge ha na ndị ọzọ na-eji atụrụ ndụ mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-elekọta ibe ha? Olee otú obi ga-adị nwaanyị ma ọ bụrụ na di ya na-eji oge hiri nne eso ndị enyi ya egwu egwuregwu? Ma ọ bụkwanụ, olee otú obi ga-adị nwoke ma ọ bụrụ na nwunye ya ejiri oge hiri nne na-eso ndị enyi ya na-atụrụ ndụ? Owu nwere ike ibido mawa onye nke e leghaara anya, obi ana-ajọ ya njọ, ya adịkwa ya ka a hụghị ya n’anya. Nke a agaghị eme ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye mee ihe niile ha nwere ike iji hụ na ha na di ma ọ bụ nwunye ha na-emekọ ihe ọnụ.—Jehova Chọrọ Ka Anyị Na-eme Omume Ọma
19, 20. (a) Olee ihe mere na ọ bụghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka mmadụ ghara ịkwa iko? (b) Olee ihe ọjọọ nwere ike ime ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye hapụ di ma ọ bụ nwunye ha gaa ihe ga-ewe ha ogologo oge?
19 Ndị ohu Jehova na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha ghara ime omume rụrụ arụ. Ụfọdụ na-ekpebi ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ha ghara ịkwa iko. Ma, na mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye abụghị ya ga-eme ka onye ahụ ghara ịkwa iko. N’oge ochie, obodo e wusiri ike na-echebe naanị ndị nọ n’ime ya. Ọ bụrụ na mmadụ esi n’ime ya pụọ mgbe ndị ọjọọ na-agagharị, e nwere ike izu ya ohi ma ọ bụdị gbuo ya. N’otu aka ahụ, di ma ọ bụ nwunye agaghị akwa iko ma ọ bụrụ na ha emee ihe Jehova kwuru, ya bụ, ma naanị ha na di ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ.
20 Pọl mere ka nke a doo anya ná 1 Ndị Kọrịnt 7:2-5. Nwoke na onye ọzọ ekwesịghị inwe mmekọahụ ma e wezụga nwunye ya. Nwaanyị na onye ọzọ ekwesịghịkwa inwe mmekọahụ ma e wezụga di ya. Onye nke ọ bụla kwesịrị inye di ma ọ bụ nwunye ya “ihe ruuru ya,” ya bụ, mmekọahụ nke di na nwunye kwesịrị ịna-enwe. Ma, ụfọdụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-ahapụ nwunye ma ọ bụ di ha gaa ihe ga-ewe ha ogologo oge, ma ọ bụ gaa ezumike, ma ọ bụkwanụ gaa ebe ọzọ n’ihi ọrụ ha, bụ́ nke ga-eme ka ha ghara inye ibe ha “ihe ruuru ya.” Cheedị ihe ọjọọ nwere ike ime ma ọ bụrụ na Setan anwata di ma ọ bụ nwunye, ya akwaa iko n’ihi na ‘o nweghị ike ịchịkwa onwe ya.’ Jehova na-agọzi ndị isi ezinụlọ na-akpa afọ ezinụlọ ha n’agaghị mewe ihe nwere ike ibutere ha na nwunye ha nsogbu.—Ọma 37:25.
Uru Ime Ihe Baịbụl Kwuru Na-aba
21. (a) Gịnị mere o ji esiri ndị mmadụ ike ikpebi ma hà ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na ha agaghị alụ? (b) Olee ihe mere ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt isi 7 ji baa uru?
21 Otu n’ime mkpebi ndị kacha esiri mmadụ ike omume bụ ma ọ̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na ọ gaghị alụ. O nweghị onye zuru okè. Ezughị okè bụkwa isi ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ na ibe ha na-enwe. N’ihi ya, n’agbanyeghị na Jehova na-agọzi ndị ohu ya, ha ga na-enwekwa nsogbu mgbe ụfọdụ, ma hà lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha alụghị. Ọ bụrụ na i mee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt isi 7, nsogbu ahụ agaghị akarị akarị. Ma ị̀ lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ị lụghị, ị “ga-eme nke ọma” n’anya Jehova. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38.) Ihe kacha mma i kwesịrị ịchọ bụ ka gị na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụrụ na Jehova enyere gị aka, ị ga-enwe ike ịbanye n’ụwa ọhụrụ ya, bụ́ ebe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-agaghịzi enwe ụdị nsogbu ha na-enwe ugbu a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Gụọ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ isi 2, paragraf nke 16-19.
Ị̀ Ga-azali Ajụjụ Ndị A?
• Olee ihe mere na o nweghị onye kwesịrị inye onye ọzọ nsogbu ka ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye?
• Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, olee otú i nwere ike isi jiri oge gị mee ihe bara uru?
• Olee otú mmadụ abụọ chọrọ ịlụ ibe ha ga-esi kwadebe maka ihe dị n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
• Olee ihe o ji bụrụ na ịlụ di ma ọ bụ nwunye abụghị ya ga-egbochi mmadụ ịkwa iko?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 14]
Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ndị ji oge ha ejekwuru Jehova ozi, na-enwe ọṅụ
[Foto dị na peeji nke 16]
Olee mgbanwe ụfọdụ ndị nwere ike ime mgbe ha lụchara di ma ọ bụ nwunye?