Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Dị Ezigbo Mkpa Ka Anyị ‘Na-eche Nche’?

Gịnị Mere O Ji Dị Ezigbo Mkpa Ka Anyị ‘Na-eche Nche’?

Gịnị Mere O Ji Dị Ezigbo Mkpa Ka Anyị ‘Na-eche Nche’?

E NWERE mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ (Mat. 24:3) Jizọs gwara ha ọtụtụ ihe ndị doro anya ha ga-eji amata ihe ha na-ajụ banyere ya. E dere ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na Matiu isi 24, Mak isi 13, nakwa na Luk isi 21. Jizọs gwakwara ha, sị: “Na-echenụ nche.”​—Mat. 24:42.

Ebe ọ bụ na ihe ịrịba ama ndị ahụ doro anya, oleezi ihe mere Jizọs ji sị ha na-eche nche? Legodị ihe abụọ e nwere ike ikwu na ọ bụ ya kpatara ya. Nke mbụ bụ na e nwere ihe ndị nwere ike ịdọpụ mmadụ uche ma mee ka okwukwe onye ahụ jụọ oyi, ya agharakwa ịna-eche nche. Nke abụọ bụ na ọ bụrụ na ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma anaghị emecha n’ebe Onye Kraịst bi, o nwere ike ichewe na ihe a na-ekwu agbasaghị ya. Nke a nwere ike ime ka o chewe na “oké mkpagbu” ahụ Jizọs kwuru na a ga-enwe ka dị anya. N’ihi ya, o nweziri ike ịdị ya ka ọ dịbeghị mkpa ka ya ‘na-eche nche.’​—Mat. 24:21.

‘Ha Amaghị’

Jizọs chetaara ndị na-eso ụzọ ya ihe mere ndị biri ndụ n’oge Noa. E nweghị onye bi n’oge ahụ ga-asị na ya amaghị banyere ozi ọma Noa na-ekwusa, nnukwu ụgbọ ọ na-arụ, na ime ihe ike juru ebe niile. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị ‘amaghị.’ (Mat. 24:37-39) Ụdị ihe ahụ ndị oge Noa mere ka ndị mmadụ na-emekwa taa ma a gwa ha ihe ha kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, a na-enwe saịn bọọdụ ndị a na-egwunye n’akụkụ ụzọ ebe a ga-ahụ ha nke ọma, bụ́ ndị a na-ede otú ndị na-anya ụgbọala kwesịrị ịna-agbaru n’ọsọ. Ma, ọtụtụ ndị na-eleghara ha anya. N’ihi nke a, mgbe ụfọdụ, gọọmenti na-arụnye ihe ndị dị mkputamkpu n’okporo ụzọ otú ọ ga-abụ ndị ọkwọ ụgbọala rute ebe ahụ ọ bụghị mmadụ ga-agwa ha jiri nwayọọ. Onye Kraịst nwekwara ike ịna-eme ka ndị ọkwọ ụgbọala ahụ, ya bụ, o nwere ike ịhụcha ihe ndị a na-egosi na anyị bi n’oge ọgwụgwụ ma ka na-eme ihe ndị na-adọpụ ya uche n’ozi ọ na-ejere Jehova. Ọ bụ otú a ka ọ dịbu otu onye na-eto eto bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, onye aha ya bụ Arielle.

Arielle na-enwe mmasị ile ụmụ nwaanyị na-eme egwuregwu ịtụ bọl aka na tiivi. E nwekwara mgbe ụlọ akwụkwọ ha hiwere otu òtù egwu bọl aka. Otú egwuregwu ahụ si atọ Arielle ụtọ mere ka o chefuo na o nwere ike imebi adịm ná mma ya na Chineke. Ọ banyere n’òtù ahụ ka ọ na-echere ha bọl. Oleezi ihe mechara mee? O kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị so n’òtù egwu bọl anyị nwechara ndị enyi nwoke na-aṅụ sịga na ọgwụ ọjọọ. Ha na-achịkwa m ọchị n’ihi na o nweghị nke m nwere. Ma, echere m na o nweghị ihe ihe a niile ga-eme m. Ma, ka oge na-aga, egwuregwu bọl ahụ malitere imebi mmekọrịta mụ na Jehova. Egwuregwu ahụ bịara rie m isi. Ọ na-abụzi m nọrọ n’ọmụmụ ihe obi m anọrọ n’ịtụ bọl. Àgwà m malitekwara ịgbanwe. Ka oge na-aga, ihe mere m ji na-egwu egwuregwu ahụ abụghịzi n’ihi na ọ na-atọ m ụtọ, kama, ọ bụ ka ndị òtù anyị na-emeri. M na-aga atụ bọl aka mgbe ọ bụla ka m nwee ike ịna-amụtakwu ya, ka a ghara inwe ndị ga-emeri anyị. Ihe ndị a mere ka ike na-agwụkarị m, mụ ana-echegbukwa onwe m. Ndị enyi m ụfọdụ hapụdịrị m n’ihi otú m si ejizi oge m niile atụ bọl aka.

“E nwere ihe mere otu ụbọchị nke mere ka m chebara onwe m echiche. Ọ bụ mgbe e nyere òtù egwu bọl anyị na ha na-asọ mpi penariti. Ejikeere m iche bọl ahụ. Ma, amaghị m mgbe m ji rịọ Jehova ka o nyere m aka ka ọ ghara ịga gol. Ihe a merenụ mere ka m mata na egwuregwu bọl a emebiela mmekọrịta mụ na Jehova. Olee otú m si mee ka mụ na Jehova dịghachiwe ná mma?

“E nweela mgbe m kiriri vidio anyị bụ́ Young People Ask—What Will I Do With My Life? * Ma, ekpebiri m ikiri ya ọzọ ma tinye uche m na ya na nke ugbu a. A sị kwuwe, ihe mụ na ya na-alụ ka ya na André, bụ́ nwa okorobịa e gosiri na vidio ahụ, lụrụ. E nwere ihe otu okenye gwara André ka o mee nke m na-agaghị echefu echefu. Ọ gwara ya ka ọ gụọ Ndị Filipaị 3:8 ma chebara ihe e dere ebe ahụ echiche. Emere m ihe ahụ a gwara André ka o mee. Nke a nyekwaara m aka ịhapụ òtù egwuregwu bọl ahụ.

“Vidio ahụ nyeere m ezigbo aka! A naghịzi m achọ ka mụ na ndị ọzọ na-asọ mpi. Ike anaghịzi agwụkarị, anaghịzikwa m echegbukarị onwe m. Obi na-atọzi m ụtọ, m na-enwekwukwa ohere mụ na ụmụnna m ga-eji na-anọrị. Anaghịzi m eji ofufe m na-efe Jehova egwu egwu. Uche m na-adịzi n’ọmụmụ ihe, ọ na-atọzikwa m ụtọ otú ọ na-atọbu m. Ana m agachizi ozi ọma anya, ọ na-abụkwa m nọtụ mụ ewere ọrụ ịsụ ụzọ inye aka.”

Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-eme ka ị na-eleghara ihe ndị Jizọs kwuru a ga-eji amata oge ọgwụgwụ anya, gbaa mbọ mee ihe ahụ Arielle mere. I nwere ike ime ụfọdụ n’ime ihe ndị na-esonụ. Jiri akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index mee nchọnchọ. Akwụkwọ ahụ yiri mapụ e ji achọta ebe akụ̀ dị oké ọnụ ahịa dị. I nwere ike iji ya chọta ebe e dere ihe ndị ga-abara gị uru ma i mee ha. I nwekwara ike ịhụ ebe a kọrọ akụkọ banyere ndị nwere ụdị nsogbu gị na ya na-alụ ugbu a. Ihe ga-eme ka ị na-eritekwu uru n’ọmụmụ ihe bụ ịna-akwadebe nke ọma tupu gị agawa nakwa ịna-edetu ihe ụfọdụ a na-ekwu. Ụfọdụ ndị achọpụtala na uche ha na-aka adị n’ihe a na-ekwu ma ha nọrọ n’ihu oche. Ọ bụrụ na ihe omume a na-eme bụ ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, gbalịa zaa ajụjụ ná mbido ihe omume ahụ. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịmụrụ anya ka ị mara otú ihe ndị na-eme n’ụwa si emezu ihe ndị ahụ Jizọs kwuru, nakwa otú ha si emezu ihe ndị ọzọ e kwuru a ga-eji amata ‘oge ikpeazụ.’​—2 Tim. 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpu. 6:1-8.

“Dịrịnụ Njikere”

Ihe ndị a ga-eji amata oge ikpeazụ na-eme n’ebe niile, ya bụ, “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:7, 14) Ọtụtụ nde mmadụ bi n’ebe ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ihe ndị ọzọ e buru n’amụma na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Ma, e nwere ọtụtụ ndị bi n’ebe nsogbu na-adịchaghị. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime nsogbu ndị e ji amata oge ọgwụgwụ abịatụbereghị gị, ì kwesịrị ichewe na oké mkpagbu ahụ ka dị ezigbo anya? I kwesịghị ichewe otú ahụ.

Chebaragodị ihe Jizọs kwuru banyere “ọrịa na-efe efe na ụkọ nri” echiche. (Luk 21:11) Cheta na Jizọs ekwughị na a ga-enwe ha n’ebe niile n’otu mgbe, o kwughịkwa na otú a ga-esi enwe ha n’ebe niile ga-aha otu. Kama Jizọs kwuru na ha ga na-eme “n’ebe dị iche iche.” N’ihi ya, anyị agaghị atụwa anya na ihe ndị na-eme n’otu ebe ga na-eme n’ebe niile n’otu mgbe. Ihe ọzọ bụ na obere oge ka Jizọs kwuchara banyere ụkọ nri, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịna-eche nche ka ha ghara iribiga ihe ókè. O kwuru, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè . . . ga-anyịgbu obi unu.” (Luk 21:34) N’ihi ya, Ndị Kraịst niile ekwesịghị ịtụwa anya na nsogbu niile ahụ Jizọs kwuru a ga-eji amata oge ikpeazụ ga-abịachara ha. Kama nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Ọ bụrụgodị na nsogbu ndị a anaghị eme n’ebe anyị bi, anyị na-anụ banyere ha na redio na tiivi, na-agụkwa banyere ha n’akwụkwọ ma ọ bụ n’Ịntanet.

Chetakwa na Jehova ewepụtala ‘ụbọchị na oge awa’ oké mkpagbu ahụ ga-amalite. (Mat. 24:36) Otú ihe si aga n’ụwa taa agaghị eme ka ụbọchị ahụ na oge awa ahụ gbanwee.

Jizọs gwara Ndị Kraịst nọ n’ebe dị iche iche, sị: “Dịrịnụ njikere.” (Mat. 24:44) Anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. O nweghịkwa onye n’ime anyị ma ihe ọ ga-anọ na-eme mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite. Ụfọdụ nwere ike ịnọ n’ebe ha na-arụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ndị ọzọ nwere ike ịnọ n’ụlọ ha na-arụ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ. (Mat. 24:40, 41) Ma, olee ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị dị njikere?

Emmanuel na nwunye ya bụ́ Victorine na ụmụ ha nwaanyị isii bi n’otu obodo dị n’Afrịka. Ihe ndị ahụ e kwuru na ha ga na-eme n’oge ọgwụgwụ anaghị emecha n’ebe ha bi. N’ihi ya, ha kpebiri ịna-amụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị ka ha nwee ike ịdị njikere. Emmanuel kwuru, sị: “Ọ na-esiburu anyị ike iwepụta oge ga-adaba adaba onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe ohere. Ma, anyị mechara na-amụ ihe ma ọ kụọ elekere isii nke ụtụtụ ma mechie mgbe o ji ọkara gafee elekere isii nke ụtụtụ. Otú anyị si eme ya bụ, anyị gụchaa ihe mmụta dịịrị ụbọchị, anyị amụọ paragraf ole na ole n’akwụkwọ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe n’izu ahụ.” Ihe a ezinụlọ a na-eme ò nyeere ha aka ịna-eche nche? Ee, o nyeere ha! Ọ bụ Emmanuel na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ ha. Nwunye ya bụ́ Victorine na-arụkwa ọrụ ịsụ ụzọ inye aka site n’oge ruo n’oge, o nyekwarala ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu ahụ. Ụmụ ha na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ.

Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Na-elenụ anya, mụrụnụ anya.” (Mak 13:33) Ekwekwala ka ihe ọ bụla mee ka ị gharazie ịna-eche nche. Kama ime otú ahụ, na-eme ihe ọ bụla ị na-amụta n’ọmụmụ ihe nakwa n’akwụkwọ anyị, dị ka Arielle mere. Dịkwa ka ezinụlọ Emmanuel mere, kwa ụbọchị, gbalịa na-eme ihe ndị ga-enyere gị aka ‘ịna-eche nche.’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Vidio a gosiri otú otu Onye Kraịst na-eto eto si gbaa mbọ ka o mee ihe dị Jehova mma.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ịmụ Baịbụl kwa ụbọchị na-enyere Emmanuel na ezinụlọ ya aka ‘ịdị njikere’