Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijere Jehova Ozi Na-eme m Obi Ụtọ Kemgbe Ụwa

Ijere Jehova Ozi Na-eme m Obi Ụtọ Kemgbe Ụwa

Ijere Jehova Ozi Na-eme m Obi Ụtọ Kemgbe Ụwa

Dị ka Fred Rusk si kọọ

Ihe ndị mere m mgbe m dị obere mere ka m kweta na ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 27:10 bụ eziokwu. Devid kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” Ka m kọọrọ gị ihe mere m ji sị na ihe a Devid kwuru bụ eziokwu.

M NỌ n’ebe nna nna m na-akọ ogho ná steeti Jọjia, nke dị n’Amerịka, too. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka e nwere Oké Ndakpọ Akụnụba e nwere n’agbata afọ 1930 na afọ 1940. Papa m, bụ́ onye ọnwụ mama m na ọnwụ nwanne m nwoke a mụrụ ọhụrụ gbawara obi, hapụrụ m ka mụ na papa ya, onye nwunye ya nwụrụla, nọrọ, ma gawa ịchọ ọrụ n’obodo ọzọ dị anya. Ka oge na-aga, ọ gbara mbọ ka m bịakwute ya ka mụ na ya biri, ma mbọ ahụ ọ gbara enweghị isi.

Ọ bụ ụmụ nna nna m ndị nke nwaanyị torola eto na-elekọta ụlọ mgbe ahụ. Nna nna m enweghị ihe o ji okpukpe kpọrọ, ma, ụmụ ya ndị nwaanyị ejighị chọọchị Southern Baptist ha na-aga egwu egwu. Ha na-amanye m ịga chọọchị na Sọnde ọ bụla, ha na-agwakwa m na ha ga-eti m ihe ma ọ bụrụ na mụ agaghị. Ihe ndị a mere na o nwechaghị ihe m ji okpukpe kpọrọ mgbe m dị obere. Ma, ịga akwụkwọ na igwu egwuregwu na-amasị m.

Nleta nke Gbanwere Ndụ M

N’otu ehihie n’afọ 1941, mgbe m dị afọ iri na ise, otu nwoke katarala ahụ́ na nwunye ya bịara n’ụlọ anyị. A gwara m na ọ bụ nwanne nne nne m nakwa na aha ya bụ Talmadge Rusk. Amabughị m onye ọ bụ, ma, emechara m mata na ya na nwunye ya bụ Ndịàmà Jehova. Ọ kọọrọ m na Chineke zubere na ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ma, nke a dị nnọọ iche n’ihe m na-anụ na chọọchị. Ọtụtụ ndị nọ n’ezinụlọ anyị ekwetaghị ihe ha kwuru, ihe ndị ahụ adịghịkwa ha mma n’obi. Ihe a mere na e kweghịzi ha bịa n’ụlọ anyị ọzọ. Ma, nwanne papa m bụ́ Mary, onye ji naanị afọ atọ tọọ m, nwetara Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

O teghị aka, Mary achọpụta na ya amatala eziokwu ahụ, e meekwa ya baptizim na 1942, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Nsogbu bịakwaara ya dị ka Jizọs kwuru na ọ ga-abịara ndị na-eso ụzọ ya. Jizọs kwuru, sị: “Ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:34-36) Ndị ezinụlọ ya bidoro nyewe ya ezigbo nsogbu. Nwanne ya nwaanyị nke tọrọ ya, onye ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ha, gakwuuru onyeisi obodo ha, ya na ya agbaa izu kpọchie deede m Talmadge. A sị na iwu ọ dara bụ na ọ na-ere akwụkwọ n’anataghị gọọmenti ikike. E jikwa maka ya ma ya ikpe.

Otu akwụkwọ akụkọ a na-ede n’obodo anyị kwuru na onyeisi obodo ahụ, onye bụkwa ọkàikpe okwu ahụ dị n’aka, gwara ndị niile nọ n’ụlọikpe ahụ, sị: “Akwụkwọ nwoke a na-ekesara ndị mmadụ . . . dị njọ ka nsí.” Ikpe mechara laara deede m mgbe o tiiri akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ. Ma, ọ nọrọ abalị iri n’ụlọ mkpọrọ.

Otú Nwanne Papa M, Bụ́ Mary, Si Nyere M Aka

Mary na-akọrọ m ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, na-akọkwara ha ndị agbata obi anyị. E nwere ụbọchị m so ya gaa na nke otu nwoke o nyere akwụkwọ bụ́ The New World * ya na ya ji amụ Baịbụl. Nwunye nwoke ahụ kwuru na ụra agaghị di ya n’anya n’abalị ebe ọ nọ na-agụ akwụkwọ ahụ. Ọ bụ eziokwu na achọghị m ibido ozugbo tinyewe uche n’ihe gbasara okpukpe, ihe ndị m na-amụta mgbe ahụ masịrị m. Ma, ihe kacha mee ka m kweta na Ndịàmà Jehova bụ ndị Chineke n’eziokwu abụghị na ha na-akụzi ihe dị na Baịbụl, kama, ọ bụ n’ihi otú ndị mmadụ si emegide ha.

Dị ka ihe atụ, ka mụ na Mary si n’ebe anyị gara bọọchaa ahịhịa n’ugbo tomato anyị otu ụbọchị na-alọta, anyị hụrụ ihe gosiri na ụmụnne Mary ndị nwaanyị a kpọọla akwụkwọ Mary, ígwè fonograf ya, na teepụ ya ndị bu okwu ndị e ji Baịbụl kwuo, ọkụ. Eji m iwe bawa mba ozugbo. Ma, nwanne Mary nke tọrọ ya gbọchiri m ọnụ ozugbo ma kwuo, sị: “Unu ga-emecha kelee anyị n’ụwa a maka ihe ọma a anyị meere unu.”

Ebe ọ bụ na Mary ekweghị akwụsị ịkọrọ ndị mmadụ ihe ndị ahụ ọ na-amụta na Baịbụl, o kweghịkwa ahapụ okpukpe ọhụrụ a ọ na-ekpe, a chụpụrụ ya n’ụlọ na 1943. Ka ihe a niile na-eme, obi dị m ezigbo ụtọ na amụtala m na Chineke nwere aha nke bụ́ Jehova. Amụtakwara m na ọ hụrụ anyị n’anya, nweekwa ọmịiko, nakwa na e nweghị ọkụ mmụọ ebe ọ na-ata ndị mmadụ ahụhụ. Ọ bụ eziokwu na agatụbeghị m ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, amụtara m na Jehova nwere nzukọ nke ndị nọ na ya hụrụ ibe ha n’anya.

E nwere otu ụbọchị m nọ na-asụcha ahịhịa n’ụlọ anyị otu ụgbọala agbafetụ ma kwụsị. Otu n’ime ụmụ nwoke abụọ nọ n’ụgbọala ahụ jụrụ m ma ọ̀ bụ m bụ Fred. Mgbe m chọpụtara na ha bụ Ndịàmà Jehova, agwara m ha, sị: “Ka m banye n’ụgbọala unu ka anyị gaa ebe dị mma anyị ga-anọ kparịta.” Emechara m chọpụta na ọ bụ Mary gwara ha ka ha chọrọ m bịa. Otu n’ime ha bụ Shield Toutjian, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ onye gbara m ume mgbe ọ kacha dị m mkpa ma gwa m ka m nọsie ike n’ofufe Jehova. Ndị ezinụlọ anyị bidoro nyewezie m nsogbu n’ihi na m na-ekwu na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ eziokwu.

Otu ụbọchị, anatara m akwụkwọ ozi Mary si Vejinia detara m. Ọ gwara m na ọ bụrụ na m kpebiri ife Jehova, m nwere ike bịa ka mụ na ya biri. Ekpebiri m ozugbo ahụ na m ga-aga. N’Ọktoba 1943, na mgbede ụbọchị Fraịdee, akwakọtara m ngwongwo m ndị dị m mkpa kwanye ha n’otu igbe ma gaa kedo igbe ahụ n’otu osisi dịtụ anya n’ebe anyị bi. N’echi ya bụ́ Satọdee, agara m n’osisi ahụ buru igbe ahụ, si n’azụ ụlọ onye agbata obi anyị gawa ebe m na-aga. Mgbe m ruru obodo Roanoke, ahụrụ m Mary na nke Edna Fowlkes.

Otú M Si Mewe nke Ọma n’Ọgbakọ, E Mee M Baptizim, Mụ Ejewe Ozi na Betel

Edna bụ nwanna nwaanyị e tere mmanụ, onye nwere ọmịiko. E nwere ike ikwu na ọ bụ Lidia nke oge a. Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ, nwunye nwanne ya nwoke, na Mary bi. Ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ ahụ, bụ́ Gladys na Grace Gregory, mechara jewe ozi ala ọzọ. Gladys, bụ́ onye gaferela afọ iri itoolu ugbu a, ka na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Japan.

Amalitere m ịna-agachi ọmụmụ ihe anya mgbe ahụ m bi na nke Edna, amụtakwara m otú e si ezi ozi ọma. Ebe ọ na-enweghị onye na-enye m nsogbu mgbe ahụ, m nwere ohere ịmụ Okwu Chineke na ịna-aga ọmụmụ ihe bụ́ nke mere ka m mụtakwuo banyere Jehova. E mere m baptizim na Jun 14, 1944. Mary, Gladys Gregory, na Grace Gregory bidoro ọrụ ịsụ ụzọ ma kwere ịga jewe ozi n’ebe ugwu Vejinia. Ha nyekwara aka mee ka e nwee ọgbakọ na Lizbọg. Ná mmalite afọ 1946, ebidoro m ọrụ ịsụ ụzọ n’otu obodo dị nso n’ebe ahụ ha nọ. N’afọ ahụkwa, mụ na ha so gaa mgbakọ mba niile m na-agaghị echefu echefu, nke e nwere na Klivland, n’Ohayo, n’Ọgọst 4-11.

Nathan Knorr, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile, kwuru na e meela atụmatụ iwusakwu Betel dị na Bruklin. O kwuru na a ga-ewu ụlọ obibi ọhụrụ, wusakwuokwa ebe obibi akwụkwọ. A chọrọ ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eto eto ndị ga-abịa nye aka n’ọrụ a. Ekpebiri m na m ga-aga ebe ahụ jewere Jehova ozi. Na Disemba 1, 1946, bụ́ mgbe ọnwa ole na ole gara ka m dejupụtachara akwụkwọ, agara m jewe ozi na Betel.

Mgbe ihe dị ka otu afọ gara, Max Larson, bụ́ onye na-elekọta ebe obibi akwụkwọ, nọ na-agafe otu ụbọchị ma kwụsị na Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ Ozi bụ́ ebe m na-arụ ọrụ. Ọ gwara m na a chọrọ ka m rụwazie na Ngalaba Ije Ozi. Mgbe m malitere ịrụ ebe ahụ, amụtara m ọtụtụ ihe banyere otú e kwesịrị isi na-eme ihe e dere na Baịbụl nakwa otú ihe si aga ná nzukọ Jehova, karịchaa mgbe mụ na onye na-elekọta ngalaba ahụ, bụ́ T. J. (Bud) Sullivan, na-arụ.

Papa m bịara leta m ọtụtụ ugboro na Betel. O mechakwara nwewe mmasị n’okpukpe. Mgbe ikpeazụ ọ bịara leta m na 1965, ọ gwara m, sị: “I nwere ike ịbịa leta m, ma agaghị m abịa ebe a ọzọ leta gị.” Agara m leta ya ugboro ole na ole tupu ya anwụọ. Obi siri ya ike na ya ga-aga eluigwe ma ya nwụọ. Ma, enwere m olileanya na Jehova ga-echeta ya. Ọ bụrụkwa na o cheta ya ma kpọlite ya, ọ gaghị aga eluigwe dị ka o chere, kama ọ ga-ebi n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs, nwee olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Mgbakọ Ndị Ọzọ M Na-agaghị Echefu Echefu na Mgbe M So Rụọ Ọrụ Iwu Ihe

Oge mgbakọ distrikti na-abụkarị oge magburu onwe ya e ji eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Otú ahụ ka ọ dị, karịchaa, ná mgbakọ mba niile ndị e nwere n’agbata afọ 1950 ruo afọ 1960 n’Ámá Egwuregwu Yanki dị na Niu Yọk. N’otu mgbakọ mba niile e nwere na 1958, narị puku mmadụ abụọ na puku iri ise na atọ na narị itoolu na iri abụọ na abụọ, bụ́ ndị si mba dị otu narị na iri abụọ na atọ, gbakọrọ ma n’Ámá Egwuregwu Yanki ma na Polo Graụnds. E nwere otu ihe mere ná mgbakọ ahụ m na-agaghị echefu echefu. Ka m nọ na ngalaba na-ahazi ka ihe si aga ná mgbakọ ahụ, Nwanna Knorr ji ọsọ na ije bịarute ebe ahụ. Ọ sịrị m: “Fred, amaghị m otú m si chefuo ịhọpụta nwanna ga-aga gwa ndị ọsụ ụzọ zukọrọla n’otu ụlọ ezumezu anyị kwụrụ ụgwọ ya, bụ́ nke dị nso ebe a, okwu. Ị̀ ga-agalinụ ngwa ngwa ugbu a jiri ihe ọ bụla dị mma gbatara gị n’obi ka ị na-aga gwa ha okwu?” Ka m na-aga, anọ m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka. M nọkwa na-eku ume ọkụ ọkụ mgbe m rutere.

N’ihi otú e si na-enwekwu ọtụtụ ọgbakọ na Niu Yọk Siti n’agbata afọ 1950 na 1970, ụlọ ndị a na-akwụ ndị nwe ha ụgwọ ka ụmụnna nọrọ na-amụ ihe anaghịzi ezu. E ji maka nke a zụta ụlọ atọ dị na Manhatan n’agbata afọ 1970 na 1990, ma rụgharịa ha otú a ga-enwe ike ịnọ na ha na-amụ ihe. Ọ bụ m bụ onyeisi oche kọmitii hụrụ maka ịrụzigharị ụlọ ndị ahụ. Ana m echeta otú Jehova si gọzie ọgbakọ ndị wetara ego e ji rụọ ọrụ ahụ nakwa ndị nyere aka a rụchaa ya. A na-anọkwa n’ụlọ ndị ahụ efe Jehova ruo taa.

Otú Ihe Ụfọdụ Si Gbanwee ná Ndụ M

Otu ụbọchị na 1957, ka m nọ na-agafe n’ebe a na-adọba ụgbọala, nke dị n’agbata ụlọ obibi dị na Betel na ebe a na-ebi akwụkwọ, mmiri malitere izo. Ahụrụ m otu ọmarịcha nwa agbọghọ bịara Betel ọhụrụ ka ọ nọ m n’ihu. Ebe ọ bụ na o jighị nche mmiri, agara m ozugbo were nke m ji kpuchite ya. Ọ bụ otú ahụ ka m si mata Marjorie, mụ na ya emechaakwa gbaa akwụkwọ na 1960. Kemgbe ahụ, mụ na ya jikwa obi ụtọ na-ejere Jehova ozi ma n’udu mmiri ma n’ọkọchị. Septemba afọ 2010 mere ya afọ iri ise anyị lụrụla, anyị mekwara obere oriri iji cheta ya.

Ozugbo anyị si ebe anyị gara ezumike ka anyị lụchara lọta, Nwanna Knorr gwara m na a họpụtala m ka m kụziwe ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. M weere ya ka ihe ùgwù pụrụ iche! Malite n’afọ 1961 ruo 1965, e wepụtara klas ise a na-agụtetụ aka karịa klas ndị nke mbụ. Ndị a na-azụ na klas ndị ahụ na-abụkarị ndị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ, a na-akụzikwara ha otú e si arụ ọrụ ụfọdụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ. Ná ngwụcha afọ 1965, e bidoghachiri ịna-enwe klas ndị ahụ ọnwa ise ọnwa ise, bidokwa na-azụ ndị ozi ala ọzọ otú a na-emebu.

Na 1972, a gwara m ka m jewezie ozi na Ngalaba Na-ahụ Maka Iderịta Akwụkwọ Ozi, ma bụrụ onye na-elekọta ngalaba ahụ. Ime nchọnchọ iji zaa ajụjụ dị iche iche a na-ajụ na inyere ndị dị iche iche nwere nsogbu aka enyerela m aka ịghọtakwu ọtụtụ ihe dị n’Okwu Chineke, ghọtakwuokwa otú ihe Chineke gwara anyị ka anyị na-eme ga-esi enyere anyị aka.

Mgbe o ruziri n’afọ 1987, a gwara m ka m gaa jewe ozi na ngalaba ọzọ a na-akpọ Ngalaba Na-enyere Ndị Dọkịta Aka Ịgwọ Ndịàmà Jehova n’Ejighị Ọbara. E nwere nzukọ dị iche iche mgbe ahụ iji kụziere ndị okenye so na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ otú ha na ndị dọkịta, ndị ọkàikpe, na ndị ọzọ nwere ike isi kwurịta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị anaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara. Nsogbu kachanụ a na-enwe mgbe ahụ bụ na ndị dọkịta na-amịnye ụmụaka Ndịàmà Jehova ọbara n’ebughị ụzọ jụọ ndị mụrụ ha, mgbe ụfọdụ, ụlọikpe na-enyedị ha ikike ka ha na-eme nke a.

A gwa ndị dọkịta na e nwere ihe ndị ọzọ e nwere ike ime iji gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara, ha na-ekwukarị na ụdị ihe ndị ahụ adịghị adị, ma ọ bụkwanụ na ha dị oké ọnụ. Ihe m na-agwakarị dọkịta kwuru nke a bụ: “Wepụtagodị aka gị.” Mgbe o mere otú ahụ, m na-asị ya: “Ọ̀ kwa ị ma na i nwere otu n’ime ihe ndị kacha mma e nwere ike iji gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara.” Otú a m si too ya n’ọrụ ya chetaara ya ihe ọ maara nke ọma, nke bụ́ na o jiri mma e ji awa mmadụ ahụ́ rụọ ọrụ nke ọma, ọ ga-eme ka ọbara buru ibu ghara ịgbapụ.

Jehova agọziela nnọọ mbọ a a gbawara kemgbe iri afọ abụọ ugbu a iji kụziere ndị dọkịta na ndị ọkàikpe otú e nwere ike isi gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara. Mgbe ha bịara ghọtawa ihe ndị anyị na-akọwara ha, otú ha si emeso anyị ihe gbanwere. Ha bịara ghọta na ihe ndị a chọpụtarala banyere otú e si agwọ ọrịa na-egosi na e nwere ihe ndị e nwere ike ime iji gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara, nakwa na e nwere ọtụtụ ndị dọkịta nakwa ụlọ ọgwụ ndị na-ekweta ịgwọ ndị ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara.

Kemgbe afọ 1996, mụ na nwunye m na-eje ozi n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, na Niu Yọk. Ụlọ akwụkwọ ahụ dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ma e si Bruklin gawa ya. Ejetụrụ m ozi n’ebe ahụ na Ngalaba Ije Ozi. E nwekwara mgbe m so kụziere ndị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ihe. Emechara m bụrụghachi onye nlekọta na Ngalaba Na-ahụ Maka Iderịta Akwụkwọ Ozi, bụ́ nke e mechara si Bruklin bufee Patasịn, anọkwa m ebe ahụ na-eje ozi kemgbe afọ iri na abụọ ugbu a.

Nsogbu Ndị Ha na Nká So Aga

Ugbu a m rurula ihe dị ka afọ iri asatọ na ise, ịrụ ọrụ ndị m na-arụ na Betel na-esiziri m ike. Mụ na ọrịa kansa na-alụ kemgbe ihe karịrị afọ iri. Ọ dị m nnọọ otú ahụ ọ dị Hezekaya, bụ́ onye Jehova tụkwasịịrị ihe n’afọ ndụ ya. (Aịza. 38:5) Nwunye m na ọrịa Alzheimer na-alụkwa. Anyị abụọ na-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime ka ọ na-enweta onwe ya. Nwunye m bụ ohu Jehova ma nke a na-akọ, ndị na-eto eto na-esikwa n’aka ya amụta ihe. Ọ bụ ezigbo nwunye m na-enyere m aka. Ọ na-amụ Baịbụl nke ọma, bụrụkwa aka ochie n’ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọtụtụ ndị o nyeere aka n’ọgbakọ anaghị echefu anyị.

Nwanne papa m ahụ bụ́ Mary nwụrụ na Mach 2010, mgbe ọ gbara afọ 87. Ọ bụ aka ochie n’ịkụzi Okwu Chineke, o nyekwaara ndị ọzọ aka ha ebido ife Chineke. O ji ọtụtụ afọ jee ozi oge niile. Enwere m obi ụtọ maka otú o si nyere m aka mụ amụta eziokwu nke Okwu Chineke, mechaa dịrị ka ya, ya bụ, mechaa bụrụ onye na-ejere Jehova Chineke hụrụ anyị n’anya ozi. E liri Mary n’akụkụ ebe e liri di ya, bụ́ onye jeburu ozi ala ọzọ n’Izrel. Obi siri m ike na Jehova ga-echeta ha niile, nakwa na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ.

Ka m na-echeta afọ iri isii na asaa m jeerela Jehova ozi, ana m ekele ya maka otú o sirila gọzie m. Ime uche Jehova na-eme m obi ụtọ kemgbe ụwa! Obi siri m ike na Jehova ga na-egosi m obi ọma ya na-erughịrị m, enwekwara m olileanya na m ga-eso ná ndị nkwa Ọkpara ya kwere ndị na-efe Chineke ga-emezu n’isi ha. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.”Mat. 19:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 E bipụtara ya na 1942, ma, a naghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mgbe m nọ n’ugbo ogho nna nna m nke dị na Jọjia, n’Amerịka, na 1928

[Foto dị na peeji nke 19]

Nwanne papa m bụ́ Mary na deede m Talmadge

[Foto dị na peeji nke 20]

Mary, Gladys, na Grace

[Foto dị na peeji nke 20]

Mgbe e mere m baptizim na Jun 14, 1944

[Foto dị na peeji nke 20]

Mgbe m na-eje ozi na Ngalaba Ije Ozi na Betel

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na Mary mgbe anyị gara mgbakọ mba niile e nwere n’Ámá Egwuregwu Yanki na 1958

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na Marjorie, n’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na nwunye m na 2008