Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

È nwere ike ịmata kpọmkwem oge awa a kpọgburu Jizọs Kraịst?

Ihe mere ajụjụ a ji dị mkpa bụ na oge Mak dere na a kpọgburu Jizọs yiri ka ọ̀ dị iche n’oge Jọn onyeozi dere. Mak kwuru, sị: “Ma ọ bụ oge awa nke atọ, ha [ndị agha] wee kpọgide ya n’osisi.” (Mak 15:25) Jọn kwuru na “ọ bụ ihe dị ka awa nke isii” ka Paịlet nyefere Jizọs n’aka ndị Juu ka ha kpọgide ya n’osisi. (Jọn 19:14-16) Ndị na-akọwa Baịbụl ekwuola ọtụtụ ihe ebe ha na-agbalị ịkọwa ihe ndị a yiri ka hà na-emegiderịta ibe ha. Ma, e nweghị ezigbo ihe Baịbụl kwuru nke ga-enye aka ịkọwa ihe dị iche n’ihe Mak dere na ihe Jọn dere. Ma, ihe nwere ike inyere anyị aka ịghọta ha bụ ma anyị tụlee otú ndị mmadụ si agụ oge n’oge ahụ.

Na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, ndị Juu weere na a na-enwe awa iri na abụọ n’ehihie, malite mgbe anwụ wawara. (Jọn 11:9) N’ihi ya, “oge awa nke atọ” na-ebido n’elekere asatọ ruo elekere itoolu, ebe “awa nke isii” na-agwụcha n’ihe dị ka elekere iri na abụọ. Ma, mgbe anwụ na-eji apụta na mgbe ọ na-eji ada anaghị abụ otu n’ụbọchị niile dị n’afọ. N’ihi ya, e nwere ụbọchị chi na-eji ngwa ngwa n’afọ nweekwa ụbọchị ọ na-anaghị eji ngwa ngwa. Ihe ọzọkwa bụ na ihe e ji ama ihe na-akụ n’ụbọchị bụ ebe anyanwụ nọ. N’ihi ya, a naghị amacha kpọmkwem ihe na-akụ n’ụbọchị. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ekwukarị na ihe mere n’ihe dị ka n’awa nke atọ, ma ọ bụ n’ihe dị ka n’awa nke anọ, ma ọ bụkwanụ n’ihe dị ka n’awa nke itoolu. (Mat. 20:3, 5; Ọrụ 10:3, 9, 30) Mgbe a na-ekwu kpọmkwem awa ihe mere, dị ka “n’awa nke asaa,” bụ mgbe ọ dị mkpa ka e kwuo mgbe ihe a na-ekwu okwu ya mere.—Jọn 4:52.

Oge Matiu, Mak, Luk na Jọn kwuru na ihe ndị mere obere oge tupu Jizọs anwụọ mere adịghị iche. Ha anọ kwuru na ndị nchụàjà na ndị okenye zukọrọ n’ụtụtụ kpee ya ikpe, mechazie kpọga Jizọs na nke Gọvanọ Pọntiọs Paịlet bụ́ onye Rom. (Mat. 27:1; Mak 15:1; Luk 22:66; Jọn 18:28) Matiu, Mak, na Luk kwuchara na ọchịchịrị malitere ịgba n’ala ahụ n’awa nke isii, mgbe Jizọs nọzi anọ n’osisi ịta ahụhụ, “ruo n’oge awa nke itoolu.”—Mat. 27:45, 46; Mak 15:33, 34; Luk 23:44.

Otu ihe anyị kwesịrị icheta banyere oge a kpọgburu Jizọs, bụ́kwanụ ihe nwere ike ime ka o yie ka akụkọ ndị a hà dị iche, bụ na a na-agụnyekọta oge a pịara onye a chọrọ ịkpọgbu ihe n’oge a kpọgburu ya. Mgbe ụfọdụ, ihe a na-apịa onye ahụ na-adị egwu nke na onye ahụ nwedịrị ike ịnwụ ebe a na-apịa ya ihe. Na nke Jizọs, ọ ga-abụrịrị na ihe a pịara ya dị egwu nke na onye ọzọ naara ya osisi ịta ahụhụ ya, butetụrụ ya. (Luk 23:26; Jọn 19:17) Ọ bụrụ na a gụkọtara oge a malitere ịpịa ya ihe n’oge a kpọgburu ya, ọ pụtara na oge ga-agatụ tupu e jiri ntu kpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ. Nke a nwere ike ime ka oge otu onye kwuru na a kpọgburu Jizọs dị iche n’oge onye ọzọ kwuru, na-adabere ma ọ̀ bụ mgbe a malitere ịpịa ya ihe ma ọ̀ bụkwanụ mgbe e ji ntu kpọgide ya n’osisi ka onye ahụ chọpụtara ihe na-akụ.

Mgbe Jọn onyeozi dere Oziọma nke ya, ọtụtụ iri afọ agaala kemgbe ndị nke ọzọ dere nke ha. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ hụrụ ihe ha dere. Ọ bụ eziokwu na oge Jọn dere na ihe ahụ mere yiri ka ọ̀ dị iche na nke Mak, ma, nke a na-egosi na ihe Jọn mere abụghị ideghachi ihe Mak dere. Ọ bụ Chineke mere ka ma Jọn ma Mak dee ihe ha dere. Ọ bụ eziokwu na e nweghị ezigbo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ga-enyere anyị aka ịkọwa kpọmkwem ihe mere ihe Mak dere ji dị iche n’ihe Jọn dere, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ha dere mere eme.