Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Enwere m Nkwarụ Ugbu a, Ma M gaghị Adịgide Otú a Ruo Mgbe Ebighị Ebi!”

“Enwere m Nkwarụ Ugbu a, Ma M gaghị Adịgide Otú a Ruo Mgbe Ebighị Ebi!”

“Enwere m Nkwarụ Ugbu a, Ma M gaghị Adịgide Otú a Ruo Mgbe Ebighị Ebi!”

Dị ka Sara van der Monde si kọọ

Ndị mmadụ na-agwakarị m, sị: “Sara, ọnụ na-abụ gị ọchị ọchị mgbe ọ bụla. Olee ihe mere obi na-eji atọ gị ụtọ mgbe niile?” Ha jụọ m ụdị ihe a, m na-agwa ha na enwere m olileanya pụrụ iche. Olileanya m bụ na “enwere m nkwarụ ugbu a, ma m gaghị adịgide otú a ruo mgbe ebighị ebi!”

A MỤRỤ M na 1974 na Paris, nke dị na Frans. Ihe agachaghị otú o kwesịrị mgbe a na-amụ m, e mechakwara chọpụta na m nwere ọrịa ụbụrụ nke na-akpata ahụ́ mkpọnwụ. Ọrịa ahụ mere na anaghị m agacha ije nke ọma, ọ na-esikwara ndị ọzọ ike ịghọta ihe m na-ekwu ma m na-ekwu okwu. Akwụkwụ mechakwara dọwa m, ọrịa ọ bụla gafekwaranụ mụ eburu.

Mgbe m dị afọ abụọ, ezinụlọ anyị kwagara Melbọn nke dị n’Ọstrelia. Ka afọ abụọ gachara, papa m gbahapụrụ mụ na mama m gaa biri ebe ọzọ. Mgbe ahụ bụ mgbe mbụ ọ dịrị m ka Chineke ọ̀ nọ m nso. Mama m, onye bụ́ Onyeàmà Jehova, na-akpọ m aga ọmụmụ ihe, bụ́ ebe m nọ mụta na Chineke hụrụ m n’anya nakwa na ihe banyere m na-emetụ ya n’obi. Ihe ndị a m mụtara, na otú mama m si na-elekọta m, nakwa otú o si na-akasi m obi, mere ka obi ruo m ala, n’agbanyeghị na ihe adịghịziri anyị otú ọ di na mbụ.

Mama m kụzikwaara m otú e si ekpegara Jehova ekpere. Ikpe ekpere na-adịrị m nnọọ mfe karịa ịgwa ndị mmadụ okwu. M kpewe ekpere, anaghị m enyewe onwe m nsogbu ka m kpọpụtachaa mkpụrụ okwu niile m chọrọ ikwu, ma ama m ihe ndị ahụ m chọrọ ikwu n’ime obi m. N’agbanyeghị na ndị mmadụ anaghị aghọtacha ihe m na-ekwu ma m kwuwe okwu, obi dị m ụtọ na Jehova na-aghọta ihe niile m na-ekwu, ma m̀ kwuru ha otú siri ike nghọta ma m̀ kwuru ha n’ime obi m.—Ọma 65:2.

Otú M Si Merie Nsogbu Ndị Ọzọ Bịaara M

Mgbe m na-erula afọ ise, ọrịa ahụ na-akpọnwụ ahụ́ m na-arịa akala njọ nke meziri na e tinyere m okporo ígwè abụọ n’ụkwụ ka m nwee ike ịna-aga ije. M na-agazi ije ka onye na-amụ ije! Mgbe m na-erula afọ iri na otu, enweghịzi m ike ịga ije chaa chaa. O mechadịrị ruo na enweghịzi m ike ịga dinara n’àkwà ma ọ bụkwanụ rịtuo ma ọ bụrụ na ígwè eletrik na-ebuli ihe eburughị m bunye n’ígwè ndị ngwọrọ m nwere, bụ́ nke m na-eji aka anya.

Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ọnọdụ a m nọ na ya na-eme ka obi na-ajọ m njọ. Ma, ana m echeta ihe mụ na mama m na-ekwukarị, ya bụ: “Anọkwala na-echegbu onwe gị maka ihe ndị ị na-agaghị emeli. Mewe ndị nke ị ga-emeli.” Ihe a anyị na-ekwu emeela ka obi kaa m ime ihe ndị dị ka ịgba ịnyịnya, ịnya obere ụgbọ mmiri, iso ndị ọzọ akpapụ, na ịnyagharị ụgbọala n’ebe ụgbọala ndị ọzọ na-anaghị agbakarị. Ama m otú e si eji aka emepụta ihe ndị mara mma. M na-ese ihe, na-adụ ákwà, na-akpa blanket, na-akpanye ihe ndị mara mma n’ákwà, na-ejikwa ụrọ akpụ ihe.

N’ihi ọrịa a m na-arịa, ụfọdụ na-ekwu na mụ agaghị enwe ike ikpebi ife Chineke. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, otu onye nkụzi nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị gwara m ka m hapụ mama m gaa biri nke m ka ‘m gharazie’ iso ya na-ekpe okpukpe ọ na-ekpe. O kwudịrị na ya ga-enyere m aka chọtara m ụlọ. Ma, agwara m ya na o nweghị ihe ga-eme ka m kwụsị ikpe okpukpe ahụ m na-ekpe, nakwa na agaghị m ahapụ mama m gaa biri nke m ruo mgbe m dị njikere ibiri nke m.

O teghị aka mụ na onye nkụzi anyị ahụ kwuchara ihe ahụ, e mere m baptizim, mụ abụrụzie Onyeàmà Jehova. Mgbe afọ abụọ gachara, agara m chọrọ otu obere ụlọ biri. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a n’ihi na m ka nwere ndị na-enyere m aka n’ihe ụfọdụ n’agbanyeghị na ebirila m nke m.

Di M Na-atụghị Anya Ya Abịara M

Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, e nweela ihe ndị ọzọ chọrọ imebi mmekọrịta mụ na Jehova. Otu ụbọchị, e nwere ihe tụrụ m n’anya merenụ. Otu nwa klas anyị nke nwekwara nkwarụ bịakwutere m ma gwa m na ya chọrọ ịlụ m. Ihe ahụ ọ gwara m mere ka isi buo m ná mbụ. Otú ahụ o si agụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ agụụ ka ha nweta onye ga-alụ ha ka o sikwa agụ mụnwa. Ma, na anyị abụọ nwechara nkwarụ apụtaghị na ihe ga-adabara anyị ma anyị lụọ. A sịdị kwuwe, nwa okorobịa ahụ abụghị Onyeàmà Jehova. Ihe anyị abụọ kweere, ihe ndị anyị na-eme ugbu a, na ihe ndị anyị chọrọ ime n’ọdịnihu abụghị otu. Oleezikwanụ otú ihe ga-esi adabara anyị abụọ ma anyị lụọ? Ihe ọzọ bụ na ekpebisiri m ike na m ga-emerịrị ihe doro anya Chineke kwuru, nke bụ́ ka anyị lụọ naanị onye kweere ihe anyị kweere. (1 Kọr. 7:39) N’ihi ihe a niile, emedara m obi gwa nwa okorobịa ahụ na ihe ahụ ọ gwara m agaghị adaba.

Ruokwa taa, anaghị m akwa mmakwaara maka ihe ahụ m mere. Obi siri m ike na m ga-enwe obi ụtọ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. (Ọma 145:16; 2 Pita 3:13) Ma, ka ọ dịgodị, ekpebiela m ịnọgide na-efe Jehova ma werekwa ụwa m otú m si hụ ya kama ịna-echegbu onwe m.

Ana m atụ anya ụbọchị m ga-esi n’ígwè ndị ngwọrọ m malie elu ma jiri ụkwụ m abụọ na-awụ ọsọ. Mgbe ahụ, m ga-eji obi ụtọ kwuo, sị: “Enweburu m nkwarụ, ma ahụ́ m niile akwụrụla chịm ugbu a, m ga-adịkwa otú a ruo mgbe ebighị ebi!”