Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ N’obi Jeere Jehova ozi

Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ N’obi Jeere Jehova ozi

Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ N’obi Jeere Jehova ozi

JIHU ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi. O ji obi ike na ume ya dum jeere Jehova ozi n’atụghị egwu, n’eleghị anya n’azụ, n’egbughịkwa oge. Jihu kpara àgwà anyị kwesịrị ịna-akpa.

E nyere Jihu ọrụ ọ ga-arụ mgbe ihe ọjọọ na-eme ná mba Izrel. Ajọ nwaanyị bụ́ Jezibel, bụ́ nwunye Ehab nwụrụla anwụ, bụrụkwa nne Jehoram, bụ́ eze na-achị mgbe ahụ, na-akpa ajọ ike ná mba ahụ. O mere ka ụmụ Izrel hapụ Jehova fewe Bel, gbuo ndị amụma Chineke, jirikwa ‘iko ọ na-akwa’ na ‘afa ọ na-agba’ mee ka ụmụ Izrel mewe omume ọjọọ. (2 Eze 9:22; 1 Eze 18:4, 13) Jehova kwuru na a ga-ekpochapụ ezinụlọ Ehab, tinyere Jehoram na Jezibel. Ọ bụ Jihu ga-edu ndị ga-eme nke a.

Mgbe mbụ Akwụkwọ Nsọ kwuru okwu Jihu bụ ebe ya na ndị isi ndị agha ibe ya nọ ọdụ n’oge ụmụ Izrel na-alụso ndị Siria agha na Remọt-gilied. Ọkwá Jihu gbagotere ná ndị agha, ma ọ bụrụdị na ọ bụghị ya bụ ọchịagha ndị agha Izrel. Ịlaịsha zigara otu n’ime ụmụ ndị amụma ka ọ gaa tee Jihu mmanụ ka ọ bụrụ eze nakwa ka ọ gwa ya ka o gbuo nwoke ọ bụla a mụrụ n’ezinụlọ Ehab, bụ́ ndị kwụsịrịla ife Jehova.—2 Eze 8:28; 9:1-10.

Mgbe ndị agha ha na Jihu nọ jụrụ ya ihe mere e ji bịakwute ya, ọ chọghị ịgwa ha. Ma, mgbe ha nyewere ya nsogbu, ọ gwara ha, ya na ha gbakwara izu igbu Jehoram. (2 Eze 9:11-14) Ọ ga-abụ na e nweela ndị na-agba iwu ezinụlọ Ehab na-eti ụkwụ nakwa ndị obi na-adịghị mma n’ihi otú Jezibel si eme. Nke ọ bụla ọ bụ, Jihu gbasiri mbọ ike ka ọ chọta otú kacha mma ọ ga-esi rụọ ọrụ e nyere ya.

E nwere mgbe e merụrụ Eze Jehoram ahụ́ n’ọgbọ agha, ya agawa Jezril ka ọ nọrọ ebe ahụ gbakee. Jihu ma na ihe ga-eme ka atụmatụ ya gaa nke ọma bụ ma ọ bụrụ na e nweghị onye gara Jezril kọọ ihe merenụ. Jihu kwuru, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla gbapụ n’obodo a ịga Jezril kọọ ihe merenụ.” (2 Eze 9:14, 15) Ikekwe ọ na-atụ anya na e nwere ike inwe ndị agha na-adụnyere Jehoram úkwù bụ́ ndị nwere ike ịlụso ya ọgụ. Jihu chọrọ ịhụ na o nweghị ihe ga-egbochi ha ime ihe ha chọrọ ime.

ỊGBA ỤGBỌ ỊNYỊNYA ARA ARA!

Ebe Jihu chọrọ ịbịa ha ná mberede, o ji ụgbọ ịnyịnya gbaa kilomita iri asaa na abụọ, site na Remọt-gilied ruo Jezril. Mgbe o rutewere, onye nche nọ n’ụlọ nche hụrụ “ìgwè ndị ikom na-awụ ọsọ, bụ́ ndị so Jihu na-abịa.” (2 Eze 9:17) Eleghị anya, Jihu kpọ ọtụtụ ndị agha iji hụ na o nweghị ihe ga-egbochi ya imezu ihe o bu n’obi.

Mgbe otu n’ime ndị nche chọpụtara na Jihu, bụ́ nwoke nwere obi ike, nọ n’otu n’ime ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ, o tiri mkpu, sị: “Ọ na-agba ịnyịnya ara ara.” (2 Eze 9:20) Ọ bụrụgodị na e jibu ịgbasi ịnyịnya ike mara Jihu, o doro anya na ọ ga na-agba ara ara na nke ugbu a n’ihi ihe ọ na-aga ime.

Jihu atụpụrụghị mmadụ abụọ e ziteere ya ọnụ. Ọ gbakwuuru Eze Jehoram na Ehazaya, bụ́ eze Juda, onye ya na Jehoram na-emekọ ihe, ebe onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ụgbọ ịnyịnya nke ya. Jehoram jụrụ Jihu sị: “Jihu, udo ọ̀ dịkwa?” Ma, Jihu ji iwe zaa ya, sị: “Olee otú udo ga-esi dị ebe ọ bụ na nne gị Jezibel na-akwa iko ma na-agba afa nke ukwuu?” Ihe a Jihu zara menyere ya ụjọ, ya atụgharịa ka ọ gbalaga. Ma, ọ gbalahụlighị Jihu. Jihu mịịrị ụta ya gbaa Jehoram n’azụ, akụ́ ụta ahụ esi ya n’obi mapụta. Jehoram dara n’ụgbọ ịnyịnya ya nwụọ. N’agbanyeghị na Ehazaya jisiri ike gbalaga, Jihu mechara nweta ya ma hụ na e gburu ya.—2 Eze 9:22-24, 27.

Onye ọzọ a ga-egbukwa n’ezinụlọ Ehab bụ ajọ eze nwaanyị bụ́ Jezibel. Jihu kwutere ya mgbe ọ kpọrọ ya “onye a a bụrụ ọnụ.” Mgbe Jihu batara Jezril, ọ hụrụ Jezibel ka o si na windo dị n’ụlọ elu nke dị n’obí eze na-eleda anya n’ala. Jihu nyere ndị na-eje ozi n’obí eze iwu ozugbo ka ha si na windo ahụ tụdata ya. O jizi ịnyịnya ya rịa onye a merụrụla Izrel niile elu. Mgbe Jihu mechara nke a, o bibiri ọtụtụ ndị ọzọ si n’ezinụlọ eze ọjọọ bụ́ Ehab.—2 Eze 9:30-34; 10:1-14.

Ọ bụ eziokwu na ime ihe ike adịghị mma, anyị kwesịrị icheta na n’oge ahụ, Jehova na-eji ndị ohu ya emezu ihe o kpere n’ikpe. Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke mere ka Ehazaya daa n’ihi ọbịbịa ọ bịara ịhụ Jehoram; mgbe ọ bịara, o so Jehoram gaa izute Jihu nwa nwa Nimshaị, bụ́ onye Jehova tere mmanụ ka o bipụ ụlọ Ehab.” (2 Ihe 22:7) Mgbe Jihu si n’ụgbọ ịnyịnya Jehoram tụpụ ozu ya, o chetara na nke a mezuru nkwa Jehova kwere na ya ga-ata Ehab ahụhụ maka ogbugbu e gburu Nebọt. Ihe ọzọkwa bụ na e nyere Jihu iwu ka ọ ‘bọọ ọbọ ọbara ndị ohu Chineke’ nke Jezibel kwafuru.—2 Eze 9:7, 25, 26; 1 Eze 21:17-19.

Taa, ọ dịghị ohu Jehova na-alụso ndị na-emegide ndị na-efe Chineke ọgụ. Chineke sịrị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ.” (Hib. 10:30) Ma e nwee ndị chọrọ imerụ ọgbakọ, ndị okenye ga-eji obi ike debe ọgbakọ ọcha dị ka Jihu mere. (1 Kọr. 5:9-13) Ndị niile nọkwa n’ọgbakọ kwesịrị ikpebisi ike na ha na ndị a chụrụ n’ọgbakọ agaghị na-emekọ ihe.—2 Jọn 9-11.

JIHU ACHỌGHỊ KA A MAA JEHOVA AKA

Ihe Jihu gwara Jehọnadab kwesịrị ntụkwasị obi gosiri ihe o bu n’obi rụọ ọrụ e nyere ya. Ọ sịrị: “Soro m gaa ka ị hụ otú m ga-esi mee ka a ghara ịma Jehova aka.” Jehọnadab kweere, banye n’ụgbọ ịnyịnya Jihu, sorokwa ya gaa Sameria. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jihu “ji aghụghọ mee ihe, ka o wee bibie ndị na-efe Bel.”—2 Eze 10:15-17, 19.

Jihu mara ọkwa na ya chọrọ ịchụrụ Bel “nnukwu àjà.” (2 Eze 10:18, 19) Otu onye ọkà mmụta kwuru na “Jihu kwuru okwu ga-eme ka a ghọta ihe dị iche n’ihe o bu n’obi.” Ọ bụ eziokwu na okwu a “pụtara ‘ịchụ àjà’ nkịtị, ọ pụtakwara ‘igbu’ ndị na-anaghịzi efe Chineke.” Jihu mere ka ndị niile na-efe Bel zukọọ n’ụlọ arụsị Bel, meekwa ka ha yiri uwe a ga-eji amata ha. Ọ chọghị ka e nwee onye na-efe Bel nke na-agaghị abịa. ‘Ngwa ngwa a chụsịrị àjà nsure ọkụ ahụ,’ Jihu gwara ndị ikom iri asatọ ji ngwa agha ka ha gbuo ndị niile na-efe Bel. O nyeziri iwu ka a kụtuo ụlọ Bel ma jiri ebe a rụrụ ya mere ebe ịga mposi, ka a ghara inwe ike ịnọ ya fee ofufe ọzọ.—2 Eze 10:20-27.

Ọ bụ eziokwu na Jihu kwafuru ọbara hiri nne, ma, Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ nwoke nwere obi ike, onye napụtara ndị Izrel n’aka ajọ nwaanyị bụ́ Jezibel na ezinụlọ ya. Tupu onye ndú ọ bụla e nwere n’Izrel emelie ihe a o mere, ọ ga-akatarịrị obi, nwee obi ike, na-anụkwa ọkụ n’obi. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl sịrị: “Nke a bụ ọrụ tara akpụ nke e ji ike na nlezianya rụọ nke ọma. Ikekwe, ọ bụrụ na e ji anya ụra rụọ ya, a gaaraghị ekpochapụ ofufe Bel n’Izrel.”

O doro anya na i kweere na ụfọdụ ọrụ Ndị Kraịst nwere taa na-achọ ka ha jiri ụdị obi Jihu ji rụọ ọrụ e nyere ya rụọ nke ha. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a nwaa anyị ka anyị mee ihe Jehova sị anyị emela? Anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa, jiri obi ike jụ ime ihe ahụ. O nweghị ihe anyị ga-ekwe ka o mee ka anyị kwụsị ife Chineke n’ihi na anyị achọghị ka a maa Jehova aka.

HỤ NA Ị NA-EJE IJE N’IWU JEHOVA

Ihe mere ná ngwụcha akụkọ a na-akụziri anyị ezigbo ihe. Jihu ‘ahapụghị ụmụ ehi ọlaedo ndị dị na Betel na Dan.’ (2 Eze 10:29) Olee otú onye a ji ịnụ ọkụ n’obi kpochapụ ndị na-anaghị efe Jehova si malitezie ikpere arụsị?

O nwere ike ịbụ na Jihu kweere na alaeze Izrel kwesịrị inwe okpukpe nke ya, alaeze Juda enweekwa nke ya, ka alaeze nke ọ bụla nwee ike ịnọrọ onwe ya. Iji nwee ike mezuo nke a, o mere ụdị ihe ndị eze bu ya ụzọ mere, ya bụ, ịhapụ ndị mmadụ ka ha na-efe nwa ehi. Nke a gosiri na o nweghịzi okwukwe na Jehova, bụ́ onye mere ya eze.

Jehova jara Jihu mma n’ihi na ‘o mere nke ọma n’ime ihe ziri ezi n’anya Chineke.’ Ma, Jihu “elezighị anya were obi ya dum jee ije n’iwu Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (2 Eze 10:30, 31) Nke a nwere ike iju gị anya ma wute gị ma ọ bụrụ na i chechaa ihe ọma niile ahụ Jihu mere. Ma, nke a nwere ihe ọ na-akụziri anyị. Anyị ekwesịtụghị iji adịm ná mma anyị na Jehova gwurie egwu. Anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-eme uche Chineke mgbe niile site n’ịgụ Okwu ya, ịtụgharị uche na ya, na isi n’ala ala obi anyị na-ekpeku Nna anyị nke eluigwe ekpere. Ya mere, ka anyị lezie anya hụ na anyị ji obi anyị dum na-eje ije n’iwu Jehova.—1 Kọr. 10:12.

[Igbe dị na peeji nke 4]

Ebe Ọzọ E Kwuru Banyere Jihu Ma E Wezụga na Baịbụl

Ọtụtụ ndị na-agba ihe dị na Baịbụl ụkwụ ekwuola na ha echeghị na ndị a kpọrọ aha ha na Baịbụl biri ndụ n’ụwa a n’eziokwu. N’ihi ya, è nwere ebe ọzọ e kwuru banyere Jihu ma e wezụga na Baịbụl?

Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a hụla ihe odide atọ si Asiria oge ochie, bụ́ ndị e dere aha Eze Izrel a na ha. N’otu n’ime ha, e sere ebe onye nwere ike ịbụ Jihu ma ọ bụ otu n’ime ndị o zigara ka ha nọchite anya ya na-akpọrọ Eze Asiria bụ́ Shalmaniza nke Atọ isiala, na-enyekwa ya onyinye. Ihe e dere n’akụkụ ihe ahụ e sere ese bụ: “Onyinye Jihu (Ia-ú-a), nwa Ọmraị (Hu-um-ri); o nyere m ọlaọcha, ọlaedo, efere saplu ọlaedo, iko ọlaedo e ji etinye okooko osisi, bụ́ nke a kapịrị okpuru ya ọnụ, ọtụtụ iko ọlaedo e ji aṅụ mmiri na bọket ndị e ji ọlaedo mee, ite, mkpara eze, (na) puruhtu e ji osisi mee [Anyị amaghị ihe okwu a bụ́ puruhtu pụtara].” Jihu abụghị kpọmkwem “nwa Ọmraị.” Ma a na-akpọkarị ndị eze chịrị Izrel ụmụ Ọmraị. O nwere ike ịbụ n’ihi na Ọmraị bụ eze a ma ama chịrị Izrel nakwa na ọ bụ ya wuru isi obodo Izrel bụ́ Sameria.

Ma, e nweghị ihe ọzọ kwadoro ihe a Eze Asiria kwuru, nke bụ́ na Jihu bịara kelee ya ma nye ya onyinye. Ma, ọ kpọrọ Jihu aha ugboro atọ n’ihe ahụ e dere n’ebe e sere Shalmaniza, nakwa n’ihe ndị e dere gbasara ndị chịrị mba Asiria. Ihe ndị a niile na-eme ka obi sikwuo anyị ike na onye a a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl biri ndụ n’ụwa a n’eziokwu.