Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udo

Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udo

Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udo

“Na-eje ije, ọ bụghị dị ka anụ ahụ́ si chọọ, kama dị ka mmụọ nsọ si chọọ.”—ROM 8:4.

1, 2. (a) Olee ezigbo nsogbu e nwerela n’ihi na ọkwọ ụgbọala mewere ihe ndị dọpụrụ ya uche? (b) Olee nsogbu mmadụ nwere ike inwe ma o nwee ihe ndị dọpụrụ ya uche n’ozi ọ na-ejere Jehova?

OTU onye ọrụ gọọmenti Amerịka okwu ime nje dị n’aka, sịrị: “Kwa afọ, o yiri ka à na-enwekwu ndị ọkwọ ụgbọala ihe na-adọpụkarị uche ka ha na-akwọ ụgbọala.” Ekwe ntị so n’ihe na-adọpụ ndị ọkwọ ụgbọala uche nke na ha anaghị etinye uche n’ihe ha kwesịrị ịna-eme, ya bụ, ịkwọrọ ụgbọala ha na-aga. Ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ maka ihe mberede okporo ụzọ ha nwere ma ọ bụ ndị nke ha gaara enwe kwuru na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ibe ha ha na ekwe ntị na-alụ n’oge ahụ kpatara ya. Onye na-akwọ ụgbọala ma na-eme ihe ndị ọzọ n’otu oge ahụ nwere ike iche na ọ ga-abara ya uru, ma nke ahụ nwere ike imebi ihe.

2 Otú ahụ ka ọ dị ná mmekọrịta anyị na Jehova. Otú ahụ ọ na-esi ike ka ọkwọ ụgbọala nke nwere ihe na-adọpụ ya uche hụ mgbe ihe mberede na-aga ime, ka ọ ga-esikwa ike ka onye nwere ihe na-adọpụ ya uche n’ife Chineke ghara ịdaba ná nsogbu. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ịna-eso ụzọ Kraịst otú kwesịrị ekwesị, kwụsịkwa itinye uche n’ihe ndị gbasara ozi Jehova, ụgbọ okwukwe anyị nwere ike ikpu. (1 Tim. 1:18, 19) Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya nọ na Rom aka ná ntị banyere nke a. Ọ gwara ha, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ, ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” (Rom 8:6) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara? Olee otú anyị nwere ike isi ghara “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́” ma ‘na-atụkwasị uche na mmụọ nsọ’?

Ha “Enweghị Amamikpe Ọ Bụla”

3, 4. (a) Olee ihe Pọl dere na ọ ghọọrọ ya ọgụ na mgba? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịma otú ihe si gaara Pọl?

3 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o dere banyere agha anụ ahụ́ ya na uche ya lụrụ. (Gụọ Ndị Rom 7:21-23.) Ihe Pọl na-ekwu abụghị na ya emeela ike ya dum iji mee ihe ziri ezi ma o kweghị ya, ọ naghịkwanụ emetere onwe ya ebere dị ka à ga-asị na mmehie na-anyịgbu ya nke na ọ maghịzi ihe ọ ga-eme. A sị kwuwe, ọ bụ nwanna tozuru okè, onye e tere mmanụ, onye a họọrọ ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 1:1; 11:13) Gịnịzi mere Pọl ji dee banyere otú ime ihe ziri ezi si ghọọrọ ya ọgụ na mgba?

4 Pọl ji obi ya dum kweta na a hapụ naanị ya, ya agaghị enwe ike ime uche Chineke otú ya si chọọ. Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ sịrị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Rom 3:23) Ebe Pọl bụ nwa Adam, o zughịkwa okè, ike mmehie na-akpa ruru ya ahụ́. Anyị na ya bụ otu n’ihi na o nweghị onye n’ime anyị zuru okè, ime ihe ziri ezi kwa ụbọchị na-abụkwara anyị ọgụ na mgba. E wezụgakwa nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike ịdọpụ anyị uche ma mee ka anyị si ‘n’okporo ụzọ dị mkpagide, nke na-eduba ná ndụ,’ tinye isi ebe ọzọ. (Mat. 7:14) Ma, Pọl nwere onye nwere ike ịnapụta ya, otú ahụkwa ka ọ dị anyị.

5. Olee otú e si nyere Pọl aka, ya enwerekwa onwe ya?

5 Pọl dere, sị: “Ònye ga-anapụta m . . . ? Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Rom 7:24, 25) Ọ gwaziri Ndị Kraịst e tere mmanụ okwu, bụ́ “ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.” (Gụọ Ndị Rom 8:1, 2.) Jehova ji mmụọ nsọ doo ha dị ka ụmụ ma kpọọ ha ka ha “bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe.” (Rom 8:14-17) Ma mmụọ nsọ ma okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Kraịst na-enyere ha aka imeri n’agha Pọl kwuru okwu ya ma si otú ahụ bụrụ ndị ‘na-enweghị amamikpe ọ bụla.’ E mewo ka ha si “n’iwu nke mmehie na nke ọnwụ” nwere onwe ha.

6. Gịnị mere ndị ohu Chineke niile kwesịrị iji ghọta ihe Pọl kwuru nke ọma?

6 N’agbanyeghị na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Pọl gwara okwu, ihe o kwuru banyere mmụọ nsọ na àjà mgbapụta Kraịst nwere ike ịbara ndị ohu Jehova niile uru n’agbanyeghị olileanya ha nwere. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Pọl si n’ike mmụọ nsọ nye ndụmọdụ ahụ, ọ dị oké mkpa ka ndị ohu Chineke niile ghọta ihe Pọl dere ma gbalịa ime ya, ya abaakwara ha uru.

Otú Chineke Si ‘Maa Mmehie Dị n’Anụ Ahụ́ Ikpe’

7, 8. (a) Olee otú o si bụrụ na Iwu ahụ “sitere n’anụ ahụ́ ghara ịdị ike”? (b) Olee ihe Chineke ji mmụọ nsọ na ihe mgbapụta ahụ mee?

7 N’isi asaa nke akwụkwọ Ndị Rom, Pọl kwetara na mmehie na ezughị okè na-akpa ike. N’isi asatọ, o kwuru banyere ike mmụọ nsọ na-akpa. Ọ kọwara otú mmụọ nsọ nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka n’agha ha na-alụso ike mmehie na-akpa iji nwee ike na-eme ihe bụ́ uche Jehova, ha na ya adịrịkwa ná mma. Pọl kwuru na Chineke ejirila mmụọ nsọ na àjà mgbapụta nke Ọkpara ya chụrụ mee ihe Iwu Mozis na-apụghị ime.

8 Iwu Mozis, bụ́ nke e dere ọtụtụ iwu mmadụ ga-edebe na ya, mara ndị mmehie ikpe. Ihe ọzọ bụ na ndị nchụàjà na-eje ozi mgbe e nwere Iwu ahụ ezughị okè, ha agaghịkwa enwe ike ịchụ àjà ga-ezu iji kpuchie mmehie. N’ihi ya, Iwu ahụ “sitere n’anụ ahụ́ ghara ịdị ike.” Ma, Chineke “mara mmehie dị n’anụ ahụ́ ikpe site n’izite Ọkpara nke ya ka ọ dịrị n’ụdị anụ ahụ́ nke na-emehie emehie” ma nye ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, si otú ahụ mee “ihe Iwu ahụ na-apụghị ime.” N’ihi ya, a ga-agụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ná ndị ezi omume ma ha nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. A gbara ha ume ka ha “na-eje ije, ọ bụghị dị ka anụ ahụ́ si chọọ, kama dị ka mmụọ nsọ si chọọ.” (Gụọ Ndị Rom 8:3, 4.) N’eziokwu, ha ga na-eme otú ahụ ruo mgbe ha jechara ozi ha na-eje n’ụwa iji nwee ike inweta “okpueze bụ́ ndụ.”—Mkpu. 2:10.

9. Gịnị ka okwu bụ́ “iwu” nke e dere ná Ndị Rom 8:2 pụtara?

9 Iwu ndị ọzọ Pọl kpọrọ aha ma e wezụga ‘Iwu Mozis’ bụ “iwu nke mmụọ nsọ” na ‘iwu nke mmehie na nke ọnwụ.’ (Rom 8:2) Gịnị ka iwu ndị a bụ? “Iwu” ndị ọ kpọrọ aha n’amaokwu a abụghị iwu ndị dị ka ndị ahụ e dere n’Iwu Mozis. Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik a kpọrọ “iwu” n’amaokwu a pụtara ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme nke na-achịkwa ha otú iwu si achịkwa onye na-edebe ya. O nwekwara ike ịpụta otú mmadụ họọrọ isi na-ebi ndụ.

10. Olee otú iwu nke mmehie na nke ọnwụ si achị anyị?

10 Pọl onyeozi dere, sị: “Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Ebe anyị bụ ụmụ Adam, iwu nke mmehie na nke ọnwụ na-achị anyị niile. Ahụ́ anyị na-ezughị okè na-agwa anyị mgbe niile ka anyị mee ihe na-adịghị mma n’anya Chineke, bụ́kwanụ ihe ga-ebutere anyị ọnwụ. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galeshia, ọ kpọrọ àgwà ndị dị otú ahụ “ọrụ nke anụ ahụ́.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” (Gal. 5:19-21) Ndị dị otú ahụ na ndị na-eje ije dị ka anụ ahụ́ si chọọ bụ otu. (Rom 8:4) Ihe ha na-eme bụ ihe ahụ́ ha na-ezughị okè gwara ha ka ha mee. Ma, ọ̀ bụ naanị ndị na-akwa iko, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị na-eme mgbaasị, na ndị na-eme mmehie ndị ọzọ dị oké njọ na-eje ije n’anụ ahụ́? Mba. Ihe ndị so n’ọrụ nke anụ ahụ́ bụ ihe mmadụ ụfọdụ nwere ike ịsị na ọ bụ adịghị ike anụ ahụ́, dị ka ekworo, iwe ọkụ, esemokwu, na anyaụfụ. Ònye ga-asị na ya akwụsịchaala ije ije dị ka anụ ahụ́ si chọọ?

11, 12. Gịnị ka Jehova mere iji nyere anyị aka ka iwu nke mmehie na nke ọnwụ hapụ ịna-achị anyị, oleekwa ihe anyị ga-eme ka Chineke meere anyị amara?

11 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova emeela ka o kwe anyị omume ịhụ na iwu nke mmehie na nke ọnwụ anaghị achị anyị! Jizọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ọ bụrụ na anyị ana-ebi ndụ na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, nke ahụ nwere ike ime ka a ghara ịma anyị ikpe n’ihi mmehie anyị ketara eketa. (Jọn 3:16-18) Anyị nweziri ike ikwu ihe Pọl kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!”

12 E nwere ike iji otú ọ dị anyị tụnyere otú ọ dị onye a gwọrọ ọrịa nke gaara egbu ya. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ka ọrịa ahụ haa ya aka kpamkpam, ọ ga-emerịrị ihe dọkịta gwara ya mee. Ọ bụ eziokwu na iwu nke mmehie na nke ọnwụ nwere ike ịha anyị aka ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, anyị ka bụkwa ndị na-ezughị okè na ndị mmehie. O nwere ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị na Chineke nwee ike ịna-adị n’ezigbo mma, ya emeekwara anyị amara ma gọzie anyị. Ka anyị wee nwee ike ime “ihe ziri ezi nke Iwu ahụ chọrọ ka e mee,” Pọl kwuru na anyị ga na-eje ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ.

Olee Otú Anyị Ga-esi Na-eje Ije na Mmụọ Nsọ?

13. Gịnị ka ije ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ pụtara?

13 E nwee ebe anyị ji ụkwụ na-aga, anyị na-agagide ruo mgbe anyị ruru ebe ahụ. N’otu aka ahụ, ije ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ pụtara ịna-agbalịsi ike ka anyị na Chineke na-adị ná mma, ọ pụtaghị na anyị agaghị emehie ihe. (1 Tim. 4:15) Kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-eje ije, ma ọ bụ na-ebi ndụ, dị ka mmụọ nsọ si chọọ. ‘Ịna-eje ije site na mmụọ nsọ’ na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma.—Gal. 5:16.

14. Olee ihe e ji ama ndị “na-eme ihe dị ka anụ ahụ́ si chọọ”?

14 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, ihe ọzọ o kwuru bụ ụdị mmadụ abụọ uche ha gbara iche iche. (Gụọ Ndị Rom 8:5.) Anụ ahụ́ a kpọrọ aha n’amaokwu a abụghị anụ ahụ́ nkịtị. Mgbe ụfọdụ na Baịbụl, okwu bụ́ “anụ ahụ́” pụtara ihe ọjọọ anụ ahụ́ anyị nke na-eme mmehie na-achọ ka anyị na-eme. Ọ bụ nke a na-akpata agha na-adị n’etiti anụ ahụ́ na uche bụ́ nke Pọl kwuru okwu ya ná mmalite. Ma, “ndị na-eme ihe dị ka anụ ahụ́ si chọọ” adịghị ka Pọl n’ihi na ha anaghịdị alụso ọchịchọ a ọgụ. Kama ichebara ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme echiche na ịnabata aka ọ na-enyere ha, ha chọrọ ‘ịna-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́.’ Ihe na-abụkarị mkpa ha bụ ime ihe ọ bụla gụrụ ahụ́ ha agụụ. Ma, ndị chọrọ ‘ịna-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ’ na-atụkwasị uche ha “n’ihe mmụọ nsọ,” ya bụ, n’ihe ndị Chineke ji enyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma na n’ihe ndị gbasara ofufe Jehova.

15, 16. (a) Olee otú mmadụ ịtụkwasị uche n’ihe si gbasa otú onye ahụ ga na-esi eche echiche? (b) Olee ebe ndị mmadụ tụkwasịrị uche ha taa?

15 Gụọ Ndị Rom 8:6. Ihe mmadụ na-emekarị, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ, bụ ihe ọ tụkwasịrị uche na ya. Ihe na-agụ ndị na-atụkwasịkarị uche ha n’anụ ahụ́ bụ ịna-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ mgbe niile. Ihe ndị ha na-echekarị, ihe ndị na-amasịkarị ha, na ihe ndị ha na-ahụkarị n’anya bụ ihe anụ ahụ́.

16 Olee ihe ndị e ji mara ọtụtụ mmadụ taa? Jọn onyeozi dere, sị: “Ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ, esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.” (1 Jọn 2:16) Ihe ndị so n’ọchịchọ ndị ahụ bụ ịkwa iko aghara aghara, ịbụ onye a ma ama, na inwe akụnụba. N’akwụkwọ dị iche iche, magazin, akwụkwọ akụkọ, fim, Ịntanet, na n’ihe ndị a na-egosi na tiivi, a na-ahụ ihe ndị dị otú a, bụ́ ndị e wepụtara karịchaa, n’ihi na ọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-atụkwasị uche na ha na ihe ndị ha chọrọ n’eziokwu. Ma, “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ,” ya bụ, ọnwụ ime mmụọ ugbu a na nke anụ ahụ́ n’oge na-adịghị anya. N’ihi gịnị? “N’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ịbụ onye iro Chineke, n’ihi na ọ dịghị n’okpuru iwu Chineke, n’eziokwu, ọ pụghịkwa ịdị. Ya mere, ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ apụghị ime ihe dị Chineke ezi mma.”—Rom 8:7, 8.

17, 18. Olee otú anyị ga-esi na-atụkwasị uche na mmụọ nsọ, gịnịkwa ka anyị ga-enweta ma anyị mee otú ahụ?

17 Ma, “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo,” ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu nakwa ahụ́ iru ala na udo nke Chineke na-enye ugbu a. Olee otú anyị ga-esi ‘tụkwasị uche na mmụọ nsọ’? Anyị ga-eme ya ma ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasị uche anyị n’ihe mmụọ nsọ, kwe ka ime ihe dị Chineke mma na-agụ anyị agụụ, na-enwekwa àgwà ndị e ji ama ndị na-efe Chineke. Anyị ga-esi otú ahụ doo uche anyị “n’okpuru iwu Chineke,” uche anyị na uche ya abụrụkwa otu. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị agaghị echewe ma ànyị ga-eme ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Anyị ga-achọ ime nke ọma, ya bụ, ime dị ka mmụọ nsọ si chọọ.

18 N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị na-atụkwasị uche n’ihe mmụọ nsọ. Anyị ga-eme nke a ma anyị ‘kee ájị̀ n’ume maka ọrụ,’ na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke nwee mmekọrịta chiri anya, ihe ndị dị ka, ikpechi ekpere anya, ịgụ Baịbụl na ịmụ ya amụ, ịga ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma. (1 Pita 1:13) Kama ikwe ka ihe anụ ahụ́ dọpụ anyị uche, ka anyị tụkwasị uche n’ihe mmụọ nsọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga na-eje ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ. Anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi ma anyị mee otú ahụ, n’ihi na ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.—Gal. 6:7, 8.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Gịnị bụ “ihe Iwu ahụ na-apụghị ime,” oleekwa otú Chineke si mee ihe ahụ?

• Gịnị bụ ‘iwu nke mmehie na nke ọnwụ,’ oleekwa otú anyị nwere ike isi nwere onwe anyị ka ọ ghara ịchị anyị?

• Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji ‘tụkwasị uche na mmụọ nsọ’?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Ị̀ na-eje ije dị ka anụ ahụ́ si chọọ ka ọ̀ bụ dị ka mmụọ nsọ si chọọ?