“Ndị Bi Nwa Oge” N’ụwa Ọjọọ
“Ndị Bi Nwa Oge” N’ụwa Ọjọọ
‘N’okwukwe, ndị a niile kwusara n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.’—HIB. 11:13.
1. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere otú ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ga-esi na-ele ụwa a anya?
JIZỌS kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha nọ n’ụwa.” Ma, o kwukwara, sị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:11, 14) Jizọs si otú a mee ka o doo anya otú ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ga-esi na-ele “usoro ihe a” Setan bụ chi ya anya. (2 Kọr. 4:4) N’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ọjọọ a, ha agaghị abụ nke ya. Ha bụ “ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge” n’ụwa a.—1 Pita 2:11.
Ha Biri Ndụ Ka “Ndị Bi Nwa Oge”
2, 3. Olee ihe mere e nwere ike iji kwuo na Inọk, Noa, na Ebreham na Sera biri ka “ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge”?
2 Malite n’oge ochie, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na-adị iche n’ụwa ọjọọ ha bi na ya. Tupu Iju Mmiri ahụ, Inọk na Noa “soro ezi Chineke na-eje ije.” (Jen. 5:22-24; 6:9) Ha abụọ ji obi ike kwusaa ikpe Jehova mara ajọ ụwa Setan n’oge ha. (Gụọ 2 Pita 2:5; Jud 14, 15.) Ọ bụ n’ihi na ha soro Chineke jee ije n’ụwa ọjọọ e nwere n’oge ha mere e ji kwuo na Inọk “mere ihe dị Chineke ezi mma” Noa abụrụ “onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ.”—Hib. 11:5; Jen. 6:9.
3 Ebreham na Sera mere ihe Chineke gwara ha ma hapụ ihe ọma niile ha nwere n’Ọọ, nke dị n’ala ndị Kaldia, ma kwere ịna-akwagharị ná mba na-abụghị nke ha. (Jen. 11:27, 28; 12:1) Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe a kpọrọ Ebreham, o ji okwukwe rube isi wee jee n’ebe a kara aka na ọ ga-enweta dị ka ihe nketa; o wee pụọ, ọ bụ ezie na ọ maghị ebe ọ na-eje. O ji okwukwe biri dị ka ọbịa n’ala nkwa ahụ dị ka à ga-asị na o bi n’ala ọzọ, biekwa n’ụlọikwuu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ́ ndị ha na ya na-eketa otu nkwa ahụ.” (Hib. 11:8, 9) Pọl kwuru banyere ndị ohu Jehova ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe, ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya ma nabata ha ma kwusaa n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.”—Hib. 11:13.
Ịdọ Aka ná Ntị E Nyere Ụmụ Izrel
4. Olee ịdọ aka ná ntị e nyere ụmụ Izrel tupu ha ebiri n’ala ha?
4 Ụmụ Ebreham, bụ́ ndị Izrel, bịara hie nne ma ghọọ mba nke nwere iwu na-achị ha, nweekwa ala. (Jen. 48:4; Diut. 6:1) Ma, ụmụ Izrel ekwesịghị ichefu na Onye nwe ala ha bi bụ Jehova. (Lev. 25:23) Ha dị ka ndị bi n’ụlọ mmadụ, bụ́ ndị kwesịrị ime ihe Onye nwe ụlọ kwuru. Ha kwesịkwara icheta na “ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ”; ha ekwesịghị ikwe ka ihe onwunwe mee ka ha chefuo Jehova. (Diut. 8:1-3) Tupu ụmụ Izrel ebiri n’ala ha, a dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb, iyi inye gị, bụ́ nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị gị wuru, na ụlọ ndị jupụtara n’ihe ọma niile ọ na-abụghị gị kwajuru, na olulu mmiri e gwuru egwu ndị ọ na-abụghị gị gwuru, ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị gị kụrụ, ị ga-eri ihe wee rijuo afọ, lezie anya ka ị ghara ichefu Jehova.”—Diut. 6:10-12.
5. Olee ihe mere Jehova ji jụ mba Izrel, oleekwa mba ọhụrụ ọ họọrọ?
5 E nwere ezigbo ihe mere e ji dọọ ha aka ná ntị. N’oge Nehemaya, e nwere ndị Livaị ihere mere mgbe ha chetara ihe mere mgbe ụmụ Izrel banyechara n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ụmụ Izrel biiri n’ụlọ ndị mara mma nweekwa ihe oriri na mmanya n’ụba, ‘ha malitere iri ihe na iriju afọ na ịma abụba.’ Ha nupụụrụ Chineke isi, gbuodị ndị amụma o zitere ka ha dọọ ha aka ná ntị. Nke a mere ka Jehova hapụ ha ka ndị iro ha mesie ha ike. (Gụọ Nehemaya 9:25-27; Hos. 13:6-9) Ndị Juu na-enweghị okwukwe mechadịrị gbuo Mesaya ahụ e kwere ná nkwa mgbe ọ bịara n’oge ndị Rom na-achị ha. Jehova jụrụ ha ma họrọ mba ọhụrụ, ya bụ, Izrel ime mmụọ.—Mat. 21:43; Ọrụ 7:51, 52; Gal. 6:16.
“Unu Abụghị nke Ụwa”
6, 7. (a) Olee otú i si ghọta ihe Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya na ụwa? (b) Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst agaghị abụ nke ụwa Setan?
6 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-anọpụ iche n’ụwa, ya bụ, n’ajọ usoro ihe Setan. Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara Jọn 15:19.
ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa, kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.”—7 Ka Ndị Kraịst na-agbasa ebe niile, hà ga-amalitezi ime ka ụwa, ya bụ, ịkpawa àgwà ka ya ma bụrụ nke ya? Mba. N’agbanyeghị ebe ha bi, ha kwesịrị igosi na ha dị iche n’usoro ihe Setan. Mgbe ihe dị afọ iri atọ gara ka Kraịst nwụchara, Pita onyeozi degaara Ndị Kraịst bi n’ebe dị iche iche na Rom akwụkwọ ozi, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ana m agba unu ume dị ka ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge ka unu na-ezere ọchịchọ anụ ahụ́, nke bụ́ ihe ndị ahụ na-alụso mkpụrụ obi ọgụ. Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ.”—1 Pita 1:1; 2:11, 12.
8. Olee otú otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kọwaa otú Ndị Kraịst oge mbụ si dị iche n’ụwa?
8 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Kenneth Scott Latourette dere ihe gosiri n’eziokwu na Ndị Kraịst oge mbụ biri ndụ ka “ndị ala ọzọ na ndị bi nwa” n’oge ndị Rom na-achị. O dere, sị: “O doro onye ọ bụla anya na a kpagburu Ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ime narị afọ atọ mbụ ka e hiwechara okpukpe ha . . . E boro ha ebubo dị iche iche. A sịrị na ha ekweghị na Chineke n’ihi na ha anaghị eme ememme ndị ọgọ mmụọ. A sịrị na ha bụ ndị kpọrọ ọhaneze asị n’ihi na ha anaghị etinye aka n’ọtụtụ ihe ndị obodo na-eme, dị ka, ememme ndị ọgọ mmụọ, ihe ndị e ji eme ọhaneze obi ụtọ, bụ́ ndị Ndị Kraịst weere na ha bụ nkwenkwe na omenala ndị ọgọ mmụọ, na omume rụrụ arụ.”
Unu Ejila Ụwa Eme Ihe n’Uju
9. Olee otú anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst si egosi na anyị abụghị “ndị kpọrọ ọhaneze asị”?
9 Oleekwanụ banyere taa? Anyị na-adịkwa iche “n’ajọ usoro ihe dị ugbu a” dị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Gal. 1:4) Nke a mere ọtụtụ ndị ji aghọtahie anyị, ụfọdụ akpọọdị anyị asị. N’agbanyeghị nke a, anyị abụghị “ndị kpọrọ ọhaneze asị.” Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ ndị mmadụ ibe anyị n’anya ka anyị ji aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-ahụ na anyị ziri onye ọ bụla anyị hụrụ n’ụlọ “ozi ọma nke a nke alaeze [Chineke].” (Mat. 22:39; 24:14) Anyị na-eme nke a n’ihi na anyị ma na ọchịchị Alaeze Chineke, nke Kraịst bụ eze ya, ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ma were usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume dochie ya.—Dan. 2:44; 2 Pita 3:13.
10, 11. (a) Olee otú anyị si ejitụ ụwa na-eme ihe? (b) Olee ụfọdụ ụzọ Ndị Kraịst mụ anya si ezere iji ụwa eme ihe n’uju?
10 Ka ọgwụgwụ usoro ihe a na-eru nso, anyị bụ́ ndị ohu Jehova ma na ugbu a abụghị mgbe anyị ga-atụsara ahụ́ n’ụwa ochie a na-anwụ anwụ. Anyị na-eme ihe Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee. Ọ sịrị: “Ụmụnna m, ana m ekwukwa na oge fọdụrụ dị ntakịrị. Site ugbu a gaa n’ihu, ka . . . ndị na-azụ ihe dịrịkwa ka ndị na-enweghị ihe, ka ndị ji ụwa eme ihe dịrịkwa ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’uju; n’ihi na ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Kọr. 7:29-31) Ma, olee otú Ndị Kraịst nke oge a si eji ụwa eme ihe? Otú ha si eme nke a bụ iji ihe ọgbara ọhụrụ e mepụtara na ụzọ ọhụrụ e si agbasa ozi na-eme ka ndị mmadụ nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-anụ ozi ọma si na Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ. Ha na-akpata ihe ha na-eri n’ụwa. Ha na-azụta ihe ndị dị ha mkpa, bụ́ ndị a na-emepụta n’ụwa. Ma, ha anaghị eji ụwa eme ihe n’uju. Nke a pụtara na ha anaghị ewere ihe ndị a na-enweta n’ụwa na ọrụ ndị a na-arụ n’ụwa ka ihe ndị kacha mkpa ná ndụ ha.—Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.
11 Ndị Kraịst mụ anya anaghị eji ụwa eme ihe n’uju ma a bịa n’ihe banyere ịga mahadum. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa chere na mmadụ ga-agarịrị mahadum ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịba ọgaranya na ịbụ onye a ma ama. Ma anyị bụ́ Ndị Kraịst bi nwa oge n’ụwa a, na-achụkwa ihe ndị dị iche. Anyị na-agba mbọ ‘ka uche anyị ghara ịdị n’ihe ndị dị elu.’ (Rom 12:16; Jere. 45:5) Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị ime ihe ọ gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) N’ihi ya, a na-agba Ndị Kraịst na-eto eto ume ka ha na-achụso ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Ha kwesịrị ịgụru akwụkwọ naanị ebe ga-eme ka ha nwee ike inweta ihe ndị dị ha mkpa ná ndụ ka ha ‘ji obi ha dum na mkpụrụ obi ha dum na ike ha dum na uche ha dum’ na-ejere Jehova ozi. (Luk 10:27) Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha ga-abụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:21; gụọ Matiu 6:19-21.
Ekwela Ka Nchegbu nke Ndụ A Bogbuo Obi Gị
12, 13. Olee otú anyị si dị iche ná ndị ọzọ nọ n’ụwa n’ihi na anyị na-eme ihe e dere na Matiu 6:31-33?
12 Otú ndị ohu Jehova si ele ihe onwunwe anya dị iche n’otú ụwa si ele ya. Ọ bụ nke a mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa. Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” (Mat. 6:31-33) Ụfọdụ ụmụnna anyị esila n’ihe ndị mere ha ná ndụ chọpụta n’eziokwu na Nna anyị nke eluigwe na-enye ha ihe ndị na-akpa ha.
13 “Nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.” (1 Tim. 6:6) Nke a dị nnọọ iche n’otú ọtụtụ ndị si ele ihe anya n’ụwa taa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị na-eto eto alụọ di ma ọ bụ nwunye, ọtụtụ n’ime ha na-achọ inweta ihe niile ozugbo. Ha na-achọ inwe ụlọ obibi nke ihe niile e ji ebi n’ụlọ dị na ya, nwee ọmarịcha ụgbọala, nweekwa ngwá elektrọniks ndị ọgbara ọhụrụ. Ma, Ndị Kraịst ndị na-ebi ndụ ka ndị bi nwa oge na-achọ inweta naanị ihe ndị dị ha mkpa ha ga-enwetali. N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na e nweela ọtụtụ ndị lefuuru ọtụtụ ihe ndị a anya ka ha wee nwee ike ijikwu oge na ume ha na-ejere Jehova ozi. E nwere ndị nke na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ, nwee ndị na-eje ozi na Betel, nwee ndị bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, nweekwa ndị na-eje ozi ala ọzọ. N’eziokwu, anyị na-aja ụmụnna anyị ndị a mma maka ozi ha ji obi ha dum na-ejere Jehova.
14. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere onye na-agha mkpụrụ?
14 Mgbe Jizọs mere ihe atụ nke onye na-agha mkpụrụ, o kwuru na “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ịkpagbu okwu Chineke dị n’obi anyị ma mee ka anyị ghara ịmị mkpụrụ. (Mat. 13:22) Ọ bụrụ na afọ eju anyị n’ihe anyị nwere n’usoro ihe a anyị bi nwa oge, nchegbu nke ndụ a agaghị akpagbu okwu Chineke dị n’obi anyị. Kama nke ahụ, ọ ga-eme ka anya anyị “na-elegide otu ebe,” ya bụ, n’Alaeze Chineke, anyị ga-ebutekwa ihe ndị gbasara ya ụzọ ná ndụ anyị.—Mat. 6:22.
“Ụwa Na-agabiga”
15. Olee ihe Jọn onyeozi kwuru nke ga-enyere ezigbo Ndị Kraịst aka ịma ihe ha ga-ebute ụzọ ná ndụ na otú ha ga-esi na-ebi ndụ n’ụwa a?
15 Ihe bụ́ isi mere anyị bụ́ Ndị Kraịst ji were onwe anyị “ka ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge” n’ụwa bụ n’ihi na anyị kwenyesiri ike na ụwa a ga-agwụ n’oge na-adịghị anya. (1 Pita 2:11; 2 Pita 3:7) Ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ na ihe ndị anyị na-achụ ga-egosi ma ànyị kweere na ụwa a agwụwala. Jọn onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ ka ha ghara ịhụ ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya n’ihi na “ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:15-17.
16. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị so ná ndị e wepụtara iche?
16 A gwara ụmụ Izrel na ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi, ha ga-abụ ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ.’ (Ọpụ. 19:5) Mgbe ndị Izrel rubeere ya isi, otú ha si efe ofufe na otú ha si ebi ndụ dị iche n’otú mba ndị ọzọ si eme. Taakwa, Jehova ewepụtarala onwe ya ndị dị nnọọ iche n’ụwa Setan. A gwara anyị, sị: “Jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa . . . na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a, ebe anyị na-echere olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ na ngosipụta dị ebube nke Chineke ukwu ahụ nakwa nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, onye nyere onwe ya n’ihi anyị ka o wee napụta anyị n’ụdị mmebi iwu niile, wee sachaara onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche, ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.” (Taị. 2:11-14) “Ndị” a bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” nke Jizọs, bụ́ ndị na-enyere ndị e tere mmanụ aka ma na-akwado ha.—Jọn 10:16.
17. Gịnị mere na ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha agaghị akwa ụta na ha biri ndụ n’ụwa ọjọọ a ka ndị bi nwa oge?
17 “Olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ” nke ndị e tere mmanụ nwere bụ iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpu. 5:10) Mgbe olileanya ahụ atụrụ ọzọ nwere ga-emezu, nke bụ́ ịdị ndụ ebighị n’ụwa, ha agaghịzi abụ ndị bi nwa oge n’ụwa ọjọọ. Ha ga-enwe ebe obibi mara mma, nweekwa ọtụtụ ihe ha ga-eri na ihe ha ga-aṅụ. (Ọma 37:10, 11; Aịza. 25:6; 65:21, 22) Ha agaghị echefu na ihe a niile ha nwere si n’aka Jehova, bụ́ “Chineke nke ụwa dum,” otú ndị Izrel mere. (Aịza. 54:5) Ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ agaghị akwa ụta na ha biri ndụ n’ụwa ọjọọ a ka ndị bi nwa oge.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee otú ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie si bie ndụ ka ndị bịara ibi nwa oge?
• Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si bie ndụ ka ndị na-abụghị nke ụwa?
• Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si egosi na ha anaghị eji ụwa eme ihe n’uju?
• Olee ihe mere anyị agaghị akwa ụta na anyị biri ndụ ka ndị bịara ibi nwa oge n’ụwa ọjọọ a?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị Kraịst oge mbụ agaghị ebe a na-eme ihe nkiri ndị na-egosi ndị na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ