Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ụmụ Nwoke Aka Ka Ha Jewere Jehova Ozi

Nyere Ụmụ Nwoke Aka Ka Ha Jewere Jehova Ozi

Nyere Ụmụ Nwoke Aka Ka Ha Jewere Jehova Ozi

“Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”—LUK 5:10.

1, 2. (a) Olee ihe ndị ikom ụfọdụ mere mgbe Jizọs kwusaara ha ozi ọma? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

MGBE Jizọs na-ekwusa ozi ọma na Galili, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere ụgbọ mmiri ka ha gaa ebe naanị ha ga-anọ. Ma, ìgwè mmadụ ji ụkwụ chụrụ ha gawa. Ndị bịara n’ụbọchị ahụ dị “ihe dị ka puku ndị ikom ise, ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị.” (Mat. 14:21) N’oge ọzọ, ìgwè mmadụ bịakwutere Jizọs ka ọ gwọọ ha, nakwa ka ha nụrụ ihe ọ na-akụzi. Ndị so bịa na nke ugbu a dị “puku ndị ikom anọ, ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị.” (Mat. 15:38) Nke a gosiri na ọtụtụ ndị ikom so ná ndị bịakwutere Jizọs, ihe ọ kụziri masịkwara ha. N’eziokwu, Jizọs ma na ọtụtụ mmadụ ga-anabata ozi ọma ahụ. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na mgbe Jizọs rụchara ọrụ ebube nke mere ka ndị na-eso ụzọ ya gbute azụ hiri nne, ọ gwara Saịmọn, bụ́ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:10) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọrụ ikwusa ozi ọma dị ka ịkụ azụ, ọtụtụ ndị ikom ga-esokwa ná ndị mmadụ ha ‘ga-akụta.’

2 Taakwa, e nwere ọtụtụ ndị ikom ozi ọma anyị ji Akwụkwọ Nsọ na-ekwusa na-amasị, ha na-emekwa ihe ha na-amụta. (Mat. 5:3) Ma, ọtụtụ ụmụ nwoke bidoro ịmụ Baịbụl anaghị achọ ịghọ ndị Jehova. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka? N’agbanyeghị na o nweghị ụbọchị Jizọs jikeere sị na ọ bụ naanị ndị ikom ka ọ na-aga izi ozi ọma, o kwuru okwu n’ihe ụfọdụ na-enye ụmụ nwoke ndị nọ n’oge ahụ nsogbu. Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi enyere ụmụ nwoke aka ka Jizọs. Ka anyị tụlee ihe atọ na-enye ha nsogbu n’obi taa. Ha na-eche: (1) otú ha ga-esi akpata ihe a ga-eri, (2) ihe ndị ọzọ ga-ekwu, nakwa (3) na o nweghị ihe ha dị mma ya.

Otú A Ga-esi Akpata Ihe A Ga-eri

3, 4. (a) Olee ihe bụ́ mkpa ọtụtụ ụmụ nwoke? (b) Olee ihe mere ụfọdụ ụmụ nwoke ji ebute ihe onwunwe ụzọ kama ihe banyere Chineke?

3 Otu onye odeakwụkwọ gwara Jizọs, sị: “Onye Ozizi, m ga-eso gị gaa ebe ọ bụla ị chọrọ ịga.” Ma, mgbe Jizọs gwara ya na “Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-atọgbọ isi ya,” nwoke ahụ gbanwere obi. Ọ ga-abụ na ọmụma nwoke ahụ na-amaghị otú ọ ga-esi enweta ihe ọ ga-eri nyere ya nsogbu n’obi n’ihi na e nweghị ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nke gosiri na ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst.—Mat. 8:19, 20.

4 Ụmụ nwoke na-ahapụkarị ihe banyere ofufe Jehova na-achụ ihe onwunwe. Ihe bụ́ mkpa ọtụtụ n’ime ha bụ otú ha ga-esi gaa mahadum ma nweta ọrụ na-enye ezigbo ego. Ha chere na ego na ihe onwunwe ga-aka abara ha uru ugbu a karịa ịmụ Akwụkwọ Nsọ na ịgba mbọ ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ihe Baịbụl na-akụzi nwere ike ịna-amasị ha ma “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba” na-eme ka ha gharazie inwe mmasị. (Mak 4:18, 19) Ka anyị tụlee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ.

5, 6. Gịnị nyeere Andru, Pita, Jems, na Jọn aka ịhapụ ihe ha ji akpata ego ma bute ọrụ ikwusa ozi ọma ụzọ?

5 Andru na nwanne ya bụ́ Saịmọn Pita bụ ndị na-akụ azụ̀. Jọn, nwanne ya bụ́ Jems, na nna ha bụ́ Zebedi bụkwa ndị na-akụ azụ̀. Ọrụ ha na-enye ha ezigbo ego nke mere ka ha were ụmụ nwoke ndị ọzọ n’ọrụ. (Mak 1:16-20) Mgbe mbụ Andru na Jọn nụrụ banyere Jizọs n’ọnụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, ha kwetara na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Andru gwara nwanne ya bụ́ Saịmọn Pita, ikekwe Jọn gwakwara nwanne ya bụ́ Jems. (Jọn 1:29, 35-41) Ha anọ sooro Jizọs ruo ọnwa ole na ole ka ọ na-ekwusa ozi ọma na Galili, Judia, na Sameria. Ha anọ mechara gaghachi rụwa ọrụ ịkụ azụ ha na-arụ. Ha nwere mmasị n’ihe banyere Chineke, ma nke ahụ abụghị ihe mbụ ná ndụ ha.

6 Ka oge na-aga, Jizọs kpọrọ Pita na Andru ka ha soro ya ma ghọọ “ndị na-akụta mmadụ.” Gịnị ka ha mere? “Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbụ ha wee soro ya.” Jems na Jọn mekwara otu ihe ahụ mgbe ọ kpọrọ ha. “Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbọ mmiri ahụ na nna ha wee soro ya.” (Mat. 4:18-22) Gịnị nyeere ndị ikom ndị a aka ịbanye n’ozi oge niile? Hà mere nke a n’echeghị ya eche? Mbanụ! Ọnwa ole na ole gara aga, ha gere Jizọs ntị, hụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, hụ otú o si anụ ọkụ n’obi maka ezi omume, hụkwa otú ọtụtụ mmadụ si na-anabata ozi ọma ọ na-ekwusa. Nke a mere ka okwukwe ha nwere na Jehova sikwuo ike, meekwa ka ha tụkwasịkwuo ya obi.

7. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye ndị ya ihe na-akpa ha?

7 Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs ma nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ha tụkwasị Jehova obi? (Ilu 3:5, 6) Otú anyị si akụzi ihe ga-eme ka ha nwee ike ime nke a ma ọ bụ ghara ime ya. Mgbe anyị na-akụziri ha ihe, anyị kwesịrị ịgwa ha nkwa Chineke kwere na ọ ga-agọzi anyị n’ụba ma anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze ya. (Gụọ Malakaị 3:10; Matiu 6:33.) N’agbanyeghị na anyị nwere ike iji ọtụtụ amaokwu Baịbụl gosi otú Jehova si enye ndị ohu ya ihe na-akpa ha, otú anyịnwa si akpa àgwà ga-enyekwara ha aka. Ọ bụrụ na anyị akọọrọ onye anyị na-amụrụ ihe otú Jehova si na-enyere anyị aka, o nwere ike ime ka ọ tụkwasị Jehova obi. Anyị nwekwara ike ịkọrọ ya ihe ga-agba ya ume anyị gụtara n’akwụkwọ anyị. *

8. (a) Olee ihe mere onye a na-amụrụ Baịbụl ji kwesị ‘idetụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma’? (b) Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịhụ n’onwe ya na Jehova dị mma?

8 Naanị ịgụ na ịnụ otú Jehova si gọzie ndị ọzọ agaghị eme ka okwukwe onye anyị na-amụrụ ihe sie ike. O kwesịkwara ịhụ ná ndụ ya ihe na-egosi na Jehova dị mma. Ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma; obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.” (Ọma 34:8) Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye ahụ anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịhụ na Jehova dị mma? Ka e were ya na ihe na-esiri onye ị na-amụrụ ihe ike, ya ana-agbakwa mbọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ịgba chaa chaa, ma ọ bụ ịṅụ oké mmanya. (Ilu 23:20, 21; 2 Kọr. 7:1; 1 Tim. 6:10) Í cheghị na ihe ga-enyere ya aka ịhụ ịdị mma Jehova ga-abụ ịkụziri ya ka ọ rịọ Chineke ka o nyere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ahụ ọ na-akpa? Cheekwa ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị agbaa onye anyị na-amụrụ ihe ume ka o wepụta oge na-amụ Baịbụl kwa izu, na-akwadebekwa ọmụmụ ihe, ma na-agachi ha anya. N’eziokwu, okwukwe ya ga-esi ike ma ọ bụrụ na ọ hụ otú Jehova si na-agọzi mbọ ọ na-agba.

Egwu Maka Ihe Ndị Ọzọ Ga-ekwu

9, 10. (a) Gịnị mere Nikọdimọs na Josef onye Arimatia achọghị ka ndị ọzọ mara na ha nwere mmasị n’ihe Jizọs na-akụzi? (b) Olee ihe mere ụfọdụ ụmụ nwoke anaghị achọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

9 Ụfọdụ ụmụ nwoke nwere ike ha agaghị achọ iso Kraịst n’ihi ihe ndị ọzọ ga-ekwu. Nikọdimọs na Josef onye Arimatia ekweghị ka a mara na ha nwere mmasị n’ihe Jizọs na-akụzi n’ihi na ụjọ na-atụ ha maka ihe ndị Juu ibe ha ga-ekwu ma ọ bụ ihe ha ga-eme ma ha mata. (Jọn 3:1, 2; 19:38) E nwere ihe mere ha ji na-atụ ụjọ. Ndị ndú okpukpe kpọrọ Jizọs asị nke ukwuu nke na ha na-achụpụ onye ọ bụla kwuru na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs n’ụlọ nzukọ ha.—Jọn 9:22.

10 N’ebe ụfọdụ taa, ọ bụrụ na mmadụ egosi mmasị n’ihe banyere Chineke ma ọ bụ na Baịbụl, ma ọ bụkwanụ n’okpukpe, ndị ọrụ ibe ya, ndị enyi ya, ma ọ bụ ndị ikwu ya nwere ike inyewe ya nsogbu. N’ebe ndị ọzọ, onye na-akọrọ onye ọzọ ihe nwere ike ime ka ọ hapụ okpukpe ọ nọ na ya na-achọ ihe ga-eme ya. Ụjọ a na-aka njọ ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye agha, ma ọ bụ bụrụ onye na-adọ ọchịchị, ma ọ bụkwanụ bụrụ onye a ma ama n’obodo. Dị ka ihe atụ, otu nwoke bi na Jamanị kwuru, sị: “Ihe unu bụ́ Ndịàmà Jehova na-ekwusa banyere Baịbụl bụ eziokwu. Ma, m bụrụ Onyeàmà Jehova taa, onye ọ bụla ga-ama. Olee ihe ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ, ndị agbata obi m, na ndị klọb mụ na ezinụlọ m nọ ga-eche? Ọ gaghị ekwe m omume.”

11. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ka ha ghara ịna-atụ egwu mmadụ?

11 N’agbanyeghị na ndịozi Jizọs nwere obi ike, e nwekwara oge ndị ha tụrụ ndị ọzọ ụjọ. (Mak 14:50, 66-72) Olee otú Jizọs si nyere ha aka ha agaa n’ihu na-eso ụzọ ya n’agbanyeghị nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị ọzọ na-enye ha? Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ijikere maka mmegide a ga-emecha megidewe ha. Ọ gwara ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị, na mgbe ọ bụla ha chụpụrụ unu, kọchaa unu ma mebie aha unu wee kwuo na unu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, n’ihi Nwa nke mmadụ.” (Luk 6:22) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-akọcha ha. Nkọcha ọ bụla a ga-akọcha ha bụ “n’ihi Nwa nke mmadụ.” Jizọs mesikwara ha obi ike na Chineke ga-anọnyere ha ma ọ bụrụhaala na ha atụkwasị ya obi na ọ ga-enyere ha aka, nyekwa ha ume. (Luk 12:4-12) Ihe ọzọ Jizọs mekwara bụ ịkpọ ndị malitere iso ya ọhụrụ ka ha na ndị na-eso ụzọ ya nọrịa ka ha na ha nwee ike ịbụ ndị enyi.—Mak 10:29, 30.

12. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịkwụsị ịtụ egwu mmadụ?

12 Anyịnwa kwesịkwara inyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ha kwụsị ịtụ egwu mmadụ. Otu n’ime ụzọ anyị nwere ike isi mee nke a bụ inyere ha aka ịma ihe ha ga-eme ma ndị ọzọ nyewe ha nsogbu. (Jọn 15:19) Dị ka ihe atụ, i nwere ike inyere onye ị na-amụrụ ihe aka ya achọta ihe dị mma ọ ga-aza ndị ọrụ ibe ya na ndị ọzọ ma ha jụọ ya ajụjụ ma ọ bụkwanụ ha kwuo na ha ekweghị n’ihe o kweere. Anyị ga-emete ya enyi, meekwa ka ọ mata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị ihe ya na ya na-alụ ugbu a merela. Nke kacha mkpa bụ na anyị kwesịrị ịkụziri ya ka ọ na-ekpe ekpere mgbe niile, jirikwa obi ya dum na-ekpe ya. Nke a ga-enyere ya aka ịbịaru Chineke nso ma mee Jehova Ebe Mgbaba na Oké Nkume ya.—Gụọ Abụ Ọma 94:21-23; Jems 4:8.

Mgbe Ha Chere na O Nweghị Ihe Ha Dị Mma Ya

13. Olee ihe na-eme ụfọdụ anaghị achọ iso na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova?

13 Ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị achọ itinye aka n’ihe banyere ofufe Chineke n’ihi na ha amaghị agụ ihe nke ọma ma ọ bụ na okwu anaghị aga ha were were n’ọnụ ma ọ bụkwanụ n’ihi na ihere na-eme ha. Ihere na-eme ụfọdụ ụmụ nwoke ikwu obi ha n’ihu ọha. Nke a na-eme, ha cheta mgbe onye na-amụrụ ha ihe ji abịa, cheta ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ma ọ bụ cheta ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere, obi awụnye ha n’afọ. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Mgbe m dị obere, m na-eme ngwa ngwa gaa n’ọnụ ụzọ mmadụ, mee ka m̀ na-apị mgbịrịmgba ụzọ ma jiri nwayọọ gafere, na-ekpe ekpere ka a ghara inwe onye ga-anụ ụda ụkwụ m ma ọ bụ hụ m. . . . Ọ na-abụ m cheta ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mụ adaa ọrịa.”

14. Olee ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs agwọlighị nwata nwoke mmụọ ọjọọ ji?

14 Cheedị otú obi dị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ha na-enweghị ike ịgwọ otu nwata nwoke mmụọ ọjọọ ji. Nna nwa ahụ bịakwutere Jizọs ma gwa ya, sị: “[Nwa m nwoke] bụ onye akwụkwụ, ọnọdụ ya dịkwa njọ, n’ihi na ọ na-adaba n’ọkụ mgbe mgbe, na-adabakwa n’ime mmiri mgbe mgbe; m wee kpọtara ya ndị na-eso ụzọ gị, ma ha enweghị ike ịgwọ ya.” Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ ahụ́ adị nwata ahụ mma. Ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara bịakwute Jizọs ma jụọ ya, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?” Jizọs zara ha, sị: “Ọ bụ n’ihi okwukwe nta unu. N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si n’ebe a gafee n’ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.” (Mat. 17:14-20) Anyị ga-enwerịrị okwukwe na Jehova ma ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri nsogbu ndị yiri ugwu. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ echefuo nke a ma chewe na ya nwere ike imeli ihe ndị a n’ike aka ya? Ọ bụrụ na o melighị ha, ọ ga-adị ya ka o nweghị ihe ọ dị mma ya.

15, 16. Olee otú anyị ga-esi enwe ike inyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịkwụsị iche na o nweghị ihe ya dị mma ya?

15 Otu ụzọ dị mma anyị ga-esi nyere onye chere na o nweghị ihe ọ dị mma ya aka bụ ịgba ya ume ka ọ tụkwasị Jehova obi kama ichewe ihe ọ ga-emeli na ihe ọ na-agaghị emeli. Pita dere, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru; na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:6, 7) Otú anyị ga-esi mee nke a bụ inyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ya na Jehova dịrị ná mma. Onye hụrụ Jehova n’anya anaghị eji ihe ndị gbasara Chineke egwu egwu. Ọ hụrụ Okwu Chineke n’anya, na-egosikwa na ya nwere “mkpụrụ nke mmụọ.” (Gal. 5:22, 23) Ọ na-ekpechi ekpere anya. (Fil. 4:6, 7) Ọ na-arịọkwa Chineke ka o nye ya obi ike na ume ọ ga-eji emeri nsogbu ọ bụla bịaara ya ma ọ bụ nke ọ ga-eji arụ ọrụ ọ bụla e nyere ya.—Gụọ 2 Timoti 1:7, 8.

16 E nwekwara ike inwe ndị anyị na-amụrụ ihe anyị kwesịrị inyere aka ka ha mụta otú ha ga-esi na-agụ ihe nke ọma, ma ọ bụkwanụ otú ha ga-esi nwee ike iso ndị ọzọ na-akparịta ụka otú dị mma. O nwere ike ịdị ụfọdụ ndị ka ọ̀ bụ na ha erughị eru ife Chineke n’ihi omume ọjọọ ndị ha mere tupu ha amụta ihe Jehova chọrọ. N’agbanyeghị ihe bụ́ nsogbu ha, ihe ga-akacha enyere ha aka bụ ma anyị jiri ịhụnanya na ndidi nyere ha aka. Jizọs kwuru, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.”—Mat. 9:12.

‘Kụtakwuonụ’ Ndị Ikom

17, 18. (a) Olee otú anyị nwere ike isi zikwuo ọtụtụ ụmụ nwoke ozi ọma? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

17 Anyị chọrọ ka e nwekwuo ọtụtụ ụmụ nwoke ndị ga-amụta eziokwu nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, bụ́ nke dị naanị na Baịbụl. (2 Tim. 3:16, 17) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi eme ka ozi ọma anyị rutekwuo ọtụtụ ụmụ nwoke? Ọ bụ ma anyị na-ewepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma n’uhuruchi, n’ehihie Satọdee ma ọ bụ Sọnde, ma ọ bụ n’oge ezumike, bụ́ mgbe ọtụtụ ụmụ nwoke na-anọkarị n’ụlọ. Ọ bụrụ na anyị agaa ozi ọma, anyị nwere ike ịjụ ndị anyị hụrụ n’ụlọ ma nwoke nwe ụlọ ọ̀ nọ ya. Anyị kwesịkwara ịna-ezi ụmụ nwoke ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ozi ọma mgbe ọ bụla o kwere anyị omume, na-ezikwa ụmụ nwoke ndị nwunye ha bụ Ndịàmà ozi ọma.

18 Ka anyị na-ezi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma, obi siri anyị ike na ndị nwere ezi obi ga-anabata ozi ọma. Ka anyị jiri ndidi nyere ndị niile nwere mmasị aka ịmụta eziokwu ahụ. Ma, olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụ nwoke ndị e mere baptizim aka ka ha eruo eruo ịrụ ọrụ ndị e nwere ná nzukọ Jehova? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Gụọ Yearbooks of Jehovah’s Witnesses na akụkọ ndụ ndị na-agba n’Ụlọ Nche na Teta!

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú e nwere ike isi nyere ụmụ nwoke aka ka ha bute ihe ndị gbasara ofufe Chineke ụzọ?

• Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ka ha ghara ịna-atụ egwu mmadụ?

• Olee ihe nwere ike inyere ụfọdụ ndị aka ka ha kwụsị iche na o nweghị ihe ha dị mma ya?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Ị̀ na-ewepụtakwu oge ezikwu ọtụtụ ụmụ nwoke ozi ọma?

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka o nwee ike ịma ihe ọ ga-eme ma ọnwụnwa bịara ya?