Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na I Nwere “Ihe Ùgwù nke Iji Obiọma Na-enye Ihe”?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na I Nwere “Ihe Ùgwù nke Iji Obiọma Na-enye Ihe”?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na I Nwere “Ihe Ùgwù nke Iji Obiọma Na-enye Ihe”?

IHE e ji mara Ndị Kraịst nọ na Filipaị bụ na ha na-enye onyinye n’ụba iji kwado ezi ofufe. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ha, ọ sịrị: “Ana m ekele Chineke m mgbe niile n’oge ọ bụla m chetara unu n’arịrịọ niile m na-arịọsi ike n’ihi unu niile, mgbe m ji ọṅụ na-arịọsi arịrịọ ike, n’ihi ọrụ unu rụworo n’ịgbasa ozi ọma malite n’ụbọchị mbụ ruo ugbu a.” (Fil. 1:3-5) Pọl chetara nnọọ mgbe e mere Lidia na ndị ezinụlọ ya baptizim, Lidia esie ọnwụ ka Pọl na ndị ya na ha so na-ekwusa ozi ọma bata n’ụlọ ya ka o lee ha ọbịa.—Ọrụ 16:14, 15.

Obere oge nke a mechara, ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ na Filipaị zigaara Pọl ihe oriri ugboro abụọ n’oge ọ nọrọ izu ole na ole na nke Ndị Kraịst ibe ya bi na Tesalonaịka, bụ́ obodo dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị kilomita na iri isii ma e si Filipaị gawa ya. (Fil. 4:15, 16) Ka afọ ole na ole gachara, mgbe ndị Filipaị na ụmụnna ndị ọzọ nọ na Masedonia nọ ná mmekpa ahụ́ ma ‘daa ogbenye nke ukwuu,’ ha nụrụ na ụmụnna ndị nọ na Jeruselem, bụ́ ndị a nọ na-akpagbu, nọ ná mkpa, ha chọkwara inyere ha aka. Pọl gbara akaebe na ha mere nke a “karịa otú ike ha hà n’ezie.” O dekwara, sị: “Ha rịọsiri anyị arịrịọ ike . . . ka anyị kwe ka ha nwee ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ihe.”—2 Kọr. 8:1-4; Rom 15:26.

Ka ihe dị ka afọ iri gachara ndị Filipaị ghọrọ Ndị Kraịst, ha ka na-emesapụkwa aka. Mgbe ha nụrụ na a tụọla Pọl mkpọrọ na Rom, ha zipụrụ Epafrọdaịtọs ka o bugara onyeozi a ihe oriri. Ihe niile ọ gara, ma nke ọ gara n’ala nkịtị ma nke ụgbọ mmiri bu ya gaa, dị otu puku kilomita na narị abụọ na iri asatọ na asaa. O doro anya na ndị Filipaị chọrọ inye Pọl ihe oriri ka o nwee ike ịna-agba ụmụnna ume ma na-ekwusa ozi ọma, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ.—Fil. 1:12-14; 2:25-30; 4:18.

Taa, ezi Ndị Kraịst na-ewere na ọ bụ ihe ùgwù na ha na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Ha na-eji oge ha, ume ha, na ego ha akwado ihe ndị gbasara Alaeze ahụ. N’igbe dị n’isiokwu a, e kwuru ụzọ ụfọdụ mmadụ nwere ike isi kwado ọrụ a Chineke nyere anyị rụọ.

[Igbe dị na peeji nke 22, 23]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Họọrọ Isi Na-enye

ONYINYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ kpebie, ego ole ha ga na-enye n’onyinye n’igbe e dere “Worldwide Work” (ya bụ, “Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ”).

N’ọnwa ọ bụla, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ha nwetara n’igbe a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya ziga ego onyinye n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya. (Mmadụ nwekwara ike iziga nke ọ bụla n’ime onyinye e kwuru okwu ha n’igbe a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya.) E kwesịrị ide “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E nwekwara ike inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike irete ego. Onye na-ezite ihe ndị a kwesịrị izitekọta ha na obere akwụkwọ ozi iji kọwaa na ha bụ onyinye.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe iji kwadoo ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. Ha bụ:

Ịnshọransị: E nwere ike idenye aha Watch Tower n’ebe a na-ede aha onye a chọrọ ka e nye ego ịnshọransị ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye ga-eso keta ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ego E Tinyere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o tinyere n’ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụkwanụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. A ga-eme nke a otú ụlọ akụ̀ dị ná mba ya kwuru ka e si mee ya.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego n’onyinye ma ọ bụkwanụ mmadụ nwere ike ikwu na a ga-enye ha Watch Tower ma ya nwụọ.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye ala na ụlọ e nwere ike ire ere, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya ma ka biri na ya n’oge niile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-enye ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: E nwere ike idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, mmadụ nwekwara ike ikwu na uru a ga na-enweta n’ụlọ ọrụ o nwe ma ọ bụ n’ahịa ọ na-azụ ga na-agara Watch Tower.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye na-enye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Ị chọọ ịmatakwu banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Naịjirịa, site n’ịkpọ ha na telefon ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ ozi, n’adres e dere n’okpuru ebe a ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: 07080662020